Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Olileanya Ọ Bụla Maka Nzọpụta?

È Nwere Olileanya Ọ Bụla Maka Nzọpụta?

È Nwere Olileanya Ọ Bụla Maka Nzọpụta?

A kpọwo narị afọ nke 20 otu n’ime narị afọ ndị a kasị kwafuo ọbara na ha nke ihe a kpọrọ mmadụ hụtụworo. Mpụ, agha, esemokwu agbụrụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, emeghị ihe n’eziokwu, na ime ihe ike juru ebe nile karịsịa n’ime iri afọ ole na ole ndị gara aga. Tụkwasị na nke a, ndị mmadụ enwewo ihe mgbu na nhụjuanya n’ihi ọrịa, ịka nká, na ọnwụ. Olee onye ntọhapụ pụọ n’ọtụtụ nsogbu ndị dị n’ụwa taa na-adịghị agụsi agụụ ike? Ka anyị na-elepụ anya n’ọdịnihu, è nwere olileanya ọ bụla maka nzọpụta?

TỤLEE ọhụụ ahụ e mere ka Jọn onyeozi hụ n’ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. O dere, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) N’otu aka ahụ, Aịsaịa onye amụma buru amụma, sị: “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—Aịsaịa 25:8.

Cheedị banyere ihe mmezu nke nkwa Chineke ga-apụta! A ga-anapụta, ma ọ bụ gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmegbu na ime ihe ike, pụọkwa n’ihe ndị na-akpata nhụjuanya na nsogbu. Leenụ, ọbụna ọrịa, ịka nká, na ọnwụ agaghị eti anyị ihe otiti! Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwe nkwa ndụ ebighị ebi n’okpuru ọnọdụ zuru okè n’elu ala. (Luk 23:43; Jọn 17:3) Ndị nile chọkwara ya ga-enweta ya. “[Chineke] na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4.

Otú ọ dị, iji rite uru site ná nkwa Chineke, anyị aghaghị ịghọta òkè Jisọs Kraịst na-ekere ná nzọpụta anyị ma gosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ. Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’izo aka n’òkè dị mkpa Jisọs Kraịst na-ekere n’okwu a, Pita onyeozi kwuru, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.” (Ọrụ 4:12) Pọl onyeozi na onye òtù ya bụ́ Saịlas gbara otu onye ji ezi obi jụọ ha ajụjụ ume, sị: “Kwere n’Onyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụtakwa gị, gị onwe gị na ezinụlọ gị.”—Ọrụ 16:30, 31.

Ee, Jisọs Kraịst bụ “Onye ahụ nke na-eduba mmadụ ná ndụ,” nzọpụta kwekwara omume nanị site na ya. (Ọrụ 3:15 ) Ma olee otú otu onye pụrụ isi bụrụ onye bụ́ isi otú ahụ n’ịzọpụta anyị? Inwe nghọta zuru ezu banyere òkè ọ na-ekere n’akụkụ a kwesịrị ime ka olileanya anyị nwere maka nzọpụta sikwuo ike.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]

Peeji nke 3: Ụgbọ Elu Ndị E Ji Atụ Bọmbụ: Foto USAF; ụmụaka agụụ na-agụgbu: MBA NDỊ DỊ N’OTU/J. FRAND; ụgbọ agha mmiri na-agba ọkụ: Foto Ndị Agha Mmiri U.S.