Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”

“Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”

“Anyị Ga-ahụ n’Alaeze Chineke”

“Ezigbo enyi m! Rupert, taa, a mara m ikpe ọnwụ. Erurula m újú. Jide n’aka na ahụrụ m gị na ndị nile nọ n’ụlọ n’anya. Anyị ga-ahụ n’Alaeze Chineke.”

NA June 8, 1942, Franc Drozg dere okwu ndị a minit ole na ole tupu ndị agha Nazi agbagbuo ya. Gịnị mere e ji gbagbuo ya?

Dị ka ihe ndekọ dị n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia, si kwuo, ọkpụ ụzụ́ a dị afọ 38 jụrụ isonyere Wehrmannschaft, bụ́ òtù ndị agha Germany nọ na Slovenia nke Germany weghaara. Ọ bụ onye Bibelforsche, ma ọ bụ Onye Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’ógbè ahụ mgbe ahụ. N’ime ihe kwekọrọ n’Aịsaịa 2:4, ọ gaghị akwado agha ndị Nazi na-ebu, na-ekwupụta na ya bụ onye Alaeze Chineke na-achị.—Matiu 6:33.

N’obodo Franc bụ́ Ptuj, a maara ya dị ka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) N’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike o nwere, o kwusara ozi ọma ahụ n’esepụghị aka ruo mgbe e jidere ya na May 1942.

Ndị Nazi kpagburu ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Slovenia n’ụzọ kpụ ọkụ ọnụ. Franc so ná ndị mbụ n’ime ha a gbagburu n’ihi nkwenkwe okpukpe ya. Dị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ, okwu ndị a wusiri ya ike: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:22) Okwukwe o nwere n’ịdị adị nke ọchịchị eluigwe ahụ pụtara ìhè n’okwu ikpeazụ o kwuru, “Anyị ga-ahụ n’Alaeze Chineke.”

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 32]

Franc Drozg: Foto Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia; akwụkwọ ozi: E debere nke o ji aka ya dee n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Nnwere Onwe Mba dị na Maribor, Slovenia