Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ

Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ

Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ

Otu onye a ma ama na-eme egwuregwu n’ụwa, onye bụ aka ochie n’egwuregwu ya, bụ́ onye yiri ka ahụ o siri ya nnọọ ike, tụbọrọ na mberede mgbe ọ na-amụgharị ihe ma nwụọ. Onye ahụ na-eme egwuregwu bụ Sergei Grinkov, bụ́ onye nwetaworo ihe nrite ọlaedo ugboro abụọ n’egwuregwu Olympic dị ka onye na-agbagharị na ice, onye ime egwuregwu ya jiri ike bịa ná njedebe mgbe a ka malitere ịnụ aha ya—mgbe ọ dị nanị afọ 28. Lee ọdachi nke ahụ bụ! Gịnị kpatara ya? Ọ bụ nkụchi obi. E kwuru na ọ nwụrụ nnọọ na mberede n’ihi na e nweghị ụdị ihe àmà ọ bụla gosiri na ọ na-arịa ọrịa obi. Ma, ndị nnyocha chọpụtara na obi ya zara aza nakwa na akwara na-ekesa ọbara n’obi ya sụchiri nnọọ asụchi.

Ọ BỤ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọtụtụ nkụchi obi ọ na-eme n’enyeghị ihe mgbaàmà, ndị ọrụ ahụ ike na-ekwu na ọ naghị adịkebe otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-elegharakarị ihe mgbaàmà na ihe ndị so akpata ya, dị ka ekutechaghị ume, ibu oké ibu, na obi mgbu, anya. N’ihi ya, ọbụna ma a sị na ọtụtụ ndị anwụghị mgbe ha nwere nkụchi obi, ha na-enwe nkwarụ dị oké njọ n’oge ndụ ha fọdụrụnụ.

Echiche ndị ọrụ ahụ ike kwekọrịtara na ya taa bụ na igbochi nkụchi obi chọrọ mmadụ ịkpachara anya mgbe nile n’ụdị ihe ọ na-eri na otú o si ebi ndụ nakwa ile ahụ mgbe nile. * Ime ihe ndị dị otú ahụ, tinyere ịdị ezi njikere ime mgbanwe n’ebe ndị ọ dị mkpa, ga-enyere mmadụ aka n’ụzọ dị ukwuu n’izere ihe ndị dị njọ nkụchi obi na-akpata.

Otú ọ dị, e nwere akụkụ ọzọ nke obi anyị bụ́ nke kwesịrị ilebara anya ọbụna karị. “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị,” ka Bible na-adọ anyị aka ná ntị, “n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) N’ezie, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’obi ihe atụ. Ọ dị mkpa ịnọ na nche iji chebe obi nkịtị anyị, ma ọ dị mkpa ọbụna karị ịnọgide na nche ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe obi ihe atụ anyị pụọ n’ọrịa ndị pụrụ ịkpata ọnwụ ime mmụọ.

Nnyocha nke Obi Ihe Atụ

Dị ka ọ dị n’ọrịa obi nkịtị, n’ụzọ ime mmụọ, otu n’ime ụzọ ndị a kasị jide n’aka e si egbochi obi nkụchi bụ ịmata ihe ndị na-akpata ya na iwere nzọụkwụ iji mee ihe banyere ha. Ya mere, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime isi ihe ndị na-akpata nsogbu obi—nke nkịtị na nke ihe atụ.

Ihe oriri. Ọ bụ ihe a nakweere n’ebe nile na nri ratụ ratụ, ọ bụ ezie na ọ na-atọ ụtọ, adịchaghị ma ọ bụ adịghịdị akwalite ahụ ike. N’otu aka ahụ, nri ratụ ratụ nke uche dị n’ebe a pụrụ inweta ha ngwa ngwa, na-adọrọkwa uche, ma ha na-emebi ahụ ike ime mmụọ nke mmadụ. A na-akpọsa ọtụtụ ihe ndị na-egosi mmekọahụ rụrụ arụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ime ihe ike, na ime anwansi, n’ụzọ na-adọrọ adọrọ n’usoro mgbasa ozi. Iji ihe ndị dị otú ahụ na-emejupụta uche na-ebibi obi ihe atụ. Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:16, 17.

Ihe oriri ndị na-akwalite ahụ ike, dị ka mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, adịchaghị amasị onye iri nri ratụ ratụ maara ahụ. N’otu aka ahụ, nri ime mmụọ ndị dị mma ma na-edozi ahụ pụrụ ịbụ ihe na-adịchaghị amasị onye ọ marawooro ahụ iji ihe nke ụwa na-emejupụta uche na obi ya. Ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ ịṅụrụtụ “mmiri ara” nke Okwu Chineke. (Ndị Hibru 5:13) N’ikpeazụ, ọ dịghị azụlite ntozu okè ime mmụọ bụ́ nke dị mkpa iji buo ibu ọrụ ime mmụọ ya ndị bụ́ isi n’ọgbakọ na n’ozi ndị Kraịst. (Matiu 24:14; 28:19; Ndị Hibru 10:24, 25) Ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ ekwewo ka ike ime mmụọ ha belata ruo n’ókè nke na ha na-aghọ Ndịàmà na-adịghị ejekwa ozi ma ọ bụ Ndịàmà n’ọnụ!

Ihe ize ndụ ọzọ bụ na ọdịdị elu ahụ pụrụ ịdị na-eduhie eduhie. Mmadụ ịrụ ọrụ ndị Kraịst iji mezuo iwu pụrụ ikpuchi ọrịa na-akawanye njọ nke obi ihe atụ bụ́ nke iji nzuzo na-enwe echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya ma ọ bụ ihe ntụrụndụ a na-egosi omume rụrụ arụ, ime ihe ike, ma ọ bụ anwansi na ha, meworo ka ọ ghara ịdị ike. Ihe oriri ime mmụọ ndị dị otú ahụ na-adịghị mma pụrụ iyi ka ọ dịchaghị ihe ọ na-eme ọnọdụ ime mmụọ mmadụ, ma ọ pụrụ ịkwarụ obi ihe atụ otú erighị ezigbo ihe pụrụ isi gbasie akwara ma mebie obi nkịtị. Jisọs dọrọ aka ná ntị megide mmadụ ikwe ka ọchịchọ ndị na-ezighị ezi bata ya n’obi. Ọ sịrị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Ee, erighị ezigbo ihe n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịkpata nkụchi obi ime mmụọ. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ a ga-atụle.

Mmega ahụ. Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ụzọ ndụ nke ịnọ otu ebe pụrụ iso kpata nkụchi obi nkịtị. N’otu aka ahụ, ụzọ ndụ nke ịnọ otu ebe n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị njọ. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ịdị na-ekeretụ òkè n’ozi ndị Kraịst ma na-eme nke a nanị mgbe ọ dịịrị ya mfe, n’emeghị mgbalị iji ghọọ “onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (2 Timoti 2:15) Ma ọ bụ, mmadụ pụrụ ịdị na-aga nzukọ ụfọdụ nke ndị Kraịst ma na-eme ihe dị nta iji kwadebe ma kere òkè na ha. Ọ pụrụ ịbụ na o nweghị ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ma ọ bụ agụụ ma ọ bụkwanụ ịnụ ọkụ n’obi maka ihe ime mmụọ. Emegaghị ahụ n’ụzọ ime mmụọ na-emesị mee ka okwukwe onye ahụ pụrụ inwebu ghara ịdị ike ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ nwụọ. (Jemes 2:26) Pọl onyeozi kwuru banyere ihe ize ndụ a mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, bụ́ ndị o doro anya na ụfọdụ n’ime ha adabawo n’ụzọ ndụ nke ịnọ otu ebe dị otú ahụ. Rịba ama ụzọ o si dọọ aka ná ntị banyere otú nke a pụrụ isi gbasie ọnọdụ ime mmụọ ha. “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ: kama na-arịọrịtanụ ibe unu arịrịọ kwa ụbọchị, n’ogologo oge a a na-akpọ ya Taa; ka obi onye ọ bụla n’etiti unu ghara ime etili site n’aghụghọ nke mmehie.”—Ndị Hibru 3:12, 13.

Nchekasị. Isi ihe ọzọ na-akpatakwa nkụchi obi nkịtị bụ oké nchekasị. N’otu aka ahụ, nchekasị ma ọ bụ “nchegbu nke ndụ,” pụrụ igbu obi ihe atụ n’ụzọ dị mfe, ọbụna na-eme ka onye ahụ kwụsị ijere Chineke ozi kpam kpam. Ịdọ aka ná ntị Jisọs nyere banyere nke a bịara n’ezi oge: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” (Luk 21:34) Nchekasị pụkwara inwe mmetụta dị njọ n’ebe obi ihe atụ anyị dị ma ọ bụrụ na anyị anọrọ na-enwe mwute ruo ogologo oge n’ihi mmehie anyị mere na nzuzo. Eze Devid sitere n’ahụmahụ ya mata ihe mgbu nchekasị dị otú ahụ na-emerụ ahụ na-akpata mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghịkwa udo ọ bụla dị n’ọkpụkpụ m nile n’ihi mmehie m. N’ihi na ajọ omume m nile agabigawo n’elu isi m: dị ka ibu arọ ha dịkarịrị m arọ.”—Abụ Ọma 38:3, 4.

Inwebiga obi ike ókè. Ọtụtụ ndị nweworo nkụchi obi nwere nnọọ obi ike banyere ọnọdụ ahụ ike ha kpọmkwem tupu ha enwee nkụchi obi. Mgbe mgbe, a na-ewezụga ile ahụ n’ụsọ ma ọ bụ ọbụna jiri ọchị kwuo na ọ bụ ihe na-adịtụdịghị mkpa. N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ pụrụ iche na ebe ọ bụ na ha abụwo ndị Kraịst ruo oge ụfọdụ, ma eleghị anya, ọ dịghị ihe pụrụ ime ha. Ha pụrụ ileghara ile ahụ ime mmụọ ma ọ bụ ime nnyocha onwe onye anya ruo mgbe ọdachi mere. Ọ dị oké mkpa iburu n’uche ezi ndụmọdụ megidere inwebiga obi ike ókè bụ́ nke Pọl onyeozi nyere, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikweta na anyị ezughị okè nakwa ịdị na-enyocha onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ site n’oge ruo n’oge.—1 Ndị Kọrint 10:12; Ilu 28:14.

Elegharala Ihe Mgbaàmà Anya

E nwere ezi ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji lekwasị anya karịsịa n’ọnọdụ nke obi ihe atụ. Na Jeremaịa 17:9, 10, anyị na-agụ, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya? Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-enyocha obi, na-anwa akụrụ, ọbụna inye onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, dị ka mkpụrụ nke omume ya nile si dị.” Ma, e wezụga inyocha obi anyị, Jehova na-emekwa ndokwa ịhụnanya iji nyere anyị aka n’ime nnyocha onwe onye dị mkpa.

Site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” a na-enye anyị ihe ncheta ndị na-abịa n’ezi oge. (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, otu n’ime ụzọ ndị bụ́ isi obi ihe atụ anyị pụrụ isi duhie anyị bụ site n’ime ka anyị nọgide na-eche echiche efu nke ụwa. Ha bụ echiche banyere ihe ndị na-adịghị adị, ịmụ anya arọ nrọ, na uche ịdị na-awagharị n’ihe ndị na-abaghị n’ihe. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ nnọọ ịghọ ihe ndị na-emerụ ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ha akpalite echiche ndị na-adịghị ọcha. N’ihi ya, anyị aghaghị ịjụ ha kpam kpam. Ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmebi iwu asị dị ka Jisọs kpọrọ ya, anyị ga-echebe obi anyị pụọ n’ịnọgide na-eche echiche efu nke ụwa.—Ndị Hibru 1:8, 9.

Tụkwasị na nke ahụ, anyị nwere enyemaka nke ndị okenye na-ahụ n’anya nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ezie, ọ bụ eziokwu na anyị na-enwe ekele maka nchegbu ndị ọzọ na-enwe banyere anyị, ibu ọrụ nke ilekọta obi ihe atụ anyị dabeere n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ n’otu n’otu. Ọ dị anyị nile n’otu n’otu n’aka ‘ịnwapụta ihe nile’ na ịnọ ‘na-anwa onwe anyị ma anyị dị n’okwukwe ahụ.’—1 Ndị Tesalọnaịka 5:21; 2 Ndị Kọrint 13:5.

Chebe Obi Gị

Ụkpụrụ Bible bụ́ na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi,” metụtakwara ahụ ike nke obi ihe atụ anyị. (Ndị Galetia 6:7) Mgbe mgbe, ihe na-adị ka ọdachi ime mmụọ mere na mberede na-emesị bụrụ n’ihi mmadụ ịnọgide na nzuzo na-achụso ihe ndị na-emebi ihe n’ụzọ ime mmụọ ruo ogologo oge dị ka ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, inwebiga nchegbu ókè banyere ihe onwunwe, ma ọ bụ ịgbalịsi ike ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ onye ọchịchị.

Ya mere, iji chebe obi, ọ dị oké mkpa mmadụ ilezi anya banyere ihe oriri ime mmụọ ya. Were Okwu Chineke na-azụ uche na obi gị. Jụ nri ratụ ratụ nke uche bụ́ ndị a pụrụ inweta ngwa ngwa na ndị na-amasị anụ ahụ, ma nanị ihe ha na-eme bụ ịgbasi obi ihe atụ. Ọbụ abụ ahụ ji ihe myirịta nke dabara adaba—nakwa nke nkà ọgwụ na ahụ ike kwadoro—dọọ aka ná ntị, sị: “Obi ha bụ nanị abụba dị ka abụba.”—Abụ Ọma 119:70.

Ọ bụrụ na e nwere àgwà ọjọọ ndị ị kpara na nzuzo eri ogologo oge, gbalịsie ike iwepụsị ha, ma ọ́ bụghị ya, ha ga-asụchi akwara ihe atụ gị. Ọ bụrụ na ụwa amalite iyi gị ka ọ̀ na-adọrọ mmasị nakwa ka à na-enweta ihe ụtọ na ntụrụndụ dị ukwuu na ya, tụgharịa uche na ndụmọdụ amamihe dị na ya Pọl onyeozi nyere. O dere, sị: “Nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, . . . Ka ndị na-eji ụwa mee ihe wee dị ka ha ejibigaghị ya ókè: n’ihi na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” (1 Ndị Kọrint 7:29-31) Ọ bụrụkwa na akụ̀ na ụba amalite ịdọrọ mmasị gị, ṅaa ntị n’okwu Job bụ́: “Ọ bụrụ na emewo m ọlaedo ka ọ bụrụ okwukwe efu m, ọ bụrụkwa na asịwo m ọlaedo ọma, Ị bụ ntụkwasị obi m; nke ahụ bụkwa ajọ omume ndị ikpe ga-ekpe: n’ihi na n’ime ihe a m ga-agọnahụ Chineke Nke dị n’elu.”—Job 31:24, 28; Abụ Ọma 62:10; 1 Timoti 6:9, 10.

Iji gosipụta ịdị njọ nke ịdị na-elegharakarị ndụmọdụ dabeere na Bible anya, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye a na-abara mba ọtụtụ mgbe ma ọ na-ekwesi olu ya ike, n’otu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ dịghịkwa ngwọta dị.” (Ilu 29:1) N’ụzọ dị iche, site n’ilekọta obi ihe atụ anyị nke ọma, anyị pụrụ inweta obi ụtọ na udo nke obi bụ́ nke na-abịa site n’ibi ndụ dị mfe, na nke dị n’usoro. Nke a abụwo mgbe nile ụzọ a na-anakwere nke ọma nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ma nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa, bụ ụzọ irite uru nke ukwuu; n’ihi na anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:6-8.

Ee, ịzụ onwe anyị na imega ahụ n’ụzọ nke nsọpụrụ Chineke ga-eme ka anyị jide n’aka na anyị nwere obi ihe atụ nke gbasiri ike. Site n’ilezi anya nke ọma n’ihe anyị na-eri n’ụzọ ime mmụọ, anyị agaghị ekwe ka ụzọ na echiche ụwa ndị na-ebibi ihe merụọ ma ọ bụ bibie ọnọdụ ime mmụọ anyị. Karịsịa, site n’ịnakwere ndokwa Jehova na-eme site ná nzukọ ya, ka anyị na-enyocha obi ihe atụ anyị mgbe nile. Iji ịdị uchu na-eme nke ahụ ga-enyere anyị aka n’ụzọ dị ukwuu izere ihe ọjọọ ndị na-esi ná nkụchi obi ime mmụọ apụta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko lee usoro isiokwu bụ́ “Nkụchi Obi—Gịnị Ka A Pụrụ Ime?” bụ́ ndị dị ná mbipụta Teta! nke December 8, 1996, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

IHE ORIRI IME MMỤỌ NA-ADỊGHỊ MMA PỤRỤ ỊKWARỤ OBI IHE ATỤ OTÚ ERIGHỊ EZIGBO IHE PỤRỤ ISI GBASIE AKWARA MA MEBIE OBI NKỊTỊ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

ỤZỌ NDỤ NKE ỊNỌ OTU EBE N’ỤZỌ IME MMỤỌ PỤRỤ ỊRỤPỤTA IHE NDỊ DỊ NJỌ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“NCHEGBU NKE NDỤ” PỤRỤ IBIBI OBI IHE ATỤ N’ỤZỌ DỊ MFE

[Foto dị na peeji nke 11]

Ileghara ahụ ike ime mmụọ anyị anya pụrụ ịkpata oké ihe mgbu

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ịzụlite àgwà ime mmụọ ndị dị mma na-echebe obi ihe atụ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Foto AP/David Longstreath