Ịza Òkù Jehova Kpọrọ Na-enye Ụgwọ Ọrụ
Akụkọ Ndụ
Ịza Òkù Jehova Kpọrọ Na-enye Ụgwọ Ọrụ
DỊ KA MARIA DO CÉU ZANARDI SI KỌỌ
“Jehova maara ihe ọ na-eme. Ọ bụrụ na ọ kpọrọ gị òkù, i kwesịrị iji obi umeala zaa ya.” Okwu ndị a nna m kwuru ihe dị ka afọ 45 gara aga, nyeere m aka ịza òkù mbụ nzukọ Jehova kpọrọ m, ije ozi dị ka onye ozi oge nile. Taa, aka m na-enwe ekele maka ndụmọdụ ahụ nna m nyere m n’ihi na ịza òkù dị otú ahụ enyewo m ụgwọ ọrụ bara ụba.
NA 1928, papa m tụrụ ụtụ magazin Ụlọ Nche ma nwee mmasị na Bible. Ebe ọ bụ na o bi n’ebe etiti Portugal, nanị ụzọ ya na ọgbakọ Chineke si enwe mmekọrịta bụ akwụkwọ ndị a na-esi na post ọfịs ezitere ya nakwa Bible nne na nna m ochie nweburu. Na 1949, mgbe m dị afọ 13, ezinụlọ anyị kwagara Brazil, bụ́ obodo mama m, ma biri ná mpụga Rio de Janeiro.
Ndị agbata obi ọhụrụ anyị kpọrọ anyị òkù ịbịa chọọchị ha, anyị gakwara ugboro ole na ole. Ọ na-amasị papa m ịjụ ha ajụjụ banyere ọkụ ala mmụọ, mkpụrụ obi, na ọdịnihu nke ụwa—ma ha adịghị enye azịza ọ bụla. “Anyị aghaghị ichere nnọọ ka ezigbo ndị mmụta Bible bịa,” ka papa m na-ekwukarị.
Otu ụbọchị, otu nwoke kpuru ìsì bịara n’ụlọ anyị, na-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Papa m jụrụ ya banyere otu ihe ahụ, o nyekwara ezigbo azịza ndị dabeere na Bible. N’izu sochirinụ, onye ọzọ so ná Ndịàmà Jehova letara anyị. Mgbe ọ zasịrị ọtụtụ ajụjụ, ọ naara ikike ịla ma kwuo na ya aghaghị ịga ozi ubi. Mgbe papa m na-aghọtaghị ihe o bu n’obi, ọ gụọrọ ya Matiu : “Ubi ahụ bụ ụwa.” Papa m jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ m soro gị?” “Eenụ,” ka ọ zara. Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu maka ịchọtaghachi eziokwu Bible! E mere papa m baptism ná mgbakọ na-esonụ, e mekwara mụ onwe m baptism n’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị, na November 1955. 13:38
Ịza Òkù Mbụ A Kpọrọ M
Otu afọ na ọkara mgbe e mesịrị, enwetara m otu nnukwu envelopu na-acha nchara nchara site n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rio de Janeiro bụ́ nke e ji kpọọ m òkù ịbanye n’ọrụ nkwusa oge nile. Ahụ adịtụghị mama m n’oge ahụ, n’ihi ya, arịọrọ m nna m maka ndụmọdụ ya. “Jehova maara ihe ọ na-eme,” ka o ji olu siri ike zaghachi. “Ọ bụrụ na ọ kpọrọ gị òkù, i kwesịrị iji obi umeala zaa ya.” N’ịbụ onye okwu ndị ahụ kpaliri, edejupụtara m akwụkwọ ndejupụta ahụ ma banye n’ozi oge nile na July 1, 1957. Ebe mbụ e kenyere m ọrụ bụ Três Rios, bụ́ obodo dị na Rio de Janeiro State.
Ná mmalite, ndị bi na Três Rios enweghị mmasị ige ntị n’ozi anyị n’ihi na anyị adịghị eji nsụgharị Bible nke ndị Katọlik eme ihe. Anyị nwetara enyemaka mgbe anyị malitere iduziri Geraldo Ramalho, bụ́ onye na-anụrụ okpukpe Katọlik ọkụ n’obi, ọmụmụ Bible. Site n’enyemaka ya, enwetara m Bible nke onye ụkọchukwu nọ n’ógbè ahụ bịanyere aka na ya. Site n’oge ahụ gawa, mgbe ọ bụla mmadụ ọ bụla kwuru okwu mgbochi, ana m egosi ha aka ahụ ụkọchukwu bịanyere na ya, ha na-akwụsịkwa ịjụ ajụjụ. E mesịrị mee Geraldo baptism.
Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu mgbe e mere mgbakọ kpọmkwem n’ebe etiti Três Rios na 1959. Onyeisi ndị uwe ojii, bụ́ onye a na-amụrụ Bible n’oge ahụ, mere ndokwa ọbụna ịkpọsa usoro ihe omume ahụ site n’ide ya n’ákwà ma kwụba ya n’ebe nile n’obodo ahụ. Mgbe m rụsịrị ọrụ na Três Rios ruo afọ atọ, a kpọrọ m ịrụ ọrụ n’ebe ọhụrụ n’Itu, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 110 n’ebe ọdịda anyanwụ São Paulo.
Akwụkwọ Ndị Na-acha Ọbara Ọbara, Anụnụ Anụnụ, na Odo Odo
Mgbe mụ na onye e kenyere mụ na ya ọrụ ịsụ ụzọ chọsịrị ebe obibi ruo oge ụfọdụ, anyị chọtara ebe obibi dị mma n’ebe etiti obodo ahụ n’ụlọ Maria, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke dị obiọma. Maria mesoro anyị ihe ka a ga-asị na anyị bụ ụmụ ya nwanyị. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, bishọp Roman Katọlik nke Itu bịara na nke ya ma gwa ya ka ọ chụpụ anyị, ma o guzosiri ike, na-asị: “Mgbe di m nwụrụ, ọ dịghị ihe i mere iji kasie m obi. Ndịàmà Jehova a enyeworo m aka n’agbanyeghị na abụghị m onye òtù okpukpe ha.”
Ihe dị ka n’oge ahụ, otu nwanyị gwara anyị na ndị ụkọchukwu Katọlik nke Itu amachibidowo ndị parish ha iwu ịnara “akwụkwọ ahụ na-acha ọbara ọbara nke na-ekwu banyere Ekwensu.” Ha na-ekwu banyere akwụkwọ ahụ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu,” nke dabeere na Bible nke anyị nọworo na-enyefe ndị mmadụ n’ime izu. Ebe ọ bụ na akwụkwọ ahụ
na-acha ọbara ọbara abụrụwo nke ndị ụkọchukwu “machibidoro iwu,” anyị mere ndokwa inyefe akwụkwọ nke na-acha anụnụ anụnụ (“New Heavens and a New Earth”). E mesịa, mgbe ndị ụkọchukwu matara banyere mgbanwe a, anyị malitere inyefe akwụkwọ nke na-acha odo odo, (What Has Religion Done for Mankind?), otú ahụ ka anyị nọ na-eme. Ọ bụ ihe dị mma na anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị mkpo ha nwere àgwà dị iche iche!Mgbe m nọsịrị ihe dị ka otu afọ n’Itu, enwetara m ozi teligram nke e ji kpọọ m òkù ịrụ ọrụ ruo nwa oge na Betel, bụ́ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rio de Janeiro, ná nkwadebe maka mgbakọ mba. Eji m obi ụtọ zaa ya.
Ihe Ùgwù na Ihe Ịma Aka Ndị Ọzọ
Na Betel, ọrụ adịghị agwụ agwụ, obi dịkwa m ụtọ inye aka n’ụzọ ọ bụla kwere omume. Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ bụ ịga ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụtụtụ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ezinụlọ kwa uhuruchi Monday! Ekpere sitere n’ala ala obi nke Otto Estelmann na ndị ọzọ nwere ahụmahụ so n’ezinụlọ Betel metụtara m n’ụzọ dị ukwuu.
Mgbe e nwesịrị mgbakọ mba ahụ, akwakọtara m ibu m ịlaghachi n’Itu, ma n’ụzọ tụrụ m n’anya, ohu alaka ahụ, bụ́ Grant Miller, nyere m akwụkwọ ozi e ji na-akpọ m ịbụzi onye òtù ezinụlọ Betel ahụ. Onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ bụ Nwanna Nwanyị Hosa Yazedjian, bụ́ onye ka na-eje ozi na Betel dị na Brazil. N’oge ahụ, ezinụlọ Betel pere mpe—nanị anyị mmadụ 28—anyị nile bụkwa ezigbo ndị enyi.
Na 1964, João Zanardi, bụ́ nwa okorobịa na-eje ozi oge nile, bịara Betel ịnara ọzụzụ. N’oge ahụ, e kenyere ya ọrụ dị ka ohu sekit, ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, n’ebe dị nso. Mgbe ụfọdụ anyị na-ezute ma ọ bịa Betel inye akụkọ ozi ya. Ohu alaka ahụ nyere João ikike ịbịa ọmụmụ ihe ezinụlọ a na-enwe n’uhuruchi Monday, n’ihi ya, anyị bịara nwee ike ịnọkọkwu ọnụ. Mụ na João lụrụ n’August 1965. Eji m obi ụtọ zaa òkù nke isonyere di m n’ọrụ sekit.
N’oge ahụ, ọrụ njegharị n’ime ime Brazil bụtụ nnọọ ahụmahụ na-akpali akpali. Agatụghị m echefu nleta anyị letara ìgwè ndị nkwusa nọ n’Aranha, nke dị na Minas Gerais State. Anyị aghaghị ịbanye ụgbọ okporo ígwè ma jirizie ụkwụ gaa nke fọdụrụnụ—na-ebu akpati, ígwè typewriter, ígwè e ji egosi ihe nkiri slide, akpa ozi ọma, na akwụkwọ. Lee obi ụtọ anyị na-enwe ịhụ Lourival Chantal, bụ́ nwanna nwoke merela agadi, ka ọ nọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè na-eche anyị mgbe nile iji nyere anyị aka ibu ibu anyị.
Ọ bụ n’ụlọ e nwetara ná ngo ka a nọ enwe nzukọ n’Aranha. Anyị na-ehi n’otu obere ọnụ ụlọ dị n’azụ ya. N’otu akụkụ ya, e nwere ọkụ icheku nke anyị ji esi ihe oriri na mmiri ụmụnna ji bọket kutere anyị. Otu olulu e gwuru n’etiti ọdọ achara dị nso bụ ebe anyị na-aga mposi. N’abalị, anyị na-amụnye ọkụ gas iji chụpụ ébé barber—ahụhụ na-ebunye mmadụ ọrịa Chagas. N’ụtụtụ, anwụrụ ọkụ na-eme ka oghere imi anyị jiwe oji. Ọ bụ nnọọ ahụmahụ na-akpali mmasị!
Ka anyị na-eje ozi n’otu sekit dị na Paraná State, anyị nwetara otu n’ime envelopu ndị ahụ na-acha nchara nchara ọzọ site n’alaka ụlọ Luk 14:28 ma gụkọọ ihe ọ ga-efu tupu anyị anakwere ọrụ a n’ihi na a machibidoro ọrụ ndị Kraịst anyị iwu n’ebe ahụ, gọọmenti Portugal ejidewokwarị ọtụtụ ụmụnna.
ọrụ. Ọ bụkwa òkù ọzọ nzukọ Jehova kpọrọ—nke ugbu a bụ ije ozi na Portugal! Akwụkwọ ozi ahụ gbara anyị ume ịtụle ụkpụrụ dị naÀnyị ga-aga n’ala anyị ga-eche mkpagbu dị otú ahụ ihu? “Ọ bụrụ na ụmụnna anyị bụ́ ndị Portugal pụrụ ibi ebe ahụ ma na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, gịnị mere anyị apụghị ime ya?” ka João kwuru. N’icheta okwu agbamume nna m gwara m, ekwenyere m, sị: “Ọ bụrụ na Jehova kpọrọ anyị òkù a, anyị kwesịrị ịza ya ma tụkwasị ya obi.” N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, anyị nọ na Betel dị na São Paulo, na-anarakwu ọzụzụ ma na-akwadebe akwụkwọ ndị anyị ga-eji mee njem ahụ.
João Maria na Maria João
Ụgbọ mmiri anyị, bụ́ Eugênio C si n’ọdụ ụgbọ mmiri Santos, São Paulo State, kwọpụ na September 6, 1969. Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị itoolu n’oké osimiri, anyị rutere Portugal. Na mbụ, anyị na ụmụnna nwoke ndị nwere ahụmahụ nọ n’okporo ámá ndị ahụ dị warara dị n’Alfama na Mouraria, n’ógbè ochie nke Lisbon, rụkọrọ ọrụ ruo ọtụtụ ọnwa. Ha zụrụ anyị ileru anya nke ọma ka ọ ghara ịdịrị ndị uwe ojii mfe ijide anyị.
Anyị nọ n’ụlọ Ndịàmà enwe nzukọ ọgbakọ. Mgbe anyị chọpụtara na ndị agbata obi enyowela anyị enyowe, anyị na-eme ngwa ngwa bufee nzukọ anyị n’ebe ọzọ ka e wee ghara ịwakpo ụlọ ahụ ma ọ bụ jide ụmụnna. Anyị na-anọ n’Ogige Ntụrụndụ Monsanto, nke dị ná mpụga Lisbon, nakwa na Costa da Caparica, nke bụ́ ógbè osisi jupụtara na ya nke dị n’ụsọ oké osimiri, enwe mkpapụ ntụrụndụ, dị ka anyị na-akpọ mgbakọ anyị. Anyị na-eji ejiji ka ndị na-enwe ntụrụndụ, ìgwè ndị atendantị nọ na nche na-eguzokwa n’ebe dị iche iche na-eche nche. Ọ bụrụ na onye a na-enyo enyo abịawa, oge na-afọdụrụ anyị ịmalite otu egwuregwu, ịmalite ntụrụndụ, ma ọ bụ ịmalite ịbụ abụ ọdịnala.
Iji mee ka o sikwuoro ndị uwe ojii na-echekwa obodo ike ịmata anyị, anyị zeere iji ezigbo aha anyị eme ihe. Ụmụnna maara anyị dị ka João Maria na Maria João. Anyị adịghị ede aha anyị n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ n’ihe ndekọ ọ bụla. Kama nke ahụ, e nyere anyị nọmba. Emere m mkpebi siri ike ịghara iburu adres ụmụnna n’isi. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ bụrụ
na e jide m, ọ gaghị ekwe m omume ịrara ha nye.N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị ahụ, mụ na João kpebisiri ike iji ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa àmà, ebe anyị maara na nnwere onwe anyị pụrụ ifunahụ anyị n’oge ọ bụla. Anyị mụtara ịdabere n’ebe Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, nọ. Dị ka Onye Nchebe anyị, o ji ndị mmụọ ozi ya eme ihe n’ụzọ nke na ọ na-adị anyị ka anyị “na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.”—Ndị Hibru 11:27.
N’otu oge, ka anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Porto, anyị zutere otu nwoke nke siri ọnwụ na anyị ga-abata n’ụlọ ya. Nwanna nwanyị mụ na ya na-arụkọ ọrụ kweere n’egbughị oge, ọ dịghịkwa ihe ọzọ m pụrụ ime karịa isoro ya. N’ụzọ tụrụ m egwu, achọpụtara m na e nwere foto nke otu onye yi uwe ndị agha na paseji. Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? Onye anyị bịara na nke ya gwara anyị ka anyị nọdụ ala, ma jụzie m, sị: “Ị̀ ga-ekwe ka nwa gị nwoke jee ozi agha ma ọ bụrụ na a kpọọ ya?” Ọ bụ ọnọdụ chọrọ nlezianya. Mgbe m kpesịrị ekpere n’ime obi m, eji m olu dị jụụ zaghachi, sị: “Enweghị m ụmụ, ejikwa m n’aka na ọ bụrụ na m jụọ gị ajụjụ e chepụtara echepụta otú a, ihe a m zara ka ị ga-azakwa.” Ya agbachi nkịtị. Ya mere agara m n’ihu, sị: “Ọ bụrụ ugbu a na ị jụọ m ihe ọ dị ka ya ịbụ onye nwanne ya nwoke ma ọ bụ nna ya nwụnahụrụ, apụrụ m ịza ya n’ihi na ma nwanne m nwoke ma nna m anwụọla.” Anya mmiri juru m anya ka m na-ekwu ya, achọpụtakwara m na ọ fọrọ nke nta ka ya onwe ya bewe ákwá. Ọ kọwara na nwunye ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya. O gere ntị nke ọma ka m na-akọwa olileanya mbilite n’ọnwụ. E mesịa, anyị ji olu ọma si ya nọrọ nke ọma ma pụọ n’enweghị nsogbu, na-ahapụrụ Jehova okwu ahụ.
N’agbanyeghị mmachibido iwu ahụ, e nyeere ndị nwere obi eziokwu aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu. Ọ bụ na Porto ka di m nọ malite ịmụrụ Horácio Bible, bụ́ ọchụ nta ego, nke nwere ọganihu dị ngwa. Mgbe e mesịrị, nwa ya nwoke bụ́ Emílio, bụ́ dọkịta ma nke a na-akọ, wekwaara nguzo ya n’ebe Jehova nọ, e meekwa ya baptism. N’ezie, ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị mmụọ nsọ Jehova.
“Unu Amabeghị Ihe Jehova Ga-ekwe Ka O mee”
Na 1973, a kpọrọ mụ na João ịga Mgbakọ Mba Nile nke “Mmeri Chineke” na Brussels, Belgium. Ọtụtụ puku ụmụnna bụ́ ndị Spain na Belgium bịara ya, tinyere ndị si Mozambique, Angola, Cape Verde, Madeira, na Azores. N’okwu mmechi ya, Nwanna Knorr, onye si n’isi ụlọ ọrụ dị na New York, gbara ume, sị: “Nọgidenụ na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Unu amabeghị ihe Jehova ga-ekwe ka o mee. Ikekwe unu nwere ike ịga mgbakọ mba nile na-abịanụ na Portugal!”
N’afọ sochirinụ, ọrụ nkwusa nwetara nkwado
iwu na Portugal. Dịkwa ka Nwanna Knorr si kwuo, na 1978, anyị nwere mgbakọ mba nile mbụ anyị na Lisbon. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịzọrọ njem gagharịa n’okporo ámá ndị dị na Lisbon, jiri kaadị mkpọsa, magazin, na akwụkwọ ịkpọ òkù maka okwu ihu ọha, na-agba àmà! Ọ bụ atụmanya mezuru emezu.Anyị enweela ike ịhụ ụmụnna anyị ndị Portugal n’anya, bụ́ ndị a tụrụ ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ ma tie ha ihe n’ihi ịnọgide na-anọpụ iche dị ka ndị Kraịst. Ọchịchọ anyị bụ ịnọgide na-eje ozi na Portugal. Otú ọ dị, ọ gajeghị ịdị otú ahụ. Na 1982, João nwere nsogbu siri ike n’obi, alaka ụlọ ọrụ ahụ tụkwara aro ka anyị laghachi Brazil.
Oge Na-ama Aka
Ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ Brazil nyere anyị nnọọ nkwado ma kenye anyị ije ozi n’Ọgbakọ Quiririm nke dị na Taubaté, nke dị na São Paulo State. Ahụ ike João kara njọ ngwa ngwa, n’oge na-adịghịkwa anya, o nweghịzi ike isi n’ụlọ pụọ. Ndị nwere mmasị na-abịa n’ụlọ anyị maka ọmụmụ Bible, a na-enwekwa nzukọ ije ozi ubi kwa ụbọchị, nakwa ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ nke a na-enwe kwa izu. Ndokwa ndị a nyeere anyị aka ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe.
João nọgidere na-eme ihe ọ pụrụ ime n’ozi Jehova ruo kpọmkwem mgbe ọ nwụrụ n’October 1, 1985. Enwere m mwute ma datụ mbà n’obi, ma ekpebisiri m ike ịga n’ihu n’ọrụ e kenyere m. Enwetara m ihe ndọghachi azụ ọzọ n’April 1986 mgbe ndị ohi tikara ebe obibi m ma zuo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile dị na ya. Na nke mbụ ya ná ndụ m, enwere m mmetụta nke ịbụ onye owu na-ama na onye ụjọ na-atụ. Otu di na nwunye ji ịhụnanya kpọọ m ka m soro ha nọrọ ruo nwa oge, enwekwara m ekele dị nnọọ ukwuu maka ya.
Ọnwụ João na ohi ahụ e zuru m metụtakwara ozi m na-ejere Jehova. Obi esighịzi m ike n’ozi. Mgbe m degasịịrị alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ banyere ihe isi ike m, enwetara m òkù a kpọrọ m ịnọ oge ụfọdụ na Betel iji nyere m aka ime ka mmetụta uche m dịghachi mma. Lee ka e si wusikwuo m ike n’oge ahụ!
Ozugbo ọ dị m ka ahụ ọ dịtụwala m mma, azara m òkù ije ozi n’Ipuã, bụ́ obodo dị na steeti São Paulo. Ọrụ nkwusa mere ka m jide ọrụ n’aka mgbe nile, ma e nwere oge ndị m nwere nkụda mmụọ. N’oge ndị dị otú ahụ, ana m akpọ ụmụnna nọ na Quiririm na fon, otu ezinụlọ na-abịakwa leta m ruo ụbọchị ole na ole. Nleta ndị ahụ na-agba m ume n’ezie! N’ime afọ mbụ m nọrọ n’Ipuã, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị 38 mere njem ahụ dị ogologo iji hụ m anya.
Na 1992, afọ isii mgbe ọnwụ João gasịrị, nzukọ Jehova kpọrọ m òkù ọzọ, nke ugbu a bụ ịga Franca, São Paulo State, bụ́ ebe m ka na-eje ozi dị ka onye ozi oge nile. Ókèala ebe a na-amị nnọọ mkpụrụ. Na 1994, amaliteere m onyeisi obodo ahụ ọmụmụ Bible. N’oge ahụ, ọ nọ na-azọ ọkwá ọchịchị ná nzukọ ndị omeiwu Brazil, ma n’agbanyeghị ohere ọ na-adịghị enwe, anyị na-amụ ihe kwa ehihie Monday. Iji zere inweta ihe mgbochi, ọ na-agbanyụ fon ya. Lee ka o si nye m obi ụtọ ịhụ ka o ji nke nta nke nta hapụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, sitekwa n’enyemaka nke eziokwu ahụ, wuliteghachi alụmdi na nwunye ya! E mere ya na nwunye ya baptism na 1998.
N’ileghachi anya azụ, apụrụ m ikwu na ndụ m dị ka onye ozi oge nile ejupụtawo ná ngọzi na ihe ùgwù ndị dị ukwuu. Ịza òkù ndị Jehova kpọworo m site ná nzukọ ya enyewo m ụgwọ ọrụ bara ụba n’ezie. Ụdị òkù ọ sọkwara sị kpọọ m n’ọdịnihu, adị m njikere ịza ya dị ka m nọworo na-adị.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Na 1957, bụ́ mgbe m banyere n’ozi oge nile, na taa
[Foto dị na peeji nke 26]
Ka mụ na ezinụlọ Betel nke Brazil nọ na 1963
[Foto dị na peeji nke 27]
Agbamakwụkwọ anyị n’August 1965
[Foto dị na peeji nke 27]
Mgbakọ e nwere na Portugal ka a machibidoro ọrụ ahụ iwu
[Foto dị na peeji nke 28]
Ịgba àmà okporo ámá na Lisbon n’oge Mgbakọ Mba Nile nke “Okwukwe Na-enwe Mmeri” e mere na 1978