Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ Dị Irè

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ Dị Irè

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ Dị Irè

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ele Ụkpụrụ Ọma ahụ anya dị ka ozizi metụtara omume nke Jisọs kụziri, ya onwe ya kwuru, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m.”—Jọn 7:16.

EE, ONYE ihe Jisọs kụziri, gụnyere ihe a bịara mara dị ka Ụkpụrụ Ọma ahụ si n’aka, bụ onye ahụ zitere Jisọs, ya bụ, Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke.

Ná mmalite, Chineke zubere ka ihe nile a kpọrọ mmadụ na-emeso ibe ha ihe dị ka ha ga-achọ ka e si na-emeso ha. O setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma n’igosipụta nchegbu maka ọdịmma nke ndị ọzọ n’ụzọ o si kee ụmụ mmadụ: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” (Jenesis 1:27) Nke a pụtara na Chineke ji ịhụnanya kenye ụmụ mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke àgwà ya ndị pụtara ìhè ka ha wee nwee ike ibi ndụ n’udo, obi ụtọ, na ịdị n’otu—nwee ike ibi ya ruo mgbe ebighị ebi. Akọ na uche Chineke nyere ha, ọ bụrụ na a zụọ ya nke ọma, ga-eduzi ha imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ha onwe ha ga-achọ ka e si na-emeso ha ihe.

Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị Weghaara Ọnọdụ

Ebe ọ bụ na ihe a kpọrọ mmadụ nwere mmalite dị ebube otú ahụ, gịnị meziri? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ndị mmadụ bịara nwewa àgwà ọjọọ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara nke ọma ihe ndekọ Bible banyere ihe di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ mere, dị ka e dekọrọ na Jenesis isi 3. N’ịbụ ndị Setan, bụ́ onye na-emegide ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke, kpaliri, Adam na Iv jiri ịchọ ọdịmma onwe onye nanị jụ ịchịisi Chineke ma họrọ inwere onwe ha na ikpebiri onwe ha ihe. Ọ bụghị nanị na omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nnupụisi ha furu ha ihe dị ukwuu kamakwa ọ kpataara ụmụ nile ha ga-amụ n’ọdịnihu ọdachi. Nke ahụ bụ ihe na-egosipụta n’ụzọ doro anya ọdachi na-esite n’ileghara ozizi ahụ a bịara mara dị ka Ụkpụrụ Ọma anya. N’ihi ya, “mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.

Ọ bụ ezie na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu gbakụtara ụzọ ịhụnanya nke Jehova Chineke azụ, ọ gbahapụghị ha. Dị ka ihe atụ, Jehova nyere mba Israel Iwu ya iduzi ha. Iwu ahụ kụziiri ha imeso ndị ọzọ ihe otú ha onwe ha ga-achọ ka e si mesoo ha ihe. Iwu ahụ nyere ntụziaka banyere otú a ga-esi na-emeso ndị ohu, ụmụntakịrị na-enweghị nna, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe. Ọ kọwapụtara ihe a ga-eme banyere mwakpo, ịtọrọ mmadụ, na izu ohi. Iwu ndị metụtara ịdị ọcha gosipụtara nchegbu maka ahụ ike nke ndị ọzọ. E nwere ọbụna iwu ndị metụtara mmekọahụ. Jehova chịkọtara Iwu ya site n’ịgwa ndị ahụ, sị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị,” bụ́ okwu Jisọs mesịrị hota. (Levitikọs 19:18; Matiu 22:39, 40) Iwu ahụ kwukwara otú a ga-esi na-emeso ndị nọ dị ka ọbịa n’etiti ụmụ Israel ihe. Iwu ahụ kwuru, sị: “Emegbukwala ọbịa: n’ihi na unu onwe unu amawo mkpụrụ obi nke ọbịa, n’ihi na ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụmụ Israel aghaghị igosi ndị ụwa na-atụ n’ọnụ obiọma.—Ọpụpụ 23:9; Levitikọs 19:34; Deuterọnọmi 10:19.

Ruo oge nile Israel ji ikwesị ntụkwasị obi gbasoo Iwu ahụ, Jehova gọziri mba ahụ. N’okpuru ọchịchị Devid na Solomọn, mba ahụ nwere ọganihu, ndị ahụ nwekwara obi ụtọ na afọ ojuju. Otu ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị, sị: “Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya.”—1 Ndị Eze 4:20, 25.

N’ụzọ dị mwute, udo na ntụkwasị obi nke mba ahụ adịteghị aka. Ọ bụ ezie na ụmụ Israel nwere Iwu Chineke, ha edebeghị ya; ha kwere ka ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bịanyụọ nchegbu ha nwere maka ndị ọzọ. Nke a, tinyere ndapụ n’ezi ofufe, wetaara ha nile n’otu n’otu na dị ka otu mba ihe isi ike. N’ikpeazụ, n’afọ 607 T.O.A., Jehova kwere ka ndị Babilọn bibie alaeze Juda, obodo Jerusalem, na ọbụna ọmarịcha ụlọ nsọ dị n’ebe ahụ. N’ihi gịnị? “N’ihi na unu anụghị okwu m nile, lee, M gaje iziga chịrị agbụrụ nile nke Ugwu, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ọ bụkwa Nebukadreza, bụ́ eze Babilọn, bụ́ ohu m, ka M ga-ezigara ozi, M ga-emekwa ka ha bịa imegide ala nke a, na imegide ndị bi ya, na imegide mba nile ndị a nọ ya gburugburu; M ga-ewezụgakwa ha ka e bibie ha, M ga-emekwa ha ka ha ghọọ ihe ijuanya, na ihe ịma ọsụ, na mkpọmkpọ ebe dị mgbe ebighị ebi.” (Jeremaịa 25:8, 9) Lee ihe funahụrụ ha n’ihi ịgbahapụ ofufe dị ọcha nke Jehova!

Ihe Nlereanya A Ga-eṅomi

N’aka nke ọzọ, ọ bụghị nanị na Jisọs Kraịst kụziri Ụkpụrụ Ọma ahụ kamakwa o setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma n’ịgbaso ya. O chebaara ọdịmma nke ndị ọzọ echiche n’ụzọ ziri ezi. (Matiu 9:36; 14:14; Luk 5:12, 13) N’otu oge, na nso obodo Nain, Jisọs hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ obi gbawara ka e bu nanị otu nwa nwoke ọ mụrụ na-aga ili. Ihe ndekọ Bible ahụ na-ekwu, sị: “Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ya.” (Luk 7:11-15) Okwu bụ́ “nwee ọmịiko,” dị ka Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words si kwuo, pụtara “mmadụ ịbụ onye a kpaliri mmụọ ya.” Ihe mgbu nke obi nwanyị ahụ metụrụ Jisọs n’ahụ, ọ kpalikwara ya ime ihe ndị dị mma iji mee ka ihe mgbu ya kwụsị. Lee ọṅụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere mgbe Jisọs kpọlitere nwata nwoke ahụ n’ọnwụ ma “were ya nye nne ya”!

N’ikpeazụ, n’ikwekọ ná nzube Chineke, Jisọs ji ọchịchọ obi ya taa ahụhụ ma nye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta ka e wee nwee ike ịtọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Nke a bụ ihe nlereanya kasịnụ nke ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ.—Matiu 20:28; Jọn 15:13; Ndị Hibru 4:15.

Ndị Na-etinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’Ọrụ

È nwere ndị na-ebi ndụ n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ n’oge anyị a? Ee, ọ bụghịkwa nanị mgbe ọ dị ha mma n’ahụ. Dị ka ihe atụ, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ na Nazi Germany, Ndịàmà Jehova jigidesiri okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ na ịhụnanya ha nwere n’ebe onye agbata obi ha nọ ike ma jụ imebi Ụkpụrụ Ọma ahụ. N’agbanyeghị na Ọchịchị manyere ndị mmadụ ime mkpọsa ịkpọasị na ịkpa ókè megide ndị Juu nile, Ndịàmà nọgidere na-agbaso Ụkpụrụ Ọma ahụ. Ọbụna n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, ha nọgidere na-echebara ụmụ mmadụ ibe ha echiche, soro ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu agụụ na-agụgbu na-ekerịta ihe oriri ha, n’agbanyeghị na o highị nne. Ọzọkwa, n’agbanyeghị na Ọchịchị nyere ha iwu ibuli ngwá agha iji gbuo ndị ọzọ, ha jụrụ ime otú ahụ, dị nnọọ ka ha na-achọghị ka ndị ọzọ gbuo ha. Olee otú ha ga-esi gbuo ndị ha kwesịrị ịhụ n’anya dị ka onwe ha? N’ihi ọjụjụ ha jụrụ, ọ bụghị nanị na a kpụgara ọtụtụ n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ kama e gburu ha.—Matiu 5:43-48.

Ka ị na-agụ isiokwu a, ị na-erite uru n’ihe atụ ọzọ nke itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ọrụ. Ndịàmà Jehova na-aghọta na taa, ọtụtụ mmadụ na-ata ahụhụ n’enweghị olileanya na enyemaka. N’ihi nke a, Ndịàmà ji ọchịchọ obi ha na-eme ihe dị mma iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere olileanya na nduzi dị irè a na-achọta n’ime Bible. Ha nile bụ akụkụ nke ọrụ izi ihe zuru ụwa ọnụ a na-arụ ugbu a n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-arụtụbeghị ya mbụ. Gịnị si na ya apụta? Dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 2:2-4, “ọtụtụ ndị dị iche iche,” n’ezie ihe karịrị nde mmadụ isii gburugburu ụwa, abụrụla ndị ‘e ziri ụzọ Jehova, ha ana-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.’ N’ụzọ ihe atụ, ha amụtala ‘ịkpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ Ha achọtawo udo na ntụkwasị obi n’oge a jupụtara ná nsogbu.

Gịnị Banyere Gị?

Tụgharịa uche ruo nwa oge n’oké ihe mgbu na ahụhụ ileghara Ụkpụrụ Ọma ahụ anya wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ eri nnupụisi ahụ e nwere n’Iden, bụ́ nke Setan bụ́ Ekwensu kpaliri. Jehova na-ezube ịgbanwe ọnọdụ ahụ n’isi nso. N’ụzọ dị aṅaa? “Ihe e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè bụ́ nke a, ka O wee laa ọrụ nile nke ekwensu n’iyi.” (1 Jọn 3:8) Nke a ga-eme n’okpuru ọchịchị nke Alaeze Chineke, nke dị n’aka Jisọs Kraịst maara ihe ma ruo eruo, bụ́ onye kụziri ma bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ.—Abụ Ọma 37:9-11; Daniel 2:44.

Eze Devid nke Israel oge ochie kwuru, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri. Ogologo ụbọchị nile ka ọ na-eme amara, na-ebinyekwa ihe; mkpụrụ ya bụkwa ndị a gọziri agọzi.” (Abụ Ọma 37:25, 26) Ị́ gaghị ekweta na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa na-akwakọba ma na-azọkọrọ nnọọ ihe kama ịdị ‘na-eme amara ma na-ebinye ihe’? N’ụzọ doro anya, ịgbaso Ụkpụrụ Ọma ahụ pụrụ iduga n’ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ nọrọ n’ọnọdụ nke inweta ngọzi ugbu a nakwa n’ọdịnihu n’okpuru Alaeze Chineke. Alaeze Chineke ga-ekpochapụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ajọ omume nile n’ụwa ma were usoro ihe ọhụrụ Chineke ga-eweta dochie anya usoro ihe dị ugbu a nke ọchịchị rụrụ arụ nke mmadụ. Mgbe ahụ, mmadụ nile ga-anụ ụtọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ.—Abụ Ọma 29:11; 2 Pita 3:13.

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

Ọ bụghị nanị na Jisọs kụziri Ụkpụrụ Ọma ahụ kamakwa o setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma n’ibi ndụ kwekọrọ na ya

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ịgbaso Ụkpụrụ Ọma ahụ pụrụ iduga n’ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi