Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ozizi Zuru Ụwa Ọnụ

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ozizi Zuru Ụwa Ọnụ

Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ozizi Zuru Ụwa Ọnụ

“Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.”—Matiu 7:12.

Ọ BỤ Jisọs Kraịst kwuru okwu ndị ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. N’ime narị afọ ndị gafeworonụ kemgbe ahụ, e kwuwo ma dee ihe dị ukwuu banyere okwu ole na ole ahụ. Dị ka ihe atụ, a jawo ya mma dị ka “kpọmkwem ihe bụ́ isi e ji mara Akwụkwọ Nsọ,” “nchịkọta nke ọrụ dịịrị onye Kraịst n’ebe onye agbata obi ya nọ,” na “ụkpụrụ bụ́ isi nke omume ọma.” A marala ya nnọọ nke ọma nke na a na-ezokarị aka na ya dị ka Ụkpụrụ Ọma.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’akụkụ ụwa a sị na ọ bụ nke ndị Kraịst ka e nwere echiche nke Ụkpụrụ Ọma ahụ. Okpukpe ndị Juu, okpukpe Buddha, na nkà ihe ọmụma ndị Gris kwuchara banyere ụkpụrụ omume ọma a bụ́ isi n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ. Nke ndị nọ n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kasị mara amara bụ ihe Confucius kwuru, bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù pụrụ iche n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dị ka onye amamihe na onye ozizi kasịnụ. N’akwụkwọ bụ́ The Analects, bụ́ nke atọ n’ime Four Books (Akwụkwọ Anọ) nke Confucius, anyị na-ahụ ka e kwupụtara echiche ahụ ugboro atọ. Ugboro abụọ, ka Confucius na-aza ajụjụ ụmụ akwụkwọ ya jụrụ, o kwuru, sị: “Ihe unu na-achọghị ka e mee unu, unu emela ya ndị ọzọ.” N’oge ọzọ, mgbe nwa akwụkwọ ya bụ́ Zigong turu ọnụ, sị, “Ihe m na-adịghị achọ ka ndị ọzọ mee m, adịghịkwa m achọ ime ha ya,” onye nkụzi ahụ ji okwu mgbakwụnye a na-akpali iche echiche zaghachi, sị, “Ee, ma nke a ka ị na-enwebeghị ike ime.”

N’ịgụ okwu ndị a, mmadụ pụrụ ịhụ na okwu Confucius bụ akụkụ a sọgharịrị isi nke ihe Jisọs mesịrị kwuo. Ọdịiche pụtara ìhè na ha bụ na Ụkpụrụ Ọma ahụ Jisọs kwupụtara na-achọ omume ziri ezi nke imere ndị ọzọ ihe ọma. Were ya na ndị mmadụ na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ziri ezi Jisọs kwuru, na-echebara ndị ọzọ echiche, na-eme ihe iji nyere ndị ọzọ aka, na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ a kwa ụbọchị. Ị̀ na-eche na nke ahụ ga-eme ka ụwa taa bụrụ ebe ka mma? Eenụ.

Ma è kwupụtara ụkpụrụ ahụ n’ụzọ Jisọs si kwuo ya, ma a sọgharịrị ya isi, ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla ọzọ, ihe dị ịrịba ama bụ na ndị biri n’oge dị iche iche nakwa n’ebe dịgasị iche iche, ndị a zụlitekwara n’ụzọ dị iche iche atụkwasịwo obi nke ukwuu n’echiche nke Ụkpụrụ Ọma ahụ. Nke a na-egosi nnọọ na ihe Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ ozizi zuru ụwa ọnụ nke na-emetụta ndụ ndị mmadụ n’ebe nile n’ọgbọ nile.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ ga-amasị m ka e jiri nkwanye ùgwù, ikpe ziri ezi, obi ọcha na-emeso m ihe? Ọ̀ ga-amasị m ibi n’ụwa nke ajọ mbunobi agbụrụ, mpụ, na agha na-adịghị? Ọ̀ ga-amasị m ibi n’ezinụlọ ebe onye ọ bụla na-echebara mmetụta na ọdịmma nke ndị ọzọ echiche?’ N’ezie, ònye ga-asị ka ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ikwe omume ghara ime? Nke bụ́ nnọọ eziokwu bụ na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-anụ ụtọ ọnọdụ ndị a. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha agaghịdị elewe anya ihe ndị dị otú ahụ.

E Mebie Ụkpụrụ Ọma Ahụ

N’akụkọ ihe mere eme nile, e nweela mpụ ndị e mesoro ụmụ mmadụ bụ́ ndị e leghaara ihe ndị ruuru mmadụ anya kpam kpam na ha. Ndị a na-agụnye ahịa ohu a zụrụ n’Africa, ogige ọnwụ nke ndị Nazi, iji ụmụaka akpa ego n’ike, na ajọ mgbuchapụ ndị e mere n’otu ebe ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Ndepụta ahụ na-eyi egwu pụrụ ịkarị nke a.

Taa, iche nanị banyere onwe onye bụ ihe jupụtara n’ụwa anyị nke e ji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị bụ́ ọkpọka eme ihe na ya. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-eche banyere ndị ọzọ mgbe ọdịmma ha ma ọ bụ ihe ha weere dị ka ihe ruuru ha nọ n’ihe ize ndụ. (2 Timoti 3:1-5) Gịnị mere imerime mmadụ jiworo ghọọ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị dị obi ọjọọ, ndị na-adịghị enwe mmetụta, na ndị na-eche nanị banyere onwe ha? Ọ́ bụghị n’ihi na, n’agbanyeghị na a mazuuru Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ebe nile, a na-ewezụga ya n’ụsọ dị ka ụkpụrụ omume na-adịghị irè? N’ụzọ dị mwute, otú a ka ọ dị ọbụna n’etiti ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha kweere na Chineke. E lewekwa ya anya site n’otú ihe si na-aga, ndị mmadụ ga-anọgide na-eche nanị banyere onwe ha.

Ya mere, ajụjụ ndị dị mkpa a na-aghaghị ịjụ bụ: Gịnị ka ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ na-agụnye? Ọ̀ dị onye ka na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya? Ọ̀ dịkwa mgbe ọ bụla a ga-enwe oge ihe nile a kpọrọ mmadụ ga na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ? Iji nweta azịza ndị bụ́ eziokwu nye ajụjụ ndị a, biko gụọ isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Confucius na ndị ọzọ kụziri akụkụ dị iche iche nke Ụkpụrụ Ọma ahụ