Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ntụziaka Chineke e dekọrọ na Jeremaịa 7:16 ọ̀ na-apụta na ndị Kraịst agaghị ekpe ekpere banyere onye a chụpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst n’ihi na ọ bụ onye mmehie na-enweghị nchegharị?

Mgbe Jehova masịrị Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi ikpe, ọ gwara Jeremaịa, sị: “Ma gị onwe gị, ekpela ekpere banyere ndị nke a, ebulikwala iti mkpu na ikpe ekpere banyere ha, arịọkwala m arịrịọ: n’ihi na M gaghị na-anụ olu gị.”—Jeremaịa 7:16.

Gịnị mere Jehova ji machibido Jeremaịa iwu ikpe ekpere banyere ụmụ Israel? N’ụzọ doro anya, ọ bụ n’ihi anya ha kpachapụrụ na-emebi Iwu ya. N’ihu ọha nakwa n’emeghị ihere, ha nọ “na-ezu ohi, na-egbu mmadụ, na-akwa iko, na-aṅụ iyi ụgha, na-esurere Beal ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na-ejeso chi ọzọ dị iche iche.” N’ihi ya, Jehova gwara ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, sị: “M ga-esikwa n’ihu m tụfuo unu, dị ka M tụfuru ụmụnna unu nile, bụ́ mkpụrụ nile nke Efraim.” N’ezie, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị bụ́ Jeremaịa, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ, ikpe ekpere ka Jehova gbanwee ikpe Ya.—Jeremaịa 7:9, 15.

N’ikwekọ na nke a, Jọn onyeozi dere banyere ụdị ekpere e kwesịrị ikpegara Chineke. O bu ụzọ mesie ndị Kraịst obi ike, sị: “Ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ Ya si dị, Ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Mgbe ahụ, banyere ikpe ekpere n’isi ndị ọzọ, Jọn gara n’ihu, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ nwanna ya ka ọ na-emehie mmehie nke na-adịghị eweta ọnwụ, ọ ga-arịọ arịrịọ, Chineke ga-enyekwa ya ndụ inye ndị na-emehie mmehie ahụ nke na-adịghị eweta ọnwụ. Mmehie dị nke na-eweta ọnwụ: ọ bụghị ekpere banyere nke a ka m na-agwa ya ka o kpee.” (1 Jọn 5:16) Jisọs kwukwara banyere mmehie nke ‘a na-agaghị agbaghara’ mmadụ, ya bụ, mmehie e mere megide mmụọ nsọ.—Matiu 12:31, 32.

Nke a ọ̀ pụtara na ndị nile a chụpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst maka ime mmehie n’enweghị nchegharị emewo mmehie “na-eweta ọnwụ,” n’ihi ya kwa, bụrụ ndị a na-ekwesịghị ikpe ekpere banyere ha? Nke a agaghị abụcha otú ahụ n’ihi na n’ọnọdụ ụfọdụ, njehie ndị dị otú ahụ abụghị mmehie ndị na-eweta ọnwụ. N’ezie, o siri ike ikwu ma ha bụ. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ Eze Manase nke Juda. O wuoro chi ụgha dị iche iche ebe ịchụàjà, jiri ụmụ ya ndị ikom chụọ àjà, mee mgbaasị, ma dọba arụsị a pịrị apị n’ụlọ nsọ Jehova. N’ezie, Bible na-ekwu na Manase na ndị ahụ mere “ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.” Maka ihe a nile, Jehova tara Manase ahụhụ site n’ime ka e kee ya agbụ ma dọrọ ya n’agha laa Babilọn.—2 Ndị Eze 21:1-9; 2 Ihe E Mere 33:1-11.

Mmehie Manase, n’agbanyeghị otú ha dịruru ná njọ, hà bụ ụdị na-eweta ọnwụ? O doro anya na ha abụghị, n’ihi na ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu banyere ya, sị: “Mgbe a na-akpagbu ya, ọ chọọ ka ihu Jehova, bụ́ Chineke ya, dajụọ, wee huru ala nke ukwuu n’ihu Chineke nke nna ya hà. O wee kpeere Ya; O wee kwe ka ọ rịọta ihe ọ rịọrọ, wee nụrụ arịrịọ amara ya, mee ka ọ lọta na Jerusalem baa n’alaeze ya. Manase wee mara na Jehova, Ya onwe ya, bụ Chineke.”—2 Ihe E Mere 33:12, 13.

N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwubi na mmadụ aghaghị ịbụ onye ikpe mmehie na-eweta ọnwụ mara nanị n’ihi na a chụpụrụ ya n’ọgbakọ. Ọ pụrụ iwe oge tupu ezi ọnọdụ obi onye ahụ ana-apụta ìhè. N’ezie, a na-ekwukarị na otu n’ime nzube ndị e ji achụpụ onye mmehie n’ọgbakọ bụ iji mee ka ọ mara onwe ya, a na-enwekwa olileanya na ọ ga-eme ka o chegharịa ma chigharịa.

Ebe ọ bụ na onye ahụ anọghịzi n’ọgbakọ, ndị mbụ ga-ahụ mgbanwe obi ọ bụla n’àgwà ya pụrụ ịbụ ndị nọ ya nso, dị ka onye òtù ọlụlụ ya ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ ya. Ndị na-ahụ mgbanwe ndị dị otú ahụ pụrụ ikwubi na onye mmehie ahụ emeghị mmehie na-eweta ọnwụ. A pụrụ ịkpali ha ikpe ekpere ka onye mmehie ahụ nweta ume site n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ nakwa ka Jehova mesoo ya ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Ya.—Abụ Ọma 44:21; Eklisiastis 12:14.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịnọ n’ọnọdụ nke ịhụ ihe àmà zuru ezu iji kwere na onye mmehie ahụ echegharịala, e nwere ike ọgbakọ n’ozuzu ha agaghị ahụ ya otú ahụ. Ọ ga-eju ha anya, wute ha, ọbụna mee ka ha sụọ ngọngọ ma ọ bụrụ na ha anụ ka mmadụ na-ekpe ekpere n’ihu ọha banyere onye ahụ jehierenụ. N’ihi nke a, ndị a kpaliri ikpe ekpere banyere onye mmehie ahụ kwesịrị ime otú ahụ nanị mgbe nanị ha na-ekpe ekpere, na-ahapụrụ ndị okenye ọ dị n’aka ha n’ọgbakọ ihe ọ bụla ọzọ ga-apụta n’okwu ahụ.

[Foto dị na peeji nke 31]

A gbaghaara Manase mmehie ya ndị dị oké njọ mgbe o hururu ala n’ihu Jehova

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

E mepụtaghachiri ya site n’Illustrierte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s