Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụọ Egwu Jehova, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu

Tụọ Egwu Jehova, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu

Tụọ Egwu Jehova, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu

“Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—EKLISIASTIS 12:13.

1, 2. (a) Olee otú egwu pụrụ isi chebe anyị n’ụzọ anụ ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ndị nne na nna maara ihe ji agbalịsi ike ịkụnye egwu ziri ezi n’ime ụmụ ha?

“DỊ NNỌỌ ka obi ike na-etinye ndụ n’ihe ize ndụ, otú ahụ ka egwu na-echebe ya,” ka Leonardo da Vinci kwuru. Mmadụ ime ka ọ̀ bụ anwụ anwụ na-egbochi ya ịmata ihe ize ndụ, ebe egwu na-echetara ya ka ọ kpachara anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị agaruo n’ọnụ ọnụ ebe kpọdara akpọda ma hụ ebe anyị pụrụ ịdaru, amamihe ebumpụta ụwa na-akpali ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ịlaghachi azụ. N’otu aka ahụ, ọ bụghị nanị na egwu ziri ezi na-akwalite ezi mmekọrịta nke anyị na Chineke, dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu ụzọ kamakwa, ọ na-enye aka echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ.

2 Otú ọ dị, a ghaghị ịmụta ịtụ egwu ọtụtụ ihe ndị dị ize ndụ n’oge a amụta. Ebe ọ bụ na ụmụaka amaghị banyere ihe ize ndụ nke eletrik ma ọ bụ nke okporo ụzọ na-ekwo ekwo, ha pụrụ inwe oké ihe ọghọm n’ụzọ dị mfe. * Ndị nne na nna maara ihe na-agbalị ịkụnye egwu ziri ezi n’ime ụmụ ha, na-adọ ha aka ná ntị ugboro ugboro banyere ihe ize ndụ ndị gbara ha gburugburu. Ndị nne na nna maara na egwu a pụrụ n’ezie ichebe ndụ ụmụ ha.

3. Gịnị mere Jehova ji adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ime mmụọ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

3 Jehova nwere nchegbu yiri nke ahụ maka ọdịmma anyị. Dị ka Nna na-ahụ n’anya, ọ na-ezi anyị ihe site n’Okwu ya na nzukọ ya ka anyị wee mee ihe ga-abara anyị uru. (Aịsaịa 48:17) Akụkụ nke usoro izi ihe Chineke a na-agụnye ịdọ anyị aka ná ntị “ugboro ugboro” banyere ihe ize ndụ ime mmụọ dị iche iche ka anyị wee nwee ike ịzụlite egwu ziri ezi maka ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ. (2 Ihe E Mere 36:15, NW; 2 Pita 3:1) N’akụkọ ihe mere eme nile, a gaara ezerewo ọtụtụ ọdachi ime mmụọ na ọtụtụ nhụjuanya ‘ma a sị nnọọ na ndị mmadụ zụlitere obi ha ịtụ egwu Chineke ma debe ihe o nyere n’iwu.’ (Deuterọnọmi 5:29, NW) ‘N’oge a dị oké egwu,’ olee otú anyị pụrụ isi zụlite obi anyị ịtụ egwu Chineke ma zere ihe ize ndụ ime mmụọ?—2 Timoti 3:1.

Si n’Ihe Ọjọọ Wezụga Onwe Gị

4. (a) Ụdị ịkpọasị dị aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị ịzụlite? (b) Olee otú omume mmehie na-adị Jehova? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

4 Bible na-akọwa na “egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.” (Ilu 8:13) Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible kọwara ụdị ịkpọasị a dị ka “àgwà mmadụ na-akpaso mmadụ na ihe ndị ọ na-emegide, ndị ọ na-enweghị mmasị na ha, na ndị ọ na-elelị bụ́kwa ndị ọ na-achọghị ka e nwee ihe jikọrọ ya na ha.” Ya mere, egwu Chineke na-agụnye ịsọ nnọọ ihe nile dị njọ n’anya Jehova oyi. * (Abụ Ọma 97:10) Ọ na-akpali anyị isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị, dị nnọọ ka anyị ga-esi n’ọnụ ọnụ ebe kpọdara akpọda laghachi azụ mgbe egwu anyị bu pụta ụwa dọrọ anyị aka ná ntị. “Ọ bụkwa egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya,” ka Bible na-ekwu.—Ilu 16:6.

5. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nwekwuo egwu Chineke ma na-akpọkwu ihe ọjọọ asị? (b) Gịnị ka akụkọ ihe mere eme nke mba Israel na-akụziri anyị n’akụkụ a?

5 Anyị pụrụ inwekwu egwu a ziri ezi ma ọ bụ ịkpọkwu ihe ọjọọ asị site n’ịtụle ihe ndị na-emerụ ahụ mmehie na-aghaghị ịkpata. Bible na-eme ka anyị jide n’aka na anyị ga-aghọrọ mkpụrụ anyị ghara—ma ànyị na-agha dị ka anụ ahụ si dị ma ọ bụ dị ka mmụọ nsọ si dị. (Ndị Galetia 6:7, 8) N’ihi nke a, Jehova kọwara n’ụzọ doro anya, ihe na-aghaghị isi n’ileghara iwu ya anya na ịgbahapụ ezi ofufe pụta. E wezụga nchebe Chineke, ntakịrị mba Israel nke dị mfe mwakpo gaara adaba n’aka ndị agbata obi ha nwere obi ọjọọ ma dị ike. (Deuterọnọmi 28:15, 45-48) E dekọrọ ọdachi nnupụisi Israel kpatara n’ụzọ zuru ezu na Bible “ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ” ka anyị wee mụta ihe site na ya ma zụlite egwu Chineke.—1 Ndị Kọrint 10:11.

6. Olee ụfọdụ ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ anyị pụrụ ịtụle ka anyị na-amụ banyere egwu Chineke? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

6 E wezụga ihe mere mba Israel n’ozuzu, Bible nwere ahụmahụ mere eme nke ndị gosipụtara ekworo, anyaukwu, mpako, ma ọ bụ mee omume rụrụ arụ. * Ụfọdụ n’ime ndị a ejeworo Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ, ma n’otu oge a dị mkpa ná ndụ ha, egwu Chineke ha gosipụtara esichaghị ike, ha ghọtakwara ajọ mkpụrụ. Ịtụgharị uche n’ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ ga-eme ka mkpebi anyị sikwuo ike ịghara ihie ụzọ dị ka ha hiere. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe dị mwute ma ọ bụrụ na anyị echere ruo mgbe anyị nwere ọdachi tupu anyị anakwere ndụmọdụ Chineke! N’ụzọ megidere ihe e kweere ebe nile, ahụmahụ onwe onye—karịsịa nke e nwetara site n’imeju ọchịchọ onwe onye—abụghị onye nkụzi kasị mma.—Abụ Ọma 19:7.

7. Ònye ka Jehova na-akpọbata n’ụlọikwuu ihe atụ ya?

7 Ezigbo ihe ọzọ mere anyị ga-eji zụlite egwu Chineke bụ ọchịchọ anyị ichebe mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị na-atụ egwu imejọ Jehova n’ihi na anyị ji ọbụbụenyi anyị na ya kpọrọ ihe. Ònye ka Chineke na-ewere dị ka enyi ya, bụ́ onye ọ ga-akpọbata n’ụlọikwuu ihe atụ ya? Ọ bụ nanị onye “na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume.” (Abụ Ọma 15:1, 2) Ọ bụrụ na anyị ji mmekọrịta a bụ́ ihe ùgwù anyị nwere n’ebe Onye Okike anyị nọ kpọrọ ihe, anyị ga-elezi anya ije ije n’izu okè n’anya ya.

8. Olee otú ụfọdụ ụmụ Israel nọ n’oge Malakaị si ghara iji ọbụbụenyi ha na Chineke kpọrọ ihe?

8 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ụmụ Israel n’oge Malakaị ejighị ọbụbụenyi ha na Chineke kpọrọ ihe. Kama ịtụ egwu Jehova na ịsọpụrụ ya, ha chụrụ anụmanụ ndị na-arịa ọrịa na ndị nwere nkwarụ n’àjà n’ebe ịchụàjà ya. Omume ha n’ebe alụmdi na nwunye dị gosipụtakwara na ha adịghị atụ egwu Chineke. Iji lụrụ ụmụ agbọghọ, ha na-achụpụ ndị nwunye ha lụrụ n’okorobịa n’ihi ihe ndị na-enweghị isi. Malakaị gwara ha na Jehova kpọrọ “nchụpụ nwunye” asị nakwa na mmụọ aghụghọ ha ekewapụwo ha n’ebe Chineke ha nọ. Olee otú Chineke pụrụ isi nwee mmasị n’àjà ha mgbe ebe ịchụàjà jupụtara n’anya mmiri n’ụzọ ihe atụ—anya mmiri ákwá obi mgbawa nke ndị nwunye ha ha gbahapụrụ agbahapụ? Enwetụghị nkwanye ùgwù dị otú ahụ maka ụkpụrụ Jehova kpaliri Ya ịjụ, sị: “Olee ebe egwu m dị?”—Malakaị 1:6-8; 2:13-16.

9, 10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị ji ọbụbụenyi anyị na Jehova kpọrọ ihe?

9 N’otu aka ahụ taa, Jehova na-ahụ obi mgbawa nke ọtụtụ ndị di ma ọ bụ nwunye na ụmụ, bụ́ ndị ndị bụ́ di na nna ma ọ bụ ọbụna nwunye na nne na-achọ ọdịmma onwe ha nanị ma rụọ arụọ n’omume, kpatawooro nkụda mmụọ. N’ezie, ọ na-ewute ya. Enyi Chineke ga-ahụ ihe otú Chineke si ahụ ha ma rụsie ọrụ ike iji wusie alụmdi na nwunye ya ike, jụ echiche ụwa bụ́ nke na-eme ka nkekọ alụmdi na nwunye yie ihe na-adịchaghị mkpa, ma ‘gbanahụ ịkwa iko.’—1 Ndị Kọrint 6:18.

10 N’alụmdi na nwunye, dịkwa ka ọ dị n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ anyị, ịkpọ ihe nile dị njọ n’anya Jehova asị, tinyere inwe ekele miri emi maka ịbụ enyi ya, ga-eme ka anyị nwee ihu ọma na nnwapụta Jehova. Pita onyeozi kwuru n’ụzọ siri ike, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Anyị nwere ọtụtụ ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi otú egwu Chineke si kpalie ndị mmadụ ime ihe ziri ezi n’ọnọdụ dịgasị iche iche siri ike.

Mmadụ Atọ Ndị Tụrụ Egwu Chineke

11. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka a gụrụ Abraham n’onye “na-atụ egwu Chineke”?

11 E nwere otu nwoke a kọrọ banyere ya na Bible bụ́ onye Jehova n’onwe ya kọwara dị ka enyi ya—nna ochie bụ́ Abraham. (Aịsaịa 41:8 ) E tinyere egwu Abraham nwere n’ebe Chineke nọ n’ule mgbe Chineke gwara ya ka ọ chụọ nanị otu nwa ya, bụ́ Aịsak, n’àjà, bụ́ onye Chineke ga-esite na ya mezuo nkwa o kweworo na ụmụ Abraham ga-aghọ mba ukwu. (Jenesis 12:2, 3; 17:19) “Enyi Chineke” ọ̀ ga-agafe ule a tara akpụ? (Jemes 2:23) Kpọmkwem oge Abraham weliri mma ya elu ka o gbuo Aịsak, mmụọ ozi Jehova sịrị: “Esetịla aka gị tụkwasị n’ahụ nwa okoro ahụ, emekwala ya ihe ọ bụla: n’ihi na ugbu a ka M maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gị nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.”—Jenesis 22:10-12.

12. Gịnị kpaliri Abraham ịtụ egwu Chineke, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta mmụọ yiri nke ahụ?

12 Ọ bụ ezie na Abraham egosipụtabuwo onwe ya ịbụ onye na-atụ egwu Jehova, n’oge a o gosipụtara na ya na-atụ egwu Chineke n’ụzọ dị ịrịba ama. Njikere ọ dị ịchụ Aịsak n’àjà karịrị nnọọ ngosipụta nke nrubeisi n’ihi nkwanye ùgwù. Ọ bụ ntụkwasị obi zuru ezu Abraham nwere na Nna ya nke eluigwe ga-emezu nkwa Ya site n’ịkpọlite Aịsak n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa kpaliri ya. Dị ka Pọl dere, Abraham ‘kwezuru na ihe Chineke kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.’ (Ndị Rom 4:16-21) Ànyị dị njikere ime uche Chineke ọbụna mgbe ọ chọrọ ịchụ ihe dị ukwuu n’àjà? Ànyị nwere obi ike zuru ezu na nrubeisi dị otú ahụ ga-ewetara anyị abamuru na-adịte aka, na-amara na Jehova bụ “onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ”? (Ndị Hibru 11:6) Nke ahụ bụ ezi egwu Chineke.—Abụ Ọma 115:11.

13. N’ihi gịnị ka Josef pụrụ iji kọwaa onwe ya n’ụzọ ziri ezi dị ka nwoke nke ‘na-atụ egwu Chineke’?

13 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ nke ịtụ egwu Chineke—nke Josef. Dị ka ohu nke nọ n’ezinụlọ Pọtịfa, kwa ụbọchị Josef na-enwe nrụgide nke ịkwa iko. O doro anya na ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi zere izute nwunye nna ya ukwu bụ́ onye nọgidere na-achọ ka o soro ya mee omume rụrụ arụ. N’ikpeazụ, mgbe o ‘jidere ya n’uwe ya,’ ọ ‘gbalagara pụọ n’èzí.’ Gịnị kpaliri ya iwezụga onwe ya n’ihe ọjọọ ozugbo? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na isi ihe kpaliri ya bụ egwu Chineke, bụ́ ọchịchọ izere ime “oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke.” (Jenesis 39:7-12) Josef pụrụ ịkọwa onwe ya n’ụzọ ziri ezi dị ka nwoke nke ‘na-atụ egwu Chineke.’—Jenesis 42:18.

14. Olee otú obi ebere Josef si gosipụta ezi egwu Chineke?

14 Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Josef zutere ụmụnne ya ihu na ihu, bụ́ ndị jiworo obi ọjọọ renye ya n’ịbụ ohu. Ọ pụrụ ijiwo oge a ihe oriri dị ha oké mkpa megwara ha n’ụzọ dị mfe ihe ọjọọ ahụ ha mere ya. Ma imeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ obi ọjọọ adịghị egosipụta egwu Chineke. (Levitikọs 25:43) Ya mere, mgbe Josef hụrụ ihe àmà zuru ezu na-egosi na ụmụnne ya agbanwewo obi, o ji obi ebere gbaghara ha. Dị ka Josef, egwu Chineke anyị nwere ga-akpali anyị iji ezi ihe merie ihe ọjọọ, gbochiekwa anyị ịdaba n’ọnwụnwa.—Jenesis 45:1-11; Abụ Ọma 130:3, 4; Ndị Rom 12:17-21.

15. N’ihi gịnị ka àgwà Job jiworo mee ka obi Jehova ṅụrịa?

15 Job bụ ihe atụ ọzọ dị ịrịba ama nke onye tụrụ egwu Chineke. Jehova gwara Ekwensu, sị: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Ruo ọtụtụ afọ, àgwà zuru okè nke Job emewo ka obi Nna ya nke eluigwe ṅụrịa. Job tụrụ egwu Chineke n’ihi na ọ maara na ọ bụ ihe ziri ezi ime bụrụkwa ụzọ kasị mma isi bie ndụ. “Lee, egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe,” ka Job kwupụtara, “ọzọ, isi n’ihe ọjọọ pụta bụ nghọta.” (Job 28:28) Dị ka nwoke lụrụ nwanyị, Job adịghị ele ụmụ agbọghọ anya n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ dịghịkwa ebu ọchịchọ ịkwa iko n’obi. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ọ tụkwasịghị obi n’akụ̀ na ụba, ọ jụkwara ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị.—Job 31:1, 9-11, 24-28.

16. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Job si gosipụta obi ebere? (b) Olee otú Job si gosi na ọ na-agbaghara?

16 Otú ọ dị, egwu Chineke pụtara mmadụ ime ezi ihe nakwa isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya. N’ihi ya, Job ji obi ebere gosipụta mmasị n’ebe ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị ogbenye nọ. (Levitikọs 19:14; Job 29:15, 16) Job ghọtara na “onye ọ bụla na-egbochi obi ebere ya n’ebe ibe ya nọ, ọ ga-ahapụkwa ọbụna egwu nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Job 6:14, NW) Igbochi obi ebere pụrụ ịgụnye ịghara ịgbaghara ma ọ bụ ibu iwe n’obi. Ná ntụziaka Chineke, Job kpere ekpere n’isi ndị enyi ya atọ, bụ́ ndị kpatawooro ya oké ihe mwute. (Job 42:7-10) Ànyị pụrụ igosipụta mmụọ mgbaghara yiri nke ahụ n’ebe onye kwere ekwe ibe anyị nọ bụ́ onye pụrụ ịkpasuwo anyị iwe n’ụzọ ụfọdụ? Ikpe ekpere sitere n’obi n’isi onye ahụ mejọworo anyị pụrụ inyere anyị aka n’ụzọ dị ukwuu idi mkpasu iwe ahụ. Ngọzi ndị Job nwetara maka ịtụ egwu Chineke na-enye anyị ihe atụ nke ‘ezi ihe bara ụba nke Jehova tụkọbawooro ndị na-atụ egwu ya.’—Abụ Ọma 31:19; Jemes 5:11.

Egwu Chineke Megide Egwu Mmadụ

17. Gịnị ka egwu mmadụ pụrụ ime anyị, ma n’ihi gịnị ka egwu dị otú ahụ ji egosi ebughị ọdịnihu n’obi?

17 Ọ bụ ezie na egwu Chineke pụrụ ịkpali anyị ime ihe ziri ezi, egwu mmadụ pụrụ imebi okwukwe anyị. N’ihi nke a, mgbe Jisọs na-agba ndị ozi ya ume ka ha bụrụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ, ọ gwara ha, sị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ, ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi: kama na-atụnụ egwu Onye ahụ Nke pụrụ ịla mkpụrụ obi na ahụ n’iyi [na Gehena, NW].” (Matiu 10:28) Ịtụ egwu mmadụ na-egosi ebughị ọdịnihu n’obi, ka Jisọs na-akọwa, n’ihi na ụmụ mmadụ apụghị ibibi olileanya anyị maka ndụ n’ọdịnihu. Ọzọkwa, anyị na-atụ egwu Chineke n’ihi na anyị maara banyere ike ya dị egwu, bụ́ nke ike nke mba nile na-adịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ya. (Aịsaịa 40:15) Dị ka Abraham, anyị nwere obi ike zuru ezu n’ike Jehova nwere ịkpọlite ndị ohu Ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ. (Mkpughe 2:10 ) N’ihi ya, anyị ji obi ike na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na Chineke dịịrị anyị, ònye na-emegide anyị?”—Ndị Rom 8:31.

18. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si akwụghachi ndị na-atụ egwu ya ụgwọ ọrụ?

18 Ma onye na-emegide anyị ọ̀ bụ onye òtù ezinụlọ anyị ma ọ bụ onye na-achọ anyị okwu n’ụlọ akwụkwọ, anyị ga-ahụ na “n’egwu Jehova ka ntụkwasị obi siri ike dị.” (Ilu 14:26) Anyị pụrụ ikpeku Chineke ekpere maka ume, na-amara na ọ ga-anụ ekpere anyị. (Abụ Ọma 145:19) Ọ dịghị mgbe Jehova na-echezọ ndị na-atụ egwu ya. Ọ na-emesighachi anyị obi ike site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.”—Malakaị 3:16.

19. Ụdị egwu ndị dị aṅaa ga-abịa ná njedebe, ma ụdị dị aṅaa ga-adịru mgbe ebighị ebi?

19 Oge na-eru nso mgbe mmadụ nile nọ n’ụwa ga-efe Jehova ofufe, egwu mmadụ ga-apụkwa n’anya. (Aịsaịa 11:9) Egwu maka agụụ, ọrịa, mpụ na agha ga-agabigakwa. Ma egwu Chineke ga-adịgide ruo mgbe nile ebighị ebi ka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe na n’ụwa ga-anọgide na-egosi ya nkwanye ùgwù, nrubeisi, na nsọpụrụ ruuru ya. (Mkpughe 15:4) Ka ọ dịgodị, ka anyị nile ṅaa ntị na ndụmọdụ Solomọn bụ́: “Ekwela ka obi gị kwosoo ndị mmehie ekworo: kama n’egwu Jehova ka ị ga-anọ ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ọdịnihu aghaghị ịdị; a gaghị ebipụkwa olileanya gị.”—Ilu 23:17, 18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ụfọdụ ndị toworo eto na-akwụsị ịtụ egwu ihe ize ndụ mgbe ọrụ ha na-eme ka ha na-anọ n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ mgbe nile. Mgbe a jụrụ otu ọkwa nkà bụ́ aka ochie ihe mere mkpụrụ aka ndị kapịnta na-ejighị ezu ezu, ọ zara n’ụzọ dị mfe, sị: “Ha na-akwụsị ịtụ nkwọ osisi ji ike eletrik arụ ọrụ bụ́ nke na-akwọ ihe oké ọsọ ọsọ, egwu.”

^ par. 4 Jehova n’onwe ya na-asọ ihe oyi otú a. Dị ka ihe atụ, Ndị Efesọs 4:29 na-akọwa okwu na-adịghị mma dị ka ‘okwu rere ure.’ Okwu Grik e ji mee ihe maka “rere ure” na-ezo aka n’ụzọ nkịtị ná mkpụrụ osisi, azụ̀, ma ọ bụ anụ rere ere. Okwu dị otú ahụ na-egosi n’ụzọ doro anya otú anyị kwesịrị isi na-asọ okwu mkparị ma ọ bụ okwu rere ure oyi. N’otu aka ahụ, ọtụtụ mgbe, a na-akọwa arụsị n’Akwụkwọ Nsọ dị ka “ndị yiri nsị́ anụ.” (Deuterọnọmi 29:17; Ezikiel 6:9, NW) Oyi ebumpụta ụwa anyị na-asọ nsị́ anụ, ma ọ bụ nke mmadụ, na-enyere anyị aka ịghọta oyi Chineke na-asọ ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị.

^ par. 6 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ banyere Ken (Jenesis 4:3-12); Devid (2 Samuel 11:2–12:14); Gihezi (2 Ndị Eze 5:20-27); na Ụzaịa (2 Ihe E Mere 26:16-21).

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú anyị si amụta ịkpọ ihe ọjọọ asị?

• N’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ ụmụ Israel si ghara iji ọbụbụenyi ha na Jehova kpọrọ ihe n’oge Malakaị?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka Abraham, Josef, na Job banyere egwu Chineke?

• Olee egwu nke na-agaghị agabiga ma ọlị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 19]

Ndị nne na nna maara ihe na-akụnye egwu ziri ezi n’ime ụmụ ha

[Foto dị na peeji nke 20]

Dị nnọọ ka egwu si eme ka anyị wezụga onwe anyị n’ebe ihe ize ndụ dị, egwu Chineke na-eme ka anyị si n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị

[Foto dị na peeji nke 23]

Job nọgidere na-atụ egwu Chineke ọbụna mgbe ndị enyi ụgha kwugidere ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site ná nsụgharị Bible bụ́ Vulgata Latina, 1795