Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Mmeri dị aṅaa n’okwu ikpe metụtara okpukpe ka Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba nke Germany nyere aka mee ka e nwee?

Ụlọikpe ahụ kagburu ikpe na-ezighị ezi nke ụlọikpe ọzọ kpere megide Ndịàmà Jehova na ha ịbụ ndị a maara dị ka òtù ga na-erite uru n’iwu metụtara ọrụ ebere. E kwuru n’ikpe ahụ e kpelaara ha na a bịa n’ihe metụtara nnwere onwe okpukpe, mmadụ pụrụ ‘irubere nkwenkwe okpukpe ya isi’ karịa ihe Ọchịchị chọrọ.—8/15, peeji nke 8.

Ogologo oge ha aṅaa ka Job tara ahụhụ?

Akwụkwọ Job adịghị egosi na ọ tara ahụhụ ruo ọtụtụ afọ. Ọ pụrụ ịbụ na ahụhụ Job na ngwọta ya weere ọnọdụ n’ime ọnwa ole na ole, ikekwe n’ihe na-erughị otu afọ.—8/15, peeji nke 31.

N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Ekwensu abụghị nkwenkwe ụgha nkịtị?

Jisọs Kraịst maara na Ekwensu dị adị. Ọ bụ onye dị adị nwara Jisọs ọnwụnwa, ọ bụghị ihe ọjọọ nke dị n’ime ya. (Matiu 4:1-11; Jọn 8:44; 14:30)—9/1, peeji nke 5-6.

Ilu 10:15 na-asị: “Akụ̀ nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike: mbibi nke ndị na-enweghị ike bụ ogbenye ha bụ.” Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

Akụ̀ na ụba pụrụ ịbụ ihe nchebe pụọ n’ihe ụfọdụ a na-ejighị n’aka ná ndụ, dị nnọọ ka obodo e wusiri ike si echebetụ ndị bi n’ime ya. N’aka nke ọzọ, ịda ogbenye pụrụ ịkpata mbibi mgbe ihe ndị a na-atụghị anya ha mere.—9/15, peeji nke 24.

N’echiche dị aṅaa ka a malitere “ịkpọku aha Jehova” n’oge Enọsh? (Jenesis 4:26)

E jiwo aha Chineke na-eme ihe kemgbe mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ; n’ihi ya, ihe a malitere ime n’oge Enọsh abụghị iji okwukwe na-akpọku aha Jehova. Ọ pụrụ ịbụwo na ndị mmadụ jiri aha Chineke mee ihe n’ụzọ rụrụ arụ site n’ịza ya n’onwe ha ma ọ bụ ịkpọ ya ndị ọzọ bụ́ ndị ha na-eme ka a ga-asị na ha si n’aka ha na-efe Chineke ofufe.—9/15, peeji nke 29.

Dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, gịnị ka okwu ahụ bụ “ịdọ aka ná ntị” pụtara?

Okwu ahụ adịghị enye echiche ọ bụla nke mmegbu ma ọ bụ mmekpọ ọnụ. (Ilu 4:13; 22:15) N’ụzọ bụ́ isi, okwu Grik e ji mee ihe maka “ịdọ aka ná ntị” metụtara inye ntụziaka, izi ihe, mgbazi, nakwa mgbe ụfọdụ, iji ịhụnanya nye ntaramahụhụ siri ike. Otu ụzọ dị mkpa ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie Jehova bụ site n’ịgbalịsi ike ime ka ụzọ nkwurịta okwu nke ha na ụmụ ha ghere oghe. (Ndị Hibru 12:7-10)—10/1, peeji nke 8, 10.

Olee otú ezi ndị Kraịst taa si egosi na ha na-akwado ịchịisi Chineke?

N’ịkwado Alaeze Chineke, Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ na-akpata nnupụisi, ọbụna n’ala ebe ndị a machibidoro Ndịàmà iwu. (Taịtọs 3:1) Ha na-atụnye ụtụ bara uru n’ụzọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya mbụ si mee ya ma na-agbalịsi ike inyere ndị mmadụ aka ịnakwere ụkpụrụ ndị mara mma dị na Bible, ndị dị ka ịkwụwa aka ọtọ, ịdị ọcha nke omume, na àgwà ọma n’ihe banyere ọrụ.—10/15, peeji nke 6.

Olee otú mmiri na-enye ndụ si asọ n’Andes?

Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ na-eme mgbalị iwegara ndị bi n’ebe ahụ eziokwu Bible, ọbụna n’asụsụ abụọ ndị ógbè ahụ na-asụ, bụ́ Quechua na Aymara. Ndịàmà na-eleta ndị bi n’àgwàetiti ndị dị n’Ọdọ Mmiri Titicaca, gụnyere àgwàetiti ndị “na-ese n’elu mmiri” bụ́ ndị e wukwasịrị n’ala dịtụ elu ma dị larịị bụ́ ndị e ji amị ndị na-esi n’ọdọ mmiri ahụ etopụta mee.—10/15, peeji nke 8-10.

Gịnị ka Chineke nyeworo maka iduzi anyị bụ́ nke a pụrụ iji tụnyere usoro nduzi nke kọmputa bụ́ nke dị n’ụgbọelu ọgbara ọhụrụ na-ebu ndị njem?

Chineke enyewo ụmụ mmadụ ihe ga na-eduzi ha n’ụzọ omume ọma, bụ́ echiche omume. Nke a bụ akọ na uche anyị ketara eketa. (Ndị Rom 2:14, 15)—11/1, peeji nke 3-4.

N’ihi gịnị ka ọnwụ Jisọs ji baa uru dị ukwuu?

Mgbe mmadụ ahụ zuru okè bụ́ Adam mehiere, ọ tụfuru ndụ ya na nke ụmụ ya. (Ndị Rom 5:12) Dị ka mmadụ zuru okè, Jisọs chụrụ ndụ mmadụ ya n’àjà, si otú ahụ na-enye ihe mgbapụta nke mere ka o kwe ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi omume inweta ndụ ebighị ebi.—11/15, peeji nke 5-6.

Olee ndị bụ́ ndị Sitia ahụ a kpọtụrụ aha ná Ndị Kọlọsi 3:11?

Ndị Sitia bụ mba na-awagharị awagharị bụ́ ndị biri n’ógbè osisi na-adịghị na ha nke Europe na Esia, ndị chịrị site n’ihe dị ka 700 ruo 300 T.O.A. Ha bụ aka ochie n’ịgba ịnyịnya bụrụkwa ndị dike. Ọ pụrụ ịbụ na Ndị Kọlọsi 3:11 na-ezo aka na, ọ bụghị otu mba, kama ndị kasị bụrụ ndị ime ọhịa.—11/15, peeji nke 24-25.

N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Ụkpụrụ Ọma ahụ bụ ozizi kwesịrị ka anyị na-echebara ya echiche mgbe nile?

Okpukpe ndị Juu, okpukpe Buddha, nkà ihe ọmụma ndị Gris na okpukpe Confucius, kwuchara banyere ụkpụrụ omume ọma a bụ́ isi n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Otú ọ dị, ihe Jisọs nyere ntụziaka ya n’Ozizi Elu Ugwu ahụ chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ na-emetụtakwa ndụ ndị mmadụ nọ n’ebe nile na n’ọgbọ nile. (Matiu 7:12)—12/1, peeji nke 3.