Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú onye Kraịst bụ́ nwunye pụrụ isi mee ka iguzosi ike n’ihe ya nye Chineke na ido onwe ya n’okpuru di ya na-ekweghị ekwe kwekọọ ma ọ bụrụ na di ya na-ekere òkè n’ememe okpukpe dị iche iche?

Ya ime otú ahụ ga-achọ ya iji amamihe na akọ na-eme ihe. Ma ọ na-eme ihe ziri ezi n’ịgbalịsi ike ime ka ibu ọrụ abụọ o nwere kwekọọ. Jisọs nyere ndụmọdụ banyere ọnọdụ yiri nke ahụ, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) N’eziokwu, ọ na-ekwu banyere ibu ọrụ n’ebe ọchịchị nọ, bụ́ nke e mesịrị gwa ndị Kraịst ka ha rubere isi. (Ndị Rom 13:1) Otú ọ dị, a pụkwara iji ndụmọdụ ya mee ihe banyere nwunye ime ka ibu ọrụ ya n’ebe Chineke nọ na ido onwe ya n’okpuru di ya dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo kwekọọ, ọbụna ma a sị na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe.

Ọ dịghị onye maara Bible nke ọma nke ga-arụ ụka na Bible ekwughị na ibu ọrụ mbụ nke onye Kraịst bụ n’ebe Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile nọ, iguzosi ike n’ihe nye ya mgbe nile. (Ọrụ 5:29) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, onye na-efe ezi ofufe pụrụ ịnakwere arịrịọ ma ọ bụ ọchịchọ nke onye na-ekweghị ekwe nọ n’isi, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekere òkè n’imebi iwu ndị dị elu nke Chineke.

Anyị na-ahụ ihe atụ nwere ihe mmụta n’ebe ndị Hibru atọ nọ, dị ka a kọrọ ya na Daniel isi 3. Onye na-achị ha, bụ́ Nebukadneza, nyere iwu ka ha na ndị ọzọ zukọọ na ndagwurugwu Dura. N’ịghọta na e mere ndokwa maka ife ofufe ụgha, ndị Hibru atọ ahụ ma eleghị anya, gaara ahọrọwo ịghara ịnọ ebe ahụ. Eleghị anya, Daniel nataliri ikike ịghara ịga, ma mmadụ atọ a emelighị otú ahụ. * N’ihi ya, ha rubere isi ruo n’ókè nke ịnọ n’ebe ahụ, ma ha agaghị ekere òkè n’ihe omume ọ bụla na-ezighị ezi—ha emeghịkwa otú ahụ.—Daniel 3:1-18.

N’otu aka ahụ, n’oge ememe, di na-ekweghị ekwe pụrụ ịrịọ ma ọ bụ ịchọ ka nwunye ya bụ́ onye Kraịst mee ihe ọ na-agaghị achọ ime. Tụlee ụfọdụ ihe atụ: Ọ gwara ya ka o sie otu ụdị ihe oriri n’ụbọchị ahụ ya na ndị ọzọ ga-eme ememe. Ma ọ bụ ya ekwuo ka ezinụlọ ya (gụnyere nwunye ya) gaa leta ndị ikwu ha n’ụbọchị ahụ maka oriri ma ọ bụ nanị maka nnọkọ ntụrụndụ. Ma ọ bụ ọbụna tupu ememe ahụ, ọ pụrụ ịgwa nwunye ya na mgbe ọ ga-aga ịzụ ihe, ka ọ zụtara ya ihe ụfọdụ—ihe oriri ndị a ga-eji mee ememe ahụ, ihe ndị a ga-enye n’onyinye, akwụkwọ ndị e ji afụchi ihe onyinye na kaadị a ga-eji nye onyinye.

Ọzọkwa, onye Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị ikpebisi ike ịghara ikere òkè n’ihe omume okpukpe ụgha, ma gịnị banyere ihe ndị dị otú ahụ ọ gwara ya zụta? Ọ bụ onyeisi ezinụlọ, Okwu Chineke na-ekwukwa, sị: “Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18) N’ọnọdụ ndị a, ọ̀ pụrụ ido onwe ya n’okpuru dị ka nwunye ka ọ na-egosipụta iguzosi ike n’ihe nye Chineke? Ọ ghaghị ikpebi otú ọ ga-esi mee ka nrubeisi ya nye di ya na nrubeisi kasịnụ nye Jehova kwekọọ.

N’oge ndị ọzọ, di ya pụrụ ịgwa ya ka o sie otu ụdị ihe oriri, ma ọ bụ n’ihi na ọ bụ nke kasị amasị ya ma ọ bụ n’ihi na e nwere oge ọ na-ejikarị eri ụdị nri ahụ. Ọ ga-achọ igosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ, gosikwa na ya nakweere ịbụisi ya. Ọ̀ pụrụ ime otú ahụ ọbụna ma a sị na ọ rịọrọ nke ahụ n’oge ememe? Ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ nwunye nwere ike iji akọ na uche dị ọcha mee otú ahụ, na-ewere ya nanị dị ka ọrụ isi nri dịịrị ha kwa ụbọchị. N’ezie, ọ dịghị onye Kraịst na-eguzosi ike n’ihe nke ga-ekwu na ọ bụ maka ememe, ọbụna ma a sị na di ya kwuru otú ahụ. N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịchọ ka o soro ya mgbe ọ na-aga ileta ndị ikwu ya n’oge dịgasị iche iche n’ọnwa ma ọ bụ n’afọ. Ọ̀ pụrụ ime otú ahụ ọbụna ma a sị na ọ bụ ụbọchị ememe? Ma ọ bụ, dị ka ọ na-emebu, ọ̀ ga-adị njikere ịzụtara ya ihe ọ chọrọ n’agaghị tụlewe ihe chọrọ iji ihe ndị ahụ ọ ga-azụtara ya mgbe ọ na-azụ ihe nke ya, mee?

N’ezie, onye Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị iche banyere ndị ọzọ—mmetụta ọ ga-enwe n’ahụ ha. (Ndị Filipaị 2:4) Ọ ga-achọ izere inye echiche ọ bụla na-egosi na o so eme ememe ahụ, dị nnọọ ka ọ pụrụ ịbụwo na, ma eleghị anya, ndị Hibru atọ ahụ họọrọ ime ka ndị ọzọ ghara ịhụ ha mgbe ha na-aga na ndagwurugwu Dura. N’ihi ya, ọ pụrụ iji akọ gbalịa isoro di ya tụgharịa uche iji hụ ma di ya, n’ichebara mmetụta ya echiche, ọ ga-eji aka ya mee ihe ụfọdụ metụtara ememe ahụ iji gosi nchebara echiche maka nwunye ya nke hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ pụrụ ịhụ amamihe dị n’ịghara ime ihe pụrụ ịkpatara ha ihere ma ọ bụrụ na nwunye ya ajụ itinye aka n’ihe omume okpukpe ụgha. Ee, iji obi dị jụụ nwee nkwurịta okwu tupu oge eruo pụrụ ime ka e dozie ihe n’udo.—Ilu 22:3.

Ná nchịkọta, onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi aghaghị ịtụle ihe ndị o metụtara ma kpebizie ihe ọ ga-eme. Irubere Chineke isi aghaghị ibute ụzọ, dị ka o mere n’ebe ndị Hibru atọ ahụ nọ. (1 Ndị Kọrint 10:31) Ma n’iburu nke ahụ n’uche, onye Kraịst ahụ aghaghị ikpebi ihe na-emegideghị okwukwe ya bụ́ nke ọ pụrụ ime ma ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ onyeisi obodo agwa ya ka o mee ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche nke August 1, 2001.