Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya

Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya

Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya

MGBE Jisọs matasịrị site n’ọnụ ndị ozi ya ihe ndị mmadụ chere banyere ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ma ọ̀ bụ onye ka unu onwe unu sị na Mụ bụ?” E dekọrọ azịza Pita n’Oziọma Matiu: “Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:15, 16) Ndị ọzọ nwere otu echiche ahụ. Nataniel, bụ́ onye mesịrị ghọọ otu n’ime ndị ozi, gwara Jisọs, sị: “Rabaị, Gị onwe gị bụ Ọkpara Chineke; Gị onwe gị bụ Eze Israel.” (Jọn 1:49) Jisọs n’onwe ya kwuru banyere ịdị mkpa nke ọrụ ya, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ́ bụghị site na Mụ.” (Jọn 14:6) N’oge dịgasị iche iche, ọ kpọrọ onwe ya “Ọkpara Chineke.” (Jọn 5:24, 25; 11:4) O jikwa ọrụ ebube dị iche iche gosipụta nke a, ọbụna na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

Hà Bụ Obi Abụọ Ndị Nwere Ezi Ihe Ndabere?

Ma, ànyị pụrụ inwe obi ike n’ezie n’ihe Oziọma ndị ahụ kwuru banyere Jisọs? Hà kọwara Jisọs nke bụ́ ezigbo ya? Prọfesọ nke ngalaba nnyocha na nkọwa Bible na Mahadum Manchester, England, bụ́ Frederick F. Bruce nke nwụrụ anwụ, sịrị: “Ọ naghị adịkarị mfe iji ihe ndị e kwuru n’akụkọ ihe mere eme anwapụta ịbụ eziokwu nke ihe nile e dere n’ihe odide oge ochie, ma ha sitere na Bible ma ọ bụ na ha esiteghị. Inwe obi ike kwesịrị ekwesị na onye edemede bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi ezuola; ọ bụrụ na e nwee nke ahụ, site n’ihe àmà ndị o nyere n’onwe ya, o yiri ka ihe o dere ọ ga-abụ eziokwu. . . . Eziokwu ahụ bụ́ na ndị Kraịst nakweere Agba Ọhụrụ dị ka akwụkwọ ọgụgụ ‘dị nsọ’ abụghị ihe ga-eme ka e were ya dị ka akụkọ ihe mere eme a na-apụghị ịtụkwasị obi.”

Mgbe James R. Edwards, bụ́ prọfesọ n’ihe ọmụmụ okpukpe na Mahadum Jamestown, North Dakota, U.S.A., nyochasịrị obi abụọ ndị e nwere banyere otú e si kọwaa Jisọs n’Oziọma ndị ahụ, o dere, sị: “Anyị pụrụ iji obi ike kwuo na Oziọma ndị ahụ chebere ọtụtụ ihe akaebe dị mkpa nke eziokwu na-enweghị mgbagha banyere Jisọs. . . . Azịza ezi uche kasị dịrị na ya banyere ihe mere Oziọma ndị ahụ ji kọwaa Jisọs otú ha si kọwaa ya bụ n’ihi na ọ bụ otú ahụ ka Jisọs dị n’ụzọ bụ́ isi. Oziọma ndị ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi chebe echiche Jisọs mere ka ụmụazụ ya nwee, bụ́ na ọ bụ Chineke zitere ya n’ezie ma nye ya ike ịbụ Ọkpara na Ohu ya.” *

Ịchọ Jisọs

Gịnị banyere ihe akwụkwọ ntụaka ndị na-adabereghị na Bible kwuru banyere Jisọs Kraịst? Olee otú a ga-esi tụọ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Akwụkwọ Tacitus, Suetonius, Josephus, Pliny nke Nta, na nke ndị edemede ole na ole ndị ọzọ ma nke a na-akọ zoro aka nke ukwuu n’ebe Jisọs nọ. Banyere ha, akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica (nke 1995) na-asị: “Ihe ndekọ ndị a ndị mmadụ n’otu n’otu dere na-egosi na n’oge ochie, ọbụna ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha nwere obi abụọ banyere ịdị adị Jisọs, bụ́ nke a rụrụ ụka ya nke mbụ ya, n’enweghịkwa ihe ndabere zuru ezu, ná ngwụsị nke narị afọ nke 18, na narị afọ nke 19, nakwa ná mmalite narị afọ nke 20.”

N’ụzọ dị mwute, o yiri ka ndị ọkà mmụta nke oge a, n’ọchịchọ ha na-achọ Jisọs nke bụ́ “ezigbo ya” ma ọ bụ nke “a kọrọ n’akụkọ,” hà ji ịkọ nkọ na-enweghị ihe ndabere, arụmụka na-enweghị isi, na nchepụta echiche na-enweghị ihe ndabere, mee ka a ghara ịmata onye ọ bụ n’ezie. N’otu echiche, ọ bụ ha na-akọ akụkọ ifo ndị ha na-ebo ndị dere Oziọma ndị ahụ. Ụfọdụ nwere oké mmasị n’ime ka a na-anụkwu aha ha nakwa ka a sị na ọ bụ ha chepụtara otu ozizi ọhụrụ nke dị ịtụnanya nke na ha adịghị eji obi ọcha enyocha ihe àmà e nwere banyere Jisọs. Ka ha na-eme nke a, ha na-akụzi banyere “Jisọs” nke bụ́ nanị onye ndị ọkà mmụta chepụtara.

Maka ndị chọrọ ịchọta Jisọs nke bụ́ ezigbo ya, a pụrụ ịhụ ya na Bible. Luke Johnson, bụ́ prọfesọ nke ihe ọmụmụ Agba Ọhụrụ na mmalite ndị Kraịst na Candler School of Theology nke Mahadum Emory, kwuru na ihe ka ọtụtụ ná nchọpụta ndị e mere banyere Jisọs ahụ a kọrọ n’akụkọ na-eleghara ebumnobi Bible anya. O kwuru na ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpali mmasị inyocha ọnọdụ e nwere n’oge ndụ Jisọs ma a bịa n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọchịchị, nkà mmụta banyere ịdị adị mmadụ, na ọdịbendị. Ma, o kwukwara na ịchọpụta ihe ndị ọkà mmụta kpọrọ Jisọs nke a kọrọ n’akụkọ “abụtụghị ebumnobi nke Akwụkwọ Nsọ,” bụ́ nke “lekwasịrị anya karịsịa n’ịkọwa àgwà Jisọs,” ozi ya, na ọrụ ya dị ka Onye Mgbapụta. Ya mere, gịnị bụ kpọmkwem àgwà na ozi Jisọs?

Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya

Oziọma ndị ahụ—ihe ndekọ Bible anọ banyere ndụ Jisọs—kọwara nwoke nke nwere mmetụta ọmịiko dị ukwuu. Obi ebere na ọmịiko kpaliri Jisọs inyere ndị na-arịa ọrịa, ndị kpuru ìsì, na ndị nwere nsogbu ndị ọzọ, aka. (Matiu 9:36; 14:14; 20:34) Ọnwụ nke enyi ya nwoke bụ́ Lazarọs na iru újú nke a kpataara ụmụnne nwanyị Lazarọs kpaliri Jisọs ‘ịsụ ude, anya mmiri pụkwara ya n’anya.’ (Jọn 11:32-36) N’ezie, Oziọma ndị ahụ na-ekpughe mmetụta dị iche iche nke Jisọs nwere—ọmịiko n’ebe onye ekpenta nọ, oké ọṅụ n’ihi ihe ịga nke ọma ndị na-eso ụzọ ya nwere, iwe n’ebe ndị obi tara mmiri na-agbasobiga iwu ókè nọ, na mwute n’ihi ọjụjụ Jerusalem jụrụ Mesaịa ahụ.

Mgbe Jisọs rụrụ ọrụ ebube, o lekwasịrị anya mgbe mgbe n’òkè onye ahụ a rụrụ ọrụ ebube n’ahụ ya keere: “Okwukwe gị azọpụtawo gị.” (Matiu 9:22) Ọ jara Nataniel mma dị ka “onye Israel n’ezie,” na-asị: ‘Aghụghọ adịghị ya n’ahụ!’ (Jọn 1:47) Mgbe ụfọdụ ndị chere na onyinye otu nwanyị nyere iji gosi obi ekele ya bụ imefusị ihe, Jisọs gbachiteere ya ma kwuo na a ga na-echeta ihe ndekọ banyere mmesapụ aka ya ruo ogologo oge. (Matiu 26:6-13) O gosipụtara onwe ya ịbụ ezigbo enyi na onye ibe nwere mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụazụ ya nọ, ‘na-ahụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.’—Jọn 13:1; 15:11-15.

Oziọma ndị ahụ gosikwara na Jisọs ghọtara ngwa ngwa mkpa nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị o zutere. Ma ọ̀ na-agwa nwanyị okwu n’olulu mmiri, ma ọ bụ onye nkụzi okpukpe n’ogige, ma ọ bụ onye ọkụ azụ n’akụkụ ọdọ mmiri, o kwuru ihe ruru ha n’obi ozugbo. Mgbe Jisọs malitesịrị ikwu okwu, ọtụtụ n’ime ha na-ekpughere ya ihe dị ha n’obi. Ọ na-akpali ha ime ihe. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ndị oge Jisọs adịghị ekwe erute ndị nọ n’ọchịchị nso, na nke ya, ndị mmadụ gbara ya gburugburu. Ọ na-amasị ha ịnọ ebe Jisọs nọ; ahụ na-eru ha ala mgbe ha na ya nọ. Ahụ na-eru ụmụaka ala ma ha na ya nọrọ, mgbe o jikwa nwatakịrị mee ihe atụ, o meghị nanị ka nwatakịrị ahụ kwụrụ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya kamakwa, ọ ‘tụkwasịrị aka ya n’ubu ya.’ (Mak 9:36, NW; 10:13-16) N’ezie, Oziọma ndị ahụ kọwara Jisọs dị ka onye nwere ikike na-adọrọ adọrọ nke na ndị mmadụ nọrọ abalị atọ nanị iji ṅaa ntị n’okwu ya na-adọrọ mmasị.—Matiu 15:32.

Izu okè Jisọs emeghị ka ọ bụrụ onye na-akatọgharị mmadụ ma ọ bụ onye mpako na onye na-achịgbu ndị mmadụ na-ezughị okè mmehie na-anyịgbu bụ́ ndị o biri ndụ n’etiti ha ma kwusaara ozi ọma. (Matiu 9:10-13; 21:31, 32; Luk 7:36-48; 15:1-32; 18:9-14) Jisọs adịghị achọ oké ihe ma ọlị n’aka ndị ọzọ. Ọ tụkwasịghị ihe n’ịbụ arọ nke ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, . . . Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” Ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara na ọ bụ “Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi”; yoke ya adịghị egbu mgbu, ibu ya dịkwa mfe.—Matiu 11:28-30.

A kọrọ ihe ndị bụ́ eziokwu banyere àgwà Jisọs n’ụzọ na-enweghị mgbagha n’Oziọma ndị ahụ. Ọ gaghị adị mfe mmadụ anọ dị iche iche ichepụta otu onye pụrụ iche ma kọọ banyere ya n’ụzọ ndị kwekọrọ n’ibe ha n’akụkọ anọ dị iche iche. Ọ ga-afọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume ndị edemede anọ dị iche iche ịkọwa otu onye ma kwuo otu ihe banyere onye ahụ n’ụzọ kwekọrọ nnọọ ekwekọ ma ọ bụrụ na onye ahụ adịghị adị n’ezie.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Michael Grant jụrụ otu ajụjụ na-akpali iche echiche, sị: “Olee otú ọ pụrụ isi kwe omume na, n’Oziọma ahụ nile, e nyere nkọwa dị nnọọ ịrịba ama banyere otu nwa okorobịa mara mma nke so ụdị ndị inyom nile kpakọrịta n’enweghị nsogbu, gụnyere ndị a maara nke ọma na ha nwere aha ọjọọ, n’akpatụghị ókè, n’asọtụghị ha asọ, ma ọ bụ mee oké nsọ nsọ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’oge ọ bụla, ya abụrụ onye guzosiri nnọọ ike n’ezi ihe?” Azịza ezi uche dị na ya bụ na nwoke dị otú ahụ dịrị adị n’ezie ma kpaa àgwà otú Bible si kwuo.

Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya na Ọdịnihu Gị

E wezụga inye nkọwa nke ihe mere eme banyere Jisọs mgbe ọ nọ n’ụwa, Bible na-egosi na tupu ya aghọọ mmadụ, ọ dịrị adị dị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Puku afọ abụọ gara aga, Chineke bufere ndụ nke Ọkpara ya nke eluigwe n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu ka e wee mụọ ya dị ka mmadụ. (Matiu 1:18) N’oge ozi elu ala ya, Jisọs kpọsara Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ahụhụ, ọ zụkwara ndị na-eso ụzọ ya ịnọgide na-arụ ọrụ nkwusa a.—Matiu 4:17; 10:5-7; 28:19, 20.

Na Nisan 14 (ihe dị ka April 1), 33 O.A., e jidere Jisọs, kpee ya ikpe, maa ya ikpe, ma gbuo ya n’ihi ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. (Matiu 26:18-20, Mt 26:48–27:50) Ọnwụ Jisọs bụ ihe mgbapụta, na-atọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe n’ọnọdụ mmehie ha, sikwa otú ahụ na-emeghere ndị nile ga-egosipụta okwukwe na ya ụzọ maka inweta ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 3:23, 24; 1 Jọn 2:2) Na Nisan 16, a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rịgoghachiri n’eluigwe. (Mak 16:1-8; Luk 24:50-53; Ọrụ 1:6-9) Dị ka Eze Jehova họpụtara, Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ nwere ikike zuru ezu imezu nzube mbụ nke Chineke maka ụmụ mmadụ. (Aịsaịa 9:6, 7; Luk 1:32, 33) Ee, Bible kọwara Jisọs dị ka onye bụ́ isi n’imezu nzube Chineke.

Na narị afọ mbụ, ìgwè mmadụ nakweere Jisọs n’ihi ihe ọ bụ—Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye e zitere n’ụwa iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ịnwụ dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 20:28; Luk 2:25-32; Jọn 17:25, 26; 18:37) Ọ gaara esi ike ndị mmadụ ịbụ ndị a kpaliri ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs mgbe ha na-eche mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ihu ma ọ bụrụ na ha amaghị onye ọ bụ. Ha ji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi nakwere ọrụ o nyere ha, ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19.

Taa, ọtụtụ nde ndị Kraịst nwere obi eziokwu na ihe ọmụma maara na Jisọs abụghị onye a kọrọ n’akụkọ ifo. Ha nakweere ya dị ka Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze nke Alaeze Chineke e guzobere n’eluigwe, bụ́ onye na-aga ịchị ụwa dum n’isi nso. Ozi banyere ọchịchị Chineke a bụ ozi ọma n’ihi na ọ na-ekwe nkwa nnwere onwe pụọ ná nsogbu ụwa. Ezi ndị Kraịst na-egosipụta na ha ji iguzosi ike n’ihe na-akwado Eze Jehova họpụtara site n’ikwusara ndị ọzọ “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.”—Matiu 24:14.

Ndị na-akwado ndokwa Alaeze ahụ e mere site n’aka Kraịst, bụ́ Ọkpara nke Chineke ahụ dị ndụ, ga-adị ndụ inweta ngọzi ebighị ebi. Ngọzi ndị a pụkwara ịbụ nke gị! Ndị na-ebipụta akwụkwọ a ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmata Jisọs nke bụ́ ezigbo ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Maka ntụle zuru ezu nke ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ, lee isi nke 5 ruo 7 nke akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Ndị Ọzọ Kwuworo

“Ewerewo m Jisọs onye Nazaret dị ka otu n’ime ezigbo ndị nkụzi ụwa nwetụworo. . . . Aga m agwa ndị Hindu na ndụ unu agaghị ezu ezu ọ gwụla ma unu ji nsọpụrụ ofufe na-amụ ozizi Jisọs.”—Mohandas K. Gandhi, The Message of Jesus Christ.

“Onye pụrụ iche, zuo ezuo, onye e kwuru ihe na-emegideghị ibe ha banyere ya, onye zuru okè, nke nwere ọmịiko, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, kara mmadụ nile elu otú a, apụghị ịbụ onye a kọrọ banyere ya iji duhie ndị mmadụ ma ọ bụ onye e chepụtara echepụta. . . . Onye ga-echepụta Jisọs ga-abụ onye karịrị Jisọs.”—Philip Schaff, History of the Christian Church.

“Na ụmụ mmadụ efu ole na ole n’ime otu ọgbọ ga-azụlite ụdịdị onye dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị, ụkpụrụ omume dị elu nke ukwuu na ọhụụ dị ebube banyere òtù ụmụnna nke ihe a kpọrọ mmadụ, ga-abụ ọrụ ebube siri ike ikwere nke ukwuu karịa nke ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ.” Will Durant, Caesar and Christ.

“Ọ pụrụ iyi ihe a na-apụghị ịghọta aghọta na onye na-adịghị adị nke e chepụtara echepụta, dị ka ụzọ e si eme ihe n’oge ochie, nke ya na usoro mkpọsa ngwá ahịa nke oge a bụ otu ihe, pụrụ imewo ka e nwee òtù okpukpe zuru ụwa ọnụ, ebe e nwere ọtụtụ ndị e kweere na ha dịrị adị bụ́ ndị gbalịworo ihiwe okpukpe ma ha enweghị ike.”—Gregg Easterbrook, Beside Still Waters.

‘Dị ka odeakụkọ ihe mere eme, ekwenyesiri m ike na ihe ọ sọkwara Oziọma ndị ahụ ha bụrụ, ha abụghị akụkọ ifo. Nkà e ji dee ha erughị nke akụkọ ifo. Anyị amaghị ihe ka ukwuu ná ndụ Jisọs, ọ dịghịkwa onye na-ede akụkọ ifo nke ga-ekwe ka ọ dị otú ahụ.’—C. S. Lewis, God in the Dock.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Oziọma ndị ahụ na-ekpughe mmetụta dị iche iche nke Jisọs nwere