Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’

‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’

‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’

“Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—MATIU 11:29.

1. Gịnị mere ịmụta ihe n’ọnụ Jisọs pụrụ iji bụrụ ihe na-atọ ụtọ ma na-eme ka ndụ ka mma?

JISỌS KRAỊST chere echiche, zie ihe, ma mee omume n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe nile. Ọ nọteghị aka n’ụwa, ma ọ nụrụ ụtọ ọrụ na-akwụghachi ụgwọ ma na-enye afọ ojuju, ọ nọgidekwara na-enwe obi ụtọ. Ọ kpọkọtara ndị na-eso ụzọ ya ma kụziere ha otú e si efe Chineke, otú e si ahụ ụmụ mmadụ n’anya, na otú e si emeri ụwa. (Jọn 16:33) O ji olileanya mejupụta obi ha, “sitekwa n’ozi ọma Ya wepụta ndụ na emebighị emebi n’ìhè.” (2 Timoti 1:10) Ọ bụrụ na ị gụrụ onwe gị n’otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, gịnị ka i chere na ịbụ onye na-eso ụzọ pụtara? Site n’ịtụle ihe Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ, anyị pụrụ ịmụta otú anyị ga-esi mee ka ndụ anyị ka mma. Nke ahụ na-agụnye ile ihe anya otú o si ele ihe anya na itinye ụkpụrụ ụfọdụ bụ́ isi n’ọrụ.—Matiu 10:24, 25; Luk 14:26, 27; Jọn 8:31, 32; 13:35; 15:8.

2, 3. (a) Gịnị ka ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs pụtara? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ònye ka m na-eso ụzọ ya?’

2 N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu a sụgharịrị ịbụ “onye na-eso ụzọ” pụtara n’ụzọ bụ́ isi onye na-etinye uche ya n’ihe, ma ọ bụ onye na-amụta ihe. Okwu yiri ya pụtara n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ isiokwu a dabeere na ya, bụ́ Matiu 11:29: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu [ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ, NW].” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ee, onye na-eso ụzọ bụ onye na-amụta ihe. Oziọma ndị ahụ na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “onye na-eso ụzọ” eme ihe n’ebe ụmụazụ Jisọs ndị ha na ya kpachiri anya nọ, bụ́ ndị so ya jegharịa ka ọ na-eme nkwusa, bụ́kwa ndị o ziri ihe. Ụfọdụ ndị pụrụ nnọọ ịnakwerewo ozizi Jisọs, ọbụna na-eme otú ahụ na nzuzo. (Luk 6:17; Jọn 19:38) Ndị dere Oziọma ndị ahụ kwukwara banyere “ndị na-eso ụzọ Jọn [Onye Na-eme Baptism] na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii.” (Mak 2:18) Ebe ọ bụ na Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị ka ha “na-eze ozizi ndị Farisii,” anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ònye ka m na-eso ụzọ ya?’—Matiu 16:12.

3 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụrụ na anyị mụtara ihe n’ọnụ ya, mgbe ahụ, o kwesịrị ịdị ndị ọzọ ka hà chọtara izu ike n’ụzọ ime mmụọ ma anyị na ha nọrọ. Ha kwesịrị ịchọpụta na anyị aghọkwuola ndị nwayọọ na ndị wedatara onwe ha ala n’obi. Ọ bụrụ na anyị nwere ibu ọrụ nke nlekọta n’ụlọ ọrụ anyị, ndị nne na nna, ma ọ bụ bụrụ ndị nwere ọrụ ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ̀ na-adị ndị anyị na-elekọta ka ànyị na-emeso ha ihe otú Jisọs si mesoo ndị o lekọtara?

Otú Jisọs Si Mesoo Ndị Mmadụ Ihe

4, 5. (a) Gịnị mere na o sighị ike ịmara otú Jisọs si mesoo ndị nwere nsogbu ihe? (b) Ahụmahụ dị aṅaa ka Jisọs nwere mgbe ọ na-eri ihe n’ụlọ otu onye Farisii?

4 Ọ dị anyị mkpa ịmara otú Jisọs si mesoo ndị mmadụ ihe, karịsịa ndị nwere nsogbu siri ike. Nke ahụ ekwesịghị ịbụ ihe siri ike mmụta; Bible bu ọtụtụ akụkọ banyere otú Jisọs si mesoo ndị ọzọ ihe, ndị ụfọdụ n’ime ha nọ ná nsogbu. Ka anyị rịbakwa ama otú ndị ndú okpukpe, karịsịa ndị Farisii, si mesoo ndị nwere nsogbu yiri nke ahụ ihe. Ọdịiche dị na ya ga-abụ ihe na-enye ihe ọmụma.

5 N’afọ 31 O.A., ka Jisọs na-eme njem nkwusa na Galili, “otu onye n’etiti ndị Farisii wee kpeere [Jisọs] ka O soo ya rie ihe.” Jisọs egbughị oge n’ịza òkù ahụ. “O wee baa n’ụlọ onye Farisii ahụ, wee nọdụ ná nri. Ma lee, otu nwanyị nke nọ n’obodo ahụ, bụ́ onye mmehie; mgbe ọ maara nke ọma na Ọ nọdụrụ ná nri n’ụlọ onye Farisii ahụ, o wee weta ite alabaster nke mmanụ otite dị ya n’ime, wee guzo n’azụ n’ụkwụ Ya, na-akwa ákwá, wee malite iwere anya mmiri ya desa ụkwụ Ya abụọ, o werekwa agịrị isi ya hichaa ha, o wee sutụ ụkwụ Ya ọnụ nke ukwuu, were mmanụ otite ahụ tee ha.”—Luk 7:36-38.

6. Gịnị pụrụ imewo ka nwanyị ahụ bụ́ “onye mmehie” nọrọ n’ụlọ onye Farisii ahụ?

6 Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ihe ahụ merenụ? Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Nwanyị ahụ (ama. nke 37) ji omenala na-achịkwa ihe omume ọha bụ́ nke nyere ndị nọ ná mkpa ohere ịga n’oriri dị otú ahụ iji nweta ụfọdụ n’ime ihe ndị e rifọrọ erifọ, mee ihe n’ụzọ bara uru.” Nke ahụ pụrụ ịkọwa otú mmadụ pụrụ isi bata ebe a na-akpọghị ya akpọ. A pụrụ inwewo ndị ọzọ tụrụ anya inweta nri e rifọrọ erifọ. Otú ọ dị, akparamàgwà nwanyị a gbapụrụ iche. Ọ nọghị n’akụkụ na-ele anya, na-eche ka ha risịa nri. O nwere aha ọjọọ, ebe ọ bụ “onye mmehie” a ma ama, nke mere na Jisọs kwuru na ya maara banyere “mmehie ya, nke dị ọtụtụ.”—Luk 7:47.

7, 8. (a) Olee otú anyị pụrụ isiwo meghachi omume n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ a kọrọ na Luk 7:36-38? (b) Olee otú Saịmọn si meghachi omume?

7 Were ya na ị dị ndụ laa azụ n’oge ahụ ma nọrọ n’ọnọdụ Jisọs. Ị̀ gaara esiwo aṅaa meghachi omume? Ị̀ gaara enwewo ahụ erughị ala ka nwanyị a bịakwutere gị? Olee otú ọnọdụ dị otú ahụ gaara esi emetụta gị? (Luk 7:45) Ọ̀ gaara awụwo gị akpata oyi n’ahụ, meekwa ka ị kụja?

8 Ọ bụrụ na i so ná ndị ọzọ a kpọrọ òkù ahụ, echiche gị ọ̀ pụrụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, iyitụwo nke Saịmọn onye Farisii ahụ? “Ma mgbe onye Farisii nke kpọrọ [Jisọs] hụrụ ya, o kwuo n’onwe ya, sị, Nwoke a, a sị na Ọ bụ onye amụma, Ọ ga-amara onye nwanyị a bụ nke na-emetụ Ya aka, na aha mmadụ ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.” (Luk 7:39) N’ụzọ dị iche, Jisọs bụ nwoke nwere ọmịiko dị ukwuu. Ọ ghọtara ọnọdụ nwanyị ahụ ma chọpụta nhụjuanya ya. A gwaghị anyị otú o si daba ná ndụ mmehie. Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ nwanyị na-akwa iko, o doro anya na ndị ikom obodo ahụ, bụ́ ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe, enyeghịrị ya aka.

9. Olee otú Jisọs si meghachi omume, oleekwa ihe pụworo isi na ya pụta?

9 Ma Jisọs chọrọ inyere ya aka. Ọ gwara ya, sị: “A gbagharawo gị mmehie nile gị.” Ọ gbakwụnyeziri: “Okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo.” (Luk 7:48-50) Ebe a ka ihe ndekọ ahụ gwụrụ. Mmadụ pụrụ ikwu na ọ dịghị oké ihe Jisọs meere ya. N’ụzọ bụ́ isi, ọ gọziri ya wee zilaga ya. Ì chere na ọ laghachiri, ma eleghị anya, n’ụzọ ndụ ọjọọ ya? Ọ bụ ezie na anyị apụghị ijide n’aka kpọmkwem, rịba ama ihe Luk na-ekwu mgbe nke a gasịrị. Ọ kọrọ na Jisọs gawara “site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke.” Luk kọkwara na “ụmụ nwanyị ụfọdụ” so Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, “[site] n’ihe ndị [ụmụ nwanyị ahụ] nwere na-ahụ maka mkpa ha.” A pụghị ikwu na ọ gaghị ekwe omume na nwanyị a nwere nchegharị na obi ekele sozi n’etiti ha, jiri akọ na uche dị ọcha, echiche nwere nzube nke e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ, na ịhụnanya miri nnọọ emi maka Chineke na-agbaso ụzọ ndụ nke nsọpụrụ Chineke.—Luk 8:1-3, NW.

Ọdịiche Dị n’Etiti Jisọs na Ndị Farisii

10. Gịnị mere o ji baa uru ịtụle ihe ndekọ nke Jisọs na nwanyị ahụ gara n’ụlọ Saịmọn?

10 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ a doro anya? Ọ na-emetụ anyị n’ahụ, ọ́ bụghị ya? Weregodị ya na ị nọ n’ụlọ Saịmọn. Olee otú ọ ga-adị gị? Ị̀ ga-emeghachi omume dị ka Jisọs, ka ọ̀ ga-adịtụ gị otú ọ dị onye Farisii ọ nọ na nke ya? Jisọs bụ Ọkpara Chineke, n’ihi ya, anyị apụghị inwe mmetụta ma mee omume kpọmkwem dị ka ya. N’aka nke ọzọ, e nwere ike anyị agaghị achọ iwere onwe anyị na anyị dị ka Saịmọn, onye Farisii. Ọ bụ mmadụ ole na ole ga-anya isi na ha dị ka ndị Farisii.

11. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji chọọ ka e were anyị dị ka ndị Farisii?

11 Site n’ịtụle ihe àmà ndị sitere na Bible na ndị na-esiteghị na Bible, anyị pụrụ ikwubi na ndị Farisii buliri onwe ha elu dị ka ndị na-ahụ maka ọdịmma nke ọha na eze na nke mba. O jughị ha afọ na Iwu Chineke doro anya ma dị mfe nghọta n’ụzọ bụ́ isi. N’ebe ọ bụla Iwu ahụ yiri ha ka ọ kapịghị okwu ọnụ, ha na-achọ ịgbakwụnye nkọwa nke aka ha iji mee ka ọ ghara ịdị mmadụ mkpa iji akọ na uche ya mee ihe. Ndị ndú okpukpe a nwara iti iwu ga na-achịkwa omume n’ihe nile, ọbụna n’ihe ndị dị nta. *

12. Olee otú ndị Farisii si lee onwe ha anya?

12 Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ bụ́ Josephus mere ka o doo anya na ndị Farisii weere onwe ha dị ka ndị dị obiọma, ndị dị nwayọọ, ndị na-ekpe ikpe ziri ezi, na ndị ruru eru n’ozuzu ha maka ọrụ ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha dịtụ otú ahụ. Nikọdimọs pụrụ ịgbabata gị n’uche. (Jọn 3:1, 2; 7:50, 51) Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha gbasoro ụzọ ndị Kraịst. (Ọrụ 15:5) Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere banyere ndị Juu ụfọdụ, dị ka ndị Farisii, sị: “Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” (Ndị Rom 10:2) Otú ọ dị, Oziọma ndị ahụ kọwara ha dị ka ndị nkịtị si hụ ha—ndị mpako, ndị nganga, ndị ezi omume n’anya onwe ha, ndị na-achọpụtakarị mmejọ, ndị nkatọ, na ndị nlelị.

Echiche Jisọs

13. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ndị Farisii?

13 Jisọs katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị ka ndị ihu abụọ. “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha.” Ee, ibu ahụ dị arọ, yoke a tụkwasịkwara n’olu ndị ahụ bụkwa nke na-egbu mgbu. Jisọs gara n’ihu ịkpọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii “ndị nzuzu.” Onye nzuzu bụụrụ obodo ya ihe mkpasu iwe. Jisọs kpọkwara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii “ndị ndú ìsì” ma kwuo na ha “ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe.” Ònye ga-achọ ka Jisọs were ya dị ka onye Farisii?—Matiu 23:1-4, 16, 17, 23.

14, 15. (a) Gịnị ka otú Jisọs si mesoo Matiu Livaị ihe na-ekpughe banyere ụzọ ndị Farisii? (b) Olee ihe ndị dị mkpa anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ a?

14 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile na-agụ Oziọma ndị ahụ pụrụ ịhụ otú ihe ka ọtụtụ ná ndị Farisii dịruru ná njọ. Mgbe Jisọs kpọsịrị Matiu Livaị, onye ọna ụtụ, ịbụ onye na-eso ụzọ ya, Livaị siere ya nri ukwu. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha wee tamuwe imegide ndị na-eso ụzọ Ya, sị, N’ihi gịnị ka unu na-eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie ndị a na-eri ihe? Jisọs wee zaa, sị ha, . . . Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ọ bụ ndị mmehie ka ha chegharịa.”—Luk 5:27-32.

15 Livaị n’onwe ya ghọtara ihe ọzọ Jisọs kwuru n’oge ahụ: “Ma gaanụ mụta ihe okwu a bụ, Ana m achọ ebere, ọ bụghị àjà.” (Matiu 9:13) Ọ bụ ezie na ndị Farisii zọọrọ na ha kweere n’ihe ndị amụma Hibru dere, ha anakwereghị ihe a e kwuru na Hosea 6:6. Ọ bụrụ na ha gaje ịda iwu, ha na-ejide n’aka na ọ gaghị abụ iwu ọdịnala. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya, sị, ‘À maara m dị ka onye na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ nduzi ụfọdụ, dị ka ndị na-egosipụta echiche onwe onye ma ọ bụ ụzọ nkịtị e si ele ihe anya? Ka ihe mbụ ndị ọzọ ji mara m ọ̀ bụ onye ebere na ezigbo mmadụ?’

16. Gịnị ka e ji mara ndị Farisii, oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ịdị ka ha?

16 Nkatọ, nkatọ, nkatọ. Nke ahụ bụ ihe e ji mara ndị Farisii. Ndị Farisii na-achọ ihe ọ bụla a na-emezighị emezi—ndị a na-emezighị emezi n’ezie ma ọ bụ ndị ha chere na e mezighị ha emezi. Ha na-etinye ndị mmadụ n’ọnọdụ ịgọchitere onwe ha ma na-echetara ha ebe ndị ha kụrụ afọ n’ala. Ndị Farisii ji inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ahịhịa ndị dịkarịsịrị nta, dị ka mkpa akwụkwọ na-esi ísì ụtọ, anise, na cummin nyaa isi. Ha mere ka a hụ ime nsọ nsọ ha site n’ejiji ha ma nwaa iduzi mba ahụ. N’ezie, ọ bụrụ na omume anyị gaje ikwekọ n’ihe nlereanya Jisọs, anyị aghaghị izere àgwà nke ịdị na-achọpụta na ịdị na-eme ka a hụ ntụpọ nke ndị ọzọ mgbe nile.

Olee Otú Jisọs Si Dozie Nsogbu?

17-19. (a) Kọwaa otú Jisọs si mee ihe banyere ọnọdụ nke pụrụ ịrụpụtawo ihe dị oké njọ. (b) Gịnị mere ka ọnọdụ ahụ bụrụ nke na-arụgide arụgide na nke na-adịghị mma? (ch) A sị na ị nọ ebe ahụ mgbe nwanyị ahụ gakwuuru Jisọs, olee otú ị gaara esiwo meghachi omume?

17 Ụzọ Jisọs si edozi nsogbu dị nnọọ iche na nke ndị Farisii. Tụlee otú Jisọs si mee ihe banyere ọnọdụ nke pụrụ ịdịwo oké njọ. O metụtara otu nwanyị nke nweworo oruru ọbara ruo afọ 12. Ị pụrụ ịgụ ihe ndekọ ahụ na Luk 8:42-48.

18 Ihe ndekọ Mak na-ekwu na nwanyị ahụ ‘tụrụ egwu, maakwa jijiji.’ (Mak 5:33) N’ihi gịnị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’ihi na ọ maara na o mebiwo Iwu Chineke. Dị ka Levitikọs 15:25-28 si kwuo, nwanyị ọbara ya na-adịghị eru ka e si kee ya bụ onye rụrụ arụ ruo ogologo oge oruru ọbara ahụ ga-adịru, nakwa otu izu. Ihe ọ bụla o metụrụ aka na onye ọ bụla ahụ ya na ya metụrụ na-arụkwa arụ. Iji gakwuru Jisọs, nwanyị a aghaghị isi n’etiti ìgwè mmadụ gafee. Mgbe anyị lere ihe ndekọ ahụ anya n’afọ 2,000 ka o mesịrị, anyị na-enwere ya ọmịiko maka ahụ erughị ala ya.

19 Ọ bụrụ na ị nọ ya n’ụbọchị ahụ, olee otú ị gaara esiwo lee ọnọdụ ahụ anya? Gịnị ka ị gaara ekwuwo? Rịba ama na Jisọs mesoro nwanyị a ihe n’ụzọ obiọma, ịhụnanya, na nchebara echiche, n’ekwughịdị banyere nsogbu ọ bụla ọ pụrụ ịkpatawo.—Mak 5:34.

20. Ọ bụrụ na ihe dị na Levitikọs 15:25-28 bụ ihe a chọrọ n’aka mmadụ taa, olee ihe ịma aka anyị ga-eche ihu?

20 Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe a merenụ? Were ya na ị bụ okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst taa. Werekwa ya na Levitikọs 15:25-28 bụ ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst taa nakwa na nwanyị bụ́ onye Kraịst emebiwo iwu ahụ, na-enwe mmetụta nke ịbụ onye ụjọ ji na onye a gbahapụrụ agbahapụ. Ị̀ ga-esi aṅaa meghachi omume? Ị̀ ga-eji ndụmọdụ nkatọ wedaa ya ala n’ihu ọha? “Mbanụ,” ka ị ga-asị, “agaghị m eme otú ahụ ma ọlị! N’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, aga m eme mgbalị nile iji gosi ya obiọma, ịhụnanya, na nchebara echiche.” Nke ahụ amaka! Ma ihe ịma aka dị na ya bụ ime ya eme, iṅomi ihe nlereanya Jisọs.

21. Gịnị ka Jisọs kụziiri ndị mmadụ banyere Iwu ahụ?

21 N’ụzọ bụ́ isi, ndị mmadụ nwere mmetụta na Jisọs mere ka ha zuru ike, wulie ha elu ma gbaa ha ume. Ebe Iwu Chineke kapịrị okwu ọnụ, ọ bụ ihe e kwuru na ya ka e bu n’obi. Ọ bụrụ na o yiri ka ọ kapịghị okwu ọnụ, ha na-ejikwu akọ na uche ha mee ihe, ha pụkwara igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ site ná mkpebi ha. Iwu ahụ nyere ha ohere imesara ahụ. (Mak 2:27, 28) Chineke hụrụ ndị ya n’anya, rụọ ọrụ n’esepụghị aka maka ọdịmma ha, ma dị njikere imere ha ebere mgbe ha dara. Otú ahụ ka Jisọs dị.—Jọn 14:9.

Ihe Ndị Si n’Ozizi Jisọs Pụta

22. Ịmụta ihe n’ọnụ Jisọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka inwe àgwà dị aṅaa?

22 Ndị gere Jisọs ntị ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya nwere ekele maka ịbụ eziokwu nke okwu ya bụ́: “Yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:30) Ọ dịtụghị mgbe ọ dị ha ka ọ na-ebogbu ha, na-amaja ha, ma ọ bụ na-agwa ha okwu gabiga ókè. Ha nwekwuuru onwe ha, nwekwuo obi ụtọ na obi ike banyere mmekọrịta ha na Chineke na nke ha na ibe ha. (Matiu 7:1-5; Luk 9:49, 50) Ha si n’aka ya mụta na ịbụ onye ndú ime mmụọ na-achọ n’aka mmadụ ime ka ndị ọzọ zuru ike, igosipụta obi umeala.—1 Ndị Kọrint 16:17, 18; Ndị Filipaị 2:3.

23. Olee ihe dị mkpa nke iso Jisọs nọrọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa nkwubi okwu nke ahụ nyeere ha aka iru?

23 Ọzọkwa, ịdị mkpa nke ịnọgide soro Kraịst na-adị n’otu na ịnakwere àgwà o gosipụtara kpaliri mmasị ọtụtụ ndị. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Dị ka Nna m hụrụ m n’anya, Mụ onwe m hụkwara unu n’anya: nọgidenụ n’ime ịhụnanya m. Ọ bụrụ na unu edebe ihe nile M nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m; dị ka Mụ onwe m debeworo ihe nile Nna m nyere n’iwu, nọgidekwa n’ịhụnanya Ya.” (Jọn 15:9, 10) Ọ bụrụ na ha gaje inwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị ozi na ndị ohu Chineke, ha aghaghị iji ịdị uchu na-etinye ihe ha mụtara n’ọnụ Jisọs n’ọrụ, ma n’ime nkwusa ma n’izi ozi ọma dị ebube nke Chineke n’ihu ọha nakwa n’otú ha si emeso ndị ezinụlọ ha nakwa ndị enyi ha ihe. Ka òtù ụmụnna na-amụba ịghọ ọgbakọ, ọ ga-adị ha mkpa ichetara onwe ha ugboro ugboro na ụzọ ya bụ ụzọ ziri ezi. Ihe ọ kụziri bụ eziokwu, ụdị ndụ ha hụrụ na o biri bụkwa n’ezie ụdị ndụ e kwesịrị ịchọsi ike ibi.—Jọn 14:6; Ndị Efesọs 4:20, 21.

24. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi site n’ihe nlereanya Jisọs?

24 Ka ị na-atụgharị uche ugbu a n’ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị nọworo na-atụle, ị̀ hụrụ ụzọ ndị ị ga-esi meziwanye ihe? Ì kweere na Jisọs chere echiche, zie ihe, ma mee omume n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe nile? Ọ bụrụ otú ahụ, kara obi. Okwu agbamume ọ gwara anyị bụ: “Ọ bụrụ na unu matara ihe ndị a, ngọzi na-adịrị unu ma a sị na unu na-eme ha.”—Jọn 13:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 “E mere ka ọdịiche ahụ bụ́ isi [nke dị n’etiti Jisọs na ndị Farisii] pụta ìhè nanị site n’iburu n’uche nghọta abụọ na-emegiderịta onwe ha e nwere banyere Chineke. Nye ndị Farisii, Chineke bụ n’ụzọ bụ́ isi onye na-enye iwu; nye Jisọs, ọ bụ onye na-eme amara na onye ọmịiko. N’ezie, onye Farisii adịghị agọnahụ ịdị mma na ịhụnanya nke Chineke, ma nye ya, e gosipụtara ha n’onyinye nke Tora [Iwu] nakwa n’ikwe omume nke idebe iwu e nyere na ya. . . . Ndị Farisii hụtara ịgbaso ọdịnala a na-edeghị ede, tinyere ụkpụrụ nduzi ya maka ịkọwa iwu ahụ, dị ka ụzọ isi mezuo ihe e dere na Tora. . . . Mbuli Jisọs buliri iwu abụọ nke ịhụnanya (Mat. 22:34-40) elu ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịbụ ụkpụrụ a nakweere maka inye nkọwa na ọjụjụ ọ jụrụ ọdịdị ekweghị mmadụ megharịa ahụ nke iwu ahụ e nyere n’ọnụ . . . dugara ya n’imegide nkọwa ndị Farisii na-enye n’ihe ndị e kwesịrị iji akọ na uche kpebie.”—The New International Dictionary of New Testament Theology.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs pụtara nye gị?

• Olee otú Jisọs si mesoo ndị mmadụ ihe?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si zie ihe?

• Olee otú Jisọs si dị iche n’ebe ndị Farisii nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Lee ka àgwà Jisọs kpasoro ndị mmadụ si dị iche na nke ndị Farisii!