Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Afọ Ofufo Akpọta Ndị Mmadụ na Gilead

Mmụọ Afọ Ofufo Akpọta Ndị Mmadụ na Gilead

Mmụọ Afọ Ofufo Akpọta Ndị Mmadụ na Gilead

E GUZOBERE Watchtower Bible School of Gilead iji zụọ ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye maka ije ozi ala ọzọ ná mba na-abụghị nke ha. Olee ndị na-abịa Gilead? Ọ bụ ndị nwere mmụọ afọ ofufo. (Abụ Ọma 110:3) N’ezie nke ahụ pụtara ìhè na September 8, 2001, bụ́ mgbe klas nke 111 gụsịrị akwụkwọ.

Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ nke klas ahụ ejiworị ọchịchọ obi ha hapụ ezinụlọ, ndị enyi, na mba ha iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. N’ime otú ahụ, ha nwalere onwe ha iji hụ ma ha nwere ike ime mgbanwe iji biri n’ebe dịtụ iche. Dị ka ihe atụ, Richer na Nathalie haziri ihe omume ha iji gaa Bolivia, Todd na Michelle mere otú ahụ iji gaa Dominican Republic, David na Monique mekwara otú ahụ iji gaa n’otu mba dị n’Esia iji zisaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ejeelarị ozi na Nicaragua, Ecuador, na Albania.

A gbara Christy ume ịmụ asụsụ Spanish n’ụlọ akwụkwọ kọleji, na-enye aka ịkwadebe ya ịnọ afọ abụọ n’Ecuador tupu ya alụọ di. Ndị ọzọ sonyeere ọgbakọ ndị ji asụsụ mba ọzọ eme ihe ná mba ha. N’iche ihe ịma aka dị iche ihu, Saul na Priscilla gosipụtara mmụọ afọ ofufo site n’ịrụsi ọrụ ike iji mụtakwuo asụsụ Bekee tupu ha abịa ụlọ akwụkwọ ahụ.

Izu 20 e ji nye ha ọzụzụ n’ozi ala ọzọ gwụrụ ngwa ngwa. Ụbọchị ngụsị akwụkwọ ruru, ụmụ akwụkwọ ahụ na ndị enyi na ndị ezinụlọ ha nọkwa na-ege ntị na ndụmọdụ amamihe dị na ha na okwu agbamume ndị e ji sị ha gaa nke ọma.

Onyeisi oche nke usoro ihe omume ahụ bụ Theodore Jaracz, onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Okwu mmeghe ya kọwapụtara eziokwu ahụ bụ́ na dị ka òtù, anyị ahapụbeghị nzube e ji azụ ụmụ akwụkwọ na Gilead, ya bụ, iji kwusaa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mak 13:10) Gilead na-akwadebe ụmụ akwụkwọ ndị ruru eru ịrụ ọrụ nkwusa a n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa ka ha rụworo n’oge gara aga nakwa n’akụkụ ụwa ebe a chọrọ ndị ozi ala ọzọ a zụrụ azụ karịsịa. Nwanna Jaracz dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ka ha jiri ọzụzụ e nyere ha na Gilead mee ihe nke ọma ka ha na-esonyeziri ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi ugbu a ná mba 19 bụ́ ebe ndị e kenyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ọrụ.

Ndụmọdụ Bịara n’Ezi Oge Maka Ndị ahụ Na-agụsị Akwụkwọ

Usoro isiokwu sochiri. William Van De Wall, onye so na Kọmitii Alaka nke United States kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ịnụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Ala Ọzọ—Ihe E Ji Amata Ezi Ndị Kraịst.” O lekwasịrị anya n’ọrụ ahụ e nyere bụ́ ‘ime ndị na-eso ụzọ,’ bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 28:19, 20, ọ gbakwara ụmụ akwụkwọ ahụ ume, sị: “Ṅomienụ Jisọs, bụ́ onye ji ịnụ ọkụ n’obi na ikpo ọkụ rụọ ọrụ ozi ala ọzọ ya.” Iji nyere ndị ahụ gaje ịbụ ndị ozi ala ọzọ aka ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi maka ọrụ ozi ala ọzọ, ọ gbara ha ume, sị: “Nweenụ usoro ihe omume unu ga-agbasoli; nọgidenụ na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye dị mma, na-enweta ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ n’ihe ndị metụtara ọchịchị Chineke; na-ebukwanụ n’uche mgbe nile ihe mere unu ji nọrọ n’ebe e kenyere unu ọrụ.”

Onye ọzọ kwuru okwu n’usoro ihe omume ahụ bụ Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nọgidenụ Na-azụlite ‘Ikike Iche Echiche Unu.’” (Ndị Rom 12:1, NW) O nyere klas ahụ na-agụsị akwụkwọ ndụmọdụ dị irè, na-agba ha ume iji ikike iche echiche na nke ịtụgharị uche Chineke nyere ha na-eme ihe. “Nọgidenụ na-echebara ihe Jehova na-agwa unu site n’Okwu ya echiche nke ọma. Nke a ga-echebe unu,” ka o kwuru. (Ilu 2:11) Nwanna Pierce dụkwara klas ahụ ọdụ ka ha ghara ịdị na-esi ọnwụ n’echiche nke ha iji ghara igbochi ‘ikike iche echiche’ ha. N’ezie, ihe ncheta ndị a bịara n’oge ha ga-enyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka ka ha na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ.

Onye ọzọ onyeisi oche ahụ kpọpụtara bụ otu n’ime ndị nkụzi Gilead, bụ́ Lawrence Bowen, onye kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Kpebienụ na Unu Agaghị Ama Ihe Ọ Bụla.” O kwuru na n’ihe banyere ọrụ ozi ala ọzọ Pọl onyeozi rụrụ na Kọrint, o ‘kpebiri na ọ gaghị ama ihe ọ bụla ma e wezụga Jisọs Kraịst, bụ́kwa onye a kpọgidere n’osisi.’ (1 Ndị Kọrint 2:2, NW) Pọl maara na ikike kasịnụ n’eluigwe na n’ala, bụ́ mmụọ nsọ, na-akwado ozi e ziri n’akụkụ dum nke Bible: iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’aka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 3:15) A gbara ụmụ akwụkwọ 48 ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha dị ka Pọl na Timoti ma nwee ihe ịga nke ọma dị ka ndị ozi ala ọzọ, na-ejigide “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ.”—2 Timoti 1:13.

“Jiri Ihe Ùgwù Gị Kpọrọ Ihe, Onyinye Si n’Aka Chineke” bụ isiokwu nke okwu ikpeazụ nke usoro isiokwu nke okwu mmeghe. Wallace Liverance, bụ́ onye na-edebanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, nyeere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka ịghọta na ihe ùgwù ije ozi dị iche iche bụ ngosipụta nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, ọ bụghị ihe ruuru ha ma ọ bụ ihe ha rụtara. N’iji ihe nlereanya nke Pọl onyeozi mee ihe, Nwanna Liverance kwuru, sị: “Ọ bụghị ọrụ kpebiri nhọrọ Jehova họọrọ Pọl ịbụ onyeozi nye mba nile, dị ka a ga-asị na Pọl rụtara ikike ije ozi ahụ n’ọrụ ma ọ bụ na ọ bụ ihe e ji ya n’ụgwọ. Ọ dabereghị n’afọ ole o jeruru ozi ma ọ bụ n’ahụmahụ o nwere. Dị ka mmadụ si ele ihe anya, ọ pụrụ iyiwo ka Banabas ọ ga-abụ onye e kwesịrị ịhọrọ. Ọ dabereghị n’ikike onwe onye; o doro anya na Apọlọs bụ ọkà n’ikwu okwu karịa Pọl. Ọ bụ ngosipụta nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (Ndị Efesọs 3:7, 8) Nwanna Liverance gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha jiri onyinye ha, ma ọ bụ ihe ùgwù ije ozi ha, nyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị enyi Chineke na ndị ga-enweta “onyinye amara nke Chineke [bụ́] ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

Mgbe nke a gasịrị, Mark Noumair, bụ́ onye nkụzi ọzọ nke Gilead, duziri okwu na-ekpo ọkụ nke ya na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ kwurịtara n’isiokwu bụ́ “Ime Nkwadebe Na-arụpụta Ezi Ihe.” (Ilu 21:5) Ahụmahụ ndị e nwere gosiri na mgbe onye ozi kwadebere nke ọma maka ozi, karịsịa site n’ịkwadebe obi ya, ọ ga-enwe ezi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọ gatụghị eche ihe ọ ga-ekwu eche. Kama nke ahụ, ọ ga-ekwu ma mee ihe iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. “Nke a bụ isi ihe na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma dị ka onye ozi ala ọzọ,” ka Nwanna Noumair kwuru, na-ekwu site n’ahụmahụ ya onwe ya nwere dị ka onye ozi ala ọzọ n’Africa.

Ozi Ala Ọzọ—Ọrụ Na-eju Afọ

Ralph Walls na Charles Woody gbara ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nwere ahụmahụ, bụ́ ndị nọ n’Ebe Agụmakwụkwọ Patterson maka ọzụzụ pụrụ iche, ajụjụ ọnụ. Ajụjụ ọnụ ndị ahụ mesiri ya ike na ọ bụ ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ na-eme ka e nwee ọṅụ n’ozi ala ọzọ. Ọ bụ ihe na-emesighachi obi ike nye ụmụ akwụkwọ ahụ nakwa ndị ezinụlọ na ndị enyi ha bụ́ ndị so na-ege ntị, ịnụ ka ndị ozi ala ọzọ a nwere ahụmahụ ji ọnụ ha akọwa ihe mere ozi ala ọzọ ji bụrụ ọrụ na-eju afọ.

John E. Barr, bụ́ onye na-eje ozi n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu bụ́ isi nke ụbọchị ahụ, nke isiokwu ya bụ “Bụkuonụ Jehova Abụ Ọhụrụ.” (Aịsaịa 42:10) Nwanna Barr kwuru na okwu ahụ bụ́ “abụ ọhụrụ” pụtara ugboro itoolu na Bible. Ọ jụrụ, sị, “Gịnịdị bụ abụ ọhụrụ a?” Mgbe ahụ, ọ zara, sị: “Ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu na-ekpughe na a na-abụ abụ ọhụrụ n’ihi ihe ọhụrụ ndị na-eme n’ojiji Jehova na-eji ọbụbụeze ya eme ihe.” Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha nọgide na-etinye ọnụ n’ịbụ abụ ndị e ji eto Alaeze Chineke nke na-enwe mmeri bụ́ nke dị n’aka Eze Mesaịa ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs. Nwanna Barr kwuru na ọzụzụ ha nataworo na Gilead enyeworo ha aka ịghọta akụkụ dịgasị iche iche nke “abụ ọhụrụ” a n’ụzọ miri emi karịa mgbe ọ bụla ọzọ. “Ụlọ akwụkwọ a emesiwo ike mkpa ọ dị unu isonyere ụmụnna unu ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ebe ọ bụla unu ga-aga ‘na-abụ abụ’ otuto Jehova; soronụ ndị ọzọ na-adị n’otu mgbe nile.”

Mgbe e nyesịrị ụmụ akwụkwọ ahụ diplọma ha, onye na-ekwuchitere klas ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ekele sitere n’obi maka ọzụzụ ha nataworo na Gilead.

Ị̀ pụrụ ịmụba ozi ị na-ejere Chineke ma mee ka ọ na-amịpụtakwu mkpụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, rụsie ọrụ ike dị ka ụmụ akwụkwọ a na-agụsị akwụkwọ meworo. Nke a bụ ihe nyere aka mee ka ha ruo eruo ịrụ ọrụ n’ubi ala ọzọ. Mmadụ na-enweta ọṅụ dị ukwuu mgbe o ji obi ụtọ nye onwe ya n’afọ ofufo n’ozi Chineke.—Aịsaịa 6:8.

[Igbe dị na peeji nke 25]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 19

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ ha: 33.2

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.8

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.6

[Foto dị na peeji nke 26]

Klas nke 111 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Yeomans, C.; Toukkari, A.; Nuñez, S.; Phillips, J.; Dawkin, M.; Silvestri, P. (2) Morin, N.; Biney, J.; López, M.; Van Hout, M.; Cantú, A.; Szilvassy, F. (3) Williams, M.; Itoh, M.; Van Coillie, S.; Levering, D.; Fuzel, F.; Geissler, S. (4) Yeomans, J.; Moss, M.; Hodgins, M.; Dudding, S.; Briseño, J.; Phillips, M. (5) López, J.; Itoh, T.; Sommerud, S.; Kozza, C.; Fuzel, G.; Moss, D. (6) Williams, D.; Dudding, R.; Geissler, M.; Morin, R.; Biney, S.; Cantú, L. (7) Dawkin, M.; Hodgins, T.; Levering, M.; Silvestri, S.; Van Hout, D.; Briseño, A. (8) Van Coillie, M.; Nuñez, A.; Kozza, B.; Sommerud, J.; Toukkari, S.; Szilvassy, P.