Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne Na Nna—Gboonụ Mkpa Ụmụ Unu!

Ndị Nne Na Nna—Gboonụ Mkpa Ụmụ Unu!

Ndị Nne Na Nna—Gboonụ Mkpa Ụmụ Unu!

NDUZI na ịdọ aka ná ntị ịhụnanya dị ụmụaka mkpa, karịsịa site n’aka ndị mụrụ ha. N’akụkụ a, otu onye Brazil bụ́ onye nkụzi, bụ́ Tania Zagury, na-ekwu, sị: “Àgwà nke nwatakịrị ọ bụla bụ ịchọ ihe ụtọ. Ọ dị mkpa ịkpara ha ókè. Ọ bụ ndị nne na nna ga-eme nke a. Ọ bụrụ na ha emeghị ya, ụmụ ha agaghị ekwe nchịkwa.”

Otú ọ dị, n’ọtụtụ ala, mmetụta nke ọha mmadụ na-anabata ihe nile nke ji onye ọ bụla imere otú masịrị ya kpọrọbiga ihe ókè pụrụ ime ka o sie ike ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị n’elu. Ebeezi ka ndị nne na nna pụrụ ịga maka enyemaka? Ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke na-aghọta na ụmụ ha bụ “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa.” (Abụ Ọma 127:3) N’ihi ya, ha na-elegara Okwu Chineke, bụ́ Bible, anya maka nduzi n’ịzụlite ha. Dị ka ihe atụ, Ilu 13:24 na-asị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.”

E kwesịghị ịghọta ojiji Bible ji okwu bụ́ “mkpanaka” mee ihe ịpụta nanị inye ntaramahụhụ nkịtị; ọ na-anọchi anya ụzọ e si enye mgbazi, n’agbanyeghị ụdị ọ pụrụ ịbụ. N’ezie, mgbe mgbe, okwu ọnụ pụrụ ịbụ nanị ihe dị mkpa iji gbazie nwata na-ehie ụzọ. Ilu 29:17 na-asị: “Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka i zuo ike; ee, ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ.”

Ịdọ aka ná ntị ịhụnanya dị ụmụaka mkpa ka ha wee kwụsị àgwà ọjọọ. Mgbazi dị otú ahụ e mere n’obiọma na n’ụzọ kwụsiri ike na-enye ihe àmà na nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya. (Ilu 22:6) Ya mere, ndị nne na nna, obi adala unu mbà! Site n’ịgbaso ndụmọdụ bụ́ ịgba ma dị irè nke dị na Bible, unu ga-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ ma mee ka ụmụ unu na-akwanyere unu ùgwù.