Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Henry nke Asatọ na Bible

Henry nke Asatọ na Bible

Henry nke Asatọ na Bible

N’AKWỤKWỌ ya bụ́ History of the English-Speaking Peoples (Mpịakọta nke 2), Winston Churchill dere, sị: “N’ihe banyere nkwenkwe okpukpe, Ndozigharị ahụ wetara mgbanwe dị ukwuu. Bible bụzi ebe ọhụrụ a nakweere e si enweta ndụmọdụ bụ́ ịgba nke metụtaworo ihe dị ukwuu. Ọgbọ oge gboo chere na ọ dị ize ndụ bụ́ Ihe Odide Dị Nsọ ịdị n’aka ndị na-amaghị akwụkwọ nakwa na ọ bụ nanị ndị ụkọchukwu kwesịrị ịgụ ya.”

Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu, sị: “Mgbe mbụ e wepụtara Bible zuru ezu e biri ebi, bụ́ nke Tyndal na Coverdale sụgharịrị gaa na Bekee, bụ ná ngwụsị oge mgbụsị akwụkwọ nke 1535, a na-ebipụtakwa ọtụtụ mbipụta ugbu a. Ọchịchị nyere ndị ụkọchukwu ndụmọdụ ka ha na-agba ndị mmadụ ume ịgụ Bible.” Mgbe ọtụtụ narị afọ nke amaghị Bible gasịrị, ndị England gaje ịghọ ndị maara Bible, ma ọ bụ ọchịchị Henry nke Asatọ kpatara nke a ọ bụghị ndị chọọchị. *

“Dị ka a ga-asị na ọ bụ iji merukwuo ndị ahụ nwere echiche mgbe ochie banyere Bible ihe n’ahụ́, na Paris, Ọchịchị nyere ikike ibipụta ọnụ ọgụgụ Bible Bekee buru ibu, bụ́ nke dị ụtọ ọgụgụ karịa mbipụta mbụ, na September 1538 kwa, o nyere iwu na parish nile dị ná mba ahụ ga-azụ otu mpịakọta Bible Bekee kasị ibu, nke a ga-edebe na chọọchị ọ bụla, bụ́ ebe ndị parish pụrụ inweta ya n’ụzọ dị mfe ma gụọ ya. E debere mkpụrụ isii na Katidral St Paul, nke dị na City of London, ìgwè mmadụ na-enubatakwa na katidral ahụ kwa ụbọchị iji gụọ ha, karịsịa, dị ka a gwara anyị, mgbe ha chọtaliri onye na-agụ ihe nke ọma ịgụpụta ya n’olu dara ụda.”

N’ụzọ dị mwute, n’ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị adịghị eji ihe ùgwù ha nwere ịgụ Bible eme ihe mgbe nile. Nke a bụ oké ihe na-akpata nchegbu, ebe ọ bụ nanị Bible bụ akwụkwọ “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Eze Henry nke Asatọ chịrị England site na 1509 ruo 1547.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Henry nke Asatọ: Ihe osise dị na Royal Gallery na Kensington, site n’akwụkwọ bụ́ The History of Protestantism (Mpịakọta nke Mbụ)