Jehova Enyewo “Ike Karịrị Ike Nkịtị”
Akụkọ Ndụ
Jehova Enyewo “Ike Karịrị Ike Nkịtị”
DỊ KA HELEN MARKS SI KỌỌ
Ọ bụ n’ụbọchị anwụ na-achasi ike n’oge okpomọkụ nke 1986. Nanị m nọ n’ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwá ahịa n’otu n’ime ọdụ ụgbọelu ndị na-adịtụghị ekwo ekwo na Europe. Ọ bụ na Tiranë, bụ́ isi obodo Albania, bụ́ nke kwupụtaworo na ya bụ “mba mbụ n’ụwa, nke na-ekweghị na Chineke dị.”
N’ỊBỤ onye na-amaghị ihe ọ ga-eme nke ụjọ jikwa, anọ m na-ele ka otu ọfịsa bu egbe malitere inyocha ibu m. A sị na m mere ma ọ bụ kwuo ihe ọ bụla iji mee ka o nyowe m enyowe, ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịbụ ịchụpụ m ná mba ahụ, tụọkwa ndị nọ n’èzí na-eche m mkpọrọ ma ọ bụ kpụga ha n’ogige ọrụ mmanye. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, abịara m nwee ike ime ka ọfịsa ahụ nwekwuo omume enyi site n’inye ya ụfọdụ chịngọm na ihe nracha. Ma olee otú mụ bụ́ nwanyị nọ n’etiti afọ ndị 60 ya, si banye n’ọnọdụ a? Gịnị mere m ji hapụ ndụ ntụsara ahụ́ ma tinye onwe m n’ihe ize ndụ site n’ịgbalị ime ka ihe ndị metụtara Alaeze gakwuo n’ihu n’otu n’ime ebe Ọchịchị Kọmunist kasị sie ike?
Nwata Na-arịakarị Ọrịa nke Na-ajụkarị Ajụjụ
Afọ abụọ mgbe a mụsịrị m na 1920 na Ierápetra, Krit, nna m nwụrụ n’ihi oyi bara ya n’ahụ́. Mama m dara ogbenye, ọ maghịkwa akwụkwọ. Mụ ka a tọchara n’ime ụmụ anọ, ebe ọ bụkwa na m na-arịa ọrịa akụm, atara m ahụ́ ma yie onye ahụ́ gwụrụ. Ndị agbata obi tụụrụ mama m aro ka o jiri obere ihe ọ na-akpata lekọtawa ụmụ atọ ndị nke ahụ́ ka sie ike ma hapụ m ka m nwụọ. Obi dị m ụtọ na ọ gbasoghị ndụmọdụ ahụ.
Iji jide n’aka na mkpụrụ obi papa m na-ezu ike n’eluigwe, mama m na-aga n’ebe e liri ya mgbe nile, ọ na-akpọrọkarị onye ụkọchukwu Ọtọdọks ga-ekwu okwuchukwu. Otú ọ dị, okwuchukwu ndị ahụ anaghị adị ọnụ ala. Aka m na-echeta otu ụbọchị Krismas oké oyi na-atụ bụ́ mgbe o si n’ebe e liri papa m sekpụrụ m lọta. Anyị ka nyepụrụ onye ụkọchukwu ego nile anyị nwere. Mgbe mama m sisịara anyị bụ́ ụmụaka akwụkwọ nri, ọ bara n’ọnụ ụlọ ọzọ, afọ ya tọgbọ chakoo, anya mmiri nọkwa na-asọda na ntì ya n’ihi obi nkoropụ. Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, akachiri m obi gaa jụọ onye ụkọchukwu ahụ ihe mere papa m ji nwụọ na ihe mere nne m bụ́ ogbenye ga-eji na-akwụ ụkọchukwu ụgwọ. O ji ihere takwụnyere m, sị: “Chineke kpọọrọ ya. Ọ bụ otú ụwa dị. Ọ ga-adịcha mma.”
O siiri m ike ịhụ otú azịza ya na ekpere nke Onyenwe anyị, bụ́ nke m mụtara n’ụlọ akwụkwọ, si kwekọọ. Aka m na-echeta ọmarịcha okwu mmeghe ya nwere nzube: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Ọ bụrụ na Chineke zubere ka e mee uche ya n’ụwa, gịnị mere anyị ga-eji na-atagbu onwe anyị n’ahụhụ?
Ọ fọrọ nke nta ka m nweta azịza nye ajụjụ ahụ mgbe, na 1929, Emmanuel Lionoudakis, bụ́ onye nkwusa oge nile nke Ndịàmà Jehova, bịara n’ebe obibi anyị. * Mgbe nne m jụrụ ya ihe ọ chọrọ, Emmanuel ekwughị ihe ọ bụla kama o nyere ya kaadị ịgba àmà. Mama m nyere m kaadị ahụ ka m gụọ. Ebe ọ bụ na adị m nanị afọ itoolu, aghọtachaghị m ya. N’iche na onye nkwusa ahụ bịara na nke anyị bụ onye ogbi, nne m zaghachiri, sị: “Chei! Ị pụghị ikwu okwu, apụghị m ịgụ ihe.” Mgbe ahụ, o ji obiọma sị ya lawa.
Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, achọtara m azịza ya. Nwanne m nwoke, bụ́ Emmanuel Paterakis, si n’aka otu onye ozi oge nile ahụ nweta akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead? (Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?), nke Ndịàmà Jehova bipụtara. * Mgbe m gụrụ ya, enwetara m ahụ́ efe n’ịmara na Chineke akpọrọghị nna m. Aghọtara m na ọnwụ bụ ihe ezughị okè mmadụ na-akpata nakwa na nna m na-echere mbilite n’ọnwụ baa ná ndụ n’ụwa paradaịs.
“Akwụkwọ A Alawo Gị n’Iyi!”
Eziokwu Bible meghere anya anyị. Anyị chọtara Bible ochie nke papa m nwe ma malite ịmụ ya, mgbe mgbe anyị na-eji ọkụ kandụl amụ ya gburugburu ekwú ọkụ. Ebe ọ bụ na ọ bụ nanị m bụ nwa agbọghọ nọ n’ógbè ahụ nke nwere mmasị na Bible, a gụnyeghị m n’ihe omume nke obere ìgwè Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ. Ruo oge ụfọdụ, ekwenyesiri m ike—ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ na-ezighị ezi—na okpukpe a bụ nanị maka ụmụ nwoke.
Ịnụ ọkụ n’obi nwanne m nwoke nwere n’ọrụ nkwusa bụụrụ m ihe mkpali. O teghị aka ndị uwe ojii amalite ilekwasị ezinụlọ anyị anya n’ụzọ pụrụ iche, na-abịa na nke anyị n’oge nile n’ehihie na abalị ịchọ Emmanuel na akwụkwọ. Ana m echeta nke ọma mgbe onye ụkọchukwu bịara ime ka anyị kwenye ịlaghachi na chọọchị. Mgbe Emmanuel ji Bible gosi ya na aha Chineke bụ Jehova, ụkọchukwu ahụ buuru Bible ahụ n’ike, fee ya n’ihu nwanne m nwoke iji yie ya egwu, ma tie, sị, “Akwụkwọ a alawo gị n’iyi!”
Na 1940, mgbe Emmanuel jụrụ ije agha, e jidere ya ma ziga ya n’ọgbọ agha ndị Albania. Anyị anụghịzi ozi ya ma chee na ọ nwụọla. Otú ọ dị, afọ abụọ mgbe e mesịrị, n’ụzọ anyị na-atụghị anya ya, anyị nwetara akwụkwọ ozi si n’aka ya o si n’ụlọ mkpọrọ zite. Ọ ka dị ndụ, ahụ́ dịkwa ya! Otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị o hotara n’akwụkwọ ozi ahụ adịghị apụ m apụ n’obi kemgbe ahụ: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Lee ka agbamume dị otú ahụ si dị anyị mkpa nke ukwuu!
Site n’ụlọ mkpọrọ ya, Emmanuel gwara ụfọdụ ụmụnna ka ha bịa leta m. Ozugbo, e mere ndokwa ka a na-enwe nzukọ Ndị Kraịst na nzuzo
n’otu ụlọ dị n’ugbo ná mpụga obodo ahụ. Anyị amaghị na a na-ele anyị! Otu Sunday, ndị uwe ojii bu egbe gbara anyị gburugburu. Ha kpọbajuru anyị n’otu gwongworo ma bugharịa anyị n’obodo ahụ dum. Aka m pụrụ ịnụ ka ndị mmadụ na-akwa anyị emo ma na-eme anyị akaje, ma Jehova ji mmụọ ya nye anyị udo nke obi.E bugara anyị n’obodo ọzọ, bụ́ ebe a tụbara anyị n’ọnụ ụlọ nga ndị gbara nnọọ ọchịchịrị ma ruo unyí. Ebe mposi nke ọnụ ụlọ nga m bụ bọket a na-akwafu nsị́ dị na ya otu ugboro n’ụbọchị. A mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa asatọ n’ihi na e weere m dị ka “onye nkụzi” nke ìgwè ahụ. Otú ọ dị, otu nwanna a tụrụ mkpọrọ n’ebe ahụ mere ndokwa ka ọkàiwu ya nyere anyị aka n’okwu ikpe anyị, o mekwara ka a tọhapụ anyị.
Ndụ Ọhụrụ
Mgbe a tọhapụrụ Emmanuel n’ụlọ mkpọrọ, ọ malitere ileta ọgbakọ ndị dị n’Atens dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Akwagara m n’ebe ahụ na 1947. N’ikpeazụ, ezutere m nnukwu ìgwè Ndịàmà—ọ bụghị nanị ndị ikom kamakwa ndị inyom na ụmụaka. N’ikpeazụ, na July 1947, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptizim ime mmiri. Ana m echekarị echiche banyere ịghọ onye ozi ala ọzọ, amalitekwara m ịga ụlọ akwụkwọ uhuruchi iji mụta asụsụ Bekee. Na 1950, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ. Mama m bịara soro m biri, ya onwe ya nakwekwaara eziokwu Bible. Ọ nọgidere bụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ afọ 34 mgbe nke ahụ gasịrị.
N’otu afọ ahụ, ezutere m John Marks (Markopoulos), bụ́ nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe a na-akwanyere ùgwù nke ọma nke si United States. A mụrụ John n’ebe ndịda Albania, mgbe ọ kwagasịkwara United States, ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Na 1950, ọ nọ na Gris na-anwa ịgbata visa o ji aga Albania—nke bụ́ n’oge ahụ, mba jụrụ ịnabata ndị si ala ọzọ nke nọkwa n’okpuru ụdị kasịnụ nke Ọchịchị Kọmunist. Ọ bụ ezie na John ahụbeghị ezinụlọ ya kemgbe 1936, e kweghị ka ọ banye Albania. Oké ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka ozi Jehova na ịhụnanya miri emi o nwere maka òtù ụmụnna metụrụ m n’ahụ́. Anyị lụrụ n’April 3, 1953. E mesịa, eso m ya kwaga n’ụlọ ọhụrụ anyị na New Jersey, U.S.A.
Iji kwadoo onwe anyị ka anyị na-eme nkwusa oge nile, mụ na John nwere obere ihe anyị ji achụta ego n’ikperé mmiri New Jersey, anyị na-esiri ndị ọkụ azụ̀ nri ụtụtụ. Anyị na-esi ya nanị n’oge okpomọkụ, site n’isi ụtụtụ ruo elekere 9:00 nke ụtụtụ. Site n’ime ka ndụ anyị dị mfe ma na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ, anyị bịara nwee ike iji ihe ka ukwuu n’oge anyị rụọ ọrụ nkwusa. N’afọ ndị gafeworonụ, a gwara anyị ịkwaga n’obodo dịgasị iche iche e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa. N’ebe ndị ahụ, site n’enyemaka Jehova, anyị nyeere ndị nwere mmasị aka, guzobe ọgbakọ dị iche iche, nyekwa aka wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche.
Inyere Ụmụnna Anyị Nọ ná Mkpa Aka
Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, anyị nwetara atụmanya na-akpali akpali. Ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ chọrọ iso Ndị Kraịst ibe anyị bi n’ala ndị dị na Balkan, bụ́ ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu, na-enwe nkwurịta okwu. Ruo ọtụtụ afọ, e kewapụrụ Ndịàmà Jehova bi ná mba ndị ahụ n’ebe òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nọ, ha na-enweta obere nri ime mmụọ ma ọ bụdị ghara inweta enweta, a na-emegidekwa ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. A na-eche ihe ka ọtụtụ n’ime ha nche n’esepụghị aka, ọtụtụ nọkwa n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ọrụ mmanye. Mbipụta ndị dabeere na Bible, nduzi, na agbamume dị ha mkpa ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, otu ozi anyị si Albania nweta na-agụ, sị: “Na-ekpekunụ Chineke ekpere n’isi anyị. A na-ejichi akwụkwọ anyị site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ha adịghị ekwe ka anyị mụọ ihe. A tụrụ mmadụ atọ mkpọrọ.”
N’ihi ya, na November 1960, anyị malitere njem were ọnwa isii iji leta ụfọdụ n’ime mba ndị ahụ. O doro anya na “ike karịrị ike nkịtị,” bụ́ obi ike, nkwuwa okwu, na ịdị nkọ nke Chineke 2 Ndị Kọrint 4:7) Ebe mbụ anyị gara bụ Albania. Anyị zụtara ụgbọala nta na Paris ma malite njem. Mgbe anyị rutesịrị Rom, ọ bụ nanị John gbataliri visa maka ịga Albania. Agara m Atens, Gris, ma chere ya.
na-enye, ga-adị anyị mkpa iji rụzuo ọrụ a e ziri anyị ịrụ. (John banyere Albania ná ngwụsị February 1961 ma nọgide ebe ahụ ruo ngwụsị March. Na Tiranë, ya na ụmụnna 30 nọkọrịtara. Lee obi ụtọ ha nwere inweta akwụkwọ na agbamume dị ha mkpa nke ukwuu! Ọ dịbeghị onye si mba ọzọ leta ha ruo afọ 24.
Iguzosi ike n’ezi ihe na ntachi obi nke ụmụnna ahụ kpaliri mmasị John. Ọ nụrụ na a chụrụ ọtụtụ n’ọrụ ma tụọ ha mkpọrọ n’ihi na ha ekereghị òkè n’ihe omume nke mba ahụ nọ n’okpuru Ọchịchị Kọmunist. Ihe metụrụ ya n’ahụ́ karịsịa bụ mgbe ụmụnna nwoke abụọ dị afọ 80 na ụma nyere ya 100 dollar (U.S.) n’onyinye maka ọrụ nkwusa. Ha anọwo na-echekwa ego ruo ọtụtụ afọ site n’obere ụgwọ ezumike nká a na-akwụ ha.
Ụbọchị ikpeazụ John nọrọ n’Albania bụ March 30, 1961—ụbọchị Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs. John kwuuru mmadụ 37 na-ege ntị okwu Ememe Ncheta ahụ. Mgbe okwu ahụ gasịrị, ụmụnna si n’ọnụ ụzọ dị n’ebe azụ kpọpụ John ngwa ngwa ma jiri ụgbọala buga ya n’ọdụ ụgbọ mmiri Durrës, bụ́ ebe ọ nọ banye ụgbọ mmiri ndị ahịa Turkey na-aga Piraiévs (Piraeus), Gris.
Obi dị m ụtọ ịnabataghachi ya n’ahụ́ ọma. Ugbu a, anyị pụrụ ịga n’ihu n’ebe ndị ọzọ fọdụrụnụ na njem anyị dị ize ndụ. Anyị gara ná mba atọ ọzọ dị na Balkan bụ́ ndị machibidoworo ọrụ anyị iwu—ọ bụ ọrụ dị ize ndụ, ebe ọ bụ na anyị bu akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ígwè typewriter, na ihe ndị ọzọ. Anyị nwetara ihe ùgwù nke izute ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị guzosiri nnọọ ike n’ihe bụ́ ndị dị njikere itinye ọrụ ha, nnwere onwe ha, na ọbụna ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi Jehova. Ịnụ ọkụ n’obi na ezi ịhụnanya ha bụ ihe na-akpali akpali. Obi dịkwa anyị ụtọ na Jehova nyere “ike karịrị ike nkịtị.”
Mgbe anyị mesịrị njem anyị n’ụzọ gara nke ọma, anyị laghachiri United States. N’afọ ndị sochirinụ, anyị nọgidere na-eji ụzọ dịgasị iche iche na-eme ihe iji gbalịa iziga akwụkwọ n’Albania na iji nweta akụkọ banyere ozi ụmụnna anyị na-eje.
N’ije Ọtụtụ Mgbe, n’Ihe Ize Ndụ
Ọtụtụ afọ gafere, ọnwụ John na 1981, bụ́ mgbe ọ dị afọ 76, mekwara ka nanị m nọrọ. Nwa nwanne m nwanyị, bụ́ Evangelia, na di ya, bụ́ George Orphanides, ji obiọma kpọbata m, ha enyewokwa m nkwado bara uru n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ dị irè kemgbe ahụ. Ha onwe ha kwa ahụwo nkwado Jehova mgbe ha na-eje ozi n’okpuru mmachibido iwu na Sudan. *
N’ikpeazụ, a gaje ime mgbalị ọhụrụ iji soro ụmụnna anyị nọ n’Albania na-enwe nkwurịta okwu. Ebe ọ bụ na ndị ikwu di m bi ebe ahụ, a jụrụ m ma m ga-ekwe ịga ná mba ahụ. N’ezie aga m ekwe!
Mgbe m mesịrị mgbalị n’esepụghị aka ruo ọtụtụ ọnwa, na May 1986, agbatara m visa n’ụlọ ọrụ onye na-anọchite anya mba Albania n’Atens. Ndị na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba dọsiri m aka ná ntị ike na ọ bụrụ na o nwee ka ihe si gajọọ, na m atụkwala anya inweta enyemaka ná mba ọzọ. Mgbe m gakwuuru onye ọrụ njem ịgbata tiketi ụgbọelu m ji aga Albania, o nyeghị ya ọnụ okwu. N’ekweghị ka ụjọ gbochie m, n’oge na-adịghị anya, anọ m n’ime nanị otu ụgbọelu si Atens aga Tiranë kwa izu. Ọ bụ nanị ndị agadi atọ bụ́ ndị Albania nọ n’otu ụgbọelu ahụ; ha gara Gris maka nsogbu ahụ́ ike.
Ozugbo ụgbọelu ahụ fedara, a kpọbara m n’ime otu ụlọ tọgbọ chakoo nke ndị na-ahụ maka ntụbata na mbupụ ngwá ahịa ji mere ọfịs. Ụmụnne di m nke nwoke na nke nwanyị, ọ bụ ezie na ha abụghị Ndịàmà Jehova, dị njikere inyere m aka ime ka mụ na ụmụnna ole na ole nọ n’ógbè ahụ hụ. Dị ka iwu si kwuo, ha aghaghị ime ka onyeisi ógbè ahụ mara na m bịara. N’ihi ya, ndị uwe ojii lekwasịrị m anya. N’ihi
ya, ndị ikwu m tụrụ aro ka m nọrọ n’ụlọ ha ka ha gaa chọọ mmadụ abụọ n’ime ụmụnna ndị bi na Tiranë ma kpọtara m ha.N’oge ahụ, ọ bụ nanị ụmụnna itoolu raara onwe ha nye ka a maara nọ n’Albania dum. Ọtụtụ afọ nke mmachibido iwu, mkpagbu, na iche nche emewo ka ha dị nnọọ akọ. Ha gbarụrụ ihu. Mgbe m mesịrị ka obi sie ụmụnna abụọ ahụ ike n’ebe m nọ, ajụjụ mbụ ha jụrụ m bụ: “Olee Ụlọ Nche ndị ahụ?” Ruo ọtụtụ afọ, nanị ihe ha nwere bụ akwụkwọ ochie abụọ—ọ bụghịdị Bible.
Ha kọrọ ogologo akụkọ banyere ụzọ obi ọjọọ ọchịchị si na-emegide ha. Ha kọrọ banyere otu nwanna ha hụrụ n’anya bụ́ onye kpebisiri ike ịnọpụ iche ná ntụli aka na-abịanụ. Ebe ọ bụ Ọchịchị ka ihe nile dị n’aka, nke a pụtara na a gaghị ekenye ezinụlọ ya ihe oriri ọ bụla. A ga-atụ ụmụ ya ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na ezinụlọ ha mkpọrọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe gbasara ha na nkwenkwe okpukpe ya. A kọrọ na ndị òtù ezinụlọ nwanna a, n’ihi ụjọ, gburu ya n’abalị bu ụbọchị ntụli aka ahụ ụzọ, tụba ozu ya n’olulu, ma mesịa kwuo na o gburu onwe ya n’ihi ụjọ.
Ụdị ogbenye Ndị Kraịst ibe anyị ahụ dara na-agbawa obi. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe m nwara inye onye nke ọ bụla n’ime ha dollar 20, ha jụrụ, na-asị, “Nanị ihe anyị chọrọ bụ nri ime mmụọ.” Ụmụnna ndị a m hụrụ n’anya ebiwo ndụ ruo ọtụtụ iri afọ n’okpuru ọchịchị aka ike nke nwerela ihe ịga nke ọma n’ime ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi ná mba ahụ ghọọ ndị na-ekweghị na Chineke dị. Ma okwukwe na mkpebisi ike ha kwụ chịm dị ka nke Ndịàmà nọ n’ebe ndị ọzọ. Ikike Jehova nwere inye “ike karịrị ike nkịtị,” ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị taa akpụ, abụrụwo nke a kụnyere n’obi m n’ezie ka ọ na-erule oge m hapụrụ Albania izu abụọ mgbe e mesịrị.
Enwekwara m ihe ùgwù nke ileta Albania ọzọ na 1989 nakwa na 1991. Ka nnwere onwe ikwu okwu na nke okpukpe ji nke nta nke nta na-agbasa ná mba ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-efe Jehova mụbara n’ike. Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta nke Ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ́ ndị nọ n’ebe ahụ na 1986 amụbaala ugbu a ruo ihe karịrị ndị nkwusa 2,200 na-arụsi ọrụ ike. Melpo, bụ́ nwanne di m nke nwanyị, so n’ime ha. À pụrụ inwe obi abụọ ọ bụla na ngọzi Jehova dịkwasịrị ìgwè ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi?
Ebiwo M Ndụ Na-enye Afọ Ojuju Site n’Ike Jehova
Mgbe m leghachiri anya azụ, obi na-esi m ike na ọrụ anyị—nke mụ na John—abụghị ihe efu. Anyị ji ike ntorobịa anyị mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Ọrụ anyị n’ozi oge nile abụrụwo nke nwere nzube karịa ọrụ ọ bụla ọzọ anyị pụrụ ịrụwo. Ana m aṅụrị ọnụ n’isi ọtụtụ ndị anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị anyị nyewooro aka ịmụta eziokwu Bible. Ugbu a m merela agadi, apụrụ m iji obi m dum gbaa ndị na-eto eto ume ‘icheta Onye Okike Ukwu ha n’ụbọchị nile nke ntorobịa ha.’—Eklisiastis 12:1.
N’agbanyeghị na adị m afọ 81, aka m na-eje ozi dị ka onye nkwusa ozi ọma oge nile. Ana m eteta ụra n’oge ma na-agbara ndị nọ n’ebe bọs na-akwụsị, n’ebe ndị a na-adọba ụgbọala, n’okporo ámá, n’ụlọ ahịa, ma ọ bụ n’ogige ntụrụndụ, àmà. Nsogbu nke ịka nká na-emezi ka ndụ na-esiri m ike, ma ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ m na-ahụ n’anya—nnukwu ezinụlọ ime mmụọ m—nakwa ezinụlọ nwa nwanne m nwanyị, egosipụtawo na ha bụ ezigbo ndị nkwado. Karịsịa, amụtawo m na ‘ike karịrị ike nkịtị bụ nke Chineke, ọ bụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.’—2 Ndị Kọrint 4:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Maka akụkọ ndụ Emmanuel Lionoudakis, lee Ụlọ Nche, September 1, 1999, peeji nke 25-29.
^ par. 11 Maka akụkọ ndụ Emmanuel Paterakis, lee Ụlọ Nche, November 1, 1996, peeji nke 22-27.
^ par. 31 Lee 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 91-92, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 25]
N’elu: John, (n’isi isi aka ekpe), mụ onwe m (n’etiti), nwanne m nwoke bụ́ Emmanuel nọ m n’aka ekpe, mama anyị anọrọ ya n’aka ekpe, tinyere ìgwè ndị Betel, Atens, 1950
[Foto dị na peeji nke 25]
N’aka ekpe: Ka mụ na John nọ n’ebe anyị na-ere ihe n’ikperé mmiri New Jersey, 1956
[Foto dị na peeji nke 26]
Mgbakọ distrikti e mere na Tiranë, Albania, 1995
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụlọ Betel, Tiranë, Albania. E wusịrị ya na 1996
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na nwa nwanne m nwanyị, bụ́ Evangelia Orphanidis (n’aka nri) na di ya, bụ́ George
[Foto dị na peeji nke 26]
N’elu: isiokwu si n’otu “Ụlọ Nche” 1940 bụ́ nke a sụgharịrị na nzuzo gaa n’asụsụ Albanian