Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Okenye—Zụọnụ Ndị Ọzọ Ibu Ibu Ahụ

Ndị Okenye—Zụọnụ Ndị Ọzọ Ibu Ibu Ahụ

Ndị Okenye—Zụọnụ Ndị Ọzọ Ibu Ibu Ahụ

N’ỌGBAKỌ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị ikom pụrụ ije ozi n’ọnọdụ nlekọta. E nwere ụzọ ihe atọ bụ́ isi kpatara ya.

Nke mbụ, Jehova na-emezu nkwa ya bụ́ ‘ime ka onye dịkarịsịrị nta ghọọ mba nwere ume.’ (Aịsaịa 60:22) Site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ, e meela ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptizim dị ka Ndịàmà Jehova n’ime afọ atọ gara aga. A chọrọ ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi iji nyere ndị ọhụrụ a e mere baptizim aka itozu okè dị ka Ndị Kraịst.—Ndị Hibru 6:1.

Nke abụọ, ịka nká ma ọ bụ nsogbu ahụ́ ike arụgidewo ụfọdụ ndị jeworo ozi dị ka ndị okenye ruo ọtụtụ iri afọ iwebilata ibu ha na-ebu n’ọgbakọ.

Nke atọ, ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-anụ ọkụ n’obi na-ejezi ozi dị ka ndị so na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ, Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, ma ọ bụ Kọmitii Ụlọ Mgbakọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, iji mee ka ibu ọrụ ha nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, ha aghaghị ịhapụ, ma ọ dịkarịa ala, ụfọdụ n’ime ibu ọrụ ha nwere n’ọgbakọ ha.

Olee otú a pụrụ isi gboo mkpa dị ngwa nke inwetakwu ndị ikom ruru eru? Ọ bụ site n’ọzụzụ. Bible na-agba Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ume ịzụ “ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ga-eru eru nke ọma, n’aka nke ha, ịkụziri ndị ọzọ ihe.” (2 Timoti 2:2) Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ngwaa bụ́ “ịzụ” pụtara “izi ihe iji mee ka e kwesị ekwesị, ruo eruo, ma ọ bụ mara nke a na-akọ.” Ka anyị tụlee otú ndị okenye pụrụ isi zụọ ndị ikom ndị ọzọ ruru eru.

Na-agbasonụ Ihe Nlereanya Jehova

N’ezie, Jizọs Kraịst ‘kwesịrị ekwesị, ruo eruo, ma mara nke a na-akọ’ n’ọrụ ya—ọ bụghịkwa ihe ijuanya! Ọ bụ Jehova Chineke ji aka ya zụọ ya. Olee ihe ndị mere ka usoro ọzụzụ a dị nnọọ irè? Jizọs kwuru ụzọ ihe atọ, dị ka e dekọrọ na Jọn 5:20: “Nna m [1] nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe Ọkpara ya nọ, [2] na-egosikwa ya ihe nile ya onwe ya na-eme, ọ ga-egosikwa ya [3] ọrụ ndị ka ndị a ukwuu.” Inyocha nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị a ga-eme ka a ghọta okwu banyere ọzụzụ.

Rịba ama na ihe mbụ Jizọs kwuru bụ: “Nna m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe Ọkpara ya nọ.” Site ná mmalite okike, Jehova na Ọkpara ya nwere mmekọrịta chiri anya. Ilu 8:30 na-eme ka a ghọtakwuo mmekọrịta ahụ: “Anọkwa m [Jizọs] n’akụkụ Ya [Jehova Chineke], dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Jizọs enweghị obi abụọ na ya bụ ‘ihe na-atọ Jehova ụtọ.’ Jizọs ezochighịkwa ọṅụ o nwere mgbe ọ na-arụ ọrụ n’akụkụ Nna ya. Lee ka o si amagbu onwe ya mgbe ndị okenye na ndị ha na-azụ nwere mmekọrịta na-ekpo ọkụ ma ghere oghe!

Ihe nke abụọ Jizọs kwuru bụ na Nna ya “na-egosikwa ya ihe nile ya onwe ya na-eme.” Okwu ndị a na-akwado ihe e kwuru n’Ilu 8:30, nke bụ́ na Jizọs ‘nọ n’akụkụ’ Jehova mgbe a na-eke eluigwe na ala. (Jenesis 1:26) Ndị okenye pụrụ ịgbaso ihe nlereanya ahụ magburu onwe ya site n’iso ndị ohu na-eje ozi na-arụkọchi ọrụ anya, na-egosi ha otú ha ga-esi na–arụ ọrụ ha n’ụzọ dị mma. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị a họpụtara ọhụrụ dị ka ndị ohu na-eje ozi ka ọ dị mkpa ka a na-enye ọzụzụ n’ụzọ na-aga n’ihu. Gịnị banyere ụmụnna nwoke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọworo na-agbalị iru eru maka ọrụ onye nlekọta ruo ọtụtụ afọ ma a họpụtabeghị ha? (1 Timoti 3:1) Ndị okenye kwesịrị inye ndị ikom dị otú ahụ ndụmọdụ a kapịrị ọnụ ka ha wee mara ebe ndị ha ga-emeziwanye ihe.

Dị ka ihe atụ, ohu na-eje ozi pụrụ ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, onye na-abịa n’oge, na onye ji nlezianya arụ ọrụ ya. Ọ pụkwara ịbụ ezigbo onye ozizi. N’ọtụtụ akụkụ, ọ pụrụ ịdị na-arụ ọrụ bụ́ ịgba n’ọgbakọ. Otú ọ dị, o nwere ike ọ maghị na ọ na-adị eji aka ike emeso Ndị Kraịst ibe ya ihe. Ọ dị ndị okenye mkpa igosipụta “ịdị nwayọọ nke dịịrị amamihe.” (Jems 3:13) Ọ́ gaghị abụ igosipụta obiọma bụ́ onye okenye ịgwa ohu na-eje ozi ahụ okwu, na-akọwara ya nsogbu ahụ n’ụzọ doro anya, na-enye ya ihe atụ ndị a kapịrị ọnụ, ma na-atụ aro ndị dị irè maka imeziwanye ihe? Ọ bụrụ na onye okenye ahụ ejiri nlezianya ‘mee ka ndụmọdụ ya bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ,’ o yiri ka a ga-anabata okwu ya nke ọma. (Ndị Kọlọsi 4:6) N’ezie, ohu na-eje ozi ahụ ga-eme ka ọrụ onye okenye ahụ dịkwuo mfe site n’ige ntị nke ọma na ịnabata ndụmọdụ ọ bụla e nyere ya.—Abụ Ọma 141:5.

N’ọgbakọ ụfọdụ, ndị okenye na-enye ndị ohu na-eje ozi ọzụzụ dị irè n’ụzọ na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, ha na-akpọrọ ndị ohu na-eje ozi ruru eru mgbe ha na-aga ileta ndị ọrịa ma ọ bụ ndị agadi. N’ụzọ dị otú a, ndị ohu na-eje ozi na-enweta ahụmahụ n’ọrụ ọzụzụ atụrụ. N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe ohu na-eje ozi pụrụ ime iji nwekwuo ọganihu ime mmụọ.—Lee igbe dị n’okpuru nke isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Ohu Na-eje Ozi Pụrụ Ime.”

Isi ihe nke atọ mere ọzụzụ e nyere Jizọs ji dị irè bụ na Jehova bu ọganihu a ga-enwe n’ọdịnihu n’uche zụọ ya. Jizọs kwuru banyere Nna ya na ọ ga-egosi Ọkpara ahụ “ọrụ ndị ka ndị a ukwuu.” Ahụmahụ Jizọs nwetara mgbe ọ nọ n’ụwa nyeere ya aka ịzụlite àgwà ndị ga-adị ya mkpa n’ịrụzu ọrụ ndị a ga-enye ya n’ọdịnihu. (Ndị Hibru 4:15; 5:8, 9) Dị ka ihe atụ, lee nnukwu ọrụ a gaje ikenye Jizọs n’ọdịnihu—ọrụ ịkpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụ anwụ ugbu a n’ọnwụ na ikpe ha ikpe!—Jọn 5:21, 22.

Mgbe ndị okenye na-azụ ndị ohu na-eje ozi taa, ha kwesịrị iburu mkpa ndị a ga-enwe n’ọdịnihu n’uche. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka e nwere ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi zuru ezu igbo mkpa e nwere ugbu a, ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ ga-adị ma ọ bụrụ na e guzobe ọgbakọ ọhụrụ? Ma ọ bụrụ na e guzobe ọtụtụ ọgbakọ? N’ime afọ atọ gara aga, e nwere ihe karịrị ọgbakọ 6,000 n’ụwa nile. Lee ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi a chọrọ iji lekọta ọgbakọ ọhụrụ ndị ahụ!

Ndị okenye, ùnu na-agbaso ihe nlereanya Jehova site n’iso ndị unu na-azụ na-enwe mmekọrịta chiri anya ma na-ekpo ọkụ? Ùnu na-egosi ha otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha? Ùnu na-eburu mkpa ndị a ga-enwe n’ọdịnihu n’uche? Ịgbaso ihe nlereanya Jehova n’otú o si zụọ Jizọs ga-arụpụtara ọtụtụ ndị ngọzi bara ụba.

Ụjọ Atụla Unu Ikenye Ndị Ọzọ Ọrụ

Ndị okenye bụ́ aka ochie bụ́ ndị ibu ọtụtụ ibu ọrụ maara ahụ́ pụrụ ịlatụ azụ n’ikenye ndị ọzọ ọrụ. Ọ pụrụ ịbụ na ha agbalịwo ime otú ahụ n’oge gara aga ma a rụghị ya otú juru ha afọ. N’ihi ya, ha pụrụ ịzụlite àgwà bụ́, ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ka a rụọ ọrụ nke ọma, ị ghaghị iji aka gị rụọ ya.’ Ma àgwà a ò kwekọrọ n’uche Jehova, dị ka e gosipụtara n’Akwụkwọ Nsọ, nke bụ́ ka ndị na-enwechaghị ahụmahụ nweta ọzụzụ n’aka ndị ka nwee ahụmahụ?—2 Timoti 2:2.

E mechuru Pọl onyeozi ihu mgbe otu n’ime ndị ya na ha so mee njem, bụ́ Jọn Mak, hapụrụ ọrụ e kenyere ya na Pamfilia ma laghachi n’ụlọ. (Ọrụ 15:38, 39) Otú ọ dị, Pọl ekweghị ka ndọghachi azụ ahụ kụda ya mmụọ n’ịzụ ndị ọzọ. Ọ họọrọ nwanna ọzọ na-eto eto, bụ́ Timoti, ma zụọ ya n’ọrụ ozi ala ọzọ. * (Ọrụ 16:1-3) Na Beria, ndị ozi ala ọzọ ahụ nwetara mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ nke na Pọl ịnọgide ebe ahụ bịara bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya. N’ihi ya, ọ hapụrụ ọgbakọ ọhụrụ ahụ n’aka Saịlas, bụ́ nwanna ka mee okenye nke tozuru okè, na Timoti. (Ọrụ 17:13-15) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Timoti mụtara ọtụtụ ihe n’aka Saịlas. Mgbe e mesịrị, mgbe Timoti dị njikere ibukwu ibu ọrụ, Pọl zigara ya Tesalonaịka ịgba ọgbakọ dị ebe ahụ ume.—1 Ndị Tesalonaịka 3:1-3.

Mmekọrịta dị n’etiti Pọl na Timoti abụghị nke ndị na-amaghị ibe ha, ma ọ bụ nke jụrụ oyi. Ha nwere mmekọrịta na-ekpo ọkụ. Mgbe Pọl na-edegara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ, ọ kpọrọ Timoti, bụ́ onye ọ na-eme atụmatụ iziga ebe ahụ, “nwa m m hụrụ n’anya nke na-ekwesị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị.” Ọ gbakwụnyekwara, sị: “[Timoti] ga-echetakwara unu ụzọ m si eme ihe n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.” (1 Ndị Kọrint 4:17) Timoti nabatara ọzụzụ Pọl nyere ya, na-aghọ onye ruru eru n’ịrụ ọrụ e kenyere ya. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eto eto aghọọla ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, ma ọ bụ ọbụna ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma nke a na-akọ n’ihi na ha ritere uru n’ọzụzụ ndị okenye na-eche banyere ha bụ́ ndị nwere ezi mmasị n’ebe ha nọ nyere ha, dị ka Pọl mere n’ebe Timoti nọ.

Ndị Okenye, Zụọnụ Ndị Ọzọ!

N’ụzọ doro anya, amụma ahụ e buru n’Aịsaịa 60:22 na-emezu taa. Jehova na-eme ka ‘onye dịkarịsịrị nta ghọọ mba nwere ume.’ Ka mba ahụ wee nọgide na-abụ nke “nwere ume,” a ghaghị ịhazi ya nke ọma. Ndị okenye, gịnị ma unu tụlee ụzọ ndị unu pụrụ isi nyekwuo ndị ikom raara onwe ha nye bụ́ ndị ruru eru inweta ya, ọzụzụ? Jidenụ n’aka na ohu na-eje ozi nke ọ bụla maara nke ọma ebe ndị ọ dị ya mkpa imeziwanye ihe iji nwee ọganihu. Unu bụ́kwa ụmụnna nwoke ndị e mere baptizim, jirinụ nlebara anya ọ bụla e nyere unu mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Jirinụ ohere ndị unu nwere iji nwetakwuo ikike, ihe ọmụma, na ahụmahụ mee ihe n’ụzọ bara uru. N’ezie, Jehova ga-agọzi usoro dị otú ahụ e ji na-enye aka n’ụzọ ịhụnanya.—Aịsaịa 61:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Mgbe e mesịrị, Pọl na Jọn Mak rụkọkwara ọrụ ọzọ.—Ndị Kọlọsi 4:10.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Ihe Ndị Ohu Na-eje Ozi Pụrụ Ime

Ọ bụ ezie na ndị okenye kwesịrị inye ndị ohu na-eje ozi ọzụzụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị ohu na-eje ozi pụrụ ime iji nwekwuo ọganihu ime mmụọ.

—Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ ndị dị uchu na ndị a pụrụ ịdabere na ha ma a bịa n’ilekọta ọrụ e kenyere ha. Ha kwesịkwara ịzụlite àgwà dị mma nke ịmụ ihe. Ruo n’ókè dị ukwuu, ọganihu na-adabere n’ịmụ na itinye ihe ndị a mụtara n’ọrụ.

—Mgbe ohu na-eje ozi na-akwadebe okwu ọ ga-ekwu ná nzukọ Ndị Kraịst, o kwesịghị ịla azụ n’ịgwa okenye ruru eru ka ọ tụọrọ ya aro otú ọ ga-esi mee ihe omume ahụ.

—Ohu na-eje ozi nwekwara ike ịgwa onye okenye ka o lee otú ya ga-esi kwuo okwu dabeere na Bible, ma nye ndụmọdụ maka imeziwanye ihe.

Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịchọ, ịnakwere, na itinye ndụmọdụ ndị okenye nyere ha n’ọrụ. N’ụzọ dị otú a, ịga n’ihu ha ‘ga-apụta ìhè nye mmadụ nile.’—1 Timoti 4:15.