Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngọzi Nke Ozi Ọma Ahụ

Ngọzi Nke Ozi Ọma Ahụ

Ngọzi Nke Ozi Ọma Ahụ

“Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; O zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”—AỊSAỊA 61:1, 2.

1, 2. (a) Gịnị ka Jizọs kpughere na ya bụ, ò sikwa aṅaa mee ya? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa ka ozi ọma ahụ Jizọs kpọsara wetara?

NÁ MMALITE nke ozi Jizọs, ọ nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret n’otu Ụbọchị Izu Ike. Dị ka ihe ndekọ ahụ si kwuo, ‘e nyere ya akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaịa onye amụma, o meghekwara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma chọta ebe e dere, sị: “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m, n’ihi na o tere m mmanụ ịkpọsa ozi ọma.”’ Jizọs gara n’ihu ịgụkwu okwu amụma ahụ. Mgbe ọ gụsịrị, ọ nọdụrụ ala ma kwuo, sị: “Taa ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nke unu ka nụpụrụ mezuru.”—Luk 4:16-21.

2 N’ụzọ dị otú a, Jizọs kpughere na ya bụ onye ahụ e buru n’amụma nke na-ezisa ozi ọma ma na-akasi ndị mmadụ obi. (Matiu 4:23) Ozi Jizọs nwere izi bụkwa ozi ọma n’ezie! Ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa. Onye na-eso m agaghị eje ije n’ọchịchịrị ma ọlị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) Ee, Jizọs nwere “okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:68, 69) Ìhè, ndụ, nnwere onwe—n’ezie, ihe ndị a bụ ngọzi ndị a ga-eji kpọrọ ihe!

3. Ozi ọma dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara?

3 Mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ndị ahụ na-eso ụzọ jiri ọrụ izisa ozi ọma Jizọs gaa n’ihu. Ha kwusaara ma ndị Izrel ma ndị mba ọzọ ‘ozi ọma nke alaeze ahụ.’ (Matiu 24:14; Ọrụ 15:7; Ndị Rom 1:16) Ndị nabatara ya bịara mara Jehova Chineke. E mere ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke okpukpe, ha ghọkwara akụkụ nke mba ime mmụọ ọhụrụ ahụ, bụ́ “Izrel nke Chineke,” bụ́ nke ndị so na ya nwere atụmanya nke iso Onyenwe ha, bụ́ Jizọs Kraịst, chịa ọchịchị n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. (Ndị Galeshia 5:1; 6:16; Ndị Efesọs 3:5-7; Ndị Kọlọsi 1:4, 5; Mkpughe 22:5) Ihe ndị ahụ bụ ngọzi ndị dị oké ọnụ ahịa n’ezie!

Izisa Ozi Ọma Taa

4. Taa, n’ụzọ dị aṅaa ka e si arụzu ọrụ ahụ e nyere bụ́ ikwusa ozi ọma?

4 Taa, Ndị Kraịst e tere mmanu anọgidela na-arụzu ọrụ ahụ e buru n’amụma nke Jizọs bụ onye mbụ e nyere ya, “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-amụbawanye amụbawanye nke “atụrụ ọzọ ahụ” na-akwadokwa ha. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) N’ihi ya, a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. N’ala na ókèala 235, Ndịàmà Jehova apụwo gaa “izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; . . . ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ; ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Aịsaịa 61:1, 2) N’ihi ya, ọrụ izisa ozi ọma nke Ndị Kraịst nọgidere na-ewetara ọtụtụ ndị ngọzi, na-ewetakwara “ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla” ezigbo nkasi obi.—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

5. Banyere nkwusa ozi ọma, olee otú Ndịàmà Jehova si dị iche n’ebe chọọchị dị iche iche nke Krisendọm dị?

5 Ọ bụ eziokwu na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-akwalite ụdị dị iche iche e si ezisa ozi ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-ezipụ ndị ozi ala ọzọ ịga mee ntọghata n’ala ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, The Orthodox Christian Mission Center Magazine na-akọ banyere ọrụ ndị ozi ala ọzọ nke Ọtọdọks na Madagascar, ebe ndịda Africa, Tanzania, na Zimbabwe. Otú ọ dị, na Chọọchị Ọtọdọks, dị ka ọ dị na chọọchị ndị ọzọ nke Krisendọm, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị òtù ya adịghị ekere òkè n’ọrụ dị otú ahụ. N’ụzọ dị iche, Ndịàmà Jehova nile raara onwe ha nye na-agbalịsi ike ikere òkè n’izisa ozi ọma. Ha na-aghọta na ịkpọsa ozi ọma ahụ bụ ihe àmà na-egosi na okwukwe ha bụ ezigbo ya. Pọl kwuru, sị: “Mmadụ na-eji obi egosipụta okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, okwukwe nke na-adịghị akpali mmadụ ime ihe bụ nke nwụrụ anwụ.—Ndị Rom 10:10; Jems 2:17.

Ozi Ọma nke Na-eweta Ngọzi Ebighị Ebi

6. Ozi ọma dị aṅaa ka a na-ekwusa taa?

6 Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi kasị mma a pụrụ inwe. Ha na-emeghe Bible ha ma na-egosi ndị na-ege ntị na Jizọs chụrụ ndụ ya n’àjà iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ụzọ isi bịakwute Chineke, isi nweta mgbaghara mmehie, na olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; 2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ha na-akpọsa na e guzobewo Alaeze Chineke n’eluigwe n’okpuru Eze ahụ e tere mmanụ, bụ́ Jizọs Kraịst, nakwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ajọ omume n’ụwa ma hụ maka mweghachi nke Paradaịs. (Mkpughe 11:15; 21:3, 4) Ná mmezu nke amụma Aịzaịa, ha na-agwa ndị agbata obi ha na ugbu a bụ “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ” bụ́ mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ka pụrụ ịnabata ozi ọma ahụ. Ha na-adọkwa aka ná ntị na “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere” ga-abịa n’isi nso, bụ́ mgbe Jehova ga-eme ka ndị mmebi iwu na-enweghị nchegharị gwụsịa.—Abụ Ọma 37:9-11.

7. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi ịdị n’otu nke Ndịàmà Jehova, n’ihi gịnịkwa ka ha ji nwee ịdị n’otu dị otú ahụ?

7 N’ụwa ebe ọdachi na-eme mgbe mgbe, nke a bụ nanị ozi ọma nwere abamuru na-adịru ebighị ebi. Ndị nabatara ya na-esonye n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst dị n’otu bụ́ ndị na-adịghị ekwe ka ndịrịta iche nke mba, agbụrụ, ma ọ bụ nke akụ̀ na ụba kewaa ha. Ha ‘eyikwasịwo onwe ha ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.’ (Ndị Kọlọsi 3:14; Jọn 15:12) A hụrụ nke a n’afọ gara aga n’otu mba Africa. N’otu ụtụtụ, ụda egbe kpọtere ndị bi n’isi obodo nke mba ahụ n’ụra. A na-achọ iweghara ọchịchị n’ike. Mgbe nsogbu ahụ ghọrọ nke agbụrụ na agbụrụ, a katọrọ otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà n’ihi ichebe Ndịàmà ibe ha bụ́ ndị agbụrụ ọzọ. Ndị ezinụlọ ahụ zaghachiri, sị: “Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ anyị.” Nye ha, ndịrịta iche nke agbụrụ adịghị mkpa; ọ bụ ịhụnanya Ndị Kraịst—ịkasi ndị nọ ná mkpa obi—bụ ihe dị mkpa. Otu onye ikwu ha na-abụghị Onyeàmà kwuru, sị: “Ndị òtù okpukpe nile raara ndị ofufe ibe ha nye. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova bụ ndị na-emeghị otú ahụ.” Ọtụtụ akụkọ ndị yiri ha e si ná mba ndị ọgba aghara obodo tisasịrị nweta na-egosi na Ndịàmà Jehova ‘nwere ịhụnanya n’ezie maka òtù ụmụnna dum.’—1 Pita 2:17.

Ozi Ọma ahụ Na-agbanwe Ndị Mmadụ

8, 9. (a) Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ndị nabatara ozi ọma ahụ na-eme? (b) Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-egosi ike ozi ọma ahụ nwere?

8 Ozi ọma ahụ metụtara ihe Pọl kpọrọ “ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ọ bụghị nanị na ọ na-eme ka e nwee olileanya dị ebube e ji n’aka maka ọdịnihu kamakwa, ọ na-eme ka “ndụ dị ugbu a” ka mma. Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-eduzi Ndịàmà Jehova n’otu n’otu ka ndụ ha wee kwekọọ n’uche Chineke. (Abụ Ọma 119:101) A na-eme ka ha bụrụ ụdị mmadụ ọhụrụ ka ha na-azụlite àgwà ndị dị ka ezi omume na iguzosi ike n’ihe.—Ndị Efesọs 4:24.

9 Tụlee ihe atụ nke Franco. Ọ na-ewe iwe ọkụ. Mgbe ọ bụla ihe na-agazighị agazi, ọ na-ewe iwe ọkụ ma mebie ihe. Nwunye ya sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ihe nlereanya ha dị ka Ndị Kraịst jikwa nwayọọ nwayọọ nyere Franco aka ịhụ na ọ ghaghị ime mgbanwe. O sooro ha mụọ Bible ma mesịa nwee ike igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ndị dị ka udo na njide onwe onye. (Ndị Galeshia 5:22, 23) O so na mmadụ 492 e mere baptizim na Belgium n’afọ ije ozi nke 2001. Tụleekwa ihe banyere Alejandro. Ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri nwa okorobịa a ahụ́ nke ukwuu ruo n’ókè nke ya isi n’ebe mkpofu ahịhịa enweta ihe o ji ebi ndụ, na-atụtụ ihe ọ bụla ọ hụrụ ma na-ere ya iji zụta ọgwụ ọjọọ. Mgbe Alejandro dị afọ 22, Ndịàmà Jehova gwara ya ka ha mụọrọ ya Bible, o kwekwara. Ọ gụrụ Bible kwa ụbọchị ma gaa nzukọ Ndị Kraịst. O mere ka ndụ ya dị ọcha ngwa ngwa nke na n’ihe na-erughị ọnwa isii, o keere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma—otu n’ime mmadụ 10,115 mere otú ahụ n’afọ gara aga na Panama.

Ozi Ọma Ahụ—Ngọzi Nye Ndị Dị Umeala n’Obi

10. Olee ndị na-anabata ozi ọma ahụ, oleekwa otú àgwà ha si agbanwe?

10 Aịzaịa buru amụma na a ga-ekwusara ndị dị umeala n’obi ozi ọma ahụ. Olee ndị bụ́ ndị a dị umeala n’obi? Ha bụ ndị ahụ a kọwara n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi dị ka ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ha bụ ndị nwere obi umeala a na-achọta n’akụkụ nile nke ọha mmadụ bụ́ ndị na-emeghe obi ha ịnabata ozi nke eziokwu ahụ. Ndị dị otú ahụ na-amụta na ime uche Chineke na-eweta ngọzi ndị dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla a na-enweta n’ụwa. (1 Jọn 2:15-17) Otú ọ dị, olee otú Ndịàmà Jehova si eru n’obi ndị mmadụ n’ọrụ izisa ozi ọma ha?

11. Dị ka Pọl si kwuo, olee otú e kwesịrị isi na-ekwusa ozi ọma ahụ?

11 Ọ dị mma, tụlee ihe nlereanya nke Pọl onyeozi, bụ́ onye degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Mgbe m bịakwutekwara unu, ụmụnna m, ejighị m oké okwu ma ọ bụ oké amamihe bịa na-akpọsara unu ihe nzuzo dị nsọ banyere Chineke. N’ihi na m kpebiri na m gaghị ama ihe ọ bụla n’etiti unu ma e wezụga Jizọs Kraịst, bụkwa onye a kpọgidere n’osisi.” (1 Ndị Kọrint 2:1, 2) Pọl achọghị iji agụmakwụkwọ ya dọta mmasị ndị na-ege ya ntị. Ọ dịghị ihe ọzọ ọ kụziri ma ọ bụghị eziokwu ndị na-enweghị mgbagha sitere n’aka Chineke, bụ́ eziokwu ndị e dekọrọ na Bible taa. Rịbakwa ama agbamume Pọl nyere onye ibe ya na-ezisa ozi ọma, bụ́ Timoti: “Kwusaa okwu ahụ, nọgidesie ike na ya.” (2 Timoti 4:2) Timoti gaje ikwusa “okwu ahụ,” bụ́ ozi Chineke. Pọl degakwaara Timoti akwụkwọ, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Timoti 2:15.

12. Olee otú Ndịàmà Jehova taa si agbaso okwu na ihe nlereanya Pọl?

12 Ndịàmà Jehova na-agbaso ihe nlereanya Pọl, nakwa okwu ọ gwara Timoti. Ha na-aghọta ike nke Okwu Chineke nwere ma na-eji ya eme ihe nke ọma ka ha na-agbalị igosi ndị agbata obi ha okwu kwesịrị ekwesị nke olileanya na nkasi obi. (Abụ Ọma 119:52; 2 Timoti 3:16, 17; Ndị Hibru 4:12) N’eziokwu, ha na-eji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible eme ihe nke ọma ka ndị nwere mmasị wee nwee ike inwetakwu ihe ọmụma Bible n’oge nke aka ha. Ma ha na-agbalị mgbe nile igosi ndị mmadụ okwu nke Akwụkwọ Nsọ. Ha maara na Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ ga-akpali obi nke ndị dị umeala n’obi. Ijikwa ya na-eme ihe n’ụzọ dị otú a na-ewusi okwukwe nke ha ike.

‘Kasienụ Ndị Nile Na-eru Újú Obi’

13. N’afọ 2001, ihe ndị dị aṅaa merenụ mere ka e nwee mkpa dị ukwuu maka ịkasi ndị na-eru újú obi?

13 Ọdachi mekwara n’afọ 2001, n’ihi ya kwa, nkasi obi dị ọtụtụ ndị mkpa. E nwere ihe atụ dị ịrịba ama banyere nke a na United States na September gara aga, mgbe ndị na-eyi ọha egwu wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa nke dị na New York nakwa Pentagon nke dị nso na Washington, D.C. Lee ihe na-akpata oké ụjọ mwakpo ndị ahụ bụụrụ mba ahụ dum! N’agbanyeghị ihe ndị dị otú ahụ merenụ, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịrụzu ọrụ e nyere ha bụ́ “ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” Ahụmahụ ole na ole ga-egosi otú ha si eme nke a.

14, 15. Olee otú Ndịàmà si nwee ike iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche mee ihe n’ụzọ dị irè n’oge abụọ dị iche iji kasie ndị na-eru újú obi?

14 Otu Onyeàmà bụ́ onye na-ezisa ozi ọma oge nile jekwuuru otu nwanyị nọ n’akụkụ ụzọ ma jụọ ya ihe o chere banyere mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere n’oge na-adịbeghị anya. Nwanyị ahụ malitere ibe ákwá. O kwuru na obi adịghị ya mma na ọ dịkwa ya ka ya bụrụ na ya nwetụrụ ike inye aka. Onyeàmà ahụ gwara ya na Chineke nwere mmasị dị nnọọ ukwuu n’ebe anyị nile nọ, ọ gụkwara Aịsaịa 61:1, 2. Okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke yiri ihe ezi uche dị na ha nye nwanyị ahụ, bụ́ onye kwuru na onye ọ bụla na-eru újú. Ọ naara otu traktị ma gwa Onyeàmà ahụ ka ọ bịa leta ya n’ụlọ ya.

15 Ndịàmà abụọ na-ezisa ozi ọma zutere otu nwoke nke na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ya. Ha gwara ya ka ha gosi ya okwu nkasi obi ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ n’ihi ọdachi ahụ mere n’Ebe Azụmahịa Ụwa n’oge na-adịbeghị anya. Mgbe o kweere, ha gụrụ 2 Ndị Kọrint 1:3-7, bụ́ nke gụnyere okwu bụ́: “Nkasi obi . . . jupụtakwara site na Kraịst ahụ.” Nwoke ahụ nwere ekele na Ndịàmà ahụ bụ́ ndị agbata obi ya so ndị ọzọ na-ekerịta ihe na-akasi obi, o kwukwara, sị: “Ka Chineke gọzie ọmarịcha ọrụ unu na-arụ.”

16, 17. Ahụmahụ abụọ dị aṅaa na-egosipụta ike Bible nwere inyere ndị ọdachi mere ka ha na-eru újú ma ọ bụ nwee mwute aka?

16 Otu Onyeàmà nke na-eletaghachi ndị nwere mmasị zutere nwa nwoke nke otu nwanyị gosiburu mmasị ma gwa ya na ya nwere nchegbu banyere otú ndị agbata obi ya na-eme kemgbe ọdachi ahụ mere na nso nso ahụ mesịrị. Ọ tụrụ nwoke ahụ n’anya na Onyeàmà ahụ wepụtara oge ya ileta ndị mmadụ iji hụ otú ha na-eme. O kwuru na ya na-arụ ọrụ n’ebe dị nnọọ nso n’Ebe Azụmahịa Ụwa mgbe e mere mwakpo ahụ, hụkwa mgbe ihe ahụ dum mere. Mgbe ọ jụrụ ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, Onyeàmà ahụ gụụrụ ya amaokwu dị iche site na Bible, gụnyere Abụ Ọma 37:39, bụ́ nke na-asị: “Nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova bịa: ọ bụ ebe ha siri ike na mgbe mkpa.” Nwoke ahụ ji obiọma jụọ Onyeàmà ahụ otú ya na ezinụlọ ya mere, gwa ya ka ọ bịaghachi, ma gosipụta ekele sitere n’obi maka nleta ahụ.

17 Onye ọzọ n’ime ọtụtụ puku ndị na-eru újú Ndịàmà Jehova kasiri obi n’ụbọchị ndị sochiri ụbọchị ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere mwakpo bụ otu nwanyị Ndịàmà zutere mgbe ha na-eleta ndị agbata obi ha. Ihe merenụ wutere ya nke ukwuu, o gekwara ntị mgbe ha gụrụ Abụ Ọma 72:12-14: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ ihe ezi uche dị na ha! Nwanyị ahụ gwara Ndịàmà ahụ ka ha gụghachi amaokwu ndị ahụ ma kpọbata ha n’ime ụlọ ya ka ha gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ. Mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka ahụ, a maliteere ya ọmụmụ Bible.

18. Olee otú otu Onyeàmà si nyere ndị agbata obi ya aka mgbe a gwara ya ka o duo ha n’ekpere?

18 Otu Onyeàmà na-arụ ọrụ n’otu ụlọ nri nke dị n’otu ógbè batụrụ ọgaranya bụ́ ebe ndị bi na ya na-egosibubeghị mmasị dị ukwuu n’ozi ọma Alaeze ahụ. Mgbe mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere gasịrị, ọ bịara yie ka egwu o jidere ndị ógbè ahụ. N’uhuruchi Friday ka mwakpo ahụ gasịrị, manịja ụlọ nri ahụ gwara mmadụ nile ka ha jiri kandụl pụta n’èzí, ma nọrọ duu tụgharịa uche nwa oge iji cheta ndị ahụ nwụrụ anwụ. Iji kwanyere mmetụta ha ùgwù, Onyeàmà ahụ pụrụ n’èzí ma kwụrụ n’akụkụ ụzọ ma n’ekwughị okwu. Manịja ahụ maara na ọ bụ onye ozi nke Ndịàmà Jehova, n’ihi ya, mgbe oge ịnọ duu ahụ gasịrị, ọ gwara ya ka o duo mmadụ nile n’ekpere. Onyeàmà ahụ kweere. N’ekpere ya, o kwuru banyere iru újú ahụ zuru ebe nile ma kwuo na ọ dịghị ndị ahụ na-eru újú mkpa iru újú dị ka ndị na-enweghị olileanya. O kwuru banyere oge ajọ ọdachi ndị dị otú ahụ na-agaghị emekwa ọzọ ma kwuo na mmadụ nile pụrụ ịbịarukwu Chineke nke nkasi obi nso site n’inweta ezi ihe ọmụma sitere na Bible. Mgbe ha kwesịrị “Amen,” manịja ahụ—ya na ihe karịrị mmadụ 60 pụtara n’èzí ụlọ nri ahụ—bịakwutere Onyeàmà ahụ, kelee ya, ma makụọ ya, na-ekwu na nke ahụ bụ ekpere kasị mma ya nụtụrụla.

Ngọzi Nye Obodo

19. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi na ụfọdụ na-ahụ ụkpụrụ dị elu nke Ndịàmà Jehova?

19 N’ụbọchị ndị a karịsịa, obodo ndị Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike na ha eritewo uru site n’ọnụnọ ha—dị ka ọtụtụ ndị kwuworo. Olee otú ndị na-akwalite udo, ịkwụwa aka ọtọ, na omume dị ọcha na-agaghị esi nwee mmetụta na-aba uru n’ebe ndị mmadụ nọ? N’otu mba dị n’Ebe Etiti Eshia, Ndịàmà zutere otu onye lara ezumike nká bụ́ onye na-arụbu n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka nchebe obodo. O kwuru na ọ dị mgbe a gwara ya gaa nyochaa òtù okpukpe dịgasị iche iche. Mgbe o nyochara Ndịàmà Jehova, ịkwụwa aka ọtọ na àgwà ọma ha masịrị ya. Okwukwe ha kwụ chịm nakwa eziokwu ahụ bụ́ na ozizi ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ masịrị ya. Nwoke a kwere ka a mụọrọ ya Bible.

20. (a) Gịnị ka akụkọ ozi Ndịàmà Jehova nyere n’afọ gara aga na-egosi? (b) Gịnị na-egosi na e nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ, oleekwa otú anyị si ele ihe ùgwù anyị nke izisa ozi ọma anya?

20 Site n’ahụmahụ ole na ole ndị a kọrọ n’isiokwu a, n’ime ọtụtụ puku ndị a pụrụ ịkọ, o doro anya na Ndịàmà Jehova ji nnọọ ọrụ n’aka n’afọ ije ozi nke 2001. * Ha sooro ọtụtụ nde mmadụ kwurịta okwu, ha kasiri ọtụtụ ndị na-eru újú obi, a gọzikwara ọrụ izisa ozi ọma ha. E nwere mmadụ 263,431 gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Chineke site n’ịbụ ndị e mere baptizim. N’ụwa nile, ọnụ ọgụgụ ndị na-ezisa ozi ọma ji pasent 1.7 mụbaa. Eziokwu ahụ bụ́kwa na mmadụ 15,374,986 gara Ememe Ncheta nke ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ na-egosi na e nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) Ka anyị nọgide na-achọpụta ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-anabata ozi ọma ahụ. Ka afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ nọgidekwara na-aga n’ihu, ka anyị nọgide na-akasi “ndị obi ha tiwara etiwa” obi. Lee ihe ùgwù a gọziri agọzi anyị nwere! N’ezie, anyị nile na-ekwughachi okwu Aịzaịa, bụ́: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m.” (Aịsaịa 61:10) Ka Chineke nọgide jiri anyị na-eme ihe ka ọ na-emezu okwu amụma a: “Onyenwe anyị Jehova ga-eme ka ezi omume na otuto pute n’ihu mba nile.”—Aịsaịa 61:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Chaatị dị na peeji nke 19 ruo 22 na-egosi akụkọ nke ọrụ Ndịàmà Jehova n’afọ ije ozi 2001.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú e si jiri ozi ọma ahụ Jizọs kwusara gọzie ndị dị umeala n’obi?

• Ngọzi ndị dị aṅaa bịaara ndị nabatara ọrụ izisa ozi ọma ahụ ndị soro ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ kwusara?

• Olee otú e siworo jiri ozi ọma ahụ gọzie ndị na-anabata ya taa?

• Olee otú anyị si ele ihe ùgwù anyị nke ịbụ ndị na-ezisa ozi ọma anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 19-22]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2001 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ndịàmà Jehova na-echeta mgbe nile ibu ọrụ ha nke izisa ozi ọma

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ndị nabatara ozi ọma ahụ na-esonye n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ma dị n’otu