Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ọma Na-enye Chineke Otuto

Ọrụ Ọma Na-enye Chineke Otuto

Ọrụ Ọma Na-enye Chineke Otuto

EZI Ndị Kraịst na-ewetara Chineke otuto site n’omume ọma ha na ọrụ ha kwesịrị nṅomi. (1 Pita 2:12) A pụrụ ịhụ nke a site n’ihe mere n’Ịtali n’afọ ndị na-adịbeghị anya.

Na September 1997, oké ala ọma jijiji mere n’akụkụ dị iche iche nke ógbè Marche na Umbria, na-ebibi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụlọ 90,000. Ìgwè dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bịara nyere ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ aka ozugbo. E butere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, akpa ihi ụra, stov, ígwè na-enye ọkụ, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ndị mmadụ hụrụ ihe enyemaka ndị a.

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Il Centro kọrọ, sị: “Ndị mbụ ji ihe enyemaka bịarute n’ógbè ndị ahụ o metụtara bụ Ndịàmà Jehova nke Roseto [n’ógbè Teramo] . . . E wezụga izukọ site n’oge ruo n’oge maka ikpe ekpere, ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova na-arụ ọrụ n’ụzọ dị irè, na-enyere ndị na-ahụsi anya aka, n’achọghị ịma okpukpe ha nọ na ya.”

Onyeisi obodo Nocera Umbra, bụ́ otu n’ime obodo ndị ọ kasị metụta, degaara Ndịàmà akwụkwọ, sị: “Eji m obi m nile na-ekele unu maka aka unu nyeere ndị bi na Nocera. Eji m n’aka na ekwuru m obi ụmụ amaala ya nile.” Ọzọkwa, Ministri Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme ná Mba nyere Congregazione Cristiana dei Testimoni di Geova (Ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova) asambodo na ihe nrite “iji gbaa akaebe nye ọrụ a rụrụ na ịdị uchu e gosipụtara n’ihe banyere ọnọdụ mberede e nwere n’ógbè Umbria na Marche.”

N’October 2000, oké idei mmiri kpara ógbè Piedmont nke dị n’ebe ugwu Ịtali aka ọjọọ. Ọzọkwa, Ndịàmà mere ihe ozugbo iji weta ihe enyemaka. Ndị mmadụ hụkwara ọrụ ọma a. Ógbè Piedmont nyere ha ihe ncheta maka “ọrụ afọ ofufo dị oké ọnụ ahịa ha rụrụ n’ịkwado ndị bi na Piedmont idei mmiri ahụ metụtara.”

Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:16) Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ enye Chineke otuto, ọ bụghị onwe ha, site n’ịrụ “ọrụ ọma” ndị na-enyere ndị agbata obi ha aka n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ ndị ọzọ.