Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbaa Ndị Na-ezi Okwu Chineke Ume Ịrụzu Ọrụ Ha

A Gbaa Ndị Na-ezi Okwu Chineke Ume Ịrụzu Ọrụ Ha

A Gbaa Ndị Na-ezi Okwu Chineke Ume Ịrụzu Ọrụ Ha

ỌTỤTỤ narị puku ndị ozizi gbakọtara maka ịnara ntụziaka n’ọnwa ole na ole ndị na-adịbeghị anya. Malite na May gara aga, ha gbakọtara n’ọtụtụ narị Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. A gbara ndị bịaranụ ume izi onwe ha ihe, irukwu eru ọbụna karị, na ịrụzu ọrụ ha dị ka ndị ozizi.

Ị̀ gara otu n’ime mgbakọ ndị a? Ọ bụrụ na ị gara, obi abụọ adịghị ya na i nwere ekele maka ọmarịcha nri ime mmụọ e nyere ná mgbakọta ndị a a gbakọtara maka ofufe nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Gịnị ma i sonyere anyị ugbu a n’ịtụleghachi usoro ihe omume nke mgbakọ ahụ bụ́ nke na-akụzi ihe?

Ụbọchị nke Mbụ—Akwụkwọ Nsọ E Dere n’Ike Mmụọ Nsọ Bara Uru Iji Zie Ihe

Onyeisi oche nke mgbakọ ahụ ji okwu bụ́ “Bụrụnụ Ndị E Ziri Ihe, Unu Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nabata ndị bịaranụ, n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Site n’ịmụta ihe n’aka Jehova, bụ́ “Onye Nkụzi Ukwu,” Jizọs Kraịst ghọrọ Onye Ozizi Ukwu ahụ. (Aịsaịa 30:20, NW; Matiu 19:16) Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ọganihu dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke, anyị onwe anyị aghaghị ịbụ ndị Jehova ziri ihe.

Ihe omume nke isiokwu ya bụ “Izi Ihe Alaeze Na-amịpụta Ezi Mkpụrụ” sochiri. Site n’ajụjụ ọnụ ndị a gbara ndị na-ezi Okwu Chineke bụ́ ndị nwere ahụmahụ, e mere ka ọṅụ na ngọzi ndị a na-enweta site n’ime ndị na-eso ụzọ pụta ìhè

Okwu na-akpali akpali nke isiokwu ya bụ “Ndị ‘Oké Ọrụ Nile nke Chineke’ Na-akpali” sochiri. Na narị afọ mbụ, “oké ọrụ nile” bụ́ nke gụnyere Alaeze Chineke, kpaliri ndị mmadụ ime ihe. (Ọrụ 2:11) Anyị onwe anyị pụrụ ịkpali ndị mmadụ ime ihe site n’ịkpọsa “oké ọrụ nile” dị otú ahụ ndị dị ka ozizi Akwụkwọ Nsọ banyere ihe mgbapụta, mbilite n’ọnwụ, na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.

Okwu sochirinụ gbara mmadụ nile ume ikwe ‘Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Ha Ụtọ.’ (Abụ Ọma 35:27) Ịmụta ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ ihe ọjọọ asị, ịmụ Bible, ime ihe iji guzogide mmetụta ndị na-emerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ, na ịzụlite ịdị umeala n’obi, na-enyere anyị aka ịgbaso ezi omume. Nzọụkwụ ndị dị otú ahụ ga-enye aka ichebe anyị pụọ ná mkpakọrịta ndị na-ezighị ezi, omume ịhụ ihe onwunwe n’anya nke ụwa, na ihe ntụrụndụ rụrụ arụ na nke ime ihe ike.

Okwu bụ́ isi, nke isiokwu ya bụ “Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke,” chetaara anyị na Jehova na-eji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ elu ala ya, eme ka anyị bụrụ ndị ozi ya ruru eru. N’ihe banyere iji Okwu Chineke eme ihe, ọkà okwu ahụ dụrụ anyị ọdụ, sị: “Nzube anyị bụ ime ka ozi ahụ dị na Bible si n’ime akwụkwọ e biri ebi bamie n’obi nke ndị na-ege anyị ntị.”

Isiokwu nke usoro isiokwu mbụ nke mgbakọ ahụ bụ “Izi Onwe Anyị Ihe Mgbe Anyị Na-ezi Ndị Ọzọ.” Akụkụ ya nke mbụ mesiri ya ike na anyị kwesịrị ịgbaso otu ụkpụrụ ahụ dị elu nke omume ọma Ndị Kraịst bụ́ nke anyị na-ezi ndị ọzọ. Akụkụ nke sochirinụ dụrụ anyị ọdụ ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:15) Iji zie onwe anyị ihe, ọ dị anyị mkpa iji ịdị uchu na-enwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya, n’agbanyeghị afọ ole anyị jewooro Chineke ozi. Akụkụ ikpeazụ nke usoro isiokwu ahụ gosiri na Ekwensu na-ele anyị, na-achọ àgwà ndị dị ka nganga, mmụọ nnwere onwe, echiche nke ịdị mkpa n’anya onwe anyị, ekworo, anyaụfụ, obi ilu, iwe, na ịchọpụta mmejọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị eguzogidesie Ekwensu ike, ọ ga-agbapụ n’ebe anyị nọ. Iji guzogide ya, ọ dị anyị mkpa ịbịaru Chineke nso.—Jems 4:7, 8.

Okwu bịara n’ezi oge bụ́ “Kpọọ Ihe Otiti Ụwa nke Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Asị” gosiri anyị otú anyị ga-esi eguzogide ihe ahụ na-emerụ emerụ nke na-eyi ọnọdụ ime mmụọ anyị egwu. Habakuk onye amụma kwuru banyere Jehova, sị: “Anya Gị abụọ dị ọcha karị ịhụ ihe ọjọọ, Onye na-apụghịkwa ilegide mmegbu anya.” (Habakuk 1:13) Anyị kwesịrị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’ (Ndị Rom 12:9) A dụrụ ndị nne na nna ọdụ ka ha na-achịkwa otú ụmụ ha si eji Internet eme ihe na otú ha si ekiri telivishọn. Ọkà okwu ahụ kwuru na ndị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dọrọwooro kwesịrị inweta enyemaka site n’aka ndị enyi tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. Ọ ga-abụkwa ihe enyemaka ịdị na-atụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 97:10; Matiu 5:28; 1 Ndị Kọrint 9:27; Ndị Efesọs 5:3, 12; Ndị Kọlọsi 3:5; na 1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5, ma buru ha n’isi.

Okwu sochiri ya bụ́ “Ka Udo nke Chineke Chebe Gị,” kasiri anyị obi site n’imesi anyị obi ike na mgbe anyị na-echegbu onwe anyị, anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova ibu anyị. (Abụ Ọma 55:22) Ọ bụrụ na anyị agwa Jehova ihe nile dị anyị n’obi n’ekpere, ọ ga-enye anyị “udo nke Chineke,” bụ́ ịdị jụụ na ahụ iru ala bụ́ ndị a na-enweta site n’iso ya na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ụbọchị nke mbụ ji okwu bụ́ “Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma,” bụ́ nke kọwara mmezu nke Aịsaịa isi 60, mechie n’ụzọ na-enye obi ụtọ. N’ime ọchịchịrị nke gbachiri ụwa n’oge a, ìhè Jehova na-amụkwasị “ụmụ ala ọzọ”—oké ìgwè mmadụ nke ndị yiri atụrụ na-apụtanụ—na Ndị Kraịst e tere mmanụ. N’izo aka n’amaokwu 19 na nke 20, ọkà okwu ahụ kọwara, sị: “Jehova agaghị ‘ada’ dị ka anyanwụ ma ọ bụ ‘wepụ’ onwe ya dị ka ọnwa. Ọ ga-anọgide na-eme ka ndị ya maa mma site n’ime ka ìhè na-amụkwasị ha. Lee mmesi obi ike magburu onwe ya nke ahụ bụụrụ anyị ka anyị na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ nke ụwa a gbara ọchịchịrị!” Ná ngwụsị nke okwu ahụ, ọkà okwu ahụ mara ọkwa mwepụta nke akwụkwọ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke Abụọ. Ị̀ gụchawo mbipụta ọhụrụ a?

Ụbọchị nke AbụọNdị Ruru Eru nke Ọma Izi Ndị Ọzọ Ihe

Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụbọchị nke abụọ ahụ, anyị ji ezi mmasị gee ntị n’usoro isiokwu nke abụọ nke mgbakọ ahụ, nke bụ́ “Ndị Ozi Bụ́ Ndị Ndị Ọzọ Na-esite n’Aka Ha Aghọ Ndị Kwere Ekwe.” Ndị kwuru okwu n’usoro isiokwu a nwere akụkụ atọ kọwapụtara nke ọ bụla n’ime nzọụkwụ atọ dị n’inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị kwere ekwe—izisa ozi Alaeze ahụ, ịzụlite mmasị a chọtara, na izi ndị nwere mmasị idebe ihe Kraịst nyere n’iwu ihe. Site n’ajụjụ ọnụ ndị a gbara na mmeghachi nke ahụmahụ ndị e nwere, anyị hụrụ kpọmkwem otú anyị pụrụ isi zie ndị ọzọ ihe ịghọ ndị na-eso ụzọ.

Ihe omume nke ọzọ bụ n’isiokwu bụ́ “Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu.” Ọkà okwu ahụ gosiri na ihe kasị mkpa bụ anyị ‘ịtachi obi ruo ọgwụgwụ.’ (Matiu 24:13) Anyị kwesịrị iji ndokwa nile Chineke mere—ekpere, ọmụmụ ihe onwe onye, nzukọ, na ozi—na-eme ihe iji zụlite nsọpụrụ Chineke. Ọ dị anyị mkpa igbochi ọchịchọ na ihe omume nke ụwa imetụta ma ọ bụ ibibi nsọpụrụ Chineke anyị.

Olee otú ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ndị a na-ebogbukwa n’ibu pụrụ isi nweta ume ọhụrụ taa? Okwu bụ́ “Ịchọta Izu Ike n’Okpuru Yoke Kraịst” zara ajụjụ ahụ. Jizọs ji obiọma kpọọ ụmụazụ ya ka ha bata n’okpuru yok ya ma mụta ihe n’aka ya. (Matiu 11:28-30) Anyị pụrụ ịbata n’okpuru yok Jizọs site n’ịgbasochi ihe nlereanya ya nke ibi ndụ dị mfe na nke a haziri ahazi, anya. E ji ajụjụ ọnụ nke a gbara ndị meworo ka ndụ ha dị mfe mee ka isi ihe dị n’ihe omume a pụtakwuo ìhè.

Otu n’ime ihe ndị kasị apụta ìhè ná nnukwu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova bụ ime ndị ọhụrụ bụ́ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye ya baptizim. Nwanna kwuru okwu bụ́ “Baptism Na-eduga n’Ihe Ùgwù Izi Ihe Ndị Ka Ukwuu” ji ikpo ọkụ nabata ndị ahụ a gaje ime baptizim ma gwa ha ka ha kere òkè n’ihe ùgwù ije ozi ndị ka ukwuu. Ndị na-ezi Okwu Chineke bụ́ ndị e mere baptizim ọhụrụ, ndị rukwara ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ, pụrụ iru eru maka ibu ọrụ dịgasị iche iche n’ọgbakọ.

“Ṅomie Onye Ozizi Ukwu Ahụ” bụ isiokwu nke okwu mbụ n’ehihie ahụ. Ruo ọtụtụ ijeri afọ n’eluigwe, Jizọs ji nlezianya kirie ma ṅomie Nna ya, si otú ahụ na-aghọ Onye Ozizi Ukwu. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o ji nkà izi ihe ndị dị irè mee ihe, ndị dị ka ajụjụ ndị na-akpali iche echiche na ihe atụ ndị dị mfe ma doo anya. Jizọs mere ka ozizi ya dabere n’Okwu Chineke ma jiri ịnụ ọkụ n’obi, ikpo ọkụ, na nkwuwa okwu, kwuo okwu. Ọ̀ bụ na a kpalighị anyị iṅomi Onye Ozizi Ukwu ahụ?

Okwu ọzọ na-akpali akpali bụ́ “Ị̀ Dị Njikere Ijere Ndị Ọzọ Ozi?,” gbara anyị ume iṅomi ihe nlereanya Jizọs n’ijere ndị ọzọ ozi. (Jọn 13:12-15) Ọkà okwu ahụ gbara kpọmkwem ndị ikom ruru eru ume ịdị ka Timoti n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ enyere ndị ọzọ aka. (Ndị Filipaị 2:20, 21) A gbara ndị nne na nna ume iṅomi Elkena na Hana n’inyere ụmụ ha aka ịchụso ozi oge nile. A dụkwara ndị na-eto eto ọdụ ka ha ṅomie ihe nlereanya nke Jizọs Kraịst na nwa okoro ahụ bụ́ Timoti site n’ịdị njikere iwepụta onwe ha ije ozi. (1 Pita 2:21) Okwu ndị jiworo ohere ndị dapụtaranụ mee ihe iji nyere ndị ọzọ aka kwuru kpalikwara anyị.

Isiokwu nke usoro isiokwu nke atọ bụ “Rite Uru n’Ụzọ Ka Zuo Ezuo Site ná Mmụta Ọchịchị Chineke.” Ọkà okwu nke mbụ mesiri ike mkpa ọ dị ịmụba oge anyị na-etinyeru uche n’ihe. Iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ, anyị pụrụ iji oge ọmụmụ ihe onwe onye ndị dị mkpirikpi malite ma gbalịa ịgbatịkwu ha. Ọ gbakwara ndị na-ege ntị ume ka ha na-asape akụkụ Akwụkwọ Nsọ e hotara ma na-edetu ihe n’oge nzukọ na-aga n’ihu. Ọkà okwu nke abụọ mere ka anyị mara mkpa ọ dị ijidesi “ụkpụrụ nke okwu ndị na-enye ezi ndụ” ike. (2 Timoti 1:13, 14) Iji chebe onwe anyị pụọ n’ihe ndị rụrụ arụ a na-egosi n’usoro mgbasa ozi, nkà ihe ọmụma nke mmadụ, ndị oké nkatọ Bible, na ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, anyị aghaghị ịzụpụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye nakwa maka ịga nzukọ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ọkà okwu ikpeazụ nke usoro isiokwu ahụ mere ka ọ pụta ìhè mkpa ọ dị itinye ihe ndị anyị mụtara n’ọrụ ka anyị wee nwee ike irite uru zuru ezu site ná mmụta ọchịchị Chineke.—Ndị Filipaị 4:9.

Lee ka anyị si nwee obi ụtọ ịnụ okwu bụ́ “Ndokwa Ndị Ọhụrụ Maka Ọganihu Ime Mmụọ Anyị”! Anyị ṅụrịrị ọṅụ ịmata na a ga-ebipụta akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, n’isi nso. Anyị tụsikwuru anya ya ike ka ọkà okwu ahụ na-akọwapụta ihe ndị dị n’ime ya. Banyere akụkụ nke bu ndụmọdụ okwu dị iche iche n’akwụkwọ ahụ, ọ sịrị: “Akwụkwọ ọhụrụ a akọwaghị akụkụ 53 a nke ịgụ ihe nke ọma, ikwu okwu, na izi ihe, otú ndị ụwa si akọwa ha. Nkọwa ha dabeere n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ.” Akwụkwọ ahụ ga-egosi otú ndị amụma, Jizọs, na ndị na-eso ụzọ ya si gosipụta ezi nkà n’izi ihe. Ee, akwụkwọ a na ihe ọhụrụ ndị e webara n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-enyere anyị aka n’ezie ịbụ ndị na-ezi Okwu Chineke n’ụzọ ka mma.

Ụbọchị nke Atọ—Bụrụnụ Ndị Ozizi n’Ihi Oge

Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụbọchị ikpeazụ ahụ, mmadụ nile gere ntị nke ọma n’usoro isiokwu ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, bụ́ “Amụma Malakaị Na-akwadebe Anyị Maka Ụbọchị Jehova.” Malakaị buru amụma ihe dị ka otu narị afọ mgbe ndị Juu sisịrị na Babilọn lọghachi. Ha adabawo ọzọ ná ndapụ n’ezi ofufe na ajọ omume, na-ewetara aha Jehova nkọcha site n’ileghara iwu ezi omume ya anya nakwa site n’iweta anụ ndị kpuru ìsì, ndị dara ngwụrọ, na ndị na-arịa ọrịa maka ịchụ àjà. Ọzọkwa, ha na-achụpụ ndị nwunye ha lụrụ n’okorobịa, eleghị anya iji lụrụ ndị inyom ala ọzọ.

Isi mbụ nke amụma Malakaị mesiri anyị obi ike na Jehova hụrụ ndị ya n’anya. O gosipụtara mkpa ọ dị ịtụ Chineke egwu nsọpụrụ na inwe ekele maka ihe ndị dị nsọ. Jehova na-atụ anya ka anyị nye ya ihe kasị mma anyị nwere, na-efe ya ofufe n’ihi na anyị ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị hụ ya n’anya. Ozi dị nsọ anyị na-eje ekwesịghị ịbụ iji mezuo iwu, anyị aghaghị ịza Chineke ajụjụ.

N’ịkọwa otú isi nke abụọ nke akwụkwọ Malakaị si metụta ụbọchị anyị, ọkà okwu nke abuọ nke usoro isiokwu ahụ jụrụ, sị: “Ànyị mụ anya n’onwe anyị ka a ghara ‘ịhụ ajọ omume n’egbugbere ọnụ anyị’?” (Malakaị 2:6) Ndị na-edu ndú n’izi ihe kwesịrị ijide n’aka na ihe ha na-ekwu dabesiri ike n’Okwu Chineke. Anyị kwesịrị ịkpọ aghụghọ ndị dị ka ịgba alụkwaghịm n’ụzọ na-ezighị ezi asị.—Malakaị 2:14-16.

N’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Ònye Ga-alanarị Ụbọchị Jehova?,” ọkà okwu ikpeazụ nke usoro isiokwu ahụ nyere aka ịkwadebe anyị maka ụbọchị Jehova. “Lee ihe nkasi obi ọ bụ nye ndị ohu Jehova ịmata na Malakaị isi 3, amaokwu nke 17, na-enwe mmezu ya bụ́ isi n’ahụ ha!” ka ọkà okwu ahụ kwupụtara. “Ọ na-ekwu, sị: ‘Ha ga-abụkwa nke m, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, n’ụbọchị ahụ mgbe Mụ onwe m ga na-eme ihe, bụ́ ihe nke aka m; M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ nwa ya nke na-efe ya.’”

Ihe ọzọ pụtara ìhè ná mgbakọ ahụ bụ ihe nkiri isiokwu ya bụ “Kwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù,” bụ́ nke e yi uwe ihe nkiri mee, nke e gosipụtara ụmụ Kora na ya. N’agbanyeghị omume nnupụisi nke nna ha n’ebe Mozis na Erọn nọ, ha nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na ndị nnọchianya ya. Ọ bụ ezie na Kora na ndị òtù ya lara n’iyi, ụmụ Kora lanarịrị. Okwu na-esonụ bụ́ “Jiri lguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke,” kọwara otú ihe nkiri ahụ si gbasa onye ọ bụla n’ime anyị. Ọkà okwu ahụ dọrọ aka ná ntị banyere ebe isii Kora na ndị òtù ya dara ada: ejighị iguzosi ike n’ihe na-akwado ịbụisi Jehova; ikwe ka mpako, oké ọchịchọ, na ekworo merie ha; ilekwasị anya n’ezughị okè nke ndị Jehova họpụtara; ịzụlite àgwà ime mkpesa; enweghịzi afọ ojuju n’ihe ùgwù ije ozi ha; na ikwe ka ọbụbụenyi ma ọ bụ nkekọ ezinụlọ butere iguzosi ike n’ihe nye Jehova ụzọ.

“Olee Ndị Na-akụziri Mba Nile Eziokwu Ahụ?” bụ isiokwu nke okwu ihu ọha. Eziokwu nke e kwuru banyere ya abụghị ihe ndị bụ́ eziokwu n’ozuzu ha, kama ọ bụ eziokwu banyere nzube Jehova bụ́ nke Jizọs Kraịst gbara àmà banyere ya. Ọkà okwu ahụ tụlere eziokwu metụtara nkwenkwe, eziokwu metụtara otú e si efe ofufe, na eziokwu metụtara àgwà onwe onye. Site ná ntụnyere a e ji Ndị Kraịst narị afọ mbụ tụnyere Ndịàmà Jehova taa, nkwenye anyị kwenyere na ‘Chineke nọ n’etiti anyị n’ezie’ bịara sikwuo ike n’ezie.—1 Ndị Kọrint 14:25.

Mgbe nchịkọta nke isiokwu Ụlọ Nche nke dịịrị ọmụmụ maka izu ahụ gasịrị, e ji okwu ikpeazụ bụ́ “Ịrụzu Ọrụ Izi Ihe Anyị n’Ụzọ Dị Ngwa,” kpalie ndị nile na-ezi okwu Chineke bụ́ ndị bịara mgbakọ ahụ, ime ihe. Ntụleghachi dị mkpirikpi nke usoro ihe omume ahụ mesiri ike mkpa ọ dị iji Akwụkwọ Nsọ na-ezi ihe, ụzọ ndị anyị pụrụ isi ghọọ ndị ozizi ruru eru, nakwa mkpa ọ dị inwe obi ike n’eziokwu ahụ anyị na-ezi ndị ọzọ. Ọkà okwu ahụ dụrụ anyị ọdụ ime ka ‘ọganihu anyị pụta ìhè’ nakwa ‘ilezi onwe anyị na ozizi anyị anya mgbe nile.’—1 Timoti 4:15, 16.

Lee oriri ime mmụọ anyị riri ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke”! Ka anyị na-eṅomi Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova, na Onye Ozizi Ukwu anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, n’izi ndị ọzọ okwu Chineke.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Wepụtara Iji Gboo Mkpa Ndị Pụrụ Iche

Ndị bịara Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” ji obi ụtọ nata akwụkwọ abụọ ndị kwesịrị ịba uru dị ukwuu n’izi ndị mmadụ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa. Traktị bụ́ Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ? ga-abụ ngwá ọrụ bara uru iji soro ndị bi n’ala ebe asụsụ ha na-egosighị ọdịiche dị n’etiti “mkpụrụ obi” na “mmụọ” malite mkparịta ụka. Traktị ọhụrụ ahụ gosiri n’ụzọ doro anya na mmụọ, bụ́ ike ndụ, dị iche ná mmụọ e kere eke nakwa na ndị mmadụ adịghị aghọ mmụọ e kere eke mgbe ha nwụrụ.

E wepụtara broshuọ bụ́ A Satisfying Life—How to Attain It (Ndụ Na-eju Afọ—Ụzọ Isi Nweta Ya) n’asụsụ Bekee ná ngwụsị nke ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ. Nzube e ji kwadebe broshuọ a bụ iji malitere ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere Onye Okike nke bụ́ onye nakwa banyere akwụkwọ e dere site n’ike mmụọ nsọ Chineke ọmụmụ Bible. Ì nwewo ike iji akwụkwọ ọhụrụ ndị a mee ihe n’ozi gị?

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Na Milan, Ịtali, nakwa ná mgbakọ dị iche iche e mere gburugburu ụwa, e mere ọtụtụ narị mmadụ baptizim

[Foto dị na peeji nke 29]

Ihe nkiri bụ́ “Kwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù” kpaliri ndị na-ege ntị