Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma

Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma

Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma

“Ihe mejupụtara mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ọ bụla nke ịdị mma na ezi omume na eziokwu.”—NDỊ EFESỌS 5:9.

1. Olee otú ọtụtụ nde mmadụ si egosi ugbu a na ha kwenyere n’ihe e dere n’Abụ Ọma 31:19?

IHE kasị mma mmadụ ọ bụla pụrụ ime bụ inye Jehova otuto. Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-eme nke a site n’ito Chineke maka ịdị mma ya. Dị ka Ndịàmà na-eguzosi ike n’ihe nke Jehova, anyị ji obi anyị dum ekweta ihe ọbụ abụ ahụ kwuru bụ́ onye bụrụ, sị: “Lee ka ezi ihe Gị si baa ụba, nke Ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu Gị.”—Abụ Ọma 31:19.

2, 3. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị ejighị omume ọma kwadoo ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị?

2 Egwu nsọpụrụ anyị na-atụ Jehova na-akwali anyị ito ya maka ịdị mma ya. Ọ na-akpalikwa anyị ‘ikele Jehova, ịgọzi ya, na ikwupụta nsọpụrụ nke alaeze ya.’ (Abụ Ọma 145:10-13) Ọ bụ ya mere anyị ji eji ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ezie, anyị aghaghị iji omume ọma kwadoo ọrụ nkwusa anyị. Ma ọ́ bụghị ya, anyị pụrụ iwetara aha nsọ Jehova nkọcha.

3 Ọtụtụ mmadụ na-azọrọ na ha na-efe Chineke, ma omume ha adịghị ekwekọ n’ụkpụrụ ndị e setịpụrụ n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. Banyere ndị na-adịghị ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzọrọ ha na-azọrọ na ha na-eme ihe ọma, Pọl onyeozi dere sị: “Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị, onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi? Gị, onye na-asị ‘Akwala iko,’ ị̀ na-akwa iko? . . . ‘A na-ekwulu aha Chineke n’ihi unu n’etiti ndị mba ọzọ’; dị nnọọ ka e dere ya.”—Ndị Rom 2:21, 22, 24.

4. Mmetụta dị aṅaa ka omume ọma anyị na-enwe?

4 Kama iwetara aha Jehova nkọcha, anyị na-agbalịsi ike ito ya site n’omume ọma anyị. Nke a na-enwe mmetụta dị mma n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst nọ. Otu ihe bụ na ọ na-enyere anyị aka ime ka ndị na-emegide anyị ghara inwe ọnụ okwu. (1 Pita 2:15) Nke ka mkpa bụ na omume ọma anyị na-adọta ndị mmadụ ná nzukọ Jehova, na-emeghere ha ụzọ inye ya otuto na inweta ndụ ebighị ebi.—Ọrụ 13:48.

5. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụle ugbu a?

5 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ànyị pụrụ isi aṅaa zere omume pụrụ ibutere Jehova mkparị ma mee ka ndị na-achọ eziokwu sụọ ngọngọ? N’ezie, ànyị pụrụ isi aṅaa nwee ihe ịga nke ọma n’igosipụta ịdị mma?

Mkpụrụ nke Ìhè A hụ

6. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ‘ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị ahụ,’ ma mkpụrụ dị aṅaa kwesịrị ịpụta ìhè n’etiti Ndị Kraịst?

6 Dị ka Ndị Kraịst raara onwe ha nye, anyị na-anụ ụtọ ihe na-enyere anyị aka izere ‘ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị ahụ.’ Ha na-agụnye ọrụ ndị na-ebutere Chineke mkparị dị ka ịgha ụgha, izu ohi, okwu mkparị, okwu na-ekwesịghị ekwesị banyere mmekọahụ, omume na-emenye ihere, okwu na-abaghị n’ihe, na ịṅụbiga mmanya ókè. (Ndị Efesọs 4:25, 28, 31; 5:3, 4, 11, 12, 18) Kama itinye aka n’ọrụ ndị dị otú ahụ, anyị “na-eje ije dị ka ụmụ nke ìhè.” Pọl onyeozi kwuru na “ihe mejupụtara mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ọ bụla nke ịdị mma na ezi omume na eziokwu.” (Ndị Efesọs 5:8, 9) Ya mere, ọ bụ site n’ije ije n’ìhè ka anyị ji enwe ike ịnọgide na-egosipụta ịdị mma. Ma olee ụdị ìhè nke a bụ?

7. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nọgide na-egosipụta mkpụrụ nke ịdị mma?

7 N’agbanyeghị ezughị okè anyị, anyị pụrụ igosipụta ịdị mma ma ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè ime mmụọ. “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 119:105) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-egosipụta “mkpụrụ nke ìhè ahụ” site ‘n’ụdị ọ bụla nke ịdị mma,’ anyị aghaghị ịnọgide na-erite uru n’ìhè ime mmụọ a na-achọta n’Okwu Chineke, nke a na-eji nlezianya akọwa ná mbipụta Ndị Kraịst, nke a na-atụlekwa mgbe nile ná nzukọ ofufe anyị. (Luk 12:42; Ndị Rom 15:4; Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ dịkwa anyị mkpa ichebara ihe nlereanya na ozizi Jizọs Kraịst echiche n’ụzọ pụrụ iche, bụ́ “ìhè nke ụwa” na “onyinyo nke ebube [Jehova].”—Jọn 8:12; Ndị Hibru 1:1-3.

Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ

8. Gịnị mere anyị ji enwe ike igosipụta ịdị mma?

8 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ìhè ime mmụọ na-enyere anyị aka igosipụta ịdị mma. Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-enwe ike igosipụta àgwà a n’ihi na mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike nọ n’ọrụ, nke Chineke na-edu anyị. Ịdị mma so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ Jehova, ọ ga-amịpụta n’ime anyị ọmarịcha mkpụrụ ya bụ́ ịdị mma.

9. Ànyị pụrụ isi aṅaa na-eme ihe kwekọrọ n’okwu Jizọs e dekọrọ na Luk 11:9-13?

9 Ọchịchọ anyị na-achọsi ike ime Jehova obi ụtọ site n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ́ ịdị mma, kwesịrị ịkpali anyị ime ihe kwekọrọ n’okwu Jizọs bụ́: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-anata, onye ọ bụla na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ. N’ezie, olee nna ọ bụ n’etiti unu, onye, ọ bụrụ na nwa ya nwoke arịọ ya azụ, nke ga-enye ya agwọ n’ọnọdụ azụ, ma eleghị anya? Ma ọ bụ nke ga-enye ya akpị ma ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá? Ya mere, ọ bụrụ unu, ọ bụ ezie na unu [ezughị okè, n’ihi ya kwa bụrụ] ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:9-13) Ka anyị na-agbaso ndụmọdụ Jizọs site n’ikpe ekpere maka mmụọ Jehova ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-egosipụta mkpụrụ ya bụ́ ịdị mma.

“Nọgide Na-eme Ihe Ọma”

10. Akụkụ ndị dị aṅaa nke ịdị mma Jehova ka e hotara n’Ọpụpụ 34:6, 7?

10 Site n’ìhè ime mmụọ sitere n’Okwu Chineke nakwa site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, anyị pụrụ ‘ịnọgide na-eme ihe ọma.’ (Ndị Rom 13:3) Site n’ịmụchi Bible anya, anyị na-amụtakwu otú anyị pụrụ isi na-eṅomi ịdị mma Jehova. Isiokwu bu ụzọ tụlere akụkụ ụfọdụ nke ịdị mma Chineke bụ́ ndị e hotara n’ihe ahụ a gwara Mozis bụ́ nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 34:6, 7, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba [n’ebere ịhụnanya, NW] na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku mmadụ ebere ịhụnanya, NW], Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” Ilebatụkwu anya n’ụzọ ndị a Jehova si egosipụta ịdị mma ya ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eme ihe ọma.’

11. Ịmara na Jehova bụ onye na-eme ebere na onye na-eme amara kwesịrị isi aṅaa emetụta anyị?

11 Okwu a Chineke kwuru na-eme ka anyị mara mkpa ọ dị iṅomi Jehova site n’ịbụ ndị na-eme ebere na ndị na-eme amara. “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere,” ka Jizọs kwuru, “ebe ọ bụ na a ga-emere ha ebere.” (Matiu 5:7; Luk 6:36) N’ịmara na Jehova bụ onye na-eme amara, a na-akpali anyị igosipụta amara na àgwà ọma n’otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe, gụnyere ndị anyị na-ekwusara ozi ọma. Nke a na-ekwekọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

12. (a) Ebe ọ bụ na Chineke adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ànyị kwesịrị isi aṅaa na-emeso ndị ọzọ ihe? (b) Ebere ịhụnanya Jehova na-akwali anyị ime gịnị?

12 Ebe ọ bụ na Chineke adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọchịchọ anyị ‘ịnọgide na-eme ihe ọma’ na-akpali anyị ịnagide obere mmejọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị na ilekwasị anya n’àgwà ọma ha. (Matiu 7:5; Jems 1:19) Ebere ịhụnanya Jehova na-akwali anyị igosipụta ezi ịhụnanya, ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ. N’ezie, nke a bụ ihe a na-achọsi ike.—Ilu 19:22.

13. Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-eme omume iji gosipụta na Jehova ‘na-aba ụba n’eziokwu’?

13 Ebe ọ bụ na Nna anyị nke eluigwe ‘na-aba ụba n’eziokwu,’ anyị na-achọ ‘ime ka a mata anyị dị ka ndị ozi ya site n’okwu bụ eziokwu.’ (2 Ndị Kọrint 6:3-7) “Ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” so n’ihe asaa rụrụ arụ n’anya Jehova. (Ilu 6:16-19) Ya mere, ọchịchọ anyị ime Chineke obi ụtọ akpaliwo anyị ‘iwepụ okwu ụgha ma na-ekwu eziokwu.’ (Ndị Efesọs 4:25) Ka anyị ghara ịla azụ mgbe ọ bụla n’igosipụta ịdị mma n’ụzọ a dị oké mkpa.

14. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-agbaghara?

14 Okwu Chineke gwara Mozis kwesịkwara ịkwali anyị ịbụ ndị na-agbaghara, n’ihi na Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie. (Matiu 6:14, 15) N’ezie, Jehova na-eweta ntaramahụhụ n’isi ndị mmehie na-enweghị nchegharị. N’ihi ya, anyị aghaghị ịkwado ụkpụrụ ya nke ịdị mma ma a bịa n’idebe ọgbakọ ọcha mgbe nile n’ụzọ ime mmụọ.—Levitikọs 5:1; 1 Ndị Kọrint 5:11, 12; 1 Timoti 5:22.

“Nọrọsienụ Ike na Nche”

15, 16. Olee otú ndụmọdụ Pọl nke e dekọrọ ná Ndị Efesọs 5:15-19 pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-egosipụta ịdị mma?

15 Iji na-agbaso ụzọ nke ịdị mma n’agbanyeghị ihe ọjọọ gbara anyị gburugburu, ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị jupụtara ná mmụọ Chineke na ilezi anya otú anyị na-ejegharị. Iji mezuo nke ahụ, Pọl gbara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ume, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ. N’ihi nke a, kwụsịnụ ịbụ ndị na-enweghị ezi uche, kama nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ. Ọzọ, unu adịla na-aṅụ mmanya gabiga ókè, bụ́ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya, kama nọgidenụ na-ejupụta na mmụọ nsọ, na-agwanụ ibe unu okwu site n’abụ ọma na otuto nye Chineke na abụ ime mmụọ, na-abụ abụ ma na-agụ egwú olu ụtọ n’obi unu nye Jehova.” (Ndị Efesọs 5:15-19) N’ezie, ndụmọdụ a kwesịrị ekwesị nye anyị na mgbe ikpeazụ a pụrụ iche.—2 Timoti 3:1.

16 Ọ bụrụ na anyị gaje ịnọgide na-egosipụta ịdị mma, anyị aghaghị ịnọrọsi na nche ike iji hụ na anyị na-eje ije dị ka ndị na-egosipụta amamihe Chineke. (Jems 3:17) Anyị aghaghị izere mmehie ndị dị oké njọ, anyị aghaghịkwa ịbụ ndị jupụtara na mmụọ nsọ, na-ekwe ka ọ na-eduzi anyị. (Ndị Galeshia 5:19-25) Site n’itinye ndụmọdụ ime mmụọ ndị a na-enye ná nzukọ Ndị Kraịst nakwa ná mgbakọ nile n’ọrụ, anyị pụrụ ịnọgide na-eme ihe ọma. Ihe Pọl gwara ndị Efesọs pụkwara ichetara anyị na n’ihe ka ọtụtụ ná mgbakọta ndị anyị na-agbakọta maka ofufe, anyị na-erite uru site ‘n’abụ ime mmụọ’ ndị anyị ji obi anyị dum na-abụ—ndị ọtụtụ n’ime ha na-ekwu banyere àgwà ime mmụọ, dị ka ịdị mma.

17. Ọ bụrụ na ọnọdụ ha na-egbochi ha ịgachi nzukọ anya, gịnị ka Ndị Kraịst na-arịasi ọrịa ike pụrụ ijide n’aka?

17 Gịnị banyere ndị kwere ekwe ibe anyị bụ́ ndị na-apụghị ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya n’ihi ajọ ọrịa na-adịghị ala ala? Ha pụrụ inwe nkụda mmụọ n’ihi na ha apụghị iso ụmụnna ime mmụọ ha ndị nwoke na ndị nwanyị na-efe Jehova mgbe nile. Ma ha pụrụ ijide n’aka na Jehova na-aghọta ọnọdụ ha, na ọ ga-eme ka ha nọgide n’ìhè ahụ, na ọ ga-enye ha mmụọ ya, na ọ ga-enyekwara ha aka ịnọgide na-eme ezi ihe.—Aịsaịa 57:15.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịgbaso ụzọ nke ịdị mma?

18 Ịgbaso ụzọ nke ịdị mma na-achọ na anyị ga-anọrọ na nche banyere ndị anyị na ha na-akpakọrịta ma gbakụta ndị “na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe” azụ. (2 Timoti 3:2-5; 1 Ndị Kọrint 15:33) Itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ na-enyere anyị aka izere ‘ime ihe ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute’ site n’ime ihe na-ekwekọghị ná nduzi ya. (Ndị Efesọs 4:30) Ọzọkwa, a na-enyere anyị aka ime ihe ọma ma ọ bụrụ na anyị esoro ndị ndụ ha na-agba àmà na ha bụ ndị nwere ịhụnanya maka ezi ihe na-enwe mmekọrịta chiri anya ma bụrụ ndị mmụọ nsọ Jehova na-eduzi.—Emọs 5:15; Ndị Rom 8:14; Ndị Galeshia 5:18.

Ịdị Mma Na-arụpụta Ezi Ihe

19-21. Kọọ ahụmahụ ndị na-egosi mmetụta igosipụta ịdị mma na-enwe.

19 Ije ije n’ìhè ime mmụọ, ịgbaso nduzi nke mmụọ Chineke, na ịnọrọ na nche maka otú anyị si na-eje ije ga-enyere anyị aka izere ihe ọjọọ na ‘ịnọgide na-eme ihe ọma.’ N’aka nke ya, nke a pụrụ ịrụpụta ihe dị mma. Tụlee ahụmahụ nke Zongezile, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na South Africa. Ka ọ na-aga akwụkwọ n’otu ụtụtụ, ọ gara ka ọ mara ego ole o nwere n’ụlọ akụ̀. Mpempe akwụkwọ si n’ígwè na-agụ ego gosiri n’ụzọ na-ezighị ezi na ego ya tụkwasịrị R42,000 ($6,000, U.S.). Otu onye nche ụlọ akụ̀ na ndị ọzọ gbara ya ume ịdọrọ ego ahụ ma tinye ya n’ụlọ akụ̀ ọzọ ka ọ bụrụzie nke ya. Ọ bụ nanị di na nwunye bụ́ Ndịàmà ya na ha bi jara ya mma maka adọrọghị nke ọ bụla n’ime ego ahụ.

20 N’ụbọchị ọzọ ụlọ akụ̀ ahụ rụrụ ọrụ, Zongezile kọọrọ ụlọ akụ̀ ahụ banyere ihe ahụ e mehiere. A chọpụtara na nọmba ihe ndekọ ego ya yiri nke otu ọchụnta ego bụ́ aka ji akụ̀ bụ́ onye ji ihie ụzọ tinye ego ya n’ihe ndekọ ego na-abụghị nke ya. N’ịbụ onye nwere ihe ijuanya na Zongezile emefughị otu kobo n’ego ahụ, ọchụnta ego ahụ jụrụ ya, sị: “Olee okpukpe ị na-ekpe?” Zongezile kọwara na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O nwetara ịja mma na-ekpo ọkụ n’aka ndị ọrụ ụlọ akụ̀ ahụ, bụ́ ndị kwuru, sị: “Ọ dị anyị ka ya bụrụ na mmadụ nile na-eme ihe n’eziokwu dị ka Ndịàmà Jehova.” N’eziokwu, ime ihe n’eziokwu na ịdị mma pụrụ ime ka ndị ọzọ nye Jehova otuto.—Ndị Hibru 13:18.

21 Ọ bụghị iwu na a ga-egosipụta ịdị mma n’ụzọ dị ịrịba ama tupu ya enwee mmetụta dị mma. Iji maa atụ: Otu Onyeàmà na-eto eto bụ́ onye na-eje ozi dị ka onye nkwusa ozi ọma oge nile n’otu n’ime àgwàetiti ndị dị na Samoa gara n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè ahụ. Ndị mmadụ nọ na-eche ka ha hụ dọkịta, Onyeàmà ahụ chọpụtakwara na ahụ jisiri otu agadi nwanyị nọketere ya ike. O mere ndokwa ka nwanyị ahụ were oge nke ya gaa ka e wee labara ya anya ngwa ngwa. N’oge ọzọ, Onyeàmà ahụ zutere agadi nwanyị a n’ọmà ahịa. Nwanyị ahụ chetara ya, chetakwa ezi ihe o mere n’ụlọ ọgwụ. “Ugbu a ka m maara na Ndịàmà Jehova hụrụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie,” ka o kwuru. Ọ bụ ezie na ọ dịbughị anabata ozi Alaeze ahụ, ịdị mma Onyeàmà ahụ gosiri ya nwere mmetụta dị mma. O kwere ka a malitere ya ọmụmụ Bible ebe obibi ma malite inweta ihe ọmụma nke Okwu Chineke.

22. Gịnị bụ otu ụzọ dị ịrịba ama karịsịa isi “nọgide na-eme ihe ọma”?

22 Ikekwe, ị pụrụ ịkọ ahụmahụ ndị na-egosi uru igosipụta ịdị mma bara. Otu ụzọ dị ịrịba ama karịsịa isi “nọgide na-eme ihe ọma” bụ ikerechi òkè anya n’ịkpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ka anyị nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ọrụ a dị oké ọnụ ahịa, na-amara na nke a bụ otu ụzọ isi na-eme ihe ọma, karịsịa n’ebe ndị nabatara ya nke ọma nọ. Nke kasị mkpa bụ na ozi anyị na omume ọma anyị na-enye Jehova otuto, bụ́ kpọmkwem isi iyi nke ịdị mma.—Matiu 19:16, 17.

Nọgide “Na-eme Ihe Ọma”

23. Gịnị mere ozi Ndị Kraịst ji bụrụ ọrụ ọma?

23 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ozi anyị bụ ọrụ ọma. Ọ pụrụ ịrụpụta nzọpụta nye anyị nakwa nye ndị na-ege ntị n’ozi Bible ma si otú ahụ na-abanye n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Matiu 7:13, 14; 1 Timoti 4:16) Mgbe ahụ, mgbe anyị na-achọ ime mkpebi, ọchịchọ ime ihe ọma pụrụ ime ma eleghị anya ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú mkpebi a ga-esi emetụta ọrụ nkwusa Alaeze m? Ụzọ m na-atụle ịgbaso ọ̀ dị mma n’ezie? Ọ̀ ga-eme ka m nwee ike inyere ndị ọzọ aka ịnakwere “ozi ọma ebighị ebi” ahụ ma soro Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya?’ (Mkpughe 14:6) Anyị ga-enweta obi ụtọ dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị na-eme mkpebi ndị na-eme ka ihe ndị metụtara Alaeze na-aga n’ihu.—Matiu 6:33; Ọrụ 20:35.

24, 25. Olee ụzọ ụfọdụ e si eme ihe ọma n’ọgbakọ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ijide n’aka ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-egosipụta ịdị mma?

24 Ya adịla mgbe anyị ga-eleda mmetụta bara uru nke ịdị mma na-enwe anya. Anyị pụrụ ịnọgide na-egosipụta àgwà a site n’ịdị na-akwado ọgbakọ Ndị Kraịst na ime ihe anyị pụrụ ime iji na-ahụ maka ọdịmma ya. N’ezie, anyị na-eme ihe ọma mgbe anyị na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya ma na-ekerechi òkè anya na ya. Ọnụnọ anyị kpọmkwem na-agba ndị anyị na ha na-efekọ ofufe ume, azịza anyị kwadebere nke ọma zaa na-ewulikwa ha elu n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-emekwa ihe ọma mgbe anyị na-eji ihe onwunwe anyị elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na mgbe anyị na-enye aka na-elezi ya anya nke ọma. (2 Ndị Eze 22:3-7; 2 Ndị Kọrint 9:6, 7) N’ezie, “ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.”—Ndị Galeshia 6:10.

25 Anyị apụghị ikwucha ọnọdụ nile ga-achọ ka e gosipụta ịdị mma. Ya mere, ka anyị na-ezute ihe ịma aka ndị ọhụrụ, ka anyị chọọ ìhè site n’Akwụkwọ Nsọ, na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ Jehova, ma na-eme ike anyị nile n’imezu uche ya ziri ezi ma zuo okè. (Ndị Rom 2:9, 10; 12:2) Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-agọzi anyị n’ụba ka anyị na-anọgide na-egosipụta ịdị mma.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ànyị pụrụ isi aṅaa mee ihe kasị mma?

• Gịnị mere e ji kpọọ ịdị mma “mkpụrụ nke ìhè”?

• Gịnị mere e ji kpọọ ịdị mma “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?

• Mmetụta dị aṅaa ka omume ọma anyị na-enwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka igosipụta ịdị mma

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Igosipụta ịdị mma na-arụpụta ezi ihe