Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Osisi “Anya Mmiri Na-agba” na “Anya Mmiri” Ya E Ji Eme Ọtụtụ Ihe

Osisi “Anya Mmiri Na-agba” na “Anya Mmiri” Ya E Ji Eme Ọtụtụ Ihe

Osisi “Anya Mmiri Na-agba” na “Anya Mmiri” Ya E Ji Eme Ọtụtụ Ihe

“Werenụ balsam maka ihe mgbu,” ka Jeremaịa 51:8 (NW) na-ekwu. Ka anyị chọrọ otu n’ime ihe e si na ha enweta ọgwụ a na-ebelata nnọọ ihe mgbu ma na-agwọ ọrịa gaa n’àgwàetiti Chios nke dị n’Oké Osimiri Aegean.

NÁ MMALITE oge okpomọkụ, ndị ọrụ ugbo nọ na Chios na-akwadebe maka iwe ihe ubi n’ụzọ a na-esikebeghị nnọọ ewe ihe ubi. Mgbe ha zachasịrị ala, ha na-ete ájá ụrọ gburugburu ihe ọkụkụ ndị yiri osisi bụ́ ndị a na-akpọ osisi mastic. Ndị ọrụ ugbo ahụ na-aka osisi ndị ahụ mma, na-eme ka “anya mmiri gbawa” ha. “Anya mmiri” na-acha nzu nzu nke bụ́ mmiri osisi ahụ na-amalite ịgbapụta. Mgbe izu abụọ ma ọ bụ atọ gasịrị, mmiri ahụ gbapụtaranụ na-akpụkọta ọnụ, ndị ọrụ ugbo ahụ na-ewekọtakwa ha, ma ọ́ bụghị kpọmkwem site n’ahụ́ osisi ahụ ya abụrụ site n’ala ụrọ ahụ dị n’okpuru. E jiwo “anya mmiri” ndị a, bụ́ ndị a na-akpọ mgba mastic, mepụta balsam.

Otú ọ dị, tupu a na-ewe ihe ubi, a chọrọ ndidi na ịrụsi ọrụ ike. Ogwe osisi ahụ tụhịrị atụhị nke na-acha nzu nzu na-eji nwayọọ eto. Ọ na-ewe afọ 40 ruo 50 tupu otu osisi etozuo etozuo—ọ na-adịkarị site na mita abụọ ruo atọ n’ogologo.

E wezụga ọrụ dị n’ịka ogwe osisi ahụ mma na iwekọta “anya mmiri” ndị ahụ, a chọkwuru ọrụ iji mepụta mastic. Mgbe ndị ọrụ ugbo wekọtasịrị “anya mmiri” nke osisi mastic, ha na-aza ha aza, saa ha mmiri, ma debe ha nke ọ bụla na nke ya na ya hà nakwa dị ka ọdịdị ha si dị. Mgbe e mesịrị, a na-asachakwu mastic ahụ ma nwezie ike iji ya mee ọtụtụ ihe.

Akụkọ Banyere Otu Ihe Ọkụkụ Dị Oké Ọnụ Ahịa

Okwu Grik maka “mastic” na “ịta ikikere ezé” nwere njikọ. Aha a na-egosi na, site n’oge ochie, a nọwo na-eji mmiri mastic eme ihe dị ka chịngọm iji mee ka ọnụ na-esi ísì ọma.

Ihe ọmụma kasị ochie e nwere banyere mastic sitere n’aka Herodotus, bụ́ onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ nke ise T.O.A. Ndị oge ochie ndị ọzọ bụ́ ndị edemede na ndị dibịa—gụnyere Apollodorus, Dioscorides, Theophrastus, na Hippocrates—kwuru banyere iji mastic agwọ ọrịa. Ọ bụ ezie na osisi mastic na-eto n’Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian nile, kemgbe ihe dị ka 50 O.A., ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị na Chios ka a na-emepụta mastic. Mastic bụkwa isi ihe kasị masị ndị meriri Chios, malite ná ndị Rom, ndị Genoa, ruo ná ndị Ottoman.

Mastic E Ji Eme Ọtụtụ Ihe

Ndị dibịa nke Ijipt oge ochie jiri mastic gwọọ ọtụtụ ọrịa, gụnyere afọ ọsịsa na ogbu na nkwonkwo. Ha jikwa ya mee ihe dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nakwa n’ịgbasi ozu. Ọ pụrụ ịbụwo na osisi mastic so n’ebe ndị e si nweta ‘balsam nke Gilead,’ bụ́ nke a maara na Bible maka iji ya agwọ ọrịa, jiri ya emepụta ihe ntecha, jirikwa ya agbasi ozu. (Jeremaịa 8:22, NW; 46:11) A tụwo aro na ọ pụrụ ịbụ na osisi ahụ na-amịpụta stacte, bụ́ otu n’ime ihe e ji esure ihe nsure ọkụ dị nsọ na-esi ísì ụtọ bụ́ nke e ji eme nanị ihe dị nsọ, so n’ezinụlọ osisi mastic.Ọpụpụ 30:34, 35.

Taa, a na-ahụ mastic ná mmiri ọgwụ e ji echekwa ihe ndị e ji ágbá see, oche, na ngwá egwu. E ji ya eme ihe dị ka ihe e ji egbochi okpomọkụ ma ọ bụ ihe e ji eme ka mmiri ghara ịbanye n’ihe, a na-ewerekwa ya dị ka otu n’ime ihe ndị kasị mma e ji eme ka ágbá ghara ịchanwụ achanwụ maka iji ya tejie ákwà na iji ya see ihe. E jiwokwa mastic mee ihe n’imepụta mgba nakwa n’imepụta akpụkpọ anụ. N’ihi ísì ọma ya na ihe ndị ọzọ o nwere, e ji mastic emepụta ncha, ihe ntecha, na ihe ndị na-esi ísì ụtọ a na-agba n’ahụ.

A kọwawo mastic n’ihe ndepụta 25 a nakweere ebe nile nke ọgwụ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ụwa nile. A ka na-ejikarị ya eme ihe n’ọgwụ ọdịnala ná mba ndị Arab. E jikwa mastic emepụta ọgwụ ezé, jirikwa ya emepụta ahụ́ mkpụrụ ọgwụ rọba.

Dị ka ebe e si enweta balsam, “anya mmiri” e ji eme ọtụtụ ihe nke osisi mastic “anya mmiri na-agba” ebelatawo ihe mgbu ma gwọọ ọrịa ruo ọtụtụ narị afọ. Ya mere, e nwere ezi ihe mere amụma Jeremaịa ji na-asị: “Werenụ balsam maka ihe mgbu.”

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Chios

Iwekọta “mastic”

E ji nlezianya ewekọta “anya mmiri” nke “mastic”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Chios na ihe osise ebe a na-ewekọta mastic: Site n’Ọ́bá Akwụkwọ Korais; ndị ọzọ nile: Kostas Stamoulis