Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?

Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?

Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?

“Nna ahụ . . . ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ.”—JỌN 14:16, 17.

1. Ihe ọmụma dị aṅaa dị mkpa ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’ime awa ndị ikpeazụ ya na ha nọrọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu?

“ONYENWE anyị, olee ebe ị na-aga?” Nke ahụ bụ otu n’ime ajụjụ ndịozi Jizọs jụrụ ya n’ime awa ndị ikpeazụ ahụ ya na ha nọrọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu na Jeruselem. (Jọn 13:36) Ka nzukọ ahụ na-aga n’ihu, Jizọs gwara ha na oge eruwo ka ya hapụ ha iji laghachikwuru Nna ya. (Jọn 14:28; 16:28) Ọ gaghịzi anọnyere ha n’anụ ahụ́ inye ha ntụziaka na ịza ajụjụ ha. Otú ọ dị, o mesighachiri ha obi ike, na-asị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka [ma ọ bụ, ihe nkasi obi] ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.”—Jọn 14:16, ihe odide ala ala peeji nke NW Bekee.

2. Gịnị ka Jizọs kwere nkwa izitere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ lasịrị?

2 Jizọs kwuru ihe ihe inyeaka ahụ bụ ma kọwaa ụzọ ọ ga-esi enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. Ọ gwara ha, sị: “Otú ọ dị, agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọ. Ma ugbu a m na-agakwuru onye ahụ zitere m . . . Ọ bụ maka abamuru unu ka m ji na-ala. N’ihi na ọ bụrụ na alaghị m, ihe inyeaka ahụ agaghị abịakwute unu ma ọlị; ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya. . . . Mgbe ihe ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, ọ ga-eduru unu gaa n’eziokwu nile.”—Jọn 16:4, 5, 7, 13.

3. (a) Olee mgbe e ziteere Ndị Kraịst oge mbụ “mmụọ nke eziokwu ahụ”? (b) Olee otu ụzọ dị mkpa nke mmụọ ahụ si bụụrụ ha “ihe inyeaka”?

3 E mezuru nkwa a na Pentikọst 33 O.A., dị ka Pita onyeozi gbara akaebe ya, sị: “Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ eziokwu nke anyị nile bụ ndị àmà ya. Ya mere, n’ihi na e buliri ya elu gaa n’aka nri nke Chineke, o wee nata mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa site n’aka Nna ya, ọ wụpụwo ihe a nke unu na-ahụ ma na-anụ.” (Ọrụ 2:32, 33) Dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa, mmụọ nsọ ahụ a wụpụrụ na Pentikọst rụzuuru Ndị Kraịst oge mbụ ahụ ọtụtụ ihe. Ma Jizọs kwere nkwa na “mmụọ nke eziokwu ahụ” ‘ga-echetara ha ihe nile ọ gwaworo ha.’ (Jọn 14:26) Ọ ga-enyere ha aka icheta ozi na ozizi Jizọs, ọbụna kpọmkwem ihe ndị o kwuru, na idetu ha edetu. Nke a ga-enyere Jọn onyeozi meworo agadi aka karịsịa ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., bụ́ mgbe ọ ga-amalite idekọ Oziọma ya. Ihe ndekọ ahụ ga-agụnye ndụmọdụ ahụ dị oké ọnụ ahịa Jizọs nyere mgbe o guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya.—Jọn isi 13-17.

4. Olee otú “mmụọ nke eziokwu ahụ” si nyere Ndị Kraịst oge mbụ e tere mmanụ aka?

4 Jizọs kwekwara ndị na-eso ụzọ oge mbụ ahụ nkwa na mmụọ ahụ ‘ga-akụziri ha ihe nile’ ma ‘duru ha gaa n’eziokwu nile.’ Mmụọ ahụ ga-enyere ha aka ịghọta ihe ndị ka mie emie nke Akwụkwọ Nsọ ma mee ka ha nọgide na-adị n’otu n’echiche, nghọta, na nzube. (1 Ndị Kọrint 2:10; Ndị Efesọs 4:3) N’ụzọ dị otú a, mmụọ nsọ ahụ nyere Ndị Kraịst oge mbụ ahụ ike ijikọta aka rụọ ọrụ dị ka otu ìgwè nke “ohu na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” iji nye Ndị Kraịst e tere mmanụ n’otu n’otu ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’—Matiu 24:45.

Mmụọ ahụ Na-agba Àmà

5. (a) Olee ihe ọhụrụ Jizọs kpugheere ndị na-eso ụzọ ya n’abalị Nisan 14, 33 O.A.? (b) Òkè dị aṅaa ka mmụọ nsọ ga-ekere n’imezu nkwa Jizọs?

5 N’abalị Nisan 14, 33 O.A., Jizọs gbanyeere ndị na-eso ụzọ ya izu na ya ga-emesịa nabata ha, ha esorokwa ya na Nna ya biri n’eluigwe. Ọ gwara ha, sị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị. Ma ọ́ bụghị ya, m gaara agwa unu, n’ihi na m na-aga ịkwadebere unu ebe. Ọzọ, ọ bụrụ na mụ agaa wee kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.” (Jọn 13:36; 14:2, 3) Ha ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. (Luk 22:28-30) Ka ha wee nwee olileanya eluigwe a, a ‘ga-amụ ha site na mmụọ nsọ’ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke, teekwa ha mmanụ iso Kraịst jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.—Jọn 3:5-8; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22; Taịtọs 3:5-7; 1 Pita 1:3, 4; Mkpughe 20:6.

6. (a) Olee mgbe ọkpụkpọ eluigwe ahụ malitere, mmadụ ole natakwara ọkpụkpọ a? (b) È mere ndị a kpọrọ baptizim baa na gịnị?

6 “Ọkpụkpọ eluigwe” a malitere na Pentikọst 33 O.A., nakwa n’akụkụ bụ́ isi, yie ka ọ bịara ná njedebe n’etiti afọ ndị 1930. (Ndị Hibru 3:1) Ọnụ ọgụgụ nke ndị e ji mmụọ nsọ kaa akara ịbụ akụkụ nke Izrel ime mmụọ bụ 144,000, bụ́ “ndị e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta.” (Mkpughe 7:4; 14:1-4) E mere ndị a baptizim baa n’ahụ́ ime mmụọ nke Kraịst, baa n’ọgbakọ ya, baakwa n’ọnwụ ya. (Ndị Rom 6:3; 1 Ndị Kọrint 12:12, 13, 27; Ndị Efesọs 1:22, 23) Mgbe e mesịrị ha baptizim ime mmiri ma were mmụọ nsọ tee ha mmanụ, ha banyere n’ụzọ ndụ iji onwe onye achụ àjà, bụ́ ndụ nke iguzosi ike n’ezi ihe ruo ọnwụ ha.—Ndị Rom 6:4, 5.

7. Gịnị mere o ji bụrụ nanị Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekere òkè n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihe nnọchianya ahụ e ji eme ihe n’Ememe Ncheta?

7 Dị ka ndị Izrel ime mmụọ, Ndị Kraịst a e tere mmanụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke dị n’etiti Jehova na “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16; Jeremaịa 31:31-34) E ji ọbara Kraịst a wụsịrị mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè. Jizọs kpọtụrụ nke a uche mgbe o guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya. Luk na-ede, sị: “O weere otu ogbe achịcha, nye ekele, nyawaa ya, ma were ya nye ha, na-asị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m bụ́ nke a gaje inye n’ihi unu. Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.’ Ọzọ, o buuru iko ahụ n’otu ụzọ ahụ mgbe ha risịworo nri anyasị, na-asị: ‘Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke na-adabere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.’” (Luk 22:19, 20) Ihe ahụ fọdụrụ, ma ọ bụ ndị fọdụrụ na 144,000 bụ́ ndị ka nọ n’ụwa, bụ ndị na-ekere òkè n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’achịcha na mmanya ahụ e ji eme ihe nnọchianya n’Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst.

8. Olee otú ndị e tere mmanụ si amata na ha anatawo ọkpụkpọ eluigwe?

8 Olee otú ndị ahụ e tere mmanụ si amata na ha anatawo ọkpụkpọ eluigwe? Mmụọ nsọ na-agbara ha àmà n’ụzọ doro anya. Pọl onyeozi degaara ndị dị otú ahụ akwụkwọ, sị: “Ndị nile mmụọ Chineke na-edu, ndị a bụ ụmụ Chineke. . . . Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ma ọ bụrụhaala na anyị atakọọ ahụhụ ka e wee mee ka anyị nwekọọ ebube.” (Ndị Rom 8:14-17) Àmà a mmụọ ahụ na-agba dị nnọọ ike nke na ndị nwetụrụ obi abụọ ma ha natara ọkpụkpọ eluigwe ahụ pụrụ iji ezi uche kwubie na ha anataghị ya, n’ihi ya kwa, ha ga-ahapụ ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ n’Ememe Ncheta.

Mmụọ ahụ na Atụrụ Ọzọ Ahụ

9. Ìgwè abụọ dị aṅaa dịrịtara iche ka a kpọtụrụ aha n’Oziọma ndị ahụ nakwa n’akwụkwọ Mkpughe?

9 N’iburu n’uche ọnụ ọgụgụ dị nta nke Ndị Kraịst a kpọrọ imejupụta Izrel ime mmụọ, Jizọs zoro aka n’ebe ha nọ dị ka “ìgwè atụrụ nta.” A nabatara ha “n’ogige atụrụ” nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, n’ụzọ dị iche ‘n’atụrụ ọzọ’ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị Jizọs kwuru na ya aghaghịkwa ịchịkọta. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ a chịkọtara na mgbe ọgwụgwụ ga-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ́ ndị na-aghaghị ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ,’ na-enwe atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. N’ụzọ na-akpali mmasị, ọhụụ Jọn hụrụ ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., gosiri ọdịiche dị n’etiti oké ìgwè mmadụ a na ndị òtù144,000 nke Izrel ime mmụọ. (Mkpughe 7:4, 9, 14) Atụrụ ọzọ ahụ hà so anata mmụọ nsọ, ọ bụrụ na ha na-anata, olee otú o si emetụta ndụ ha?

10. È si aṅaa eme atụrụ ọzọ ahụ baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ”?

10 N’ezie, mmụọ nsọ na-ekere òkè dị mkpa ná ndụ nke atụrụ ọzọ ahụ. Ha na-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova site n’ịbụ ndị e mere baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Ha na-anakwere ọbụbụeze Jehova, na-edo onwe ha n’okpuru Kraịst dị ka Eze na Onye Mgbapụta ha, ma na-ekwe ka mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, na-arụ ọrụ ná ndụ ha. Kwa ụbọchị, ha na-agbalị ịzụlite “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” ná ndụ ha, ndị bụ́ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.

11, 12. (a) È si aṅaa doo ndị ahụ e tere mmanụ nsọ n’ụzọ pụrụ nnọọ iche? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e si doo atụrụ ọzọ ahụ nsọ ma mee ka ha dị nsọ?

11 Atụrụ ọzọ ahụ aghaghịkwa ikwe ka Okwu Chineke na mmụọ nsọ mee ka ha dị ọcha, ma ọ bụ doo ha nsọ. E doworịị ndị e tere mmanụ nsọ n’ụzọ pụrụ nnọọ iche, n’ihi na a kpọrọ ha ndị ezi omume na ndị dị nsọ dị ka nwunye ọhụrụ nke Kraịst. (Jọn 17:17; 1 Ndị Kọrint 6:11; Ndị Efesọs 5:23-27) Daniel onye amụma kwuru banyere ha dị ka “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” bụ́ ndị ga-anata Alaeze dị n’aka “nwa nke mmadụ,” bụ́ Kraịst Jizọs. (Daniel 7:13, 14, 18, 27) Tupu mgbe ahụ, site n’ọnụ Mozis na Erọn, Jehova gwara mba Izrel, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova Chineke unu: unu ga-edokwa onwe unu nsọ, wee dị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.”—Levitikọs 11:44.

12 Okwu ahụ bụ́ “ido nsọ” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “usoro nke ime ka a dị nsọ, ịdopụ iche, ma ọ bụ idebe ihe iche maka ozi Jehova Chineke ma ọ bụ maka ya iji mee ihe; ọnọdụ nke ịdị nsọ, ịbụ onye e doro nsọ, ma ọ bụ onye e mere ka ọ dị ọcha.” Laarị azụ na 1938, Ụlọ Nche (Bekee) kwuru na ndị òtù Jonadab, ma ọ bụ atụrụ ọzọ ahụ, “aghaghị ịmụta na nraranye na ido nsọ bụ ihe a chọrọ n’aka onye ọ bụla nke ga-aghọ akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ ma biri n’ụwa.” N’ọhụụ banyere oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe, e kwuru banyere ha dị ka ndị ‘saworo uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ’ nakwa dị ka ndị na-ejere Jehova “ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.” (Mkpughe 7:9, 14, 15) Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, atụrụ ọzọ ahụ na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị nsọ Jehova chọrọ.—2 Ndị Kọrint 7:1.

Imere Ụmụnna Kraịst Ihe Ọma

13, 14. (a) Dị ka ilu Jizọs banyere atụrụ na ewu si dị, na gịnị ka nzọpụta nke atụrụ ahụ dabeere? (b) N’oge ọgwụgwụ a, olee otú atụrụ ọzọ ahụ siworo meere ụmụnna Kraịst ihe ọma?

13 Jizọs mere ka nkekọ chiri anya dị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ na ìgwè atụrụ nta ahụ dị n’ilu ya banyere atụrụ na ewu, bụ́ nke so n’amụma ya banyere “ngwụsị nke usoro ihe a” pụta ìhè. N’ilu ahụ, Kraịst gosiri n’ụzọ doro anya na nzọpụta nke atụrụ ọzọ ahụ na àgwà ha ga-akpaso ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị ọ kpọrọ “ụmụnna m,” nwere njikọ chiri anya. O kwuru, sị: “Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziworo, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa. . . . N’ezie asị m unu, Ruo n’ókè unu meere ya otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna m ndị a, unu meere m ya.’”—Matiu 24:3; 25:31-34, 40.

14 Okwu bụ́ “ruo n’ókè unu meere ya” na-ezo aka ná nkwado ịhụnanya e nyere ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta, bụ́ ndị ụwa Setan mesoworo ihe dị ka ndị ala ọzọ, ọbụna na-atụba ụfọdụ n’ime ha n’ụlọ mkpọrọ. Mkpa ihe oriri, uwe ga-ezuru ha, na nlekọta ahụ́ ike akpawo ha. (Matiu 25:35, 36, ihe odide ala ala peeji nke NW Bekee) N’oge ọgwụgwụ a, kemgbe 1914, ọtụtụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ achọtawo onwe ha n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’oge a na-agba akaebe na ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, akwadowo ha n’ihi na mmụọ ahụ kpaliri ha ime otú ahụ.

15, 16. (a) N’ọrụ dị aṅaa ka atụrụ ọzọ ahụ nyewooro ụmụnna Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa aka karịsịa? (b) Olee otú ndị ahụ e tere mmanụ siworo gosipụta ekele ha nwere n’ebe atụrụ ọzọ ahụ nọ?

15 Ụmụnna Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa n’oge ọgwụgwụ a enwetawo nkwado siri ike nke atụrụ ọzọ ahụ karịsịa n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere bụ́ ‘ikwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.’ (Matiu 24:14; Jọn 14:12) Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ nke ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa anọwo na-ebelata ka afọ na-agabiga, nke atụrụ ọzọ ahụ amụbawo n’ụzọ nkịtị ruo ọtụtụ nde. Ọtụtụ puku n’ime ndị a ejewo ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile—ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ—na-ezisa ozi ọma Alaeze ahụ ruo “n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ndị ọzọ na-ekere òkè n’ọrụ ịgba àmà ahụ ruo n’ókè ha nwere ike ma jiri ọṅụ were ego na-akwado ọrụ a dị mkpa.

16 Lee ka ụmụnna Kraịst e tere mmanụ si enwe ekele maka nkwado a atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị ibe ha ji iguzosi ike n’ihe na-enye ha! E kwupụtara mmetụta ha nwere n’ụzọ dị mma n’akwụkwọ bụ́ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, bụ́ nke òtù ohu ahụ bipụtara na 1986. Ọ na-asị: “Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, mmezu nke amụma Jisọs maka ‘ọgwụgwụ oge a’ bụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi ọrụ nke ‘oké ìgwè mmadụ’ nke ‘atụrụ ọzọ’ ahụ na-arụ. . . . N’ihi ya, ekele dị ukwuu dịrị ‘oké ìgwè mmadụ’ ahụ si mba nile, ndị nwekwara asụsụ dị iche iche, n’ihi òkè dị ukwuu ha kerewooro n’imezu amụma nke [Jizọs] na Matiu 24:14!”

‘E Meghị Ka Ha Zuo Okè n’Agụnyeghị Anyị

17. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị a ga-esi n’ọnwụ kpọlite ibi n’ụwa si bụrụ ndị a ‘na-agaghị eme ka ha zuo okè n’agụnyeghị’ ndị e tere mmanụ?

17 N’ikwu dị ka otu n’ime ndị e tere mmanụ ma na-ezo aka n’ebe ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nọ bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Kraịst, Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị a nile, ọ bụ ezie na a gbara àmà banyere ha site n’okwukwe ha, enwetaghịkwa mmezu nke nkwa ahụ, ebe ọ bụ na Chineke bu ụzọ hụ ihe ka mma maka anyị [ndị ahụ e tere mmanụ], ka e wee ghara ime ka ha zuo okè n’agụnyeghị anyị.” (Ndị Hibru 11:35, 39, 40) Na Narị Afọ Iri ahụ, Kraịst na 144,000 bụ́ ụmụnna ya e tere mmanụ nọ n’eluigwe, ga-arụ ọrụ dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, ma mee ka uru nke àjà mgbapụta Kraịst rute n’ụwa. N’ụzọ dị otú ahụ, ‘a ga-eme ka atụrụ ọzọ ahụ zuo okè’ n’ahụ́ na n’uche.—Mkpughe 22:1, 2.

18. (a) Gịnị ka eziokwu ndị ahụ dị na Bible kwesịrị inyere atụrụ ọzọ ahụ aka ịghọta? (b) N’olileanya dị aṅaa ka atụrụ ọzọ ahụ na-echere “mkpughe nke ụmụ Chineke”?

18 Ihe a nile kwesịrị ịkụnye n’uche nke atụrụ ọzọ ahụ ihe mere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ji lekwasị nnọọ anya nke ukwuu n’ebe Kraịst na ụmụnna ya e tere mmanụ nọ nakwa n’òkè bụ́ isi ha na-ekere n’imezu nzube Jehova. N’ihi ya, atụrụ ọzọ ahụ na-agụ ya dị ka ihe ùgwù ịkwado òtù ohu ahụ e tere mmanụ n’ụzọ ọ bụla kwere ha omume ka ha na-echere “mkpughe nke ụmụ Chineke” n’Amagedọn nakwa na Narị Afọ Iri ahụ. Ha pụrụ ilepụ anya gaa n’ịbụ ndị e mere ka ha ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:19-21.

Ịbụ Ndị E Jikọtara na Mmụọ ahụ n’Ememe Ncheta

19. Gịnị ka “mmụọ nke eziokwu ahụ” mewooro ndị ahụ e tere mmanụ na ndị enyi ha, oleekwa otú a ga-esi mee ka ha dịrị n’otu karịsịa n’uhuruchi nke March 28?

19 N’ekpere mmechi ya n’abalị Nisan 14, 33 O.A., Jizọs sịrị: “M na-arịọ arịrịọ . . . ka ha nile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka ha na anyị wee dị n’otu, ka ụwa wee kwere na i zitere m.” (Jọn 17:20, 21) Chineke ji ịhụnanya zite Ọkpara ya inye ndụ ya maka nzọpụta nke ndị ahụ e tere mmanụ na ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (1 Jọn 2:2) “Mmụọ nke eziokwu ahụ” emewo ka ụmụnna Kraịst na ndị enyi ha dịrị n’otu. N’uhuruchi nke March 28, mgbe anyanwụ dasịrị, òtù abụọ ahụ ga-ezukọta ime ememe ncheta ọnwụ Kraịst ma cheta ihe nile Jehova mewooro ha site n’àjà nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Kraịst Jizọs. Ka ọnụnọ ha n’ememe ahụ dị mkpa wusie ịdị n’otu ha ike ma mee ka mkpebi ha ịnọgide na-eme uche Chineke dịghachi ọhụrụ, si otú ahụ na-enye ihe àmà na ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi iso ná ndị Jehova hụrụ n’anya.

Ná Ntụleghachi

• Olee mgbe e ziteere Ndị Kraịst oge mbụ “mmụọ nke eziokwu ahụ,” oleekwa otú o si bụrụ “ihe inyeaka”?

• Olee otú ndị ahụ e tere mmanụ si amata na ha anatawo ọkpụkpọ nke eluigwe?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmụọ Chineke si arụ ọrụ n’ahụ́ atụrụ ọzọ ahụ?

• Olee otú atụrụ ọzọ ahụ siworo meere ụmụnna Kraịst ihe ọma, gịnịkwa mere na ‘a gaghị eme ka ha zuo okè n’agụnyeghị’ ndị ahụ e tere mmanụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

A wụsara ndị ahụ na-eso ụzọ “mmụọ nke eziokwu ahụ” na Pentikọst 33 O.A.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Atụrụ ọzọ ahụ emeworo ụmụnna Kraịst ihe ọma site n’ịkwado ha n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere bụ́ ime nkwusa