Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì So ná Ndị Chineke Hụrụ n’Anya?

Ì So ná Ndị Chineke Hụrụ n’Anya?

Ì So ná Ndị Chineke Hụrụ n’Anya?

“Onye nwere ihe ndị m nyere n’iwu ma na-edebe ha, onye ahụ bụ onye hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya.”—JỌN 14:21.

1, 2. (a) Olee otú Jehova si gosipụta ịhụnanya ya maka ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Gịnị ka Jizọs guzobere n’abalị Nisan 14, 33 O.A.?

JEHOVA hụrụ ihe o kere eke bụ́ mmadụ n’anya. N’ezie, ọ hụrụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’anya “nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ka oge ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na-eru nso, ezi Ndị Kraịst kwesịrị ịma, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, na Jehova “hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya dị ka àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:10.

2 N’abalị Nisan 14, 33 O.A., Jizọs na ndịozi ya 12 zukọrọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ na Jeruselem ime Ememe Ngabiga, nke e ji echeta nnapụta a napụtara ụmụ Izrel n’Ijipt. (Matiu 26:17-20) Mgbe ha mesịrị ememe ndị Juu a, Jizọs mere ka Judas Iskarịọt pụọ, o wee guzobe otu oriri a ga-eji na-echeta ihe bụ́ nke gaje ịghọ Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke Ndị Kraịst ga na-eme. * N’iji achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe dị ka ihe nnọchianya nke ahụ́ na ọbara ya, Jizọs mere ka ndịozi ya 11 fọdụrụnụ kerekọta òkè n’oriri a dị nsọ. Ndị dere Oziọma ndị ahụ Yiri Onwe Ha bụ́ Matiu, Mak, na Luk nakwa Pọl onyeozi, bụ́ onye kpọrọ ya “nri anyasị nke Onyenwe anyị,” nyere nkọwa zuru ezu banyere otú Jizọs si mee ya.—1 Ndị Kọrint 11:20; Matiu 26:26-28; Mak 14:22-25; Luk 22:19, 20.

3. N’ụzọ ndị dị aṅaa dị mkpa ka ihe ndekọ Jọn onyeozi banyere awa ndị ikpeazụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu si dị iche na nke ndị ọzọ?

3 Ọ dị mma ịmara na Jọn onyeozi ekwughị banyere mbugharị nke achịcha na mmanya, ikekwe n’ihi na ka ọ na-erule n’oge o dekọrọ Oziọma ya, (ihe dị ka 98 O.A.), usoro ahụ abụrụla ihe a maara nke ọma n’etiti Ndị Kraịst mbụ. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) Otú ọ dị, ọ bụ nanị Jọn, site n’ike mmụọ nsọ, nyere anyị ihe ọmụma dị oké mkpa banyere ihe Jizọs kwuru ma mee nwa oge tupu Ya eguzobe Ememe Ncheta ọnwụ Ya na nwa oge ka o guzobesịrị ya. E dekọrọ ihe ndị a na-akpali akpali n’ihe na-adịghị ala karịa isiakwụkwọ ise nke Oziọma Jọn. Ha mere ka o doo anya ụdị ndị Chineke hụrụ n’anya. Ka anyị tụlee Jọn isi nke 13 ruo 17.

Mụta Ihe Site n’Ịhụnanya Kwesịrị Nṅomi nke Jizọs

4. (a) Olee otú Jọn si mesie isiokwu bụ́ isi nke nzukọ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere mgbe o guzobere Ememe Ncheta ahụ ike? (b) Olee otu ihe dị mkpa mere Jehova ji hụ Jizọs n’anya?

4 Ịhụnanya bụ isiokwu pụtara ìhè n’isiakwụkwọ a nile bu ndụmọdụ Jizọs ji sị ụmụazụ ya nọrọ nke ọma. N’ezie, ụdị dịgasị iche iche nke okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” pụtara ugboro 31 na ha. Ọ dịghị ebe ọ bụla e mere ka ịhụnanya miri emi Jizọs nwere n’ebe Nna ya, bụ́ Jehova, na ndị na-eso ụzọ ya nọ pụta ìhè karịa n’isiakwụkwọ ndị a. A pụrụ ịhụ ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe Jehova nọ n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nile banyere ndụ ya, ma, ọ bụ nanị Jọn dekọrọ na Jizọs kwuru hoo haa, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Jizọs kwukwara na Jehova hụrụ ya n’anya ma kọwaa ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka Nna m hụworo m n’anya, mụ onwe m ahụkwa unu n’anya, nọgidenụ n’ịhụnanya m. Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debeworo ihe ndị Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” (Jọn 15:9, 10) Ee, Jehova hụrụ Ọkpara ya n’anya n’ihi nrubeisi ya zuru ezu. Lee ezi ihe mmụta nke a bụụrụ ndị nile na-eso ụzọ Jizọs Kraịst!

5. Olee otú Jizọs si gosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ?

5 E mesiri ịhụnanya miri emi Jizọs nwere n’ebe ụmụazụ ya nọ ike kpọmkwem ná mmalite nke ihe ndekọ Jọn banyere nzukọ ikpeazụ Jizọs so ndịozi ya nwee. Jọn kọrọ, sị: “Ma, ebe ọ maara tupu ememe ngabiga ahụ amalite na oge awa ya eruwo ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya, Jizọs, ebe ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) N’uhuruchi ahụ kwesịrị ncheta, ọ kụziiri ha ihe a na-apụghị ichezọ echezọ banyere iji ịhụnanya na-ejere ndị ọzọ ozi. Ọ sara ụkwụ ha. Nke a bụ ihe onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịdịwo njikere imere Jizọs na ụmụnna ha, ma ha lara azụ. Jizọs rụrụ ọrụ a dị ala ma gwazie ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na mụ onwe m, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwenụ na Onye Ozizi, sara unu ụkwụ, unu kwesịkwara ịsarịta ụkwụ ibe unu. N’ihi na m na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ, ka unu, dị nnọọ ka m meere unu, meekwa otú ahụ.” (Jọn 13:14, 15) Ezi Ndị Kraịst kwesịrị ịdị njikere ma nwee obi ụtọ ijere ụmụnna ha ozi.—Matiu 20:26, 27, ihe odide ala ala peeji nke NW Bekee; Jọn 13:17.

Na-agbasonụ Iwu Ọhụrụ Ahụ

6, 7. (a) Ihe ndị dị aṅaa dị mkpa ka Jọn dere banyere nguzobe nke Ememe Ncheta ahụ? (b) Iwu ọhụrụ dị aṅaa ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe dị ọhụrụ banyere ya?

6 Ihe ndekọ Jọn banyere ihe mere n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu n’abalị Nisan 14 bụ nanị nke kwuru kpọmkwem banyere ọpụpụ Judas Iskarịọt. (Jọn 13:21-30) Iji ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ tụnyere ibe ha na-egosi na ọ bụ nanị mgbe onye sabo ahụ pụrụ ka Jizọs guzobere Ememe Ncheta ọnwụ Ya. O soziri ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi kwurịta okwu ruo ogologo oge, na-enye ha ndụmọdụ na ntụziaka o ji sị ha nọrọ nke ọma. Ka anyị na-ejikere ịga Ememe Ncheta ahụ, anyị kwesịrị inwe mmasị miri emi n’ihe Jizọs kwuru n’oge ahụ, karịsịakwa n’ihi na anyị chọrọ n’ezie iso ná ndị Chineke hụrụ n’anya.

7 Kpọmkwem ntụziaka mbụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe o guzobesịrị Ememe Ncheta ọnwụ ya bụ ihe dị ọhụrụ. O kwuru, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Gịnị dị ọhụrụ n’iwu a? Obere oge ka e mesịrị n’uhuruchi ahụ, Jizọs mere ka nke ahụ doo anya, na-asị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka nke a ukwuu, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:12, 13) E nyere ụmụ Izrel iwu n’ime Iwu Mozis ka ha ‘na-ahụ mmadụ ibe ha n’anya dị ka onwe ha.’ (Levitikọs 19:18) Ma iwu Jizọs karịrị nke ahụ. Ndị Kraịst gaje ịhụ ibe ha n’anya dị ka Kraịst si hụ ha n’anya, na-adị njikere ịchụ ndụ ha kpọmkwem n’àjà maka ụmụnna ha.

8. (a) Gịnị ka ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà na-agụnye? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova si egosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà taa?

8 Oge Ememe Ncheta bụ oge kwesịrị ekwesị inyocha onwe anyị, n’otu n’otu nakwa dị ka ọgbakọ, iji hụ ma anyị nwere n’ezie akara a e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst—ịhụnanya yiri nke Kraịst. Ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ pụrụ ịpụta, ọ pụtawokwa mgbe ụfọdụ, na Onye Kraịst ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ kama ịrara nwanna ya nye. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọ na-agụnye anyị ịdị njikere ịchụ ọdịmma onwe anyị n’àjà iji nyere ụmụnna anyị na ndị ọzọ aka ma jeere ha ozi. Pọl onyeozi bụ ezi ihe nlereanya na nke a. (2 Ndị Kọrint 12:15; Ndị Filipaị 2:17) A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile n’ihi mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ha, ha na-enyere ụmụnna ha na ndị agbata obi ha aka, na-arụsikwa ọrụ ike iji kụziere ụmụ mmadụ ibe ha eziokwu Bible. *Ndị Galeshia 6:10.

Mmekọrịta Ndị A Ga-eji Kpọrọ Ihe

9. Iji nọgide soro Chineke na Ọkpara ya na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa, gịnị ka anyị na-enwe obi ụtọ ime?

9 Ọ dịghị ihe pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa nye anyị karịa ịbụ ndị Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jizọs, hụrụ n’anya. Otú ọ dị, iji bụrụ ndị a hụrụ n’anya ma nwee mmetụta nke ịhụnanya ahụ, anyị aghaghị ime ihe. N’abalị ikpeazụ ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrịtara, o kwuru, sị: “Onye nwere ihe ndị m nyere n’iwu ma na-edebe ha, onye ahụ bụ onye hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.” (Jọn 14:21) Ebe anyị ji mmekọrịta anyị na Chineke na nke anyị na Ọkpara ya kpọrọ ihe, anyị na-eji ọṅụ erube isi n’ihe ha nyere n’iwu. Nke a na-agụnye iwu ọhụrụ ahụ bụ́ igosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nakwa iwu ahụ Kraịst nyere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ bụ́ “ime nkwusa nye ndị mmadụ na ịgba àmà nke ọma,” na-agbalịsi ike ‘ime ndị nabatara ozi ọma ahụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’—Ọrụ 10:42; Matiu 28:19, 20.

10. Mmekọrịta ndị dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka ndị e tere mmanụ nakwa “atụrụ ọzọ” ahụ nwere?

10 Ka e mesịrị n’abalị ahụ, n’ịza ajụjụ otu onyeozi ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Judas (Tadiọs) jụrụ, Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, anyị ga-abịakwutekwa ya wee mee ka ebe obibi anyị dị n’ebe ọ nọ.” (Jọn 14:22, 23) Ọbụna mgbe ha ka nọ n’ụwa, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a kpọrọ iso Kraịst chịa n’eluigwe, na-akasị eso Jehova nakwa Ọkpara ya enwe mmekọrịta chiri anya. (Jọn 15:15; 16:27; 17:22; Ndị Hibru 3:1; 1 Jọn 3:2, 24) Ma ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị olileanya ha bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, sokwa “otu onye ọzụzụ atụrụ” ha, bụ́ Jizọs Kraịst, na Chineke ha, bụ́ Jehova, na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa, ma ọ bụrụhaala na ha ana-erube isi.—Jọn 10:16; Abụ Ọma 15:1-5; 25:14.

“Unu Abụghị Akụkụ nke Ụwa”

11. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa na-akpali iche echiche ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

11 Ná nzukọ ikpeazụ a Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere tupu ọnwụ ya, o nyere ịdọ aka ná ntị na-akpali iche echiche: Ọ bụrụ na Chineke hụrụ mmadụ n’anya, ụwa ga-akpọ onye ahụ asị. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo m asị tupu ọ kpọọ unu asị. A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị. Burunụ okwu m gwara unu n’uche, Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu; ọ bụrụ na ha edebewo okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.”—Jọn 15:18-20.

12. (a) N’ihi gịnị ka Jizọs ji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na ụwa ga-akpọ ha asị? (b) Gịnị ka ọ ga-adị mma ka mmadụ nile tụlee ka Ememe Ncheta na-eru nso?

12 Jizọs nyere ịdọ aka ná ntị a ka ndịozi 11 a kwesịrị ntụkwasị obi na ndị nile ga-abụ ezi Ndị Kraịst mgbe ha nwụsịrị ghara inwe nkụda mmụọ ma daa mbà n’ihi ịkpọasị nke ụwa. Ọ gbakwụnyere, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee ghara ịsụ ngọngọ. Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ. N’eziokwu, oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla ga-egbu unu ga-eche na ya ejeworo Chineke ozi dị nsọ. Ma ha ga-eme ihe ndị a n’ihi na ha amarabeghị Nna m ma ọ bụkwanụ mụ onwe m.” (Jọn 16:1-3) Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible na-akọwa na ụdị ngwaa a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịsụ ngọngọ” pụtara “ime ka mmadụ kwụsịwa inwe ntụkwasị obi n’ebe onye o kwesịrị ịtụkwasị obi ma na-erubere isi nọ ma gbahapụwa onye ahụ; ime ka a dapụ.” Ka oge ime Ememe Ncheta ahụ na-eru nso, mmadụ nile ga-eme nke ọma ịtụgharị uche n’ụzọ ndụ nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi, n’oge gara aga na n’oge a, ma ṅomie ihe nlereanya ha nke iguzosi ike n’okpuru ule. Ekwela ka mmegide ma ọ bụ mkpagbu mee ka ị gbahapụ Jehova na Jizọs, kama kpebisie ike ịtụkwasị ha obi na irubere ha isi.

13. Gịnị ka Jizọs rịọrọ n’isi ụmụazụ ya n’ekpere o kpegaara Nna ya?

13 N’ekpere mmechi ya tupu ya ahapụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu na Jeruselem, Jizọs gwara Nna ya, sị: “Enyewo m ha okwu gị, ma ụwa akpọwo ha asị, n’ihi na ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa. M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:14-16) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-eche ndị ọ hụrụ n’anya nche, iji wusikwuo ha ike ka ha na-anọpụ iche n’ụwa.—Aịsaịa 40:29-31.

Nọgidenụ n’Ịhụnanya nke Nna ahụ na nke Ọkpara Ya

14, 15. (a) Gịnị ka Jizọs ji tụnyere onwe ya, n’ụzọ dị iche ‘n’osisi vaịn dị aṅaa kosara ekosa’? (b) Olee ndị bụ́ “alaka” nke “ezi osisi vaịn ahụ”?

14 Ná mkparịta ụka enyi na enyi nke Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi nwere n’abalị Nisan 14, o ji onwe ya tụnyere “ezi osisi vaịn,” n’ụzọ dị iche ‘n’osisi vaịn na-ekosa ekosa’ bụ́ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ sịrị: “Abụ m ezi osisi vaịn ahụ, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.” (Jọn 15:1) Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Jeremaịa onye amụma dekọrọ okwu ndị a Jehova gwara ndị ya na-enupụ isi, sị: “Mụ onwe m kụrụ gị rịị osisi vaịn kachasị mma, . . . ì sikwa aṅaa gbanwee ọrụ̀ osisi vaịn nke ala ọzọ n’ebe m nọ?” (Jeremaịa 2:21) Hozia onye amụma dekwara, sị: “Osisi vaịn nke na-ekosa ekosa ka Izrel bụ, mkpụrụ ka ọ na-amịziri onwe ya: . . . O kesawo obi ha.”—Hosea 10:1, 2.

15 Kama ịmịpụta mkpụrụ nke ezi ofufe, Izrel si n’ezi ofufe dapụ ma mịpụtara onwe ya mkpụrụ. Ụbọchị atọ tupu nzukọ ikpeazụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi nwere, ọ gwara ndị ndú nwere ihu abụọ nke ndị Juu, sị: ‘M na-asị unu, A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.’ (Matiu 21:43) Mba ọhụrụ ahụ bụ “Izrel nke Chineke,” nke ihe mejupụtara ya bụ Ndị Kraịst 144,000 e tere mmanụ, bụ́ ndị e ji tụnyere “alaka” nke “ezi osisi vaịn ahụ,” bụ́ Kraịst Jizọs.—Ndị Galeshia 6:16; Jọn 15:5; Mkpughe 14:1, 3.

16. Gịnị ka Jizọs gbara ndịozi ya 11 kwesịrị ntụkwasị obi ume ime, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere ihe ahụ fọdụrụnụ na-ekwesị ntụkwasị obi na mgbe ọgwụgwụ a?

16 Jizọs gwara ndịozi 11 ahụ ha na ya nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu, sị: “Alaka ọ bụla dị na mụ nke na-adịghị amị mkpụrụ ka ọ na-ewepụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ. Nọgidenụ bụrụ ndị mụ na ha dị n’otu, mụ onwe m na unu adịkwa n’otu. Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ọ gwụla ma ọ̀ dịgidere n’osisi vaịn ahụ, n’otu ụzọ ahụ unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ, ọ gwụla ma mụ na unu ọ̀ nọgidere na-adị n’otu.” (Jọn 15:2, 4) Akụkọ ihe mere eme nke ndị Jehova n’oge a na-egosi na ihe fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ná Ndị Kraịst e tere mmanụ na Onyeisi ha bụ́ Kraịst Jizọs anọgidewo na-adị n’otu. (Ndị Efesọs 5:23) Ha ekwewo ka a sachaa ma kwachaa ha. (Malakaị 3:2, 3) Kemgbe 1919, ha achịkọbatawo mkpụrụ nke Alaeze n’ụba, nke mbụ, ndị ọzọ so ná Ndị Kraịst e tere mmadụ nakwa, kemgbe 1935, ndị enyi ha bụ́ “oké ìgwè mmadụ” na-amụbawanye amụbawanye.—Mkpughe 7:9; Aịsaịa 60:4, 8-11.

17, 18. (a) Okwu ndị dị aṅaa Jizọs kwuru na-enyere ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ aka ịnọgide n’ịhụnanya Jehova? (b) Olee otú ịga Ememe Ncheta ga-esi enyere anyị aka?

17 Ihe ọzọ Jizọs kwuru metụtara Ndị Kraịst nile e etere mmanụ na ndị enyi ha: “A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m. Dị nnọọ ka Nna m hụworo m n’anya, mụ onwe m ahụkwa unu n’anya, nọgidenụ n’ịhụnanya m. Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debeworo ihe ndị Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.”—Jọn 15:8-10.

18 Anyị nile chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke, nke a na-akpalikwa anyị ịbụ Ndị Kraịst na-amịpụta mkpụrụ. Anyị na-eme nke a site n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusa ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Matiu 24:14) Anyị na-emekwa ike anyị nile iji na-egosipụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” ná ndụ anyị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ịga Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst ga-eme ka mkpebi anyị mere ime nke a sikwuo ike, n’ihi na a ga-echetara anyị ịhụnanya dị ukwuu Chineke na Kraịst nwere n’ebe anyị nọ.—2 Ndị Kọrint 5:14, 15.

19. Enyemaka ọzọ dị aṅaa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Mgbe Jizọs guzobesịrị Ememe Ncheta ahụ, o kwere nkwa na Nna ya ga-ezitere ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi “ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ.” (Jọn 14:26) A ga-atụle otú mmụọ a si enyere ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ aka ịnọgide n’ịhụnanya Jehova n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Maka afọ 2002, dị ka a gụkọrọ ya n’ụzọ kwekọrọ n’ọgụgụ oge Bible, Nisan 14 ga-amalite mgbe anyanwụ dara na Thursday, March 28. N’uhuruchi ụbọchị ahụ, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-ezukọta ime ememe ncheta ọnwụ Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs Kraịst.

^ par. 8 Lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, isiakwụkwọ nke 19 na 32.

Ajụjụ Ntụleghachi

• Olee ihe bara uru Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere iji ịhụnanya na-ejere ndị ọzọ ozi?

• Ọ̀ bụ banyere gịnị ka oge Ememe Ncheta bụ oge kwesịrị ekwesị iji nyochaa onwe onye?

• N’ihi gịnị ka ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere banyere ịkpọasị na mmegide ga-esite n’aka ụwa, na-ekwesịghị iji mee ka anyị sụọ ngọngọ?

• Ònye bụ “ezi osisi vaịn ahụ”? Olee ndị bụ́ “alaka” ahụ, gịnịkwa ka a na-atụ anya ya n’aka ha?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs kụziiri ndịozi ya ihe a na-apụghị ichezọ echezọ banyere iji ịhụnanya na-ejere ndị ọzọ ozi

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ndị na-eso ụzọ Kraịst na-erube isi n’iwu ya nke igosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà