Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Ọcha—Gịnị Ka Ọ Pụtara n’Ezie?

Ịdị Ọcha—Gịnị Ka Ọ Pụtara n’Ezie?

Ịdị Ọcha—Gịnị Ka Ọ Pụtara n’Ezie?

N’IHI adịghị ọcha na-awụ akpata oyi e nwere na Europe nakwa na United States n’ime narị afọ nke 18 na 19, ndị ozi ala ọzọ nke oge ahụ kwusara ihe a pụrụ ịkpọ “ozizi nke ịdị ọcha.” Ozizi a kwuru na adịghị ọcha bụ mmehie, ebe ịdị ọcha na-eme ka mmadụ bịarukwuo Chineke nso. Ikekwe ọ bụ nke a mere okwu ahụ bụ́ “Ịdị ọcha na-esote nsọpụrụ Chineke,” ji ewu ewu.

Chọọchị Salvation Army, nke William na Catherine Booth hiwere, gbasoro echiche a. Dị ka akwụkwọ bụ́ Health and Medicine in the Evangelical Tradition si kwuo, otu n’ime okwu ndị mbụ e ji mara ha bụ: “Ncha, Ofe, na Nzọpụta.” E mesịa, mgbe Louis Pasteur na ndị ọzọ gosipụtara n’ụzọ na-enweghị mgbagha, njikọ dị n’etiti ọrịa na nje bacteria, nanị ihe o mere bụ ịkpalikwu na inye ihe ndabere nkà mmụta sayensị maka ime atụmatụ ndị ka mma iji kwalite ahụ́ ike ọha.

Ụfọdụ n’ime nzọụkwụ ndị e weere ozugbo ahụ bụ ịghara ịchọ ka onye akaebe n’ụlọikpe sutụ Bible ọnụ na ịkwụsị iji otu iko na-aṅụ mmiri n’ụlọ akwụkwọ na n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, bụ́ nke a na-emekarị. E mere mgbalị ọbụna ime ka ndị mmadụ n’otu n’otu jiri iko nke ha dochie anya iko ahụ mmadụ nile ji eme ihe n’oriri nsọ. Ee, ndị ahụ malitere ya yiri ka ha nwere ihe ịga nke ọma dị ukwuu n’ịgbanwe àgwà ndị mmadụ n’ebe ịdị ọcha dị. Ọ dị otú ahụ ruo n’ókè nke na otu onye edemede kpọrọ ihe si na ya pụta “inwe oké mmasị n’ịdị ọcha.”

Otú ọ dị, o doro anya na ‘oké mmasị a e nwere n’ịdị ọcha’ agbanyeghị mkpọrọgwụ. O teghị aka ndị ahịa ma nke a na-akọ agbanwee ncha nkịtị ịbụ ihe e ji achọ mma. Mkpọsa ngwa ahịa ndị e ji akọ mee mere ka ndị na-azụ ahịa kweta na iji ihe ụfọdụ e ji edebe onwe onye ọcha na-eme ihe ga-eme ka onye ahụ ji ya eme ihe bụrụ onye a ma ama n’ọha nke ndị ọzọ pụrụ nanị inwere anyaụfụ. Telivishọn na-akwalite echiche efu a. A dịghị ahụkebe ebe ndị ihe na-agara nke ọma na ndị mara mma a na-egosi ná mkpọsa ngwa ahịa nakwa n’ihe nkiri telivishọn na-edebe ụlọ ọcha, na-aza èzí, na-atụtụli ihe a tụsara n’ala, ma ọ bụ na-ekpopụ nsị́ nwamba na nke nkịta ha.

E nwekwara ndị na-eche na a na-akpata ihe e ji ebi ndụ ma a gaa ọrụ, ebe ọ na-adịghị ego a na-akpata n’ọrụ ụlọ ma ọ bụ n’ọrụ idebe ihe ọcha ndị ọzọ. Ebe ọ bụkwa na ọ dịghị ego ha na-enweta na ya, gịnị mere ha ga-eji na-elekọta gburugburu ebe obibi ha? Otu ihe nke a rụpụtaworo bụ na ụfọdụ mmadụ taa na-eche na ịdị ọcha bụ nanị idebe onwe ha ọcha.

Echiche Chineke Banyere Ịdị Ọcha

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbalị ndị mbụ ahụ e mere iji kụzie ịdị ọcha nyere aka mee ka ọnọdụ ndụ ndị mmadụ ka mma. Otú ahụ ka o kwesịkwara ịdị, n’ihi na ịdị ọcha bụ àgwà nke Chineke dị nsọ ma dị ọcha, bụ́ Jehova, nke sikwa n’aka ya malite. Ọ na-ezi anyị ime ihe ga-abara anyị uru site n’ịghọ ndị dị nsọ na ndị dị ọcha n’ụzọ anyị nile.—Aịsaịa 48:17; 1 Pita 1:15.

Jehova Chineke setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. Ịdị ọcha, nakwa àgwà ya ndị ọzọ a na-apụghị ịhụ anya, bụ ndị a na-ahụ nke ọma n’ihe ndị a na-ahụ anya Chineke kere. (Ndị Rom 1:20) Anyị na-ahụ na ihe okike n’onwe ya adịghị akpata mmetọ ọ bụla na-adịgide adịgide. Ụwa na ọtụtụ usoro njikọ ya nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha na-edebe onwe ya ọcha n’ụzọ dị ịtụnanya, ọ bụkwa nke e dokwara maka ibi ndụ dị ọcha n’ezi ahụ́ ike. Ọrụ dị ọcha dị otú ahụ pụrụ isi nanị n’aka Omenkà uche ya dị ọcha. Ya mere, site na nke a, anyị pụrụ ikwubi na ndị na-efe Chineke ofufe kwesịrị ịdị ọcha n’akụkụ nile nke ndụ ha.

Akụkụ Anọ nke Ịdị Ọcha

Bible na-eme ka a mata akụkụ anọ nke ịdị ọcha bụ́ nke ndị na-efe Chineke kwesịrị ịgba mbọ na ha. Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ha.

Ime Mmụọ. A pụrụ iwere nke a dị ka nke kasị mkpa n’ime ịdị ọcha nile n’ihi na o metụtara atụmanya mmadụ na-enwe maka ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, nke a bụ ụdị ịdị ọcha a kasị eleghara anya. N’ikwu ya hoo haa, ịdị ọcha n’ụzọ ime mmụọ pụtara ịghara ma ọlị ịgafe ókè Chineke kpara n’etiti ezi ofufe na ofufe ụgha, n’ihi na Chineke na-ele ụdị ọ bụla nke ofufe ụgha anya dị ka ihe na-adịghị ọcha. Pọl onyeozi dere, sị: “‘Sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-anabatakwa unu.’” (2 Ndị Kọrint 6:17) Jems onye na-eso ụzọ kapịkwara okwu ọnụ n’akụkụ a: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke na Nna anyị si ele ihe anya bụ nke a: . . . mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ pụọ n’ụwa.”—Jems 1:27.

N’ụzọ doro anya, Chineke gosipụtara na ya adịghị anakwere ịgwakọta ofufe ụgha na ezi ofufe. Ofufe ụgha na-agụnyekarị omume na-adịghị ọcha na arụsị na chi ndị rụrụ arụ. (Jeremaịa 32:35) N’ihi ya, a na-agba ezi Ndị Kraịst ume ịjụ kpam kpam itinye aka n’ofufe na-adịghị ọcha.—1 Ndị Kọrint 10:20, 21; Mkpughe 18:4.

Omume. N’ebe a kwa, Chineke kpara ókè doro anya n’etiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. N’ozuzu, ụwa adịla ka e si kọwaa ya ná Ndị Efesọs 4:17-19: “Ha nọ n’ọchịchịrị n’uche, bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ ahụ bụ́ nke Chineke. . . . Ebe ha na-enwekwaghị mmetụta ime omume ọma, ha nyefere onwe ha n’omume rụrụ arụ iji ụdị anyaukwu ọ bụla na-arụpụta adịghị ọcha.” Echiche rụrụ arụ dị otú ahụ na-egosipụta onwe ya n’ọtụtụ ụzọ, n’ụzọ pụtara ìhè na n’ụzọ aghụghọ, n’ihi ya, ọ dị Ndị Kraịst mkpa ịnọ na nche.

Ndị hụrụ Chineke n’anya maara na ịgba akwụna, idina ụdị onwe, mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, na ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ imebi ụkpụrụ Jehova nke ịdị ọcha n’omume. Otú ọ dị, a na-egosipụta omume ndị a aghara aghara ná ntụrụndụ nakwa n’ejiji. Ya mere, Ndị Kraịst aghaghị ịnọ na nche megide omume ndị dị otú ahụ. Iyi uwe dị mkpụmkpụ gabiga ókè, nke na-adịghịkwa ekpuchi ahụ́ nke ọma na-aga nzukọ ma ọ bụ nnọkọ ntụrụndụ Ndị Kraịst na-adọrọ uche aga n’ahụ́ mmadụ n’ụzọ na-enweghị isi ma na-egosi na onye ahụ adịchaghị ọcha n’omume. E wezụga iwebata echiche na-adịghị ọcha nke ụwa ná nnọkọ Ndị Kraịst ahụ, iji ụdị ejiji ahụ pụrụ ịkpali ndị ọzọ inwewe echiche na-adịghị ọcha. Ebe a bụ otu ebe ọ dị Ndị Kraịst mkpa ịrụsi ọrụ ike n’igosipụta “amamihe nke sitere n’elu.”—Jems 3:17.

Uche. Uche mmadụ ekwesịghị ịbụ ebe echiche ọjọọ jupụtara. Jizọs dọrọ aka ná ntị megide echiche na-adịghị ọcha mgbe o kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:28; Mak 7:20-23) Okwu ndị a metụtakwara ikiri foto na ihe nkiri sinima ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ịgụ akụkọ mmekọahụ rụrụ arụ, na ige egwú ndị na-adịghị mma. N’ihi ya, ọ dị Ndị Kraịst mkpa izere iji echiche na-adịghị ọcha na-emetọ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ime ka ha kwuwe okwu ma mewe omume ndị na-adịghị ọcha na ndị na-adịghị nsọ.—Matiu 12:34; 15:18.

Anụ ahụ́. Ịdị nsọ na ịdị ọcha anụ ahụ́ nwere njikọ chiri anya n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Ya mere, ezi Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike idebe ahụ́ ha, ebe obibi ha, na gburugburu ya ọcha ma mee ka ha dị mma n’anya ruo ókè ọnọdụ kwere mee. Ọbụna n’ebe mmiri e ji asa ihe ma ọ bụ nke e ji asa ahụ́ dị ụkọ, Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị ime ike ha nile iji nọgide na-adị ọcha ma na-adị mma n’ile anya.

Ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ ga-egbochikwa iji ụtaba eme ihe n’ụdị ọ bụla, ịṅụbiga mmanya ókè, na ụdị ọ bụla nke iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, bụ́ ndị na-ebibi ahụ́ ma na-eme ka ọ na-asọ oyi. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ a kọwara n’Abụ nke Abụ nwere mmasị n’ísì ụtọ nke uwe nwa agbọghọ Shunem ahụ. (Abụ nke Abụ 4:11) Idebe ahụ́ anyị ọcha bụ ihe ịhụnanya dị na ya ime, ebe anyị chọrọ izere ịdị na-esi ndị nọ anyị nso ísì ọjọọ. Ihe ndị a na-agba n’ahụ́ iji mee ka ọ na-esi ísì ụtọ pụrụ ịdị mma, ma ha abụghị ihe a ga-eji dochie anya ịsa ahụ́ mgbe nile na iyi uwe dị ọcha.

Ịnọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi

A bịa n’ịdị ọcha anụ ahụ́, ndị mmadụ pụrụ imebiga ihe ókè. N’otu aka, ịnụbigara ịdị ọcha ọkụ n’obi ókè pụrụ ịnapụ anyị ọṅụ nke ndụ. Ọ pụkwara iri oge ndị anyị kwesịrị iji mee ihe bara uru. N’aka nke ọzọ, ụlọ ruru unyí nke na-adịghị mma n’anya pụrụ ifu ihe dị ukwuu iji dozie ya. N’agbata ụzọ abụọ a gabigara ókè ka a na-ahụ ụzọ dị irè nke ezi uche dị na ya isi na-edebe ebe obibi anyị ọcha ma na-eme ka ha dị mma ile anya.

Mee ka ọ dị mfe. Ebe obibi ma ọ bụ ọnụ ụlọ ndị ngwongwo jupụtara na ha na-esi ike idebe ọcha, ọ pụkwara isi ike ịchọpụta ebe ruru unyí n’ebe ngwongwo jupụtara otú ahụ. Ebe obibi ndị dị mfe, ndị ngwongwo na-ejupụtaghịkwa na ha na-ewe oge ka nta iji debe ha ọcha. A tụrụ nnọọ arọ ibi ndụ dị mfe n’ime Bible, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:8.

Mee ka ọ dị mma n’anya. Ebe obibi dị ọcha bụ ọrụ dịịrị ndị nile bi n’ime ya. Ebe obibi na-adịghị mma n’anya na-amalitekarị dị ka ọnụ ụlọ ndị na-adịghị mma n’anya. Ihe ịdị mma n’anya pụtara na ihe nile dị ebe ha kwesịrị ịdị. Dị ka ihe atụ, ebe uwe ndị ruru unyí ga-adị ekwesịghị ịbụ n’ala ọnụ ụlọ ihi ụra. Nke kakwa njọ, ihe ndị e ji egwuri egwu na ngwá ọrụ ndị a tụsasịrị n’ala pụrụ ịdị ize ndụ. Ọtụtụ ihe ọghọm a na-enwe n’ebe obibi bụ n’ihi emeghị ka ihe dị mma n’anya.

N’ụzọ doro anya, ịdị ọcha na ụzọ ndụ Ndị Kraịst nwere njikọ chiri anya. Banyere ụzọ ndụ nsọpụrụ Chineke, Aịzaịa onye amụma na-ekwu banyere “Ụzọ nke ịdị nsọ.” Ọ gbakwụnyekwara okwu a na-akpali iche echiche na “onye rụrụ arụ agaghị agabiga na ya.” (Aịsaịa 35:8) Ee, ịzụlite ezi àgwà nke ịdị ọcha ugbu a na-enye ihe àmà siri ike na anyị nwere okwukwe ná nkwa Chineke bụ́ na ọ ga-eguzobe ụwa paradaịs dị ọcha n’isi nso. Mgbe ahụ, n’akụkụ nile nke mbara ala a mara mma, mmadụ nile ga-eto Jehova Chineke site n’ịgbaso n’ụzọ zuru ezu, ụkpụrụ ya zuru okè nke ịdị ọcha.—Mkpughe 7:9.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ebe obibi dị ọcha bụ ọrụ dịịrị ndị nile bi n’ime ya

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụwa na-edebe onwe ya ọcha n’ụzọ dị ịtụnanya