Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ruo ókè ha aṅaa ka mmachibido ahụ Iwu Mozis machibidoro mmadụ ịlụ onye ahụ́ ya metụtara Ndị Kraịst taa?

Iwu ahụ Jehova nyere mba Izrel ekwughị oké ihe banyere ememe na usoro agbamakwụkwọ. Otú ọ dị, ọ machibidoro mmekọrịta ụfọdụ n’alụmdi na nwunye iwu. Dị ka ihe atụ, na Levitikọs 18:6-20, anyị na-ahụ ndepụta nke mmekọrịta ndị a machibidoro iwu bụ́ ndị metụtara “onye ahụ́” mmadụ. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ gara n’ihu inye ndepụta zuru ezu nke ndị na-agaghị eso ibe ha nwee mmekọahụ n’etiti ndị ahụ́ mmadụ. N’ezie, Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis ma ọ bụ bụrụ ndị o kegidere. (Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụtaghị na Ndị Kraịst pụrụ nnọọ ileghara okwu a anya mgbe ha na-ahọrọ onye ha ga-alụ. E nwere ọtụtụ ihe mere nke a ji dị otú a.

Iji malitegodị, e nwere iwu na-achị obodo bụ́ ndị na-achịkwa alụmdi na nwunye n’etiti ndị ahụ́ mmadụ, n’ụzọ bụ́kwa isi, iwu ji Ndị Kraịst irube isi n’iwu obodo ha bi na ya. (Matiu 22:21; Ndị Rom 13:1) N’ezie, iwu ndị dị otú ahụ dịgasị iche iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. A dabeere n’ụzọ bụ́ isi ná mkpụrụ ndụ ihe nketa wee tie ihe ka ọtụtụ n’ụdị iwu a n’oge a. Ọ bụ eziokwu a maara nke ọma na alụmdi na nwunye n’etiti ndị bụ́ nnọọ ndị ahụ́ yikarịrị ka ọ ga-eme ka nwa ha ga-amụ nwee nkwarụ na ọrịa ndị si ná mkpụrụ ndụ ihe nketa. N’ihi nke a nakwa n’ihi ‘ido onwe ha n’okpuru ikike ndị ka elu,’ Ndị Kraịst na-abanye n’alụmdi na nwunye na-agbaso iwu ndị metụtara alụmdi na nwunye n’ógbè ha.

Mgbe ahụ, e nwere ihe banyere ihe a na-anakwere na ihe a na-adịghị anakwere n’ógbè mmadụ bi na ya. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịbendị nile nwere ụkpụrụ nduzi na omenala ndị katọrọ alụmdi na nwunye n’etiti ndị bụ́ nnọọ ndị ahụ́, na-elekarị nkekọ dị otú ahụ anya dị ka mmadụ idina onye ahụ́ ya, n’ihi ya kwa, bụrụ arụ. Ọ bụ ezie na kpọmkwem mmekọrịta ndị a katọrọ pụrụ ịdị nnọọ iche n’ọdịbendị dị iche iche, “n’ikwu ya n’ozuzu, ruo ókè ha bụruru ndị ahụ́, otú ahụ ka iwu na-amachibido ma ọ bụ na-akatọ ha inwe mmekọahụ siruru n’ike,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-ekwu. N’ihi ya, ọbụna n’ebe ọ na-abụghị mmadụ idina onye ahụ́ ya, Ndị Kraịst adịghị achọ ime omume n’ụzọ na-egosi ileghara omenala dịwara kemgbe ụwa ma ọ bụ echiche dị mma nke ógbè ha bi na ya anya, ka ha wee ghara iwetara ọgbakọ Ndị Kraịst ma ọ bụ aha Chineke nkọcha.—2 Ndị Kọrint 6:3.

Ihe a na-agaghị eleghara anya bụ akọ na uche Chineke nyere anyị. E kenyere mmadụ nile echiche nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ndị Rom 2:15) Akọ na uche ha na-agwa ha ihe dị mma ma kwesị ekwesị na ihe megidere okike ma jọgbuo onwe ya ná njọ, ọ gwụla ma e jiwo omume rụrụ arụ merụọ ma ọ bụ gbuo ya. Jehova zoro aka n’eziokwu a mgbe o nyere ụmụ Izrel iwu ya megide alụmdi na nwunye n’etiti ndị bụ́ nnọọ ndị ahụ́ ha. Anyị na-agụ, sị: “Unu emela dị ka omume ala Ijipt, nke unu biri n’ime ya: unu emekwala dị ka omume ala Kenan, nke Mụ onwe m na-eme ka unu baa n’ebe ahụ: unu ejegharịkwala n’ụkpụrụ nile ha.” (Levitikọs 18:3) Ndị Kraịst ji akọ na uche ha dabeere na Bible kpọrọ ihe, ha adịghịkwa ekwe ka echiche gbagọrọ agbagọ nke ezi ihe na ihe ọjọọ nke mba dị iche iche merụọ ya.—Ndị Efesọs 4:17-19.

Gịnịzi ka anyị pụrụ ikwubi? Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis, akọ na uche ha na-agwa ha n’ụzọ doro anya na alụmdi na nwunye n’etiti ndị bụ́ nnọọ ndị ahụ́—dị ka nna na nwa, nne na nwa, nwanne na nwanne—bụ ihe a na-adịtụghị anakwere n’etiti Ndị Kraịst. * Ka nkekọ ezinụlọ ahụ na-agbasa, Ndị Kraịst na-aghọta na e nwere iwu na ntụzi ndị na-achịkwa alụmdi na nwunye iwu kwadoro nakwa na e nwere ụkpụrụ ọha na eze na ọdịbendị na-anakwere. A ghaghị ichebara ihe ndị a echiche nke ọma ka anyị wee nwee ike ịgbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, bụ́: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile.”—Ndị Hibru 13:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji tụlee isiokwu a n’ụzọ zuru ezu, biko lee isiokwu bụ́ “Ọlulu-Di-na-Nwunye nke Ndị-Aru—Òle Uzọ Ndi Kraist Kwesiri Isi Le ha Anya?” n’Ụlọ Nche, September 15, 1978, peeji nke 13-14.