Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kụziiri Anyị Inwe Ntachi Obi na Ịnọgidesi Ike

Jehova Kụziiri Anyị Inwe Ntachi Obi na Ịnọgidesi Ike

Akụkọ Ndụ

Jehova Kụziiri Anyị Inwe Ntachi Obi na Ịnọgidesi Ike

DỊ KA ARISTOTELIS APOSTOLIDIS SI KỌỌ

Pyatigorsk, bụ́ obodo Russia nke e ji isi iyi ndị na-asọpụta ihe ndị dị oké ọnụ ahịa na ihu igwe dị mma mara, dị n’ugwu nta ndị dị n’ebe ugwu nke Ugwu Caucasus. Ọ bụ n’ebe a ka ndị Gris gbara ọsọ ndụ mụrụ m na 1929. Afọ iri ka e mesịrị, mgbe iyi egwu nke nnụcha na mkpocha agbụrụ nke ọchịchị Stalin na oké ụjọ nke ọ kpatara gasịrị, anyị ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ ọzọ, ebe a manyere anyị ịkwaga Gris.

MGBE anyị kwagasịrị Piraiévs, Gris, okwu ahụ bụ́ “ndị gbara ọsọ ndụ” bịara nwee nnọọ ihe ọhụrụ ọ pụtara nye anyị. Ọ dị anyị nnọọ ka anyị bụ ndị ala ọzọ. Ọ bụ ezie na aha mụ na nwanne m nwoke bụ aha ndị ọkà ihe ọmụma Gris abụọ a ma ama, bụ́ Aristotle na Socrates, anyị adịghị anụkarị ka a na-akpọ anyị aha ndị ahụ. Mmadụ nile na-akpọ anyị ụmụ Russia.

Nwa oge ka Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụsịrị, nne m m hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ bụ ya ji ezinụlọ anyị, ọnwụ ya gbawakwara anyị obi. Ebe ọ bụ na ọ rịara ọrịa ruo oge ụfọdụ, ọ kụziiri m ịrụ ọtụtụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ọzụzụ a baara m uru ka oge na-aga ná ndụ m.

Agha na Nnwere Onwe

Agha ahụ, mweghara nke ndị Nazi weghaara mba ahụ, na bọmbụ ndị agha Jikọrọ Aka nọgidere na-atụ, mere ka ụbọchị ọ bụla yie ụbọchị ụwa ga-agwụ. Ịda ogbenye na agụụ karịrị akarị, ndị mmadụ nọkwa na-anwụ aghara aghara. Malite mgbe m dị afọ 11, aghaghị m iso nna m na-arụsị nnọọ ọrụ ike iji kwado anyị atọ. Amaghị asụsụ Grik nke ọma, tinyere agha ahụ na ihe ndị ọ kpatara, gbochiri agụmakwụkwọ m.

Ndị Germany hapụrụ Gris n’October 1944. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, ezutere m Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ e nwere obi nkoropụ na nhụjuanya, olileanya dị na Bible banyere ọdịnihu dị mma n’okpuru Alaeze Chineke metụrụ m n’obi. (Abụ Ọma 37:29) Nkwa Chineke kwere maka ndụ na-agaghị agwụ agwụ n’ọnọdụ udo n’elu ala ebe a, ghọrọ nnọọ balm na-agwọ ọnyá m. (Aịsaịa 9:7) Na 1946, e mere mụ na nna m baptizim, ná ngosipụta nke nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova.

N’afọ na-esonụ, enwere m ọṅụ nke inweta ọrụ mbụ m dị ka ohu na-akpọsa magazin (nke e mesịrị na-akpọ ohu na-elekọta magazin) n’ọgbakọ nke abụọ e hiwere na Piraiévs. Ókèala anyị sitere na Piraiévs ruo Eleusis, nke ịdị anya ya dị ihe dị ka kilomita 50. N’oge ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eje ozi n’ọgbakọ anyị. Enwere m ihe ùgwù nke iso ha rụkọọ ọrụ na ịmụta ihe site n’aka ha. Enwere m obi ụtọ iso ha kpakọrịta n’ihi na ha nwere ahụmahụ karịrị akarị ịkọ banyere mgbalị siri ike a chọrọ iji rụzuo ọrụ nkwusa ahụ. Site n’ụzọ ndụ ha, o doro anya na a chọrọ ndidi na nnọgidesi ike dị ukwuu iji na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. (Ọrụ 14:22) Lee ka obi si atọ m ụtọ na e nwere ihe karịrị ọgbakọ 50 nke Ndịàmà Jehova n’ógbè a ugbu a!

Ihe Ịma Aka A Na-atụghị Anya Ya

Oge ụfọdụ ka e mesịrị, amatara m Eleni, bụ́ ọmarịcha nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi nke bi n’obodo Patras. Anyị kwere onwe anyị nkwa ọlụlụ ná ngwụsị nke afọ 1952. Otú ọ dị, mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, Eleni dara oké ọrịa. Ndị dọkịta chọpụtara na o nwere akpụ ụbụrụ, ọnọdụ ya dịkwa njọ. A ghaghị ịwa ya ahụ́ ozugbo. Mgbe e mesịrị mgbalị dị ukwuu, anyị chọtara otu dọkịta n’Atens bụ́ onye—n’agbanyeghị na e nweghị ngwá ọrụ zuru ezu laa azụ n’oge ahụ—dị njikere ime ihe kwekọrọ ná nkwenkwe okpukpe anyị ma waa ya ahụ́ n’ejighị ọbara. (Levitikọs 17:10-14; Ọrụ 15:28, 29) Mgbe a wasịrị ya ahụ́, ndị dọkịta ahụ ji nlezianya na-enwe nchekwube maka atụmanya nke nwa agbọghọ a m kwere nkwa ịlụ, ma ha ekwughị na ọ pụghị inwe akpụ ọzọ.

Gịnị ka m ga-eme n’ọnọdụ a? N’ihi ọnọdụ a gbanwerenụ, àga m akagbu nkwa ọlụlụ ahụ ma nwere onwe m? Ee e! Ekwewo m nkwa ọlụlụ, achọkwara m ka ee m bụrụ ee. (Matiu 5:37) Ọ dịghị mgbe ọ bụla m chere ihe dị iche. N’okpuru nlekọta nke nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya, Eleni gbaketụrụ, anyị lụkwara na December 1954.

Afọ atọ ka e mesịrị, Eleni nwere akpụ ọzọ, otu dọkịta ahụ wakwara ya ahụ́ ọzọ. N’oge a, ọ wabakwuru ya n’ime ụbụrụ ya iji wapụchaa akpụ ahụ. N’ihi ya, akụkụ ahụ́ ụfọdụ nke nwunye m bịara kpọnwụọ, o metụtakwara akụkụ ụbụrụ ya nke na-achịkwa ikwu okwu, n’ụzọ dị njọ. Ugbu a, anyị abụọ bịara nwee ihe ịma aka ndị dị nnọọ ọhụrụ ma dị mgbagwoju anya. Ọbụna ọrụ kasị mfe bịara ghọọrọ nwunye m m hụrụ n’anya oké ihe mgbochi. Ọnọdụ ya na-akawanye njọ mere ka ọ dị mkpa ime mgbanwe ndị siri ike n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Karịsịa, ọ chọrọ ntachi obi na nnọgidesi ike dị ukwuu.

Ọ bụ ugbu a ka ọzụzụ m natara n’aka nne m bịara baa uru. Kwa isi ụtụtụ, m na-akwadebe ihe nile e ji esi nri, Eleni na-esikwa ya. Ọtụtụ mgbe, anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù, gụnyere ndị ozi oge nile, ndị anyị na-amụrụ Bible, na Ndị Kraịst ibe anyị nọ ná mkpa anyị na ha nọ n’ọgbakọ. Ha nile na-ekweta na nri ndị ahụ dị nnọọ ụtọ! Mụ na Eleni na-agbakọkwa aka arụ ọrụ ndị ọzọ dị n’ụlọ, nke mere na ụlọ anyị na-adị ọcha ma na-adị n’usoro. Ọnọdụ a chọrọ oké ihe gaje ịdịgide ruo afọ 30.

Ịnụ Ọkụ n’Obi n’Agbanyeghị Nkwarụ

Ọ bụụrụ mụ na ndị ọzọ ihe na-akpali nnọọ akpali ịhụ na ọ dịghị ihe pụrụ ibelata ịhụnanya nwunye m nwere n’ebe Jehova nọ na ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka ozi Ya. Ka oge na-aga, nakwa site ná mgbalị ọ nọgidere na-eme, Eleni jisiri ike jiri okwu ole na ole na-ekwupụta ihe dị ya n’obi. Ọ na-amasị ya iji ozi ọma ahụ sitere na Bible ejekwuru ndị mmadụ n’okporo ámá. Mgbe m na-aga njem azụmahịa, m na-akwọrọ ya aga ma na-adọba ụgbọala n’akụkụ ebe ọtụtụ mmadụ ji ụkwụ aga. Ọ na-emepe windo ụgbọala ma na-akpọ ndị na-agafe agafe ka ha bịa were Ụlọ Nche na Teta! N’otu oge, o nyefere mkpụrụ 80 n’ime awa abụọ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-enyefe magazin ochie nile anyị nwere n’ọgbakọ. Eleni na-arụchikwa ụdị ndị ọzọ nke ọrụ nkwusa ahụ anya.

N’afọ nile ahụ nwunye m nwere nkwarụ, ọ na-eso m aga nzukọ mgbe nile. Ọ dịghị mgbakọ ọ bụla kwara ya, ọbụna mgbe anyị na-aghaghị ịga mba ofesi n’ihi mkpagbu a na-akpagbu Ndịàmà Jehova na Gris. N’agbanyeghị erughị eru ya dị iche iche, o ji obi ụtọ gaa mgbakọ ndị e mere n’Austria, Germany, Saịprọs, na mba ndị ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Eleni mere mkpesa ma ọ bụ chọọ oké ihe, ọbụna mgbe ibu ọrụ dị ukwuu m nwere n’ozi Jehova mere mgbe ụfọdụ ka ihe ghara ịdịrị ya mfe.

Nye m, ọnọdụ a nyere m ọzụzụ ruo ogologo oge n’inwe ntachi obi na n’ịnọgidesi ike. Jehova nyeere m aka ọtụtụ mgbe. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị chụrụ nnọọ ọtụtụ ihe n’àjà iji nyere anyị aka n’ụzọ ọ bụla kwere omume, ndị dọkịta jikwa obiọma kwadoo anyị. N’afọ ndị ahụ ihe siiri anyị ike, ọ dịghị ihe ọ bụla dị mkpa ná ndụ kọrọ anyị, ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị nke na-eri oge dị ukwuu mere ka ọ ghara ikwe m omume ịnọgide na-arụ ọrụ ego oge nile. Anyị debere ọdịmma na ozi Jehova n’ọnọdụ mbụ mgbe nile.—Matiu 6:33.

Ọtụtụ ndị ajụwo anyị ihe kwagidere anyị n’oge ndị ahụ ihe siiri anyị ike. Ka m na-eleghachi anya azụ ugbu a, ana m aghọta na ọmụmụ Bible onwe onye, ikpeku Chineke ekpere sitere n’obi, ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ mere ka ntachi obi na nnọgidesi ike anyị sikwuo ike. E chetaara anyị mgbe nile okwu agbamume dị n’Abụ Ọma 37:3-5: “Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe; . . . Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ . . . Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” Amaokwu ọzọ nke baara anyị uru bụ Abụ Ọma 55:22: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” Dị ka nwatakịrị nke tụkwasịrị nna ya obi kpam kpam, ọ bụghị nanị na anyị na-atụkwasị Jehova ibu anyị kamakwa, anyị na-ahapụrụ ya ha.—Jems 1:6.

N’April 12, 1987, ka nwunye m na-eme nkwusa n’ihu ụlọ anyị, ibo ụzọ e ji ígwè mee ji ike mechie n’azụ ya, na-eme ka ọ dapụ n’okporo ámá, na-emerụ ya ahụ́ nke ukwuu. N’ihi ya, ọ nọrọ n’ọnọdụ amaghị onwe ya ruo afọ atọ ọzọ. Ọ nwụrụ ná mmalite afọ 1990.

Ijere Jehova Ozi Ruo Ókè Ike Kwere M

Laa azụ na 1960, a họpụtara m ije ozi dị ka ohu ọgbakọ na Nikaia, Piraiévs. Kemgbe ahụ, enwewo m ihe ùgwù nke ije ozi n’ọtụtụ ọgbakọ ndị ọzọ dị na Piraiévs. Ọ bụ ezie na enweghị m ụmụ nke aka m, enwewo m ọṅụ nke inyere ọtụtụ ụmụ ime mmụọ aka ịnọgidesi ike n’eziokwu ahụ. Ụfọdụ n’ime ha na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye ọgbakọ, ndị ohu na-eje ozi, ndị ọsụ ụzọ, na ndị òtù ezinụlọ Betel.

Mgbe e weghachiri ọchịchị onye kwuo uche ya na Gris na 1975, Ndịàmà Jehova bịara nwee ike inwe mgbakọ ha dị iche iche n’enweghị ihe mgbochi, n’abụghị ịbịa zowekwa n’ime ọhịa ọzọ. Ahụmahụ ụfọdụ n’ime anyị nwetaworo n’ịhazi mgbakọ n’ofesi bịara baa uru ugbu a. Ya mere, enwere m ọṅụ na ihe ùgwù nke ije ozi na kọmitii mgbakọ dịgasị iche iche ruo ọtụtụ afọ.

Mgbe ahụ, na 1979, e mere atụmatụ iwu Ụlọ Mgbakọ mbụ na Gris, ná mpụga Atens. E kenyere m ọrụ inye aka ịhazi na iwu ihe owuwu a buru ibu. Ọrụ a chọkwara ntachi obi na nnọgidesi ike dị ukwuu. Iso ọtụtụ narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà rụkọọ ọrụ ruo afọ atọ mere ka anyị nwee ịhụnanya na ịdị n’otu siri ike n’etiti onwe anyị. Ihe ndị mere n’oge ihe owuwu a adịghị apụ m apụ n’obi.

Igbo Mkpa Ime Mmụọ nke Ndị Mkpọrọ

Afọ ole na ole ka e mesịrị, anyị nwetara ohere ọhụrụ. Otu n’ime ụlọ mkpọrọ kasị ibu na Gris dị na Korydallos, bụ́ nke dị nso n’ókèala nke ọgbakọ m. Kemgbe April 1991, a họpụtawo m ileta ụlọ mkpọrọ a kwa izu dị ka onye ozi nke Ndịàmà Jehova. N’ebe ahụ, a na-ekwe ka m duziere ndị mkpọrọ nwere mmasị ọmụmụ Bible ma soro ha nwee nzukọ Ndị Kraịst. Ọtụtụ n’ime ha emewo mgbanwe ndị dị ukwuu, na-egosipụta ike dị ukwuu nke Okwu Chineke nwere. (Ndị Hibru 4:12) Nke a amasịwo ma ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ ma ndị mkpọrọ ndị ọzọ. A tọhapụwo ụfọdụ n’ime ndị mkpọrọ m mụụrụ Bible, ha bụkwa ndị nkwusa ozi ọma ugbu a.

Ruo oge ụfọdụ, amụụrụ m mmadụ atọ a maara nke ọma na ha na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ ihe. Ka ha nwere ọganihu ime mmụọ, ha kpụrụ afụ ọnụ ha, bọọ isi ha nke ọma, ma yiri uwe na taị wee bịa maka ọmụmụ Bible ha n’etiti August—otu n’ime ọnwa a kasị enwe okpomọkụ na ya na Gris! Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ, onyeisi ndị na-elekọta ndị mkpọrọ, na ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ si n’ọfịs ha gbapụta iji hụ ihe ịtụnanya a. Ha apụghị ikwere ihe anya ha hụrụ!

Ahụmahụ ọzọ na-agba ume mere n’akụkụ ebe ụmụ nwanyị na-anọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. A maliteere otu nwanyị a tụrụ nga mkpụrụ ọka maka igbu ọchụ, ọmụmụ Bible. E ji omume nnupụisi mara ya. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, eziokwu Bible ọ na-amụta mere ka o mee mgbanwe ndị dị ịrịba ama nke na ọtụtụ ndị kwuru na ọ dị ka ọdụm nke na-agbanwe ịghọ nwa atụrụ! (Aịsaịa 11:6, 7) Ngwa ngwa, onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ malitere ịkwanyere ya ùgwù na ịtụkwasị ya obi. Obi dị m ụtọ ịhụ ka o nwere ọganihu ime mmụọ dị mma ma ruo n’ogo nke ịrara onwe ya nye Jehova.

Inyere Ndị Ọrịa na Ndị Agadi Aka

Ịhụ ka nwunye m na ọrịa lụrụ ọgụ ruo ogologo oge emewo ka m na-aghọtakwu mkpa ndị ọrịa na nke ndị agadi nọ n’etiti anyị. Mgbe ọ bụla akwụkwọ anyị bu isiokwu nke na-agba anyị ume iji ịhụnanya nyere ndị dị otú ahụ aka, a na-akpali mmasị m. Ana m eji isiokwu ndị ahụ akpọrọ ihe ma na-ewekọtakwa ha. Ka afọ ụfọdụ gafere, enwetara m otu mpịakọta nke nwere ihe karịrị otu narị peeji—malite n’isiokwu bụ́ “Ichebara Ndị Agadi na Ndị Na-ata Ahụhụ Echiche,” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke July 15, 1962. Ọtụtụ n’ime isiokwu ndị a gosiri na ọ bara uru ka ọgbakọ ọ bụla na-enyere ndị ọrịa na ndị agadi aka n’ụzọ a haziri ahazi.—1 Jọn 3:17, 18.

Ndị okenye guzobere otu ìgwè nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị mejupụtara bụ́ ndị wepụtara onwe ha ịhụ maka mkpa nke ndị ọrịa na ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị. Anyị haziri ndị ọrụ afọ ofufo ahụ gaa n’òtù dịgasị iche iche—dị ka, ndị pụrụ inye aka n’oge ehihie, ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ inye aka n’oge abalị ruo chi ọbụbọ, ndị ọzọ bụ́ ndị ga na-ahụ maka usoro ime njem, na ndị ọzọ bụ́ ndị ga na-anọ ya site n’ụtụtụ ruo n’abalị. Ndị mejupụta òtù ndị nke ikpeazụ a bụ ndị na-anọ nso mgbe nile ije ozi ọ bụla dapụtaranụ ozugbo.

Ihe si ná mgbalị ndị dị otú ahụ pụta abụwo ihe na-agba ume. Dị ka ihe atụ, n’otu n’ime nleta ndị a na-eleta otu nwanna nwanyị na-arịa ọrịa nke nanị ya bi kwa ụbọchị, a hụrụ ya ka ọ tọgbọ n’ala ụlọ n’amaghị onwe ya. Anyị kpọtụụrụ otu nwanna nwanyị bi nso nke nwekwara ụgbọala. Ọ kwọgara nwanna nwanyị ahụ na-arịa ọrịa n’ụlọ ọgwụ kasị dịrị nso na nwa oge—nanị na minit iri! Ndị dọkịta kwuru na nke a zọpụtara ndụ ya.

Ekele ndị ọrịa na ndị agadi ahụ na-egosipụta n’ebe ndị so n’ìgwè ahụ nọ na-eju nnọọ afọ. Inwe olileanya nke iso ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a biri n’usoro ihe ọhụrụ Chineke n’ọnọdụ ndị dị iche bụ ihe na-enye obi ụtọ. Ịmarakwa na e nyeere ha aka ịtachi obi site ná nkwado ha nwetara mgbe ha na-ata ahụhụ bụkwa ụgwọ ọrụ ọzọ.

Ịnọgidesi Ike Ewetawo Ọtụtụ Ụgwọ Ọrụ

M na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Piraiévs. N’agbanyeghị ime agadi na nsogbu ahụ́ ike, enwere m obi ụtọ na m ka nwere ike ikerechi òkè anya n’ọrụ ndị a na-arụ n’ọgbakọ.

N’afọ ndị gafeworonụ, ọnọdụ ndị na-ama aka, ihe ịma aka ndị siri ike, na ihe ndabara dị iche iche achọwo ka m nwee obi ike na nnọgidesi ike gabigara ókè. Ma, mgbe nile, Jehova enyewo m ume dị mkpa iji merie nsogbu ndị a. Ugboro ugboro, ahụwo m ịbụ eziokwu nke okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Ọ bụrụ na asịwo m, E wezụgawo ụkwụ m n’ọnọdụ ya; ebere Gị na-akwagide m, Jehova. Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:18, 19.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nwunye m, bụ́ Eleni, mgbe a wasịrị ya ahụ́ nke ugboro abụọ, na 1957

[Foto dị na peeji nke 26]

N’otu mgbakọ e mere na Nuremberg, Germany, na 1969

[Foto dị na peeji nke 28]

Ìgwè ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị nyeere ndị ọrịa na ndị agadi aka