Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs

Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs

Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs

“Ọ BỤRỤ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.” (Luk 9:23) Ndị ọkụ azụ̀ dị ala na onye ọna ụtụ e ledara anya zara òkù ahụ ozugbo. Ha hapụrụ ihe nile iji soro Jizọs.—Matiu 4:18-22; Luk 5:27, 28.

Taa, a ka na-anụ òkù Jizọs na-akpọ, ọtụtụ ndị azawokwa ya. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọ na-atọ ụtọ iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible na-ala azụ ‘n’ịjụ onwe ha ma bulie osisi ịta ahụhụ ha.’ Ha na-ala azụ n’ịnakwere ibu ọrụ na ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Gịnị mere ụfọdụ ji ala azụ n’ịza òkù Jizọs na ịrara onwe ha nye Jehova Chineke? N’ezie, ọ pụrụ iwe oge dị ukwuu tupu ndị a na-azụliteghị inwe echiche ndị Juu na nke Ndị Kraịst bụ́ na e nwere nanị otu Chineke aghọta nke ọma ịdị adị nke Onye Okike bụ́ onye, nke pụrụ ime ihe nile. Ma, ọbụna mgbe e mesịrị ka ha kwenye na Chineke dị adị, ụfọdụ na-ala azụ n’ịgbaso nzọụkwụ Jizọs. Ha pụrụ ịtụ ụjọ ihe ndị ikwu na ndị enyi ha ga-eche banyere ha ma ọ bụrụ na ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Ndị ọzọ, bụ́ ndị chefuru ịdị ngwa nke oge anyị bi na ya, na-achụso ịbụ ndị a ma ama na akụ̀ na ụba. (Matiu 24:36-42; 1 Timoti 6:9, 10) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, nye ndị nọgidere na-edebe mkpebi ha nke ịghọ ụmụazụ Jizọs n’oge dị n’ihu, ọ dị ihe a ga-amụta site n’ihe ndekọ banyere Nikọdimọs, bụ́ ọgaranya nke chịrị ndị Juu n’oge Jizọs.

E Ji Ohere Ndị Magburu Onwe Ha Gọzie Ya

Nanị ihe dị ka ọnwa isii Jizọs malitesịrị ozi elu ala ya, Nikọdimọs ghọtara na Jizọs ‘dị ka onye ozizi, si n’ebe Chineke nọ bịa.’ N’ịbụ onye ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ n’oge na-adịbeghị anya mgbe ahụ na Jeruselem n’oge Ememe Ngabiga nke 30 O.A., masịrị, Nikọdimọs bịara n’abalị ikwupụta nkwere o kweere na Jizọs na ịmatakwu onye ozizi a. Mgbe ahụ, Jizọs gwara Nikọdimọs otu eziokwu dị omimi banyere mkpa ọ dị ịbụ onye ‘a mụrụ ọzọ’ iji nwee ike ịbanye n’Alaeze Chineke. N’oge a, Jizọs kwukwara okwu a: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:1-16.

Lee atụmanya dị ebube nke dị Nikọdimọs n’ihu! Ọ pụrụ ịghọ onye ya na Jizọs na-akpachi anya, nke nwere ike iji anya ya hụ akụkụ dị iche iche nke ndụ Jizọs n’elu ala. Dị ka onye na-achị ndị Juu na onye ozizi n’Izrel, Nikọdimọs maara Okwu Chineke nke ọma. O nwekwara ezi nghọta, dị ka a na-ahụ ná mmata ọ matara Jizọs dị ka onye ozizi nke si n’ebe Chineke nọ bịa. Nikọdimọs nwere mmasị n’ihe ime mmụọ, ọ dịkwa umeala n’obi n’ụzọ pụrụ iche. Lee ka ọ na-aghaghị isi bụrụ ihe siri ike bụ́ onye òtù nke ụlọikpe kasị elu nke ndị Juu ikweta na nwa ọkwa nkà nke na-abaghị ọgaranya si n’ebe Chineke nọ bịa! Àgwà nile dị otú ahụ dị oké mkpa iji bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs.

O yighị ka mmasị Nikọdimọs nwere n’ebe nwoke a si Nazaret nọ ọ jụrụ oyi. Afọ abụọ na ọkara mgbe e mesịrị, n’oge Ememe Ụlọ Ntu, Nikọdimọs gara nzukọ ndị Sanhedrin. N’oge ahụ, Nikọdimọs ka bụ “otu n’ime ha.” Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zipụrụ ndị ọrụ nche ịga jide Jizọs. Ndị ọrụ nche ahụ lọghachitere ma kọọ, sị: “Ọ dịbeghị mgbe mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a.” Ndị Farisii malitere iweda ha ala, sị: “E duhiebeghị unu onwe unu, ka è duhiewo unu? Ọ dịghị otu onye n’ime ndị na-achị achị ma ọ bụ n’ime ndị Farisii nke tinyeworo okwukwe na ya, ka ọ̀ dị? Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.” Nikọdimọs apụghịzi ịgbachi nkịtị. O kwuru, sị: “Iwu anyị adịghị ekpe mmadụ ikpe ma ọ́ bụghị ma ò buwo ụzọ nụ n’ọnụ ya wee mara ihe ọ na-eme, ka ọ̀ na-ekpe?” Mgbe ahụ, ndị Farisii ndị ọzọ katọrọ ya, sị: “Gị onwe gị kwa esighị na Galili, ka ì si? Chọọ ka ị hụ na ọ dịghị onye amụma a gaje ime ka o si na Galili bilie.”—Jọn 7:1, 10, 32, 45-52.

Ihe dị ka ọnwa isii mgbe e mesịrị, n’Ụbọchị Ememe Ngabiga nke 33 O.A., Nikọdimọs hụrụ ka a na-ebutu ozu Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. O sonyeere Josef onye Arimatịa, bụ́ onye ọzọ so na Sanhedrin, n’ịkwadebe ozu Jizọs maka olili. Iji mee nke ahụ, Nikọdimọs wetara “ngwugwu maịa na ihe otite alo” bụ́ ndị ọnụ ego ha ruru ihe dị ka 100 paụnd ndị Rom, nke ya na paụnd 72 nke ndị England ha nhata. Ọ dị oké ọnụ ahịa. Ọ chọkwara obi ike n’aka ya iji mee ka a mata na ọ dị ihe jikọrọ ya na “onye nduhie ahụ,” bụ́ ihe ndị Farisii ibe ya na-akpọ Jizọs. N’ịkwadebe ozu Jizọs ngwa ngwa maka olili, ha abụọ tọgbọrọ Jizọs n’ili ncheta ọhụrụ nke dị n’ebe dị nso. Otú ọ dị, ọbụna n’oge a, a matabeghị Nikọdimọs dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs!—Jọn 19:38-42; Matiu 27:63; Mak 15:43.

Ihe Mere Ọ Na-ejighị Mee Ihe

Jọn ekpugheghị ihe mere Nikọdimọs ji laa azụ ‘n’ibuli osisi ịta ahụhụ ya’ ma na-eso Jizọs n’ihe odide ya. Otú ọ dị, ọ tụpenyetụrụ anyị azụ̀ nke pụrụ ime ka anyị ghọta ihe mere onye Farisii a na-ejighị mee mkpebi ahụ.

Nke mbụ, Jọn mere ka ọ pụta ìhè na onye a na-achị ndị Juu “bịakwutere [Jizọs] n’abalị.” (Jọn 3:2) Otu ọkà mmụta Bible na-atụ aro, sị: “Nikọdimọs bịara n’abalị, ọ bụghị n’ihi ụjọ, kama ọ bụ iji zere ìgwè mmadụ bụ́ ndị gaara egbochiwo mkparịta ụka ya na Jizọs.” Otú ọ dị, Jọn zoro aka n’ebe Nikọdimọs nọ dị ka “nwoke ahụ bịakwutere [Jizọs] n’abalị na nke mbụ ya,” n’otu ebe ahụ ọ nọ zoo aka n’ebe Josef onye Arimatịa nọ dị ka “onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ nke nzuzo ya n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.” (Jọn 19:38, 39) Ya mere, o yikarịrị ka Nikọdimọs ọ bịakwutere Jizọs n’abalị n’ihi “egwu ọ na-atụ ndị Juu,” dị nnọọ ka ndị ọzọ biri ndụ n’oge ya tụrụ egwu iso Jizọs mekọọ ihe ọ bụla.—Jọn 7:13.

Ị̀ lawo azụ ná mkpebi gị ịghọ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi ihe ndị ikwu, ndị enyi, ma ọ bụ ndị gị na ha na-akpakọ pụrụ ikwu? “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà,” ka otu ilu na-ekwu. Ị̀ pụrụ isi aṅaa merie egwu ahụ? Ilu ahụ gara n’ihu, sị: “Ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.” (Ilu 29:25) Iji wulite ntụkwasị obi ahụ n’ebe Jehova nọ, ọ dị gị mkpa ịbịa hụ n’onwe gị na Chineke ga-akwagide gị mgbe ihe na-esiri gị ike. Na-ekpeku Jehova ekpere, na-arịọkwa ya ka o nye gị obi ike iji mee ọbụna mkpebi ndị dị nta banyere ofufe gị. Nke nta nke nta, okwukwe na ntụkwasị obi i nwere n’ebe Jehova nọ ga-amụba ruo n’ókè nke na ị ga-enwe ike ime mkpebi ndị siri ike n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.

Ọkwá Nikọdimọs na ùgwù a na-akwanyere ya dị ka onye so ná ndị na-achị achị pụkwara iso n’ihe gbochiworo ya iwere nzọụkwụ ahụ dị mkpa nke ịjụ onwe ya. N’oge ahụ, ọ ghaghị ịbụwo na ọ ka rapagidesiri ike n’ọnọdụ ya dị ka onye so na Sanhedrin. Ị̀ na-ala azụ ime ihe iji ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst n’ihi na ọkwá dị ùgwù i nwere n’ógbè unu pụrụ ifunahụ gị ma ọ bụ n’ihi na ị pụrụ ịchụ ihe ụfọdụ ga-eme ka e bulie gị n’ọkwá, n’àjà? Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke a pụrụ iji tụnyere ihe ùgwù nke ịbụ onye nwere ike ijere Onye Kasị Elu n’eluigwe na ala ozi, onye dị njikere imezu ihe ndị ị rịọrọ n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya.—Abụ Ọma 10:17; 83:18; 145:18.

Ihe ọzọ pụrụ iso mee ka Nikọdimọs yigharịa ihe pụrụ imetụtawo akụ̀ na ụba ya. Dị ka onye Farisii, ọ pụrụ ịbụwo onye ndị ọzọ, bụ́ “ndị hụrụ ego n’anya,” nwere mmetụta n’ebe ọ nọ. (Luk 16:14) Eziokwu ahụ bụ́ na ọ zụtaliri ngwugwu maịa na ihe otite alo dị oké ọnụ ahịa na-agba akaebe na ọ bụ ọgaranya. Ụfọdụ ndị taa na-anọgide na-egbu oge n’ime mkpebi iburu ibu ọrụ nke Onye Kraịst n’ihi na ha na-echegbu onwe ha banyere ihe onwunwe ha. Otú ọ dị, Jizọs dụrụ ụmụazụ ya ọdụ, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:25-33.

Ihe Dị Ukwuu Funahụrụ Ya

N’ụzọ na-akpali mmasị, akụkọ banyere Nikọdimọs, bụ́ nke a kọrọ nanị n’Oziọma Jọn, ekwughị ma ọ̀ dị mgbe ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ma ọ bụ na ọ dịghị. Dị ka otu akụkọ ọdịnala si kwuo, Nikọdimọs kwụnyeere Jizọs, e mee ya baptizim, ndị Juu akpagbuo ya, a chụtuo ya n’ọkwá ya, ma mesịa chụpụ ya na Jeruselem. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, otu ihe doro anya: Ihe dị ukwuu funahụrụ ya n’ihi iyigharị ihe mgbe Jizọs nọ n’ụwa ebe a.

A sị na Nikọdimọs malitere iso Jizọs kpọmkwem n’oge mbụ o zutere Onyenwe anyị, ọ pụrụ ịghọwo ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ihe ọmụma Nikọdimọs, nghọta ya, obi umeala ya, na ọmụma ọ maara mkpa ime mmụọ, ọ pụrụ ịghọwo onye na-eso ụzọ a ma ama. Ee, ọ pụrụ ịnụwo okwu ndị dị ịtụnanya Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru, mụta ihe ndị dị mkpa site n’ilu ndị Jizọs tụrụ, hụ ọrụ ebube ndị dị egwu Jizọs rụrụ, ma nweta ume site n’okwu Jizọs ji sị ndị ozi ya nọrọ nke ọma. Ma ihe ahụ dum funahụrụ ya.

Emeghị mkpebi Nikọdimọs furu ya ihe dị ukwuu. Otu n’ime ha bụ òkù Jizọs ji obi ụtọ kpọọ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Ohere nke inweta ume ọhụrụ a n’ụzọ nkịtị n’aka Jizọs funahụrụ Nikọdimọs!

Gịnị Banyere Gị

Kemgbe 1914, Jizọs Kraịst anọwo n’eluigwe dị ka Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke. N’ibu amụma banyere ihe ga-ewere ọnọdụ n’oge ọnụnọ ya, otu n’ime ihe ndị o kwuru bụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Tupu ọgwụgwụ abịa, a ghaghị ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ na-atọ Jizọs Kraịst ụtọ ịhụ ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekere òkè na ya. Gị onwe gị kwa pụrụ ikere òkè n’ọrụ a.

Nikọdimọs ghọtara na Jizọs si n’ebe Chineke nọ bịa. (Jọn 3:2) Site n’ịmụ Bible, ị pụrụ ịghọtawo otu ihe ahụ. Ị pụrụ imewo mgbanwe n’ụzọ ndụ gị iji na-agbaso ụkpụrụ Bible. Ị pụrụ ọbụna ịdị na-aga nzukọ nke Ndịàmà Jehova iji na-enwetakwu ihe ọmụma Bible. E kwesịrị ịja gị mma maka mgbalị ndị dị otú ahụ. Ma, ọ dị Nikọdimọs mkpa ime ihe karịrị nanị ịghọta na Jizọs si n’ebe Chineke nọ bịa. Ọ dị ya mkpa ‘ịjụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso Jizọs.’—Luk 9:23.

Buru n’uche ihe Pọl onyeozi na-agwa anyị. O dere, sị: “Ebe anyị na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ma nzube ya efunahụ unu. N’ihi na ọ na-asị: ‘N’oge a na-anara mmadụ nke ọma, anụrụ m olu gị, n’ụbọchị nzọpụta kwa, enyeere m gị aka.’ Lee! Ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma karịsịa. Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”—2 Ndị Kọrint 6:1, 2.

Ugbu a bụ oge ịzụlite okwukwe nke ga-akpali gị ime ihe. Iji mezuo nke ahụ, na-atụgharị uche n’ihe ndị ị na-amụ na Bible. Na-ekpeku Jehova ekpere, na-arịọkwa ya maka enyemaka iji na-egosipụta okwukwe dị otú ahụ. Ka ị na-enweta enyemaka ya, ekele na ịhụnanya ị na-enwe n’ebe ọ nọ ga-akpali gị ịchọ ‘ịjụ onwe gị ma bulie osisi ịta ahụhụ gị kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso Jizọs Kraịst.’ Ị̀ ga-eme ihe ugbu a?

[Foto dị na peeji nke 9]

Na mbụ, Nikọdimọs ji obi ike gbachitere Jizọs

[Foto dị na peeji nke 9]

N’agbanyeghị mmegide, Nikọdimọs nyere aka kwadebe ozu Jizọs maka olili

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọmụmụ ihe onwe onye na ekpere pụrụ iwusikwu gị ike ime ihe

[Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ ga-anakwere ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ n’okpuru idu ndú Jizọs Kraịst?