Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Maara Ihe n’Ụdị nke Ha

Ndị Maara Ihe n’Ụdị nke Ha

Ndị Maara Ihe n’Ụdị nke Ha

“NDỊ okenye nwere amamihe, ma ụmụaka maara ihe n’ụdị nke ha,” ka otu ilu ndị Nigeria na-ekwu. Edwin, bụ́ onye Kraịst bụ́ okenye na Nigeria, chọpụtara na nke a bụ eziokwu.

Otu ụbọchị, Edwin hụrụ otu igbe ọla n’okpuru tebụl ya n’ebe obibi ya.

“Ònye nwe igbe a?” ka Edwin jụrụ ụmụ ya atọ.

“Ọ bụ nke m,” ka Emmanuel dị afọ asatọ zara. O kwuru ozugbo na igbe ígwè a tara nchara nke nke ọ bụla n’ime akụkụ ya anọ dị sentimita 12, nke a kpọpuru elu ya akpọpu bụ maka onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. “Ebe ọ bụ na anaghị m aga Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa ụbọchị,” ka ọ kọwara, “ekpebiri m ịrụ igbe ka ọ ga-abụ oge ọ bụla m na-erighị ego nri ehihie m, apụrụ m itinye ya n’igbe a.”

Nna Emmanuel nwere n’ụlọ ya, igbe o ji echekwa ego e ji aga mgbakọ distrikti a na-enwe kwa afọ. Ma n’ihi ọnọdụ mberede ezinụlọ ya nwere, ha ji ego ahụ mee ihe. Iji jide n’aka na ọ gaghị eji ego onyinye ya mee ihe ọzọ, Emmanuel wegaara onye welda otu kom kom mere ochie ka o were kụchie igbe ahụ. Mgbe onye welda ahụ matara ihe a chọrọ iji kom kom ahụ mee, o ji ọla a tụfuru atụfu rụọrọ Emmanuel igbe. Michael, bụ́ nwanne Emmanuel nke dị afọ ise, rịọkwara ka a rụtara ya igbe.

N’ịbụ onye ihe ụmụ ya meworo tụrụ n’anya, Edwin jụrụ ha ihe mere ha ji rụọ igbe ndị ahụ. Michael zara, sị: “Achọrọ m inye onyinye!”

Nne na nna ha amaghị na Emmanuel, Michael, na Uchei, bụ́ nwanne ha nwanyị nke dị afọ itoolu, anọwo na-echekwa ego nri ehihie ha ha na-erighị ma na-etinye ya n’igbe ndị ahụ. Ebee ka ha si nweta echiche ahụ? Ozugbo ụmụaka ahụ toruru iji ego, ndị mụrụ ha kụziiri ha itinye ego n’igbe onyinye dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ụzọ doro anya, ụmụaka ahụ mụtara ihe a kụziiri ha nke ọma.

Mgbe igbe ndị ahụ juru, e gbuwara ha. Ngụkọta nke ego ha chekwara bụ $3.13 (U.S.)—ọ bụghị obere ego ná mba ebe ego onye nkịtị na-akpata n’afọ bụ nanị narị dollar ole na ole. Onyinye afọ ofufo ndị dị otú ahụ na-akwado ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke a na-arụ ugbu a n’ala 235 n’ụwa nile.