Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịdị Ọcha Dị Mkpa?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịdị Ọcha Dị Mkpa?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịdị Ọcha Dị Mkpa?

NDỊ mmadụ na-akọwa ịdị ọcha n’ụzọ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, mgbe nne gwara obere nwa ya ka ọ gaa kwọọ aka ma saa ihu ya, nwa ahụ pụrụ iche na idesa mkpụrụ aka ya na egbugbere ọnụ ya mmiri ezuola. Ma mama ya maara ihe karịa ya. Ọ na-akpọghachi ya azụ n’ebe mmiri dị ma jiri ncha na mmiri saa ya aka na ihu nke ọma—n’agbanyeghị mkpu ọ ga na-eti!

N’ezie, ụkpụrụ nke ịdị ọcha abụghị otu gburugburu ụwa, ndị mmadụ na-ejikwa echiche dịgasị iche iche banyere ịdị ọcha etolite. N’oge gara aga, n’ọtụtụ mba, ụlọ akwụkwọ nke gburugburu ya dị ọcha na nke a haziri nke ọma na-enyere ụmụ akwụkwọ aka ịzụlite ezi àgwà nke ịdị ọcha. Taa, a na-atụsasị ihe na mbara èzí nke ụfọdụ ụlọ akwụkwọ nke na ha na-eyi ebe a na-ekpofu ihe kama iyi ebe a na-egwuri egwu ma ọ bụ na-emega ahụ. Gịnịkwanụ banyere ọnụ ụlọ klas? Darren, bụ́ odozi ụlọ n’otu kọleji dị n’Australia, kwuru, sị: “Anyị na-ahụzi ihe ndị na-asọ oyi n’ọnụ ụlọ klas.” Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-ewere ya na a na-ata ha ahụhụ ma a gwa ha “Tụtụrụ ya” ma ọ bụ “Hichaa ya.” Nsogbu dị na ya bụ na ụfọdụ ndị nkụzi na-eji idebe ihe ọcha eme ihe dị ka ụzọ isi nye ntaramahụhụ.

N’aka nke ọzọ, ndị meworo okenye adịghị esetịpụ ezi ihe nlereanya mgbe nile n’ịdị ọcha, ma ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị ma n’ógbè achụmnta ego. Dị ka ihe atụ, a na-emetọ ọtụtụ ebe ọha na eze na-anọ ma mee ka ha na-asọ oyi. Ụfọdụ ụlọ ọrụ na-emetọ gburugburu ebe obibi. Otú ọ dị, ọ bụghị ụlọ ọrụ na achụmnta ego nkịtị na-akpata mmetọ, kama ọ bụ ndị mmadụ. Ọ bụ ezie na anyaukwu bụ, ma eleghị anya, isi ihe na-akpata nsogbu zuru ụwa ọnụ nke mmetọ na ọtụtụ ihe ndị ọ na-emebi, ihe so akpata ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ bụ àgwà ndị na-adịghị ọcha ndị mmadụ n’otu n’otu na-akpa. Onye bụbu onyeisi ọchịchị Mba Australia kwadoro nkwubi okwu a mgbe o kwuru, sị: “A ga-edozi nsogbu nile metụtara ahụ́ ike ọha ma ọ bụrụ na nwoke, nwanyị, na nwatakịrị elebara ịdị ọcha anya.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ na-eche na ịdị ọcha bụ ihe mmadụ na-emere onwe ya, o kwesịghịkwa ịgbasa onye ọ bụla ọzọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ezie?

A pụghị ikwubiga okwu ókè banyere mkpa ịdị ọcha dị ma a bịa ná nri anyị—ma ànyị zụrụ ya n’ahịa, rie ya n’ụlọ nri, ma ọ bụ rie ya n’ụlọ enyi anyị. A na-atụ anya na ndị na-emetụ nri anyị na-eri aka ma ọ bụ na-ebutere anyị ya kwesịrị ịbụ ndị na-agbaso ụkpụrụ dị elu nke ịdị ọcha. Aka ruru unyí—nke ha ma ọ bụ nke anyị—pụrụ ịbụ ebe e si ebute ọtụtụ ọrịa. Gịnị banyere ụlọ ọgwụ—ebe anyị kasị atụ anya ịhụ ịdị ọcha? Akwụkwọ bụ́ The New England Journal of Medicine kọrọ na aka ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-akwọghị akwọ pụrụ inye aka kọwaa ihe mere ọtụtụ ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ji ebute ọrịa ndị na-efu ihe ruru ijeri dollar iri kwa afọ iji gwọọ ha. N’ụzọ ziri ezi, anyị na-atụ anya ka mmadụ ọ bụla ghara itinye ahụ́ ike anyị n’ihe ize ndụ n’ihi àgwà adịghị ọcha ya.

Ọ bụkwa ihe dị oké njọ mgbe mmadụ—kpachapụrụ anya ma ọ bụ jiri elezighị anya—metọọ ebe anyị si ekute mmiri. Oleekwa otú o si dị nchebe ịgba ụkwụ ọtọ na-agagharị n’ụsọ mmiri bụ́ ebe mmadụ pụrụ ịhụ ndụdụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ na ndị ọzọ ji mee ihe ma tọgbọ ha n’ebe ahụ? Ikekwe, ọbụna ajụjụ ka mkpa anyị ga-ajụ onwe anyị bụ: Ànyị na-edebe ihe ọcha n’ebe obibi anyị?

Suellen Hoy, jụrụ n’akwụkwọ ya bụ́ Chasing Dirt, sị: “Ànyị na-adị ọcha otú anyị sibu adị?” Ọ zara, sị: “Ikekwe anyị anaghị adị.” O hotara mgbanwe a na-enwe n’omume ọha mmadụ na-anakwere dị ka isi ihe kpatara ya. Ka ndị mmadụ na-adịghị anọkebe n’ụlọ, ihe ha na-eme nnọọ bụ ịkwụ onye ọzọ ụgwọ ka ọ na-edebere ha ihe ọcha. N’ihi ya, ịnọgide na-edebe gburugburu ebe obibi ọcha abụghịzi ihe ndị mmadụ weere dị ka ihe dị ha mkpa. “Anaghị m asa ụlọ ịsa ahụ—ọ bụ ahụ́ m ka m na-asa,” ka otu nwoke kwuru. “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụlọ m rugodị unyí, adị m ọcha.”

Otú ọ dị, ịdị ọcha karịrị nnọọ ọdịdị elu ahụ́. Ọ bụ ụkpụrụ omume dị mma nke metụtara akụkụ nile nke ezi ndụ. Ọ bụkwa ọnọdụ uche na nke obi bụ́ nke na-agụnye omume na ofufe anyị. Ka anyị hụ otú o si dị otú a.