Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide “Ogwu n’Anụ Ahụ́”

Ịnagide “Ogwu n’Anụ Ahụ́”

Ịnagide “Ogwu n’Anụ Ahụ́”

“Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị.”—2 NDỊ KỌRINT 12:9.

1, 2. (a) Gịnị mere eziokwu ahụ bụ́ na anyị na-enweta ule na nsogbu na-ekwesịghị iji ju anyị anya? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-enwe obi ike n’agbanyeghị ọnwụnwa?

“A GA-AKPAGBUKWA ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Setan zọọrọ na ụmụ mmadụ na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe ha nanị, ọ chọsikwara ike igosipụta na ihe o kwuru bụ eziokwu. Jizọs dọrọ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi aka ná ntị n’otu oge, sị: “Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.” (Luk 22:31) Jizọs maara nke ọma na Chineke na-ekwe ka Setan jiri nsogbu ndị na-egbu mgbu na-ele anyị ule. N’ezie, nke ahụ apụtaghị na ihe isi ike ọ bụla anyị na-enwe ná ndụ si kpọmkwem n’aka Setan ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya. (Eklisiastis 9:11) Ma Setan na-achọsi ike iji ụzọ ọ bụla o nwere ike mee ihe iji mebie nguzosi ike n’ezi ihe anyị.

2 Bible na-agwa anyị na nsogbu anyị ekwesịghị iju anyị anya. Ihe ọ sọkwara ya dakwasị anyị, ọ bụghị ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe a na-atụghị anya ya. (1 Pita 4:12) N’ezie, “a na-esite n’ịta ahụhụ emezu otu ihe ahụ n’òtù ụmụnna [anyị] nile nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:9) Taa, Setan na-arụgidesi onye ọ bụla bụ́ ohu Chineke ike. Ọ na-atọ Ekwensu ụtọ ịhụ ka e ji nsogbu ndị yiri ogwu na-emekpa anyị ahụ́ ruo ókè o kwere mee. Iji mezuo nke ahụ, ọ na-eji usoro ihe ya eme ihe n’ụzọ nke na o yiri ka ọ ga na-amụba ‘ogwu ọ bụla anyị nwere n’anụ ahụ́’ anyị ma ọ bụ mee ka ọ ka njọ. (2 Ndị Kọrint 12:7) Otú o sina dị, mwakpo Setan ekwesịghị imebi nguzosi ike n’ezi ihe anyị. Dị nnọọ ka Jehova ‘ga-eme ụzọ mgbapụ’ ka anyị wee tachie obi n’ọnwụnwa, ọ ga-eme otu ihe ahụ mgbe anyị chere nsogbu ndị dị ka ogwu n’anụ ahụ́ anyị ihu.—1 Ndị Kọrint 10:13.

Ụzọ Isi Nagide Ogwu

3. Gịnị ka Jehova zara mgbe Pọl rịọrọ ya ka o wepụrụ ya ogwu dị n’anụ ahụ́ ya?

3 Pọl onyeozi rịọrọ Chineke ka o wepụ ogwu ahụ o nwere n’anụ ahụ́ ya. “N’ihi nke a, ugboro atọ ka m rịọsiri Onyenwe anyị arịrịọ ike ka ihe a wee si n’ebe m nọ pụọ.” Gịnị bụ azịza Jehova nye arịrịọ siri ike Pọl rịọrọ? “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:8, 9) Ka anyị tụlee azịza a ma hụ otú ọ pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nsogbu ọ bụla yiri ogwu nke na-egbu anyị mgbu.

4. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl siworo rite uru site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova?

4 Rịba ama na Chineke gbara Pọl ume inwe ekele maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke e siworo n’aka Kraịst gosi ya. N’ezie, a gọziwo Pọl n’ụba n’ọtụtụ ụzọ. Jehova ji ịhụnanya nye ya ihe ùgwù nke ịbụ onye na-eso ụzọ, n’agbanyeghị na ọ bụwo onye ji oké ịnụ ọkụ n’obi megide ụmụazụ Jizọs. (Ọrụ 7:58; 8:3; 9:1-4) Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova ji obiọma nye Pọl ọtụtụ ọrụ na ihe ùgwù ndị na-akpali akpali. Ihe nke a na-akụziri anyị doro anya. Ọbụna n’oge ihe kasị taa akpụ, anyị ka na-enwe ọtụtụ ngọzi ndị anyị ga-enwe ekele maka ha. Anyị ekwesịghị ma ọlị ikwe ka ọnwụnwa anyị mee ka anyị chezọọ ịdị mma bara ụba nke Jehova.—Abụ Ọma 31:19.

5, 6. (a) Olee otú Jehova si kụziere Pọl na “a na-eme ka ike [Ya] zuo okè n’adịghị ike”? (b) Olee otú ihe nlereanya Pọl si gosi na Setan bụ onye ụgha?

5 Obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova zuru ezu n’ụzọ ọzọ. Ike Chineke zuru nnọọ ezu iji nyere anyị aka mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa. (Ndị Efesọs 3:20) Jehova kụziiri Pọl na “a na-eme ka ike [Ya] zuo okè n’adịghị ike.” N’ụzọ dị aṅaa? O ji ịhụnanya nye Pọl ike nile dị ya mkpa iji nagide ọnwụnwa ya. N’aka nke ya, ntachi obi na ntụkwasị obi siri ike Pọl nwere n’ebe Jehova nọ mere ka mmadụ nile hụ na ike Chineke nọ na-enwe mmeri n’ihe banyere nwoke a na-adịghị ike nke na-eme mmehie. Ugbu a, tụlee mmetụta o nwere n’ebe Ekwensu nọ, bụ́ onye na-azọrọ na ụmụ mmadụ na-ejere Chineke ozi nanị mgbe ndụ dị ntụsara ahụ́, n’enweghịkwa nsogbu. Iguzosi ike n’ezi ihe Pọl mara onye nkwutọ ahụ ụra!

6 Leenụ Pọl, onye bụbu onye òtù Setan n’ọgụ ọ na-alụso Chineke, onye ji anyaike kpagbuo Ndị Kraịst, onye Farisii na-anụ ọkụ n’obi nke ihe ịrụ aka na-adịghị ya na o biburu ndụ ntụsara ahụ́ n’ihi na a mụrụ ya n’ezinụlọ ndị oké ozu. Pọl na-ejeziri Jehova na Kraịst ozi dị ka “onye kasị nta n’ime ndịozi.” (1 Ndị Kọrint 15:9) N’ihi ya, o ji obi umeala doo onwe ya n’okpuru idu ndú nke òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst na narị afọ mbụ. O jikwa ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’agbanyeghị ogwu o nwere n’anụ ahụ́. N’ịbụ nnọọ nke wutere Setan, ọnwụnwa Pọl nwere ná ndụ emeghị ka ịnụ ọkụ n’obi ya belata. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Pọl kwụsịrị inwe olileanya na ọ ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe nke Kraịst. (2 Timoti 2:12; 4:18) Ọ dịghị ogwu, n’agbanyeghị otú ọ na-egburu na mgbu, pụrụ ime ka ịnụ ọkụ n’obi ya belata. Ka ịnụ ọkụ n’obi anyị nọgide na-esi ike n’otu aka ahụ! Site n’ịkwagide anyị n’ọnwụnwa anyị, Jehova na-eji ihe ùgwù nke iso na-egosi na Setan bụ onye ụgha na-ebuli anyị elu.—Ilu 27:11.

Ndokwa Jehova Dị Oké Mkpa

7, 8. (a) Olee ụzọ Jehova si ewusikwu ndị ohu ya ike taa? (b) Gịnị mere ọgụgụ Bible kwa ụbọchị na ọmụmụ ihe ji dị anyị oké mkpa iji na-anagide ogwu n’anụ ahụ́ anyị?

7 Taa, Jehova na-enye Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ike site na mmụọ nsọ ya, Okwu ya, na òtù ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst. Dị ka Pọl onyeozi, anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova ibu anyị site n’ekpere. (Abụ Ọma 55:22) Ọ bụ ezie na Chineke nwere ike ghara iwepụ ọnwụnwa anyị, ọ pụrụ inye anyị amamihe ịnagide ha, ọbụna ndị kasị sie ike nnagide. Jehova pụkwara inye anyị obi ike—na-enye anyị “ike karịrị ike nkịtị”—iji nyere anyị aka ịtachi obi.—2 Ndị Kọrint 4:7.

8 Olee otú anyị si enweta enyemaka dị otú ahụ? Anyị aghaghị iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, n’ihi na n’ime ya ka anyị ga-ahụ okwu ngụgụ obi ndị a pụrụ ịdabere na ha o kwuru. (Abụ Ọma 94:19) N’ime Bible, anyị na-agụ okwu ndị na-emetụ n’obi bụ́ ndị ndị ohu Chineke kwuru ka ha na-arịọ Chineke maka enyemaka. Ihe Jehova na-azaghachi, bụ́ ndị na-agụnyekarị okwu nkasi obi, bụ ihe ndị a ga-atụgharị uche na ha. Ọmụmụ ihe ga-ewusi anyị ike ka “ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.” Dị nnọọ ka o si dị anyị mkpa ịdị na-eri nri nkịtị kwa ụbọchị ka ahụ́ wee na-adị anyị mma na iji na-enweta ike, anyị aghaghị ịdị na-amụchi okwu Chineke anya n’otu aka ahụ. Ànyị na-eme nke a? Ọ bụrụ na anyị na-eme ya, mgbe ahụ anyị ga-ahụ na anyị inweta “ike karịrị ike nkịtị” na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ogwu ihe atụ ọ bụla pụrụ imekpa anyị ahụ́ ugbu a.

9. Olee otú ndị okenye pụrụ isi na-akwado ndị na-anagide nsogbu?

9 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-atụ egwu Chineke pụrụ ịdị “ka ebe izonahụ ifufe” nke obi erughị ala, “ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo” nke nsogbu. Ndị okenye, bụ́ ndị chọrọ ikwekọ ná nkọwa ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, na-eji obi umeala na ezi obi arịọ Jehova ka o nye ha “ire nke ndị mmụta” ka ha wee nwee ike ịmara otú ha ga-esi na-eji okwu ndị dị mma azaghachi ndị na-ahụju anya. Okwu nke ndị okenye pụrụ ịdị ka obere mmiri ozuzo nke na-eme ka obi jụọ anyị oyi ma na-akasi anyị obi n’oge ihe na-esiri anyị ike ná ndụ. N’ezie, site ‘n’ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà,’ ndị okenye na-akwado ụmụnna ime mmụọ ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ike na-agwụ ha ma ọ bụ na ha na-enwe nkụda mmụọ n’ihi ụfọdụ ogwu ndị ha nwere n’anụ ahụ́ ha.—Aịsaịa 32:2; 50:4; 1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

10, 11. Olee otú ndị ohu Chineke pụrụ isi gbaa ndị ọzọ na-enweta ule ndị tara akpụ ume?

10 Ndị ohu Jehova nile so n’ezinụlọ ya dị n’otu nke Ndị Kraịst. Ee, anyị bụ “akụkụ ahụ́ ndị dịịrị ibe anyị n’otu n’otu,” anyị “jikwa ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” (Ndị Rom 12:5; 1 Jọn 4:11) Olee otú anyị si akwụ ụgwọ a anyị ji? Dị ka 1 Pita 3:8 si kwuo, anyị na-eme nke ahụ site ‘n’igosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, ma na-enwe obi ọmịiko’ n’ebe ndị nile bụ́ ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ. A bịa n’ebe ndị na-anagide ogwu na-egbu nnọọ mgbu n’anụ ahụ́ nọ, ma hà bụ́ ndị na-eto eto ma ha bụ́ ndị agadi, anyị nile pụrụ ichebara ha echiche n’ụzọ pụrụ iche. N’ụzọ dị aṅaa?

11 Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịmara ahụhụ ha na-ata. Ọ bụrụ na anyị na-akpọ obi nkụ, ghara ịdị na-egosi mmetụta, ma ọ bụ na-egosi enweghị mmasị, anyị pụrụ, n’amaghị ama, ịdị na-eme ka ahụhụ ha ka njọ. Anyị ịmara ọnwụnwa ha kwesịrị ịkpali anyị ịdị na-akpachapụ anya n’ihe anyị na-ekwu, otú anyị si ekwu ya, na otú anyị si eme omume. Anyị inwe nchekwube ma na-agba ha ume pụrụ inye aka mee ka ụfọdụ n’ime oké ihe mgbu nke ụdị ogwu ọ bụla na-emekpa ha ahụ́ belata. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị pụrụ igosi na anyị bụ ndị enyemaka na-eme ka ha dị ike.—Ndị Kọlọsi 4:11.

Otú Ụfọdụ Ndị Siworo Nagide Ya n’Ụzọ Gara nke Ọma

12-14. (a) Gịnị ka otu Onye Kraịst mere iji nagide ọrịa cancer? (b) Olee otú ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ nke nwanyị a si kwadoo ma gbaa ya ume?

12 Ka anyị na-eru nso ọgwụgwụ nke mgbe ikpeazụ a, “ihe ụfụ nke nhụjuanya” na-amụbawanye kwa ụbọchị. (Matiu 24:8) N’ihi ya, o yikarịrị ka ọnwụnwa ọ ga na-emekpa onye ọ bụla nọ n’ụwa ahụ́, karịsịa ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-agbalị ime uche ya. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu Onye Kraịst na-eje ozi oge nile. A chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa cancer, a ghaghịkwa ịwa ya ahụ́ iji wepụ akụkụ ahụ́ ya ndị na-emepụta asọ mmiri na mmiri ahụ́ a na-akpọ lymph. Mgbe ya na di ya matara na o bu ọrịa a, ha kpekusiri Jehova ekpere ike ozugbo ruo ogologo oge. O mesịrị kwuo na ha bịara nwee ahụ́ iru ala nke na-eyighị ihe ga-ekwe omume. Ma, ọ tachiri obi n’ọnọdụ ọma na nke ọjọọ, karịsịa mgbe ọ na-anagide nsogbu ndị ọgwụ ndị e ji gwọọ ya kpatara.

13 Iji nagide ọnọdụ ya, nwanna nwanyị a gbalịrị ịmata banyere ọrịa cancer ruo ókè o nwere ike. Ọ kpọtụụrụ ndị dọkịta ya. N’Ụlọ Nche, Teta!, nakwa ná mbipụta ndị ọzọ nke Ndị Kraịst, ọ hụrụ akụkọ ndụ ndị na-egosi otú ndị dị iche iche siworo nagide ọrịa a n’ụzọ mmetụta uche. Ọ gụkwara akụkụ Bible ndị metụtara ọnọdụ ya bụ́ ndị na-egosi ikike Jehova nwere ịkwagide ndị ya n’oge ihe na-esiri ha ike, na ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru.

14 Otu isiokwu kwuru banyere ịnagide obi nkoropụ hotara okwu ndị a amamihe dị na ha bụ́: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ.” (Ilu 18:1) Ya mere, isiokwu ahụ nyere ndụmọdụ a: ‘Zere ikewapụ onwe gị.’ * Nwanna nwanyị ahụ na-akọ, sị: “Ọtụtụ ndị gwara m na ha na-ekpe ekpere n’isi m; ndị ọzọ kpọrọ m na fon. Ndị okenye abụọ na-akpọ m na fon mgbe nile iji chọpụta otú m dị. Enwetara m okooko osisi na imerime kaadị. Ọbụna ụfọdụ ndị siiri m nri. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ji ọchịchọ obi wepụta onwe ha ibuga m n’ebe a na-enye m ọgwụ.”

15-17. (a) Olee otú otu Onye Kraịst si nagide ihe isi ike ndị ihe mberede kpatara? (b) Nkwado dị aṅaa ka ndị nọ n’ọgbakọ nyere?

15 Otu onye jewooro Jehova ozi ruo ogologo oge na New Mexico, U.S.A., nwere ihe mberede abụọ nke ụgbọala. O merụrụ ahụ́ n’olu na n’ubu, na-eme ka ogbu na nkwonkwo ọ nọworo na-anagide ruo ihe karịrị afọ 25 ka njọ. Ọ na-akọ, sị: “O siiri m ike nke ukwuu iweli isi m elu na ibu ihe ọ bụla dị arọ karịa kilogram abụọ. Ma ikpekusi Jehova ekpere ike akwagidewo m nke ukwuu. Otú ahụ ka isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche ndị anyị mụrụla meworo. Otu kwuru banyere Maịka 6:8, na-ekwu na mmadụ ịma ebe ike ya ruru n’iso Chineke na-eje ije pụtara mmadụ ịma ihe ndị a kpaara ya ókè na ha. Nke a nyeere m aka ịghọta na n’agbanyeghị ọnọdụ m, ekwesịghị m inwe nkụda mmụọ, ọ bụ ezie na oge m na-etinye n’ozi dị ala karịa ihe m chọrọ. Iji obi ọcha na-ejere ya ozi bụ ihe ka mkpa n’ụzọ bụ́ isi.”

16 Ọ kọkwara, sị: “Ndị okenye na-aja m mma mgbe nile maka mgbalị m na-eme ịga nzukọ na ozi ubi. Ndị na-eto eto na-ekele m site n’ịmakụ m. Ndị ozi bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-enwere m nnọọ ndidi, mgbe mgbe ha na-emegharị ndokwa ha n’ụbọchị ọrịa jisiri m ike. Mgbe ihu igwe na-adịghị mma, ha na-eji obiọma kpọrọ m gaa nletaghachi ma ọ bụ gwa m ka m sonyere ha n’ọmụmụ Bible ha. Ebe ọ bụkwa na anaghị m ebuli akpa ozi ọma, ndị nkwusa ọzọ na-etinye akwụkwọ m n’ime akpa ha mgbe m na-aga ọrụ nkwusa.”

17 Rịba ama otú ndị okenye ọgbakọ na ndị kwere ekwe ibe ha si nyere ụmụnna nwanyị abụọ a aka ịnagide nkwarụ ha ndị yiri ogwu. Ha nyere aka n’ezie n’ụzọ dị ire bụ́ ndị e zubere iji gboo mkpa ụfọdụ nke ime mmụọ, nke anụ ahụ́, na nke mmetụta uche. Nke ahụ ọ́ dịghị agba gị ume inyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ nọ ná nsogbu aka? Unu ndị na-eto eto pụkwara ịbụ ndị enyemaka nye ndị ha na ogwu n’anụ ahụ́ na-alụ n’ọgbakọ unu.—Ilu 20:29.

18. Agbamume dị aṅaa ka anyị pụrụ ịhụ n’akụkọ ndụ ndị a na-ebipụta na magazin Ụlọ Nche na Teta!?

18 Na magazin Ụlọ Nche na Teta!, e bipụtawo ọtụtụ akụkọ ndụ na ahụmahụ nke Ndịàmà bụ́ ndị nagideworo, ma ka nọgide na-anagide, nsogbu nke ndụ. Ka ị na-agụchi isiokwu ndị ahụ anya, ị ga-ahụ na ọtụtụ n’ime ụmụnna ime mmụọ gị ndị nwoke na ndị nwanyị gburugburu ụwa atachiwo obi n’ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọnwụ onye a hụrụ n’anya nwụrụ n’ọdachi, na ọnọdụ ndị dị ize ndụ nke oge agha. Ndị ọzọ na-arịa ọrịa ndị kwarụworo ha. Ọtụtụ apụghị ime ụfọdụ n’ime ihe ndị dị mfe ná ndụ bụ́ ndị na-enweghị ihe ha bụụrụ ndị ahụ́ siri ike. Ọrịa ha na-ele ha ule nke ukwuu, karịsịa mgbe ha na-apụghị ikere òkè n’ọrụ Ndị Kraịst ruo ókè ha ga-achọ ime. Lee ekele miri emi ha na-enwe maka enyemaka na nkwado ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị na-eto eto na ndị agadi, na-enye ha!

Ntachi Obi Na-eweta Obi Ụtọ

19. Gịnị mere Pọl ji nwee ike ịṅụrị ọṅụ n’agbanyeghị ọnwụnwa na adịghị ike ya ndị yiri ogwu?

19 Obi tọrọ Pọl ụtọ ịhụ otú Chineke si wusikwuo ya ike. O kwuru, sị: “N’ụzọ kasị enye ọṅụ, ọ kara m mma ịnya isi n’ihe metụtara adịghị ike m, ka ike nke Kraịst ahụ wee nọgide na-ekpuchi m dị ka ụlọikwuu. Ya mere, ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, ná mkparị, n’ịnọgasị ná mkpa, ná mkpagbu na ihe isi ike, maka Kraịst. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:9, 10) N’ihi ahụmahụ Pọl nwere n’onwe ya, ọ pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Ọ bụghị na m na-ekwu banyere ịnọ n’ụkọ, n’ihi na amụtawo m, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya, inwe afọ ojuju. Amaara m n’ezie ụzọ isi nwee ihe dị nta, amaara m n’ezie ụzọ isi nwee ihe n’ụba. N’ihe ọ bụla nakwa n’ọnọdụ nile amụtawo m ma ụzọ isi nọrọ n’ùjú ma ụzọ isi nọrọ n’agụụ, ma ụzọ isi nwee ihe n’ụba ma ụzọ isi nọrọ n’ụkọ. Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:11-13.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nweta ọṅụ n’ịtụgharị uche ‘n’ihe ndị a na-adịghị ahụ anya’? (b) Olee ụfọdụ “ihe ndị a na-adịghị ahụ anya” ị na-atụ anya ịhụ n’ụwa Paradaịs?

20 Mgbe ahụzi, site n’ịtachi obi n’ogwu ihe atụ ọ bụla anyị nwere n’anụ ahụ́, anyị pụrụ inweta obi ụtọ dị ukwuu n’igosi onye ọ bụla na a na-eme ka ike Jehova zuo okè n’adịghị ike anyị. Pọl dere, sị: “Anyị adịghị ada mbà . . . N’ezie a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime ahụ́ na-adịghachi ọhụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. N’ihi na ọ bụ ezie na mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge, dịkwa mfe, ọ na-arụpụtara anyị ebube nke ịdị arọ ya dị nnọọ ukwuu karị, nke na-adịrukwa ebighị ebi; ka anyị nọ na-elekwasị anya . . . n’ihe ndị a na-adịghị ahụ anya. N’ihi na ihe ndị . . . a na-adịghị ahụ anya na-adịru ebighị ebi.”—2 Ndị Kọrint 4:16-18.

21 Ihe ka ọtụtụ ná ndị Jehova taa na-enwe olileanya ibi na Paradaịs elu ala ya na inweta ngọzi ndị o kweworo ná nkwa. Ngọzi ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụrụ anyị ndị “a na-adịghị ahụ anya” taa. Otú ọ dị, oge anyị ga-eji anya anyị hụ ngọzi ndị ahụ, ee, ma nụ ụtọ ha ruo mgbe ebighị ebi, ji ọsọ na-abịa. Otu n’ime ngọzi ndị dị otú ahụ ga-abụ nnwere onwe nke ịbụ ndị na-agaghịzi enwe nsogbu ndị yiri ogwu ná ndụ ọzọ ma ọlị! Ọkpara Chineke ‘ga-etipịasị ọrụ Ekwensu’ ma “mee ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ.”—1 Jọn 3:8; Ndị Hibru 2:14.

22. Obi ike na mkpebi siri ike dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe?

22 Ya mere, ụdị ogwu ọ sọkwara ya na-emekpa anyị ahụ́ n’anụ ahụ́ taa, ka anyị nọgide na-anagide ya. Dị ka Pọl, anyị ga-enwe ume ime nke ahụ site na Jehova, bụ́ onye na-enye anyị ike n’ụba. Mgbe anyị ga-ebi n’ụwa Paradaịs, anyị ga na-agọzi Jehova bụ́ Chineke anyị kwa ụbọchị maka ihe nile dị ebube ọ na-eme maka ọdịmma anyị.—Abụ Ọma 103:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ụzọ Isi Nagide Obi Nkoropụ,” ná mbipụta Teta! nke May 8, 2000.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị mere Ekwensu ji anwa imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke ezi Ndị Kraịst, oleekwa ụzọ o si eme ya?

• Olee otú ‘e si eme ka ike Jehova zuo okè n’adịghị ike’?

• Olee otú ndị okenye na ndị ọzọ pụrụ isi na-agba ndị nsogbu na-emekpa ahụ́ ume?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Pọl kpere ekpere ugboro atọ ka Chineke wepụrụ ya ogwu o nwere n’anụ ahụ́ ya