Gịnị Ka Ọ Na-efu Iji Nọgide Na-enwe Akọ na Uche Dị Ọcha?
Gịnị Ka Ọ Na-efu Iji Nọgide Na-enwe Akọ na Uche Dị Ọcha?
“E NYE Gọọmenti Iwu Ịnara R$20,000.” Isi akụkọ a dị ịtụnanya gbara n’oge na-adịbeghị anya n’akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ Correio do Povo. Isiokwu ahụ kọrọ banyere Luiz Alvo de Araújo, nwoke na-ekesa akwụkwọ ozi n’ógbè ya, bụ́ onye resịrị gọọmenti ala. Mgbe Luiz nyefesịrị gọọmenti ala ahụ, o juru ya anya ịchọpụta na a kwụfewo ya R$20,000 (ihe dị ka $8,000, U.S.)!
Iweghachi ego ahụ a kwụfere ya ghọrọ ihe siri ike. Mgbe Luiz gasịrị n’ụlọ ọrụ ndị gọọmenti ọtụtụ mgbe ma o nweghị isi, a tụụrụ ya aro iku ọkàiwu ma dozie okwu ahụ n’ụlọikpe. “O doro anya na ọ dị onye mehiere ihe, ma n’ihi igbu oge, ọ dịghịkwa onye ma otú a pụrụ isi mezie ya,” ka ọkàikpe mara gọọmenti ikpe ka ọ nara ego ahụ ma kwụghachi ihe e mefuru n’ụlọikpe, kwuru. “Nke a bụ nke mbụ m hụrụ ụdị okwu ikpe a.”
Luiz, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-akọwa, si: “Akọ na uche m e ji Bible zụọ agaghị ekwe ka m jichie ihe na-abụghị nke m. Aghaghị m ịgbalị iweghachi ego ahụ.”
Àgwà dị otú ahụ pụrụ iju ọtụtụ ndị anya, ma ọ bụ ọbụna ghara ikwe ha nghọta. Ma Okwu Chineke na-egosi na ezi Ndị Kraịst na-eji ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha mgbe ha na-emeso ndị na-achị achị ihe akpọrọ ihe nke ukwuu. (Ndị Rom 13:5) Ndịàmà Jehova kpebisiri ike ịnọgide ‘na-enwe akọ na uche ziri ezi ma na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.’—Ndị Hibru 13:18.