Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Nagidere Ogwu n’Anụ Ahụ́ Ha

Ha Nagidere Ogwu n’Anụ Ahụ́ Ha

Ha Nagidere Ogwu n’Anụ Ahụ́ Ha

“E mere ka m nwee ogwu n’anụ ahụ́ m, bụ́ mmụọ ozi Setan, ka ọ nọgide na-ama m ụra.”—2 NDỊ KỌRINT 12:7.

1. Olee ụfọdụ nsogbu ndị mmadụ na-enwe taa?

GỊ NA ọnwụnwa na-aga n’ihu ọ̀ na-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ dị otú ahụ. ‘N’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-anagide mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, nsogbu ezinụlọ, ọrịa, nchegbu banyere ego, obi erughị ala, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, na ihe ịma aka ndị ọzọ. (2 Timoti 3:1-5) N’ala ụfọdụ, ụnwụ nri na agha na-eyi ndụ nke ọtụtụ mmadụ egwu.

2, 3. Àgwà dị aṅaa na-ezighị ezi ka nsogbu ndị yiri ogwu na-adakwasị anyị pụrụ ime ka anyị nwee, oleekwa otú nke ahụ pụrụ isi dị ize ndụ?

2 Ọ pụrụ ịdị mmadụ ka nsogbu ndị dị otú ahụ hà karịrị ya nnọọ ike, karịsịa ma ọ bụrụ na ọtụtụ ihe isi ike abịa n’otu mgbe. Rịba ama ihe Ilu 24:10 na-ekwu: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Ee, inwe nkụda mmụọ n’ihi ọnwụnwa pụrụ ịnapụ anyị ikike dị anyị oké mkpa, ọ pụkwara ime ka mkpebi anyị mere ịtachi obi ruo ọgwụgwụ gharazie isi ike. N’ụzọ dị aṅaa?

3 Nkụda mmụọ pụrụ ime ka anyị gharazie iji obi ọcha na-atụle ihe. Dị ka ihe atụ, ọ dịịrị anyị mfe ime ka ihe isi ike anyị yie ihe gabigara ókè na ịmalite imewere onwe anyị ebere. Ụfọdụ pụrụ ọbụna itiku Chineke mkpu, sị, “Gịnị mere i ji kwere ka ihe a na-eme m?” Ọ bụrụ na echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ agbanye mkpọrọgwụ n’obi mmadụ, ọ pụrụ ịnapụ ya ọṅụ na obi ike. Ohu Chineke pụrụ inwe nnọọ nkụda mmụọ nke na ọ pụrụ ọbụna ịkwụsị ịlụ “ezi ọgụ nke okwukwe.”—1 Timoti 6:12.

4, 5. N’ọnọdụ ụfọdụ, aka Setan si aṅaa adị ná nsogbu anyị, ma gịnị ka obi pụrụ isi anyị ike na ya?

4 N’ezie, ọ bụghị Jehova Chineke na-ewetara anyị ọnwụnwa. (Jems 1:13) Anyị na-enweta ule ụfọdụ nanị n’ihi na anyị na-agbalị ikwesị ntụkwasị obi nye ya. N’ezie, ndị nile na-ejere Jehova ozi na-eme onwe ha ndị onye iro ukwu ya, bụ́ Setan Ekwensu, ga-elekwasị anya. Na nwa oge fọdụụrụ ya, ‘chi ọjọọ ahụ nke usoro ihe a’ na-anwa ime ka onye ọ bụla na-ejere Jehova ozi daa mbà n’ime uche Ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) Setan na-ewetara òtù ụmụnna anyị nile gburugburu ụwa nhụjuanya ruo ókè o nwere ike. (1 Pita 5:9) N’ezie, ọ bụghị Setan kpọmkwem na-akpata nsogbu nile anyị na-enwe, ma ọ pụrụ iji nsogbu anyị na-enwe mee ihe, na-achọ ime ka ike gwụkwuo anyị.

5 Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú Setan na ngwá ọrụ ya pụrụ isiru n’ike, anyị pụrụ imeri ya! Ànyị pụrụ isi aṅaa jide nke ahụ n’aka? Ọ bụ n’ihi na Jehova Chineke na-alụchitere anyị ọgụ. O jidewo n’aka na ndị ohu ya maara atụmatụ aghụghọ Setan. (2 Ndị Kọrint 2:11) N’ezie, Okwu Chineke na-agwa anyị ọtụtụ ihe banyere ọnwụnwa ezi Ndị Kraịst na-enweta. N’ihe banyere Pọl onyeozi, Bible ji okwu bụ́ “ogwu n’anụ ahụ́” mee ihe. N’ihi gịnị? Ka anyị hụ otú Okwu Chineke si kọwaa nkebi ahịrịokwu ahụ. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụ na ọ bụghị nanị anyị ka enyemaka Jehova dị mkpa iji merie ọnwụnwa.

Ihe Mere Ule Ji Adị Ka Ogwu

6. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru banyere “ogwu n’anụ ahụ́,” gịnịkwa ka ogwu ahụ pụrụ ịbụwo?

6 N’ịbụ onye a nwaworo ọnwụnwa nke ukwuu, e nyere Pọl ike mmụọ nsọ ide, sị: “E mere ka m nwee ogwu n’anụ ahụ́ m, bụ́ mmụọ ozi Setan, ka ọ nọgide na-ama m ụra, ka e wee ghara ibuli m elu gabiga ókè.” (2 Ndị Kọrint 12:7) Gịnị bụ ogwu a Pọl nwere n’anụ ahụ́ ya? Ogwu nke mabamiri mmadụ n’anụ ahụ́ aghaghị igbu ya mgbu. Ya mere, okwu ahụ na-egosi ihe kpataara Pọl ihe mgbu—ma ọ̀ bụ nke anụ ahụ́, nke mmetụta uche, ma ọ bụ ha abụọ. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl nwere nsogbu anya ma ọ bụ ụdị nkwarụ anụ ahụ́ ọzọ. Ma ọ bụ, ogwu ahụ pụrụ ịgụnyewo ndị ahụ mara iru eru Pọl dị ka onyeozi aka ma nyoo ọrụ nkwusa na izi ihe ya enyoo. (2 Ndị Kọrint 10:10-12; 11:5, 6, 13) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ogwu ahụ dịgidere n’ahụ́ ya, a pụghịkwa iwepụ ya.

7, 8. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘nọgide na-ama ụra’ na-egosi? (b) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-anagide ogwu ọ bụla na-emekpa anyị ahụ́ ugbu a?

7 Rịba ama na ogwu ahụ nọgidere na-ama Pọl ụra. N’ụzọ na-akpali mmasị, e si n’okwu e ji eme ihe maka “nkwonkwo mkpịsị aka” nweta ngwaa Grik Pọl ji mee ihe n’ebe a. E ji okwu ahụ mee ihe n’ụzọ nkịtị na Matiu 26:67 nakwa n’ụzọ ihe atụ ná 1 Ndị Kọrint 4:11. N’amaokwu ndị ahụ, ọ na-enye echiche nke ịbụ onye a kụrụ ọkpọ. N’ihi oké asị Setan kpọrọ Jehova na ndị ohu Ya, anyị pụrụ ijide n’aka na obi dị Ekwensu ụtọ ka ogwu nọgide na-ama Pọl ụra. Taa, obi na-atọ nnọọ Setan ụtọ mgbe ogwu n’anụ ahụ́ na-enye anyị nsogbu n’otu aka ahụ.

8 N’ihi ya, dị ka Pọl, ọ dị anyị mkpa ịmara otú anyị ga-esi na-anagide ogwu ndị dị otú ahụ. Ndụ anyị dabeere n’ime otú ahụ! Cheta, Jehova na-achọ ịgbatị ndụ anyị ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya, bụ́ ebe nsogbu ndị yiri ogwu na-agaghị adakwasị anyị ọzọ ma ọlị. Iji nyere anyị aka inweta ihe mgbata n’ọsọ a dị ebube, Chineke enyewo anyị ọtụtụ ihe atụ n’Okwu ya dị nsọ, bụ́ Bible, na-egosi na ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi anagidewo ogwu n’anụ ahụ́ ha n’ụzọ gara nke ọma. Ha bụ ụmụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè, dị nnọọ ka anyị bụ. Ịtụle ụfọdụ n’etiti oké “ìgwè ndị àmà” a pụrụ inyere anyị aka ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị.’ (Ndị Hibru 12:1) Ịtụgharị uche n’ihe ha tachiri obi na ha pụrụ ime ka obi sikwuo anyị ike na anyị pụrụ ịnagide ogwu ọ bụla Setan pụrụ iji megide anyị.

Ogwu nke Na-emekpa Mefiboshet Ahụ́

9, 10. (a) Olee otú Mefiboshet si nwee ogwu n’anụ ahụ́? (b) Obiọma dị aṅaa ka Eze Devid gosiri Mefiboshet, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie Devid?

9 Tụlee Mefiboshet, bụ́ nwa enyi Devid, bụ́ Jonatan. Mgbe Mefiboshet dị afọ ise, e zitere ozi na e gbuwo nna ya, bụ́ Jonatan, na nna nna ya, bụ́ Eze Sọl. Egwu tụrụ nwanyị na-elekọta nwata ahụ. O “wee kuru ya . . . : o ruo, mgbe ọ na-eme ngwa ịgbalaga, na nwata ahụ dara ada, wee ghọọ onye ngwụrọ.” (2 Samuel 4:4) Nkwarụ a aghaghị ịbụworo nnọọ Mefiboshet ogwu ọ ga na-edi ka ọ na-etolite.

10 Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, Eze Devid, n’ihi oké ịhụnanya o nwere n’ebe Jonatan nọ, meere Mefiboshet ebere. Devid nyeghachiri ya ala nile nke Sọl ma nye ohu Sọl bụ́ Ziba ọrụ ilekọta ala ahụ. Devid gwakwara Mefiboshet, sị: “Gị onwe gị ga-erikwa nri na tebụl nke m mgbe nile.” (2 Samuel 9:6-10) Obi abụọ adịghị ya na ebere Devid meere Mefiboshet kasiri ya obi ma nye aka belata ihe mgbu nke nkwarụ ya. Lee ihe mmụta magburu onwe ya ọ bụ! Anyị onwe anyị kwa kwesịrị igosi ndị ha na ogwu n’anụ ahụ́ na-alụ obiọma.

11. Gịnị ka Ziba kwuru banyere Mefiboshet, ma olee otú anyị si mara na ihe o kwuru abụghị eziokwu? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

11 Mgbe e mesịrị, Mefiboshet nwetara ogwu ọzọ n’anụ ahụ́ ya. Ohu ya bụ́ Ziba boro ya ebubo ụgha n’ihu Eze Devid, bụ́ onye si Jeruselem na-agbapụ n’oge ahụ n’ihi nnupụisi Absalọm, bụ́ nwa Devid. Ziba kwuru na Mefiboshet ejiriwo eguzosighị ike n’ihe nọgide na Jeruselem na-enwe olileanya ime ka ọchịchị bata ya n’aka. * Devid kweere ebubo ụgha Ziba ma were ala nile nke Mefiboshet nye onye ụgha ahụ!—2 Samuel 16:1-4.

12. Olee otú Mefiboshet si meghachi omume n’ọnọdụ ya, ò sikwa aṅaa bụrụ ezi ihe nlereanya nye anyị?

12 Otú ọ dị, mgbe Mefiboshet zutere Devid n’ikpeazụ, ọ gwara eze ahụ ihe mere n’ezie. Ọ nọwo na-ejikere isonyere Devid mgbe Ziba ghọgburu ya ma wepụta onwe ya ịgachitere ya. Devid ò meziri ihe a mebirinụ? O mezitụrụ ya. O kewara ala ahụ n’etiti ndị ikom abụọ ahụ. N’ebe a kwa ka e nwere ihe ọzọ pụrụ ịbụrụ Mefiboshet ogwu n’anụ ahụ́. Ò nwere oké mmechu ihu? Ò mere mkpesa banyere mkpebi Devid, na-ekwu na nke ahụ abụghị ikpe ziri ezi? Ee e, o ji obi umeala kwenyere ọchịchọ eze ahụ. O lekwasịrị anya n’ihe ndị dị mma, na-aṅụrị ọṅụ na eze ruru eru nke Izrel alọghachiwo n’udo. Mefiboshet setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya site n’ịtachi obi ná nkwarụ, ebubo ụgha, na mmechu ihu.—2 Samuel 19:24-30.

Nehemaịa Nagidere Ọnwụnwa Ya

13, 14. Ogwu dị aṅaa ka Nehemaịa tachiri obi na ya mgbe ọ lọtara iwughachi mgbidi Jeruselem?

13 Chee echiche banyere ogwu ihe atụ Nehemaịa tachiri obi na ya mgbe ọ lọtara n’obodo Jeruselem na-enweghị mgbidi na narị afọ nke ise T.O.A. Ọ hụrụ obodo ahụ dị ka nke na-enweghị nchebe n’ụzọ nkịtị, ndị Juu ahụ lọghachirinụ bụ́ ndị nọ n’ebe ahụ bụkwa ndị a na-ahazighị ahazi, ndị nwere nkụda mmụọ, na ndị na-adịghị ọcha n’anya Jehova. Ọ bụ ezie na Eze Ataksakses nyere ya ikike iwughachi mgbidi Jeruselem, Nehemaịa matara n’oge na-adịghị anya na ọrụ e zigara ya ịrụ na-ewe ndị ọchịchị nke ala ndị dị nso iwe. “[Ọ] dị ha njọ nke ukwuu na mmadụ abịawo ịchọrọ ụmụ Izrel ọdịmma.”—Nehemaịa 2:10.

14 Ndị mmegide ahụ si ala ọzọ mere ihe nile ha pụrụ ime iji kwụsị ọrụ Nehemaịa. Iyi egwu ha, ụgha ha, nkwutọ ha, mmaja ha—gụnyere ndị nledo ha zitere iji kụdaa ya mmụọ—aghaghị ịdịwo ka ogwu na-adịghị apụ apụ n’anụ ahụ́ ya. Ọ̀ dara ná nzupụta ọjọọ dị iche iche nke ndị iro ahụ? Ee e! Ọ tụkwasịrị Chineke obi n’ụzọ zuru ezu, n’adaghị mbà. N’ihi ya, mgbe e mesịrị wughachi mgbidi Jeruselem, ha gbara akaebe na-adịgide adịgide na Jehova ji ịhụnanya kwadoo Nehemaịa.—Nehemaịa 4:1-12; 6:1-19.

15. Nsogbu dị aṅaa e nwere n’etiti ndị Juu nyere Nehemaịa nsogbu n’obi nke ukwuu?

15 Dị ka onye ọchịchị, Nehemaịa aghaghịkwa ịhụ maka ọtụtụ nsogbu e nwere n’etiti ndị Chineke. Ihe isi ike ndị a dị ka ogwu nke nyere ya nsogbu n’obi nke ukwuu n’ihi na ha metụtara mmekọrịta nke ndị ahụ na Jehova. Ndị aka ji akụ̀ nọ na-anara ọmụrụ nwa dị ukwuu, ijikwa nwee ike ịkwụ ụgwọ ndị ha ji na ịtụ ụtụ isi ndị Peasia, ụmụnna ha ndị dara ogbenye karị na-enyefe ala ha, ọbụnakwa renye ụmụ ha n’ịbụ ohu. (Nehemaịa 5:1-10) Ọtụtụ ndị Juu nọ na-ada iwu Ụbọchị Izu Ike, ha adịghịkwa akwado ndị Livaị na ụlọ nsọ ahụ. Ọzọkwa, ụfọdụ alụwo “nwunye ndị bụ́ ndị inyom Ashdod na ndị inyom Amọn na ndị inyom Moab.” Lee ka nke a si wute Nehemaịa! Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ogwu ndị a nke mere ka ọ kwụsị. Ugboro ugboro, ọ na-eme ihe banyere ọnọdụ ọ bụla dapụtaranụ dị ka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado iwu ziri ezi nke Chineke. Dị ka Nehemaịa, ka anyị ghara ikwe ka ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị ọzọ mee ka anyị gharazie iji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi.—Nehemaịa 13:10-13, 23-27.

Ọtụtụ Ndị Ọzọ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nagidere Ya

16-18. Olee otú nsogbu ezinụlọ si dakwasị Aịzik na Rebeka, Hana, Devid, na Hozia?

16 Bible nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị ọzọ nagidere ọnọdụ ndị na-akpata obi erughị ala bụ́ ndị yiri ogwu. Otu ihe na-ebutekarị ogwu dị otú ahụ bụ nsogbu ezinụlọ. Ndị nwunye abụọ nke Isọ ‘ghọọrọ Aịzik na Rebeka, bụ́ ndị mụrụ Isọ, ihe mmụọ ilu.’ Ọbụna Rebeka kwuru na ike ndụ agwụwo ya n’ihi ụmụ nwanyị ahụ. (Jenesis 26:34, 35; 27:46) Cheekwa banyere Hana na otú nwunye di ya, bụ́ Penina, si “kpasuo ya iwe nke ukwuu” n’ihi na Hana bụ nwanyị àgà. Ikekwe Hana nwetara mmekpa ahụ́ a ugboro ugboro ka nanị ha nọ n’ụlọ. Penina kpasukwara ya iwe n’ihu ọha—ihe ịrụ aka adịghị ya na ọ bụ n’ihu ndị ikwu na ibe—mgbe ezinụlọ ahụ na-aga ememe na Shaịlo. Nke a dị ka ịkụbakwu ogwu ahụ n’anụ ahụ́ Hana.—1 Samuel 1:4-7.

17 Tụgharịa uche n’ihe Devid tachiri obi na ya n’ihi ekworo ara nke nna nwunye ya, bụ́ Eze Sọl. Iji chebe ndụ ya, a manyere Devid ibi n’ọgba ndị dị n’ọzara En-gedi, bụ́ ebe ọ na-aghaghị isi n’oké nkume ndị kpọliri elu ma dị ize ndụ gafee. Ikpe na-ezighị ezi ahụ aghaghị iwutewo ya, n’ihi na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere Sọl. Ma, ruo ọtụtụ afọ, Devid nọgidere na-agba ọsọ ndụ—ihe a nile bụ n’ihi ekworo Sọl.—1 Samuel 24:14, 15; Ilu 27:4.

18 Cheedị banyere esemokwu ezinụlọ nke dakwasịrị Hozia onye amụma. Nwunye ya ghọrọ nwanyị na-akwa iko. Omume rụrụ arụ ya aghaghị ịdịwo ka ogwu mabara n’obi Hozia. Leekwa nhụjuanya ọ na-aghaghị inwewo mgbe nwunye ya mụrụ ụmụ abụọ site n’ịkwa iko ya!—Hosea 1:2-9.

19. Mkpagbu dị aṅaa mekpara Maịkaịa onye amụma ahụ́?

19 Ogwu ọzọ n’anụ ahụ́ bụ mkpagbu. Tụlee ahụmahụ Maịkaịa onye ọmụma. Ịhụ na ajọ Eze Ehab ji ndị amụma ụgha gbaa onwe ya gburugburu nakwa na Ehab na-ekwere ụgha ọcha ha aghaghị imekpawo mkpụrụ obi ezi omume Maịkaịa ahụ́. E mesịa, mgbe Maịkaịa gwara Ehab na ndị amụma ahụ na-ekwu site ná “mmụọ okwu ụgha,” gịnị ka onye ndú ndị aghụghọ ahụ mere? Leenụ, o ‘tiri Maịkaịa aka na ntì’! Nke kadị njọ bụ otú Ehab si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Jehova bụ́ na ọ gaghị enwe ihe ịga nke ọma n’agha ọ na-aga ịlụ iji nwetaghachi Remọt-gilead. Ehab nyere iwu ka a tụba Maịkaịa n’ụlọ mkpọrọ, ka e nyekwa ya nri mmegbu. (1 Ndị Eze 22:6, 9, 15-17, 23-28) Chetakwa Jeremaịa na otú ndị ogbu mmadụ na-akpagbu ya si mesoo ya ihe.—Jeremaịa 20:1-9.

20. Olee ogwu Naomi tachiri obi na ya, è sikwa aṅaa kwụghachi ya ụgwọ?

20 Ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya bụkwa ọnọdụ ọzọ dị ilu nke pụrụ ịdị ka ogwu n’anụ ahụ́. Naomi aghaghị idi ọnwụ dị mwute nke di ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ. N’ịbụ onye ka na-eru újú ọnwụ ndị ahụ, ọ laghachiri Betlehem. Ọ gwara ndị enyi ya ka ha kpọwa ya, ọ bụghị Naomi, kama Mara, bụ́ aha kwekọrọ n’obi ilu ọ na-enwe n’ihi ahụmahụ ya. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, Jehova kwụghachiri ya ụgwọ ọrụ maka ntachi obi ya site n’inye ya nwa nwa nke ghọrọ onye e si n’eriri ya mụọ Mezaịa ahụ.—Rut 1:3-5, 19-21; 4:13-17; Matiu 1:1, 5.

21, 22. Olee otú mfu si dakwasị Job, ò sikwa aṅaa meghachi omume?

21 Cheedị echiche otú Job na-aghaghị isiwo kụja mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ ike mberede nke ụmụ ya iri ọ hụrụ n’anya, e kwuwebeghị banyere ìgwè anụ ụlọ na ndị ohu ya funahụrụ ya. Na mberede, ọ bịara yie ka ndụ ya ọ̀ gwụla! Mgbe ahụ, ka Job na ihe otiti ndị a nọ na-alụ, Setan tiri ya ọrịa. Job pụrụ ichewo nnọọ na ọrịa ọjọọ a gaje igbu ya. Ihe mgbu ya bịara sie nnọọ ike odidi nke na ọ bịara dị ya ka ọnwụ ọ̀ ga-eme ka o nwere onwe ya.—Job 1:13-20; 2:7, 8.

22 Dị ka a ga-asị na ihe a nile ezubeghị, nwunye ya, n’ihi iru újú na nhụjuanya nke ya, bịakwutere ya ma kwuo, sị: “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” Lee ogwu nke a bụụrụ anụ ahụ́ na-egbu ya mgbu! Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị enyi atọ Job, kama ịkasi ya obi, ji arụmụka yiri eziokwu wakpo ya, na-ebo ya ebubo na ọ na-eme mmehie nzuzo ma na-ekwusi ike na ọ bụ nke ahụ mere ọnọdụ ọjọọ ahụ ji dakwasị ya. Arụmụka ha na-ezighị ezi kụbakwuru nnọọ ogwu ahụ n’anụ ahụ́ ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Chetakwa na Job amaghị ihe mere ihe ndị a dị egwu ji na-eme ya; ọ maghịkwa na a gaje ịhapụrụ ya ndụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, “n’ihe a nile Job emehieghị, ọ sịghịkwa na Chineke mere ihe nzuzu.” (Job 1:22; 2:9, 10; 3:3; 14:13; 30:17) Ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ ogwu n’otu mgbe, ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị ibi ndụ nke iguzosi ike n’ezi ihe. Lee ihe agbamume ọ bụ!

23. Gịnị mere ndị kwesịrị ntụkwasị obi anyị tụleworo ji nwee ike ịtachi obi n’ogwu dị iche iche ha nwere n’anụ ahụ́ ha?

23 N’ezie, ihe atụ ndị a e nyere n’elu abụtụghị nanị ndị e nwere. Bible nwere ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ. Ndị ohu a nile kwesịrị ntụkwasị obi aghaghị ịnagide ogwu ihe atụ nke ha. Leekwa ụdị nsogbu dịgasị iche iche ha chere ihu! Ma, ọ dị ihe ha nwekọrọ ọnụ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha kwụsịrị ijere Jehova ozi. N’agbanyeghị ọnwụnwa nile tara akpụ ha nwetara, ha ji ike Jehova nyere ha merie Setan. N’ụzọ dị aṅaa? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a ma gosi anyị otú anyị onwe anyị pụrụ isi nagide ihe ọ bụla yiri ogwu n’anụ ahụ́ anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Atụmatụ ọjọọ dị otú ahụ agaghị ekwesịwo nwoke nwere ekele ma dị obi umeala dị ka Mefiboshet. Obi abụọ adịghị ya na ọ maara nke ọma banyere ikwesị ntụkwasị obi e ji mara nna ya, bụ́ Jonatan. N’agbanyeghị na Jonatan bụ nwa Eze Sọl, o jiwo obi umeala nakwere Devid dị ka onye Jehova họọrọ ịbụ eze ga-achị Izrel. (1 Samuel 20:12-17) Dị ka onye bụ́ nna Mefiboshet ma na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa ezigbo enyi Devid, Jonatan agaghị akụziworo nwa ya nwoke na-eto eto ka o nwewa ọchịchọ maka ọkwá ọchịchị.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri nsogbu ndị anyị na-enwe tụnyere ogwu n’anụ ahụ́?

• Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ogwu Mefiboshet na Nehemaịa na-aghaghị ịtachi obi na ha?

• N’ime ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị ikom na ndị inyom tachiri obi n’ogwu dị iche iche n’anụ ahụ́, olee nke kasị emetụ gị n’ahụ́, n’ihi gịnịkwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Mefiboshet aghaghị ịnagide nkwarụ, ebubo ụgha, na mmechu ihu

[Foto dị na peeji nke 16]

Nehemaịa nọgidesiri ike n’agbanyeghị mmegide