Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsọpụrụ Chineke

Nsọpụrụ Chineke

Nsọpụrụ Chineke

INYE Chineke oké nsọpụrụ, ife ya ofufe, na ijere ya ozi, na-eguzosi ike n’ihe nye ọbụbụeze eluigwe na ala ya. Akwụkwọ Nsọ ji okwu Grik bụ́ eu·seʹbei·a na ụdị nkọwaaha, nkọwangwaa, na ngwaa ha na ya yiri mee ihe. A pụrụ ịsụgharị mkpọaha ahụ n’ụzọ nkịtị dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible ịbụ “ezi nsọpụrụ ofufe” ma na-ezo aka n’inwe nsọpụrụ ma ọ bụ oké nsọpụrụ n’ebe onye dị nnọọ nsọ ma zie nnọọ ezie nọ. (Tụlee 2 Pita 1:​6, Kingdom Interlinear) Okwu megidere “nsọpụrụ Chineke” bụ “asọpụrụghị Chineke” ma ọ bụ “enweghị nsọpụrụ ofufe” (Grik., a·seʹbei·a).

N’akwụkwọ bụ́ Christian Words, Nigel Turner dere, sị: “Eusebeia na-apụtakarị n’ihe odide ndị e nwere n’oge ahụ n’ụzọ na-enye echiche nke mmadụ ịbụ onye ji okpukpe akpọrọ ihe . . . ma ihe ọ pụtara n’ụzọ sara mbara karị n’asụsụ Grik a ma ama n’oge ndị Rom chịrị bụ ‘iguzosi ike n’ihe.’ . . . Nye Ndị Kraịst, eusebeia bụ ụdị kasịnụ nke nsọpụrụ nye Chineke.” (1981, peeji nke 111) Ojiji Bible ji okwu ahụ bụ́ “nsọpụrụ Chineke” mee ihe na-ezo aka n’iji iguzosi ike n’ihe na-asọpụrụ Jehova Chineke kpọmkwem.

Nkọwaaha ya na ya yiri bụ́ eu·se·besʹ, nke pụtara “nke obi dị ọcha; nke nsọpụrụ Chineke,” pụtara n’Ọrụ 10:​2, 7; 2 Pita 2:⁠9. Dị ka John A. H. Tittmann si kwuo, eu·se·besʹ “na-egosipụta ụdị oké nsọpụrụ e nwere n’ebe Chi nọ bụ́ nke na-apụta ìhè n’omume, karịsịa n’ofufe nke Chineke; . . . ọ bụ [eu·se·besʹ] bụ́ onye na-egosipụta nraranye ahụ site n’ime ihe.”​—⁠Remarks on the Synonyms of the New Testament, Edinburgh, 1833, Mpịakọta nke Mbụ, peeji nke 253, 254.

E ji ngwaa bụ́ eu·se·beʹo mee ihe na 1 Timoti 5:4 n’ihe banyere àgwà ụmụ na ụmụ ụmụ ga-enwe n’ebe nne ma ọ bụ nne nne ha di ha nwụrụ nọ. Akwụkwọ bụ́ A Greek and English Lexicon of the New Testament, nke Edward Robinson dere, (1885, peeji nke 307), na-ekwu na eu·se·beʹo pụrụ ịpụta ime nsọ nsọ n’ebe onye ọ bụla nọ. N’ihi nke a, ụfọdụ nsụgharị nke akụkụ ihe odide a na-agụ, sị: “Ha ga-ebu ụzọ mụta ịrụ ọrụ dịịrị ha ịrụrụ ezinụlọ ha.” (The Jerusalem Bible) Ma Chineke bụ Onye guzobere ndokwa ezinụlọ (Ndị Efesọs 3:​14, 15), Bible jikwa ezinụlọ Chineke tụnyere njikọ ezinụlọ. N’ihi ya, oké nsọpụrụ, ma ọ bụ nsọpụrụ Chineke, nke a ga na-egosipụta ná mmekọrịta ezinụlọ nke dị n’ezinụlọ Ndị Kraịst ga-abụ n’ezie oké nsọpụrụ nye Chineke na nrubeisi nye iwu Chineke banyere ezinụlọ na àgwà ndị òtù ya kwesịrị ịdị na-akpa. Nsụgharị nke ihe odide a bụ́ “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ndị a buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha” (Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ), kwekọrọ ná nghọta a.

‘Ihe Nzuzo ahụ Dị Nsọ Banyere Nsọpụrụ Chineke’

Onye setịpụrụ ihe nlereanya bụ́ isi nke nsọpụrụ Chineke bụ Jizọs Kraịst. Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ, sị: “N’eziokwu, ihe nzuzo dị nsọ banyere nsọpụrụ Chineke a dị ukwuu n’ezie: ‘E mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ́, a kpọrọ ya onye ezi omume na mmụọ, ọ pụtara ìhè nye ndị mmụọ ozi, e kwusara ya n’etiti ndị mba ọzọ, e kwere na ya n’ụwa, a naara ya gaa n’elu n’ebube.’” (1 Timoti 3:16) Adam, bụ́ nwoke zuru okè, esetịpụghị ihe nlereanya zuru okè nke nsọpụrụ Chineke. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ ya, bụ́ ndị a mụrụ dị ka ndị na-ezughị okè, pụrụ ime otú ahụ. Ònye ga-enwe ike ime nke a? Ọbịbịa nke Ọkpara Chineke bịara n’ụwa na ụzọ ndụ ya nke iguzosi ike n’ihe nyere azịza ya, na-ekpughe ihe ngwọta nye ihe nzuzo ahụ dị nsọ. Ọ bụ ya ka Timoti kwesịrị ilegara anya maka ihe nlereanya zuru okè nke àgwà na-egosipụta nsọpụrụ Chineke.​​—⁠1 Timoti 3:⁠15.

Jizọs Kraịst bụ otu onye nke gosipụtara nsọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru okè, n’ụzọ nile, na-egosi na mmadụ nke nọ n’anụ ahụ́ pụrụ ịnọgide na-egosipụta nsọpụrụ dị otú ahụ. N’okpuru ọnwụnwa ndị tara akpụ, ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ elu ala ya, Jizọs bụ “onye na-eguzosi ike n’ihe, onye na-adịghị aghụghọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ.” (Ndị Hibru 7:26) Ọ dịghị ntụpọ a pụrụ ịhụ n’iguzosi ike n’ihe ya, bụ́ nke a pụrụ iji boo ya ebubo n’ihu Chineke. Tupu ọnwụ ya, o kwuru, sị: “Emeriwo m ụwa,” nakwa, “Onye na-achị ụwa na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.” (Jọn 16:33; 14:30) Ọ dịghị ajọ omume ọ bụla a pụrụ ịhụ n’ime ya. Ọ pụrụ ịgwa ndị iro ya n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ònye n’ime unu na-ama m ikpe mmehie?” (Jọn 8:46) Mkpughe nke “ihe nzuzo dị nsọ banyere nsọpụrụ Chineke a” dị nnọọ ukwuu ma dịkwa ihe a kpọrọ mmadụ mkpa nke ukwuu nke mere a ga-eji kpọsaa ya n’ụwa nile. Jizọs Kraịst n’onwe ya bụ onye Ndị Kraịst na-eṅomi n’igosipụta nsọpụrụ Chineke nakwa àgwà ndị na-enye Ya nsọpụrụ n’ọgbakọ.

Ọzụzụ, na Afọ Ojuju, Dị Oké Mkpa

Ọzụzụ siri ike dị Onye Kraịst mkpa iji wee na-asọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru ezu. Ọ na-agụnye ịtachi obi ná mmegide na mkpagbu. (2 Timoti 3:​12) Nzube ma ọ bụ ebumnobi mmadụ n’inye onwe ya ọzụzụ abụghị iji nweta uru ihe onwunwe nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kpaliri. Ma onye afọ juru n’ihe o nwere, bụ́ onye nọgidere na-egosipụta nsọpụrụ Chineke ya na inwe afọ ojuju, na-erite uru. “O nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a,” ya bụ, ahụ́ ike ime mmụọ, afọ ojuju, obi ụtọ, na nzube ná ndụ. O nwekwara nkwa nke ndụ nke “gaje ịbịa.”​—⁠1 Timoti 4:​7, 8; 6:​6-⁠8; tụlee Ilu 3:​7, 8; 4:​20-⁠22.

Ọ bụ ezie na mkpagbu na ihe isi ike pụrụ ịdakwasị onye na-egosipụta nsọpụrụ Chineke, ọ dịghị ya mkpa ịtụ egwu, n’ihi na “Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” (2 Pita 2:⁠9) Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha tụkwasị nsọpụrụ Chineke ná ntachi obi ha. (2 Pita 1:​5, 6) Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị e ji ‘àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke’ mara ka ha wee nwee ike ịlanahụ ikpe nke ụbọchị Jehova.​​—⁠2 Pita 3:​7, 10, 11; 1 Pita 4:⁠18.

Ike nke Nsọpụrụ Chineke

Onye sị na ya na-egosipụta nsọpụrụ Chineke aghaghị ịma banyere ike o nwere ịgbanwe àgwà ya, ọ ghaghịkwa iji ezi obi na-egosipụta nsọpụrụ Chineke. (1 Timoti 6:11; Ndị Efesọs 4:​20-⁠24) Ọ ghaghị ịma na Okwu Chineke bụ ihe O kwuru banyere ụzọ e si egosipụta nsọpụrụ Chineke, n’ihi ya kwa, ọ ghaghị ime ihe kwekọrọ n’iwu dị n’ime ya. (Taịtọs 1:1; 2 Pita 1:⁠3) Ebe ọ bụ na ọ bụ Chineke n’onwe ya ka a ga na-egosipụta nsọpụrụ Chineke n’ebe ọ nọ, Okwu ya na mmụọ ya ga-eme ka mmadụ bịa mara Jehova kpọmkwem, n’ụzọ chiri anya, ma dịkwuo ka ya​​—⁠ịbụ onye na-eṅomi ya ma ọ bụ onye na-eme ka ya. (Ndị Efesọs 5:⁠1) Onye dị otú ahụ ga-anọgide na-egosipụta ọmarịcha àgwà dị iche iche nke Jehova Chineke.​—⁠2 Ndị Kọrint 3:⁠18.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla nke sị na ya na-ejere Chineke ozi na-adabere n’echiche nke onwe ya kama ịgbaso Bible, ọ bụrụkwa na ozizi ya ‘ekwekọghị ná nsọpụrụ Chineke,’ si otú a ghara igosipụta nrara onye nkụzi ahụ raara onwe ya nye Chineke, ọ na-aghọ ‘onye ara na-agba.’ (1 Timoti 6:​3, 4) Pọl onyeozi dọrọ onye ozi ibe ya ọ tọrọ atọ bụ́ Timoti aka ná ntị banyere ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-asọpụrụ Ya. Ọ dụrụ Timoti ọdụ ka ọ na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi, na-ajụ okwu nzuzu bụ́ ndị na-emerụ ihe dị nsọ, ka e wee ghara ime ka Timoti si n’ụzọ nke nsọpụrụ Chineke pụọ. O kwuziri na a ga-enwe ndị ga na-eme ụdị ajọ omume nile, jiri ihu abụọ na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya. (2 Timoti 2:​15, 16; 3:​1-⁠5) N’otu aka ahụ, Jud na-egosi na ndị dị otú ahụ agaghị enwe ezi nsọpụrụ ofufe ma ọ bụ nsọpụrụ n’ebe Chineke nọ, ha agaghị enwe nkwanye ùgwù ma ọ bụ ekele maka obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Ha ga-abụ ndị ji nsọpụrụ Chineke eme ihe maka uru ihe onwunwe ma ọ bụ nke anụ ahụ́. Omume rụrụ arụ ha na-eme na-ekpughe ihu abụọ ha.​​—⁠Jud 4.

Gịnị bụ “ihe omimi nke mmebi iwu a” nke Pọl zoro aka na ya?

Ọ bụ n’ebe a ka e nwere ihe omimi ọzọ, bụ́ nke na-emegide “ihe nzuzo dị nsọ” nke Jehova kpam kpam. Ọ bụ “ihe omimi nke mmebi iwu a.” Nke a bụụrụ ezi Ndị Kraịst ihe omimi n’ihi na n’oge Pọl onyeozi, ihe e ji amata “onye ahụ na-emebi iwu” apụtabeghị ìhè n’ebe otu òtù e guzobere eguzobe nke a pụkwara ịmata n’ụzọ doro anya nọ. Ọbụna mgbe “onye” ahụ pụtasịrị, ihe e ji amata ya ga-anọgide bụrụ ihe omimi nye ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihi na ọ ga na-eme ajọ omume ya n’ụdị nke nsọpụrụ Chineke. N’ezie, ọ ga-abụ onye si n’ezi nsọpụrụ Chineke dapụ. Pọl kwuru na “ihe omimi nke mmebi iwu a” adịwalarị irè n’oge ya, n’ihi na e nwere mmetụta mmebi iwu n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ nke ga-emesị mee ka e nwee òtù a si n’ezi ofufe dapụ. N’ikpeazụ, Jizọs Kraịst ga-egbufu onye a ná mpụta ìhè nke ọnụnọ ya. Onye a si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ “onye” Setan ji arụ ọrụ, ga-ebuli onwe ya ịnọ “n’elu onye ọ bụla a na-akpọ ‘chi’ ma ọ bụ ihe a na-enye oké nsọpụrụ” (Grik., seʹba·sma). N’ụzọ dị otú a, onye a na-emegide Chineke nke ukwuu dị ka ihe ọrụ nke Setan ga-eduhie nnọọ ndị mmadụ nke ukwuu, ọ ga-ewetakwara ndị na-eme omume ka ya mbibi. Ịdị irè nke “onye ahụ na-emebi iwu” ga-adị ga-abụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ọ ga na-eme ajọ omume ya n’ụzọ ga-eme ka o yie ka ọ na-asọpụrụ Chineke.​​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 2:​3-⁠12; tụlee Matiu 7:​15, 21-⁠23.