Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị!

Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị!

Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị!

‘Jehova na-eme ka ọchịchịrị m nwuo enwuo.’2 SAMUEL 22:29.

1. Olee otú ìhè na ndụ si nwee njikọ?

“CHINEKE wee sị, Ka ìhè dị: ìhè wee dị.” (Jenesis 1:3) Akụkọ banyere okike bụ́ nke e dekọrọ na Jenesis ji okwu ndị ahụ dị mkpa kọwaa Jehova dị ka isi iyi nke ìhè, bụ́ nke ndụ na-agaraghị ekwe omume n’elu ala ma e wezụga ya. Jehova bụkwa isi iyi nke ìhè ime mmụọ, bụ́ nke dị oké mkpa iji duzie anyị n’ụzọ nke ndụ. (Abụ Ọma 43:3) Eze Devid gosiri njikọ chiri anya dị n’etiti ìhè ime mmụọ na ndụ mgbe o dere, sị: “N’ebe Ị nọ ka isi iyi ndụ dị: n’ìhè Gị ka anyị na-ahụ ìhè.”—Abụ Ọma 36:9.

2. Dị ka Pọl gosiri, gịnị ka ya na ìhè nwere njikọ chiri anya?

2 Ihe dị ka 1,000 afọ mgbe oge Devid gasịrị, Pọl onyeozi zoro aka n’ihe ndekọ okike ahụ. Ka ọ na-edegara ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, ọ sịrị: “Chineke bụ onye sịrị: ‘Ka ìhè nwupụta n’ọchịchịrị.’” Pọl gosiziri na ìhè ime mmụọ na ihe ọmụma sitere n’aka Jehova nwere njikọ chiri anya mgbe ọ gbakwụnyere, sị: “Ya onwe ya enwuwokwa n’obi anyị iji were ihe ọmụma ahụ dị ebube banyere Chineke nye ha ìhè site n’ihu Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 4:6) Olee otú ìhè a si erute anyị?

BibleIhe Na-enye Ìhè

3. Ìhè dị aṅaa ka Jehova na-enye site na Bible?

3 Jehova na-enye ìhè ime mmụọ n’ụzọ bụ́ isi site n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. N’ihi ya, ka anyị na-amụ Bible ma na-enweta ihe ọmụma sitere n’aka Chineke, anyị na-ekwe ka ìhè ya na-amụkwasị anyị. Site na Bible, Jehova na-eme ka a ghọta nzube ya ma na-agwa anyị otú anyị pụrụ isi mee uche ya. Nke a na-eme ka ndụ anyị nwee nzube ma na-enyere anyị aka igbo mkpa ime mmụọ anyị. (Eklisiastis 12:1; Matiu 5:3) Jizọs mesiri ya ike na anyị aghaghị ịhụ maka mkpa ime mmụọ anyị mgbe, n’ihota ihe e dere n’Iwu Mozis, o kwuru, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’”—Matiu 4:4; Deuterọnọmi 8:3.

4. N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si bụrụ “ìhè nke ụwa”?

4 E ji nnọọ ìhè ime mmụọ mara Jizọs. N’ezie, o kwuru banyere onwe ya dị ka “ìhè nke ụwa” ma kwuo, sị: “Onye na-eso m agaghị eje ije n’ọchịchịrị ma ọlị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Okwu a na-enyere anyị aka ịghọta òkè dị mkpa Jizọs na-ekere n’inye ihe a kpọrọ mmadụ eziokwu Jehova. Ọ bụrụ na anyị gaje izere ọchịchịrị ahụ ma na-eje ije n’ìhè nke Chineke, anyị aghaghị ige ntị n’ihe nile Jizọs na-ekwu ma na-agbasochi ihe nlereanya na ozizi ya anya dị ka e dekọrọ ha na Bible.

5. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ụmụazụ Jizọs nwere mgbe ọ nwụsịrị?

5 Ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, n’izoghachi aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka ìhè, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu nwa oge n’etiti unu. Na-ejegharịnụ ije mgbe unu nwere ìhè ahụ, ka ọchịchịrị wee ghara irikpu unu; onye na-ejegharị n’ọchịchịrị adịghịkwa ama ebe ọ na-aga. Mgbe unu ka nwere ìhè ahụ, na-egosipụtanụ okwukwe n’ìhè ahụ, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.” (Jọn 12:35, 36) Ndị ghọrọ ụmụ nke ìhè mụtara “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ” nke Bible. (2 Timoti 1:13, 14) Ha jizi okwu a na-enye ezi ndụ dọpụta ndị ọzọ nwere obi eziokwu n’ọchịchịrị ma mee ka ha banye n’ìhè nke Chineke.

6. Eziokwu dị aṅaa bụ́ isi banyere ìhè na ọchịchịrị ka anyị na-achọta na 1 Jọn 1:5?

6 Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ma ọlị.” (1 Jọn 1:5) Rịba ama n’ebe a ọdịiche dị n’etiti ìhè na ọchịchịrị. Ìhè ime mmụọ si n’ebe Jehova nọ abịa, ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ime mmụọ. Ònyezi ka ọchịchịrị ahụ sitere n’ebe ọ nọ?

Ọchịchịrị Ime MmụọEbe O Sitere

7. Ònye na-akpata ọchịchịrị ime mmụọ dị n’ụwa, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ na-enwe?

7 Pọl onyeozi kwuru banyere “chi nke usoro ihe a.” O bu Setan bụ́ Ekwensu n’uche kwuo nke ahụ. Ọ gara n’ihu ikwu na onye a ‘emewo ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwupụta.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọtụtụ ndị sị na ha kwere na Chineke; ma, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu n’ime ha ekweghị na Ekwensu dị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha adịghị njikere ikwere na ikike ụfọdụ karịrị nke mmadụ pụrụ ịdị adị ma eleghị anya ma na-emetụta otú ha si eche echiche. Otú o sina dị, dị ka Pọl na-egosi, Ekwensu dị adị, na-enwekwa mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ ka ha wee ghara inwe ike ịhụ ìhè nke eziokwu. A na-ahụ ikike Setan nwere imetụta echiche nke ihe a kpọrọ mmadụ ná nkọwa a kọwara ya n’ụzọ amụma dị ka “onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) N’ihi ọrụ Setan nọworo na-arụ, ọnọdụ ahụ Aịzaịa onye amụma buru n’amụma na-emetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ ugbu a ma e wezụga ndị na-ejere Jehova ozi: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.”—Aịsaịa 60:2.

8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ si egosipụta na ha nọ ná mgbagwoju anya?

8 N’oké ọchịchịrị, ọ naghị ekwe omume ịhụ ihe ọ bụla. Ọ na-adị nnọọ mfe mmadụ ifu ụzọ ma ọ bụ inwe mgbagwoju anya na ya. N’otu aka ahụ, ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ adịghị enwe nghọta, n’oge na-adịghịkwa anya, ha na-enwe mgbagwoju anya n’ụzọ ime mmụọ. Ha pụrụ ịghọ ndị na-enweghịzi ikike ịma ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ụgha, ezi ihe na ihe ọjọọ. Aịzaịa onye amụma kwuru banyere ndị nọ n’ọchịchịrị dị otú ahụ mgbe o dere, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị na-etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu!” (Aịsaịa 5:20) Chi nke ọchịchịrị ahụ, Setan bụ́ Ekwensu, na-enwe mmetụta n’ahụ́ ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ, n’ihi ya kwa, a na-ekewapụ ha n’ebe isi iyi nke ìhè na ndụ nọ.—Ndị Efesọs 4:17-19.

Isi n’Ọchịchịrị Banye n’ÌhèIhe Ịma Aka Dị na Ya

9. Kọwaa otú ndị ajọ omume na ọchịchịrị, ma nke nkịtị ma nke ime mmụọ, si dịrị ná mma.

9 Job kwesịrị ntụkwasị obi kwupụtara otú ndị ajọ omume na ọchịchịrị nkịtị si dịrị ná mma mgbe o kwuru, sị: “Ọzọ, anya onye na-akwa iko na-arịba chi ojiji ama, sị, Ọ dịghị anya ọ bụla ga-ekiri m: ọ na-ezobe ihu ya.” (Job 24:15) Ndị ajọ omume nọkwa n’ọchịchịrị ime mmụọ, ọchịchịrị dị otú ahụ pụkwara irikpu erikpu. Pọl onyeozi kwuru na mmekọahụ rụrụ arụ, izu ohi, anyaukwu, aṅụrụma, ikwujọ mmadụ, na ịpụnara mmadụ ihe, bụ ihe ndị e ji mara ọtụtụ ndị nọ n’ọchịchịrị ahụ. Ma onye ọ bụla bịakwutere ìhè nke Okwu Chineke pụrụ ịgbanwe. Pọl mere ka o doo anya na mgbanwe dị otú ahụ kwere omume n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint. Ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Kọrint na-arụbu ọrụ nke ọchịchịrị, ma, Pọl gwara ha, sị: “Ma a sachawo unu, ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

10, 11. (a) Olee otú Jizọs si gosi nchebara echiche maka nwoke o mere ka ọ hụwa ụzọ? (b) Gịnị mere ọtụtụ ndị adịghị ahọrọ ìhè ahụ?

10 Mgbe mmadụ si n’oké ọchịchịrị bata n’ìhè, eleghị anya ọ ga-ewetụ oge tupu ya emeghee anya ya nke ọma. Na Betsaịda, Jizọs gwọrọ otu nwoke kpuru ìsì, ma o ji obiọma mee nke ahụ n’usoro n’usoro. “O wee sere nwoke ahụ [kpuru ìsì] n’aka, kpọrọ ya pụta n’obodo nta ahụ, mgbe ọ gbụsaworo ọnụ mmiri n’anya ya, o bikwasịkwara ya aka wee malite ịjụ ya, sị: ‘Ò nwere ihe ị na-ahụ?’ Nwoke ahụ wee lelie anya elu ma malite ịsị: ‘Ana m ahụ ndị mmadụ, n’ihi na ana m ahụ ihe yigasịrị osisi, ma ha na-ejegharị ejegharị.’ Mgbe ahụ o bikwasịrị aka ya n’anya nwoke ahụ ọzọ, nwoke ahụ wee hụ ụzọ nke ọma, e wee mee ka ọ dịghachi mma, ọ na-ahụkwa ihe nile nke ọma.” (Mak 8:23-25) N’ụzọ doro anya, Jizọs ji nwayọọ nwayọọ mee ka nwoke ahụ hụwa ụzọ ka ìhè anyanwụ na-achasi ike ghara igbu ya anya. Anyị pụrụ iche banyere ọṅụ nwoke ahụ nwere mgbe ọ bịara nwee ike ịhụ ụzọ.

11 Otú ọ dị, ọṅụ ndị e nyeere aka iji nwayọọ nwayọọ si n’ọchịchịrị ime mmụọ banye n’ìhè nke eziokwu na-enwe karịrị nke nwoke ahụ. Mgbe anyị hụrụ ọṅụ ha na-enwe, anyị pụrụ iche ihe mere na ọtụtụ mmadụ adịghị abịa n’ebe ìhè ahụ dị. Jizọs kwuru ihe kpatara ya, sị: “Nke a bụkwa ihe ndabere maka ikpe, na ìhè ahụ abịawo n’ime ụwa ma ụmụ mmadụ ahụwo ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ, n’ihi na ọrụ ha dị njọ. N’ihi na onye na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghịkwa abịa n’ìhè ahụ, ka e wee ghara ịkatọ ọrụ ya.” (Jọn 3:19, 20) Ee, ọtụtụ ndị na-enwe mmasị n’ime “ihe ọjọọ”—dị ka omume rụrụ arụ, imegbu mmadụ, ịgha ụgha, igwu wayo, na izu ohi—ọchịchịrị ime mmụọ nke Setan bụkwa ebe kasị mma ha na-anọ eme otú masịrị ha.

Inwe Ọganihu n’Ìhè Ahụ

12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị siworo rite uru site n’ịbịakwute ìhè ahụ?

12 Kemgbe anyị bịaworo mara ìhè ahụ, mgbanwe ndị dị aṅaa ka anyị hụworo n’ime onwe anyị? Ọ dị mma mgbe ụfọdụ ileghachi anya azụ ma tụlee ọganihu ime mmụọ anyị nweworo. Àgwà ọjọọ ndị dị aṅaa ka anyị hapụworo? Nsogbu ndị dị aṅaa anyị na-enwe ná ndụ ka anyị doziliworo? Olee otú atụmatụ ndị anyị na-eme maka ọdịnihu siworo gbanwee? Site n’ike Jehova nakwa site n’enyemaka nke mmụọ nsọ ya, anyị pụrụ ịnọgide na-eme mgbanwe n’ụdị mmadụ anyị bụ nakwa n’ụzọ anyị si eche echiche bụ́ ndị ga-egosi na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ìhè ahụ. (Ndị Efesọs 4:23, 24) Pọl si otú a kwuo ya: “Unu bụbu ọchịchịrị, ma unu bụ ìhè ugbu a n’ihe metụtara Onyenwe anyị. Nọgidenụ na-eje ije dị ka ụmụ nke ìhè, n’ihi na ihe mejupụtara mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ọ bụla nke ịdị mma na ezi omume na eziokwu.” (Ndị Efesọs 5:8, 9) Ikwe ka ìhè Jehova na-eduzi anyị na-eme ka anyị nwee olileanya na nzube, na-emekwa ka ndị nọ anyị gburugburu na-enwe obi ụtọ. Leekwa otú anyị ime mgbanwe ndị dị otú ahụ si eme ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11.

13. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị nwere maka ìhè Jehova, gịnịkwa dị mkpa iji mee otú ahụ?

13 Anyị na-egosi ekele maka ndụ obi ụtọ ka ukwuu anyị na-adị site n’igbukepụ ìhè Jehova—na-esoro ndị òtù ezinụlọ, ndị enyi, na ndị agbata obi anyị na-ekerịta ihe anyị mụtaworo na Bible. (Matiu 5:12-16; 24:14) Nye ndị jụrụ ige ntị, ọrụ nkwusa anyị na ndụ kwesịrị nṅomi anyị na-ebi dị ka Ndị Kraịst, na-aghọ ihe na-akatọ ha. Pọl na-akọwa, sị: “Nọgidenụ na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma; kwụsịkwanụ iso ha na-ekere òkè n’ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị ahụ, ma, kama nke ahụ, ọbụna na-akatọnụ ha.” (Ndị Efesọs 5:10, 11) Inyere ndị ọzọ aka ịhapụ ọchịchịrị ahụ ma họrọ ìhè ahụ na-achọ obi ike n’aka anyị. Nke ka mkpa, ọ chọrọ inwe ọmịiko na nchegbu maka ndị ọzọ na ọchịchọ sitere n’obi iso ha kerịta ìhè nke eziokwu ahụ maka abamuru ebighị ebi ha.—Matiu 28:19, 20.

Kpachara Anya Maka Ìhè Adịgboroja!

14. A bịa n’ihe banyere ìhè, ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ige ntị na ya?

14 Nye ndị nọ n’oké osimiri n’abalị, ìhè ọ bụla bụ ihe na-enye obi ụtọ. N’oge ndị gara aga, a na-amụnye ọkụ ma debe ha n’elu oké nkume ndị kpọliri elu dị n’England iji gosi ebe a pụrụ ịgbaga ma oké ifufe fewe. Ndị na-arụ n’ụgbọ mmiri na-enwe obi ụtọ ịbụ ndị ìhè ndị a na-eduga n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị nchebe. Otú ọ dị, ọkụ ụfọdụ bụ ndị nke adịgboroja. Kama ịchọta ọdụ ụgbọ mmiri, a na-eduhie ọtụtụ ụgbọ mmiri, ha na-agakwa kpọkaa n’ụsọ osimiri bụ́ okwute okwute, bụ́ ebe a na-anọ zuo ibu ha. N’ụwa a aghụghọ jupụtara, anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ịbụ ndị a dọtara n’ìhè adịgboroja ndị pụrụ iduga ná mkpọka nke ụgbọ ime mmụọ anyị. “Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè,” ka a gwara anyị. N’otu aka ahụ, ndị ohu ya, gụnyere ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ “ndị ọrụ aghụghọ,” ndị ‘nọgidekwara na-enwogha onwe ha ịbụ ndị ozi nke ezi omume.’ Ọ bụrụ na anyị anabata echiche ụgha nke ndị dị otú ahụ, obi ike anyị nwere n’Okwu eziokwu nke Jehova, bụ́ Bible, pụrụ ibelata, okwukwe anyị pụkwara ịnwụ.—2 Ndị Kọrint 11:13-15; 1 Timoti 1:19.

15. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ?

15 Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Ee, Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, “onye ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” na-amụkwasị ìhè nke ọma ‘n’okporo ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.’ (Matiu 7:14; 1 Timoti 2:4) Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị ga-esi n’okporo ụzọ ahụ dị mkpagide kpafuo ma banye n’okporo ụzọ nke ọchịchịrị. Pọl dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, Okwu Chineke na-ezi anyị ihe. Anyị pụrụ iji Okwu Chineke dọọ onwe anyị aka ná ntị ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, bụrụ ndị ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya nọ n’ọgbakọ ga-eji ya dọọ aka ná ntị. N’otu aka ahụ, anyị pụrụ ime ka ihe guzozie ma jiri obi umeala nakwere ọzụzụ e nyere n’ezi omume iji mee ka anyị nọgide na-eje ije n’okporo ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ.

Jiri Obi Ekele Na-eje Ije n’Ìhè Ahụ

16. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele maka ìhè dị ebube nke Jehova nyere anyị?

16 Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele maka ìhè dị ebube Jehova nyere anyị? Jọn isi 9 na-agwa anyị na mgbe Jizọs gwọsịrị otu nwoke kpuru ìsì site n’ọmụmụ, a kpaliri nwoke ahụ igosipụta ekele ya. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bịara nwee okwukwe n’ebe Jizọs nọ dị ka Ọkpara Chineke ma kọwapụta ya n’ihu ọha dị ka “onye amụma.” Ọzọkwa, o ji anyaike kwuo okwu megide ndị nwara ileda ọrụ ebube Jizọs rụrụ anya. (Jọn 9:17, 30-34) Pita onyeozi kpọrọ ndị e tere mmanụ so n’ọgbakọ Ndị Kraịst “otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha nwere otu mmụọ obi ekele ahụ nwoke ahụ kpuru ìsì site n’ọmụmụ, bụ́ onye a gwọrọ ìsì ya, nwere. Ha na-egosi ekele n’ebe Jehova, bụ́ Onye na-enye ha onyinye, nọ site ‘n’ịkpọsa n’ebe nile ịdị mma nke onye ahụ kpọpụtara ha n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 2:9; Ndị Kọlọsi 1:13) Ndị nwere olileanya ibi n’elu ala nwekwara otu mmụọ obi ekele ahụ, ha na-akwadokwa ụmụnna ha e tere mmanụ n’ịkpọsa “ịdị mma” Jehova n’ihu ọha. Lee ka nke a si bụrụ ihe ùgwù na-enweghị atụ nke Chineke nyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè!

17, 18. (a) Gịnị bụ ibu ọrụ dịịrị onye ọ bụla? (b) N’iṅomi Timoti, gịnị ka a na-agba Onye Kraịst ọ bụla ume izere?

17 Ọ dị oké mkpa inwe ekele sitere n’obi maka ìhè nke eziokwu. Cheta, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị si n’afọ mara eziokwu ahụ. Ụfọdụ mụtara ya mgbe ha toruworo ogo mmadụ, ha ahụkwa ngwa ngwa otú ìhè ahụ si karịa ọchịchịrị. Ndị ọzọ nwere ihe ùgwù dị ukwuu nke ịbụ ndị ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere. Ọ pụrụ ịdịrị ndị dị otú ahụ mfe iji ìhè ahụ gwurie egwu. Otu Onyeàmà, bụ́ onye nne na nna ya na-ejere Jehova ozi tupu a mụọ ya, kwetara na o were ya oge na mgbalị dị ukwuu iji ghọtazuo ihe eziokwu ahụ a malitere ịkụziri ya site n’oge ya bụ nwa ọhụrụ pụtara nakwa mkpa ọ dị. (2 Timoti 3:15) Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma anyị bụ ndị agadi, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ịzụlite ekele miri emi maka eziokwu ahụ Jehova kpugheworo.

18 A kụziiri nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” site n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ, ma ọ bụ nanị site n’ịrụsi ọrụ ike n’ozi ya ka o ji tozuo okè dị ka Onye Kraịst. (2 Timoti 3:15) Ọ bịaziri ruo eruo inyere Pọl onyeozi aka, bụ́ onye gbara ya ume, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” Dị ka Timoti, ka anyị nile zere ime ihe ọ bụla pụrụ imenye anyị ihere—ma ọ bụ mee ka ihere anyị na-eme Jehova!—2 Timoti 2:15.

19. (a) Dị ka Devid, gịnị ka anyị nile nwere ihe mere anyị ga-eji kwuo? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova, bụ́ onye nyere anyị ìhè nke eziokwu ya. Dị ka Eze Devid, anyị na-asị: “Gị onwe gị bụ oriọna m, Jehova: Jehova na-emekwa ka ọchịchịrị m nwuo enwuo.” (2 Samuel 22:29) Otú ọ dị, anyị agaghị anwa anwa bụrụ ndị onwe ha juru afọ, n’ihi na nke a pụrụ ime ka anyị laghachi n’ọchịchịrị ahụ bụ́ ebe e siworo napụta anyị. N’ihi ya, isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịtụle otú anyị jiruru eziokwu Chineke kpọrọ ihe ná ndụ anyị.

Gịnị Ka Ị Mụtaworo?

• Olee otú Jehova si enye ìhè ime mmụọ?

• Ihe ịma aka dị aṅaa ka ọchịchịrị ime mmụọ gbara anyị gburugburu na-eche anyị n’ihu?

• Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị nwere maka ìhè nke eziokwu ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8]

Jehova bụ isi iyi nke ìhè nkịtị na ìhè ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị ka Jizọs si jiri nwayọọ nwayọọ gwọọ otu nwoke kpuru ìsì, otú ahụ ka o si enyere anyị aka isi n’ọchịchịrị ime mmụọ pụta?

[Foto dị na peeji nke 11]

Ịbụ onye ìhè adịgboroja nke Setan duhiere na-arụpụta mkpọka nke ụgbọ mmiri ime mmụọ