Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ò ziri ezi ikwu na ebere Jehova na-ebelata ikpe ziri ezi ya?

Ọ bụ ezie na e jiriwo okwu a mee ihe, ọ kasị mma izere ya, ebe ọ bụ na o yiri ka ọ na-egosi na ebere Jehova na-eme ka ikpe ziri ezi ya dị nro ma ọ bụ na-egbochi ya ikpe ikpe ziri ezi, dị ka a ga-asị na ebere ya dị elu karịa ikpe ziri ezi bụ́ àgwà ka sie ike. Nke a ezighị ezi.

Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ikpe ziri ezi” na New World Translation pụkwara ịpụta “ikpe.” Ikpe ziri ezi na ezi omume nwere njikọ chiri anya. Otú ọ dị, ikpe ziri ezi na-enyekarị echiche nke ikpe. Ezi omume adịkarịghị enye echiche ahụ. Ọ bụ eziokwu na ikpe ziri ezi nke Jehova pụrụ ịgụnye inye ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị, ma ọ pụkwara ịgụnye ịzọpụta ndị kwesịrị ekwesị. (Jenesis 18:20-32; Aịsaịa 56:1; Malakaị 4:2) N’ihi ya, e kwesịghị ile ikpe Jehova anya dị ka nke mkpegbu ma ọ bụ nke e kwesịrị ime ka ọ dị nro.

Okwu Hibru e ji eme ihe maka “ebere” pụrụ izo aka n’iselata aka n’ime ihe e kpere n’ikpe. Ọ pụkwara izo aka n’igosipụta ọmịiko n’omume, na-ewetara onye ụwa na-atụ n’ọnụ ahụ́ efe.—Deuterọnọmi 10:18; Luk 10:29-37.

Jehova bụ Chineke nke, ma ikpe ziri ezi ma ebere. (Ọpụpụ 34:6, 7; Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 145:9) Ikpe ziri ezi ya na ebere ya zuchara okè, ha na-arụkọkwa ọrụ n’otu. (Abụ Ọma 116:5; Hosea 2:19) Àgwà abụọ ahụ na-emeju ma ọ bụ na-akwado ibe ha n’ụzọ zuru okè. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị gaje ikwu na ebere Jehova na-ebelata ikpe ziri ezi ya, anyị gajekwa ikwu na ikpe ziri ezi ya na-ebelata ebere ya.

Aịzaịa buru amụma, sị: “Jehova ga-echere, imere unu amara, ọ bụkwa n’ihi nke a ka a ga-ebuli Ya, inwe obi ebere n’ahụ́ unu: n’ihi na Chineke nke ikpe [“ikpe ziri ezi,” The New English Bible] ka Jehova bụ.” (Aịsaịa 30:18) N’ebe a, Aịzaịa na-egosi na ikpe ziri ezi Jehova na-akwali ya ime ebere kama ịbụ na ebere ya na-eme ka ikpe ziri ezi ya dị nro ma ọ bụ na-egbochi ya ikpe ikpe ziri ezi. Jehova na-eme ebere n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa n’ihi na ọ na-ahụ n’anya.

N’eziokwu, onye so dee Bible bụ́ Jems dere, sị: “Ebere na-aṅụrị ọṅụ mmeri n’ebe ikpe dị.” (Jems 2:13b) Otú ọ dị, Jems adịghị ekwu banyere Jehova kama ọ na-ekwu banyere Ndị Kraịst na-eme ebere—dị ka ihe atụ, ndị na-emere ndị a na-emegbu emegbu na ndị ogbenye ebere. (Jems 1:27; 2:1-9) Mgbe a na-ekpe ndị dị otú ahụ na-eme ebere ikpe, Jehova na-arịba àgwà ha ama ma jiri ebere na-agbaghara ha ná ndabere nke àjà Ọkpara ya. N’ihi ya, ebere ha na-emeri ikpe ọ bụla a pụrụ ịmawo ha.—Ilu 14:21; Matiu 5:7; 6:12; 7:2.

Ya mere, o zighị ezi ikwu na ebere Jehova na-ebelata ikpe ya n’echiche nke na ọ dị mkpa iji ebere mee ka ikpe ziri ezi ya dị nro. Jehova nwere àgwà abụọ ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha nhata n’ụzọ zuru okè. Ha na-akwado ibe ha dị nnọọ ka ha si akwado—ma na-enweta nkwado nke—àgwà ndị ọzọ nke Jehova, dị ka ịhụnanya na amamihe.