Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baptizim E Mere Clovis—Afọ 1,500 E Kpewere Okpukpe Katọlik na France

Baptizim E Mere Clovis—Afọ 1,500 E Kpewere Okpukpe Katọlik na France

Baptizim E Mere Clovis—Afọ 1,500 E Kpewere Okpukpe Katọlik na France

“N’AHA Popu, gbim,” ka ozi e dere ede nke so ihe e ji mere bọmbụ a hụrụ n’otu chọọchị dị na France bụ́ ebe Pope John-Paul nke Abụọ gaje ileta na September 1996, na-ekwu. Nke a bụ ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ nke mmegide e megidere nleta nke ise o letara obodo ndị dị n’ime France. Otú o sina dị, ihe dị ka mmadụ 200,000 bịara n’obodo France bụ́ Reims n’afọ ahụ iji soro popu mee ememe ncheta nke afọ 1,500 kemgbe a tọghatasịrị Eze Clovis bụ́ onye Frank gaa n’Okpukpe Katọlik. Ònye bụ eze a nke a kpọworo baptizim e mere ya, baptizim nke France? Gịnịkwa mere ememe ncheta ya jiworo kpata ọgba aghara dị otú ahụ?

Alaeze Ukwu Na-apụ n’Anya

A mụrụ Clovis n’ihe dị ka na 466 O.A., nwa Childeric nke Mbụ, bụ́ eze ndị Salian nke Frank. Mgbe ndị Rom merisịrị agbụrụ ndị Germany a na 358 O.A., e kwere ka ha biri n’ebe bụ Belgium ugbu a nanị ma ọ bụrụ na ha ekwere ichebe ókèala ahụ ma na-akpọnye usuu ndị agha Rom ndị soja. Mmekọrịta chiri anya nke bịara dịrị n’etiti ha na ndị France na ndị Rom bi n’ókèala ahụ mere ka ndị Frank a jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ ndị Rom. Childeric nke Mbụ bụ onye ya na ndị Rom jikọrọ aka na-alụ ọgụ megide mbata n’ike nke ndị agbụrụ ọzọ si Germany, dị ka ndị Visigoth na ndị Saxon. Nke a mere ka ndị France na ndị Rom bi n’ebe ahụ nwee ekele n’ebe ọ nọ.

Ógbè Gaul nke dị na Rom sitere n’Osimiri Rhine, nke dị n’ebe ugwu, ruo Pyrenees, nke dị n’ebe ndịda. Otú ọ dị, mgbe Ọchịagha ndị Rom bụ́ Aetius nwụsịrị, e nweghị onye ọchịchị n’ala ahụ. Ọzọkwa, ọdịda nke Romulus Augustulus, bụ́ eze ukwu ikpeazụ na Rom, dara na 476 O.A., na ọdịda akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Alaeze Ukwu Rom dara, kpatara oké nsogbu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ógbè ahụ. N’ihi ya, Gaul bịara dị ka osisi fig chara acha nke na-eche ka otu n’ime agbụrụ ndị nọ n’ókèala ya ghọrọ ya. Ọ bụtụghị ihe ijuanya na mgbe Clovis nọchisịrị anya nna ya, ọ chọwara ịgbasapụ ókèala nke alaeze ya. Na 486 O.A., o meriri onye ikpeazụ nọchitere anya Rom na Gaul n’agha ha lụrụ na nso obodo Soisson. Mmeri a mere ka ọ chịwa ókèala nile dị n’agbata osimiri Somme, nke dị n’ebe ugwu, na osimiri Loire, nke dị n’ebe etiti na ebe ọwụwa anyanwụ Gaul.

Nwoke nke Ga-aghọ Eze

N’adịghị ka agbụrụ ndị ọzọ nke Germany, ndị Frank nọgidere bụrụ ndị ọgọ mmụọ. Otú ọ dị, ọlụlụ Clovis lụrụ adaeze bụ́ onye Burgundy, bụ́ Clotilda, nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ ya. Dị ka onye Katọlik ji okpukpe ya kpọrọ ihe, Clotilda chọsiri ike ịtọghata di ya. Dị ka akụkọ ihe mere eme nke Gregory onye Tours dekọrọ na narị afọ nke isii O.A., si kwuo, ọ bụ na 496 O.A., n’oge agha a nọ Tolbiacum (Zülpich, Germany) lụsoo ndị agbụrụ Alemanni, ka Clovis kwere nkwa ịhapụ ịgọ mmụọ ma ọ bụrụ na Chi Clotilda enye ya mmeri. Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka e merie ndị agha Clovis, e gburu eze ndị Alemanni, ndị agha ya chịlikwara aka elu. Ihe Clovis ma bụ na Chi Clotilda enyewo ya mmeri. Dị ka akụkọ ọdịnala si gosi, “Senti” Remigius mere Clovis baptizim na katidral nke Reims, na December 25, 496 O.A. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị kweere na o yikarịrị ka nke ahụ o mere mgbe e mesịrị na 498/499 O.A.

Mgbalị ndị Clovis mere ijichi alaeze ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Burgundy kụrụ afọ n’ala. Ma o nwere ihe ịga nke ọma n’agha ọ lụsoro ndị Visigoth mgbe o meriri ha na Vouillé nke dị nso na Poitiers na 507 O.A., bụ́ mmeri nke mere ka ọ chịwa ihe ka ukwuu n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Gaul. Iji kelee Clovis maka mmeri a, eze ukwu Alaeze Ukwu Rom nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, bụ́ Anastasius, mere ya ọkàikpe ukwu dị ka ihe nturu ugo. N’ụzọ dị otú a, ọkwá ya bịara karịa nke ndị eze nile ọzọ nke ebe ọdịda anyanwụ, ọchịchị ya ghọkwara nke iwu kwadoro n’anya ndị France na ndị Rom nọ n’ógbè ahụ.

Ebe ọ maliteworo ịchị ndị Frank bi n’ókèala ndị dị n’akụkụ osimiri Rhine nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, Clovis mere Paris isi obodo ya. N’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya, o wusiri alaeze ya ike site n’imepụta usoro iwu ntaramahụhụ e dere ede bụ́ Lex Salica, nakwa site n’ịkpọkọta ndị kansụl chọọchị n’Orléans iji mee ka mmekọrịta dị n’etiti Chọọchị na Ọchịchị pụta ìhè. Tupu ya anwụọ, eleghị anya, na November 27, 511 O.A., ọ bụ nanị ya na-achị ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke Gaul.

Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kpọrọ ntọghata nke Clovis gaa n’okpukpe Katọlik “oge dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ebe ọdịda anyanwụ Europe.” N’ihi gịnị ka ntọghata nke eze a na-agọ mmụọ ji dị oké mkpa otú a? Mkpa ọ dị dabeere n’eziokwu ahụ bụ́ na Clovis họọrọ okpukpe Katọlik kama ozizi Arius.

Arụmụka Banyere Ozizi Arius

N’ihe dị ka 320 O.A., Arius, bụ́ ụkọchukwu n’Aleksandria, Ijipt, malitere ịgbasa echiche dị nnọọ iche banyere Atọ n’Ime Otu. Arius ekweghị na Ọkpara ahụ na Nna ahụ bụ otu onye. Ọkpara ahụ apụghị ịbụ Chineke ma ọ bụ hara ka Nna ahụ, ebe ọ bụ na o nwere mmalite. (Ndị Kọlọsi 1:15) Banyere mmụọ nsọ, Arius kweere na ọ bụ onye ma na ọ dị ala karịa ma Nna ahụ ma Ọkpara ahụ. Ozizi a, bụ́ nke a bịara mara n’ọtụtụ ebe, kpalitere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ n’ime chọọchị. Na 325 O.A., na Kansụl nke Nicea, a chụgara Arius mba ọzọ, katọọkwa ozizi ya. *

Otú ọ dị, nke a akwụsịghị arụmụka ahụ. Arụmụka ahụ e nwere banyere ozizi gara n’ihu ruo ihe dị ka afọ 60, ndị eze ukwu bụ́ ndị nọchiri ibe ha kwụnyeere otu akụkụ ma ọ bụ ọzọ. N’ikpeazụ, na 392 O.A., Eze Ukwu Theodosius nke Mbụ mere ka okpukpe ọtọdọks nke Katọlik na ozizi Atọ n’Ime Otu ya bụrụ okpukpe Alaeze Ukwu Rom nakweere. Ka ọ dịgodị, Ulifilas, bụ́ bishọp bụ́ onye Germany, atọghatawo ndị Goth gaa n’ịnakwere ozizi Arius. Agbụrụ ndị ọzọ nke Germany mere ngwa ngwa nakwere ụdị “Iso Ụzọ Kraịst” a. *

Ka ọ na-erule n’oge Clovis, Chọọchị Katọlik dị na Gaul nọ n’ọgba aghara. Ndị Visigoth nakweere ozizi Arius anọwo na-agbalị ịbịanyụ okpukpe Katọlik site n’ịjụ ka e dochie anya ndị bishọp nwụrụ anwụ. Ọzọkwa, chọọchị ahụ nwere nsogbu n’ihi esemokwu dị n’etiti òtù abụọ nke Chọọchị Roman Katọlik, nke mere ka ndị ụkọchukwu nọ n’òtù abụọ ahụ na-emegide onwe ha gburịta onwe ha na Rom. Tụkwasị n’ọgba aghara a, ụfọdụ ndị na-ede akwụkwọ Katọlik enyewo echiche na ụwa ga-agwụ n’afọ 500 O.A. N’ihi ya, e weere ntọghata nke dike ndị Frank a gaa n’okpukpe Katọlik dị ka ihe dị mma, na-ama ọkwa mmalite nke “puku afọ ọhụrụ nke ndị nsọ.”

Ma gịnị bụ ebumnobi Clovis? Ọ bụ ezie na a pụghị ịsị na o bughị ihe ndị metụtara okpukpe n’obi, o burịrị ihe banyere ọchịchị n’obi. Site n’ịhọrọ okpukpe Katọlik, Clovis nwetara ihu ọma nke ndị France na ndị Rom bụ́ ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha bụ ndị Katọlik, nakwa nkwado nke ndị isi chọọchị a na-akwanyere ùgwù. Nke a mere ka o nwee ihe ịga nke ọma karịa ndị ya na ha na-azọ ọchịchị. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu na “mmeri o meriri Gaul ghọrọ agha ntọhapụ pụọ na yok nke ndị ahụ jụrụ okwukwe bụ́ ndị nakweere ozizi Arius nke a na-enweghị mmasị na ya.”

Ònye Ka Clovis Bụ n’Ezie?

N’ihe omume ụfọdụ ndị e mere tupu ememe ncheta nke afọ 1996 ahụ, achịbishọp nke Reims, bụ́ Gérard Defois, kọwara Clovis dị ka “ihe atụ nke ntọghata e ji nlezianya na ezi uche mee.” Otú ọ dị, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye France bụ́ Ernest Lavisse, kwuru, sị: “Ntọghata nke Clovis agbanweghị àgwà ya ma ọlị; omume obiọma na nke udo nke a kụziri n’Oziọma ahụ erughị ya n’obi.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme ọzọ kwupụtara, sị: “Kama ịkpọku Odin [chi ndị Norse], ọ kpọkuru Kraịst ma bụrụkwa ụdị mmadụ ọ bụ.” N’ime ihe yiri ihe Constantine mere mgbe ihe a sị na ọ bụ ntọghata a tọghatara ya gaa n’Iso Ụzọ Kraịst gasịrị, Clovis malitere ime ka ọchịchị ya sie ike site n’iji nwayọọ nwayọọ gbuchapụ ndị nile ya na ha na-azọ ọchịchị. O gbuchapụrụ “ndị ikwu ya nile ruo ná ndị nke na-abụghị kpọmkwem ndị ahụ́ ya.”

Mgbe Clovis nwụsịrị, a malitere ịkọ akụkọ ifo nke ga-eme ka ọ ghara ịbụ dike obi tara mmiri ọ bụ ma ghọọ onye nsọ a na-akwanyere ùgwù. E lere ihe ndekọ Gregory nke Tours, bụ́ nke e dere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ ka e mesịrị, anya dị ka mgbalị a ma ụma mee iji were Clovis tụnyere Constantine, bụ́ onye mbụ nakweere “Iso Ụzọ Kraịst” n’ime ndị eze ukwu nke Rom. Sitekwa n’ikwu na Clovis dị afọ 30 mgbe e mere ya baptizim, o yiri ka Gregory ọ na-anwa iji ya tụnyere Kraịst.—Luk 3:23.

Hincmar, bụ́ bishọp nke Reims, jikwa usoro ahụ gaa n’ihu na narị afọ nke itoolu. N’otu oge mgbe katidral dị iche iche na-achọ ndị ga-eme njem ala nsọ, eleghị anya akụkọ ndụ o dere banyere onye bu ya ụzọ, bụ́ “Senti” Remigius, bụ iji mee ka a marakwuo chọọchị ya ma mee ka ọ baa ọgaranya. N’akụkọ ya, nduru ọcha wetara otu mkpọ mmanụ a ga-ete Clovis mgbe e mere ya baptizim—na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ojiji e ji mmụọ nsọ tee Jizọs mmanụ. (Matiu 3:16) Hincmar si otú ahụ mee ka e nwee njikọ n’etiti Clovis, Reims, na ọchịchị onyeeze, ma na-akwalite echiche bụ́ na Clovis bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. *

Ememe Ncheta nke Kpatara Ọgba Aghara

Onye bụbu president France bụ́ Charles de Gaulle kwuru n’otu mgbe, sị: “N’echiche m, akụkọ banyere France malitere n’ebe Clovis nọ, bụ́ onye agbụrụ ndị Frank, bụ́ ndị nyere France aha ha, họọrọ ịbụ eze France.” Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile chere otú ahụ. Ememe ncheta nke afọ 1,500 kemgbe e mere Clovis baptizim kpaliri ọgba aghara. Ná mba ebe Chọọchị na Ọchịchị nọọrọ onwe ha kemgbe 1905, ọtụtụ ndị katọrọ òkè Ọchịchị na-ekere n’ihe e weere dị ka ememe okpukpe. Mgbe ọchịchị obodo Reims mara ọkwa banyere atụmatụ ha ịkwụ ụgwọ maka ikpo okwu a ga-eji mee ihe n’oge popu ga-abịa, otu òtù mere ka a kagbuo mkpebi ahụ n’ụlọikpe dị ka ihe iwu na-akwadoghị. Ndị ọzọ chere na chọọchị na-anwa iguzobeghachi ụkpụrụ omume na ịchịisi ya na France. Ihe ọzọ so kpata nsogbu n’ememe ncheta ahụ bụ ọchịchọ a chọrọ ime Clovis ihe nnọchianya nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Front na òtù ndị Katọlik kwenyesiri ike n’ozizi bụ́ isi.

Ndị ọzọ katọrọ ememe ahụ na-adabere n’akụkọ ihe mere eme. Ha sịrị na baptizim nke Clovis atọghataghị France gaa n’okpukpe Katọlik, ebe ọ bụ na okpukpe a akwụsiworị ike n’etiti ndị France na ndị Rom n’oge ahụ. Ha zọkwaara na baptizim ya adịghị aka akara ọmụmụ nke France dị ka mba. Ha kweere na, n’ụzọ kwesịrị ekwesịrị karị, ọmụmụ France kwesịrị ịbụ mgbe e kewara alaeze Charlemagne na 843 O.A., na-eme ka ọ bụrụ Charles Onye Isi Nkwọcha, ọ bụghị Clovis, bụ eze mbụ nke France.

Afọ 1,500 E Kpewere Okpukpe Katọlik

Chọọchị Katọlik dịzi aṅaa na France ka ọ bụsịworo “ada Chọọchị” ahụ ruo ihe karịrị afọ 1,500? France nwere ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị Katọlik e mere baptizim ruo na 1938. Ugbu a, ọ bụ mba nke isii, na-anọ n’okpuru mba ndị dị ka Philippines na United States. Ọ bụkwa ezie na e nwere nde ndị Katọlik 45 na France, nanị nde 6 na-agachi Mas anya. Nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya n’etiti ndị France bụ́ ndị Katọlik kpughere na pasent 65 “na-eleghara ihe Chọọchị ahụ na-akụzi banyere mmekọahụ anya,” nyekwa pasent 5 n’ime ha, ‘ọ dịghị ihe Jizọs bụ ma ọlị.’ Àgwà ndị dị otú ahụ na-ezighị ezi kpaliri popu ịjụ mgbe o letara France na 1980, sị: “Ndị France, gịnị ka unu meworo nkwa unu kwere mgbe e mere unu baptizim?”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Lee Ụlọ Nche nke August 1, 1984, peeji nke 24.

^ par. 13 Lee Ụlọ Nche nke May 15, 1994, peeji nke 8-9.

^ par. 19 E si na Clovis nweta aha ahụ bụ́ Louis, bụ́ nke a kpọrọ ndị eze 19 nke France (gụnyere Louis nke Iri na Asaa na Louis-Philippe).

[Map dị na peeji 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NDỊ SAXON

Osimiri Rhine

Osimiri Somme

Ndị Soisson

Reims

Paris

GAUL

Osimiri Loire

Vouillé

Poitiers

PYRENEES

NDỊ VISIGOTH

Rom

[Foto dị na peeji nke 26]

Baptizim e mere Clovis dị ka ihe odide nke narị afọ nke 14 si gosi ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris

[Foto dị na peeji nke 28]

Ihe ọkpụkpụ nke na-egosi mgbe e mere Clovis baptizim (ihe ọkpụkpụ dị n’etiti) n’èzí Katidral nke Reims, France

[Foto dị na peeji nke 29]

Nleta John Paul nke Abụọ letara France iji mee ememe ncheta baptizim e mere Clovis kpatara ọgba aghara