Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jikere Ejike, Nke A Pụrụ Ịfụ Gị Ụfụ”

“Jikere Ejike, Nke A Pụrụ Ịfụ Gị Ụfụ”

“Jikere Ejike, Nke A Pụrụ Ịfụ Gị Ụfụ”

Ị̀ NỤTỤLA okwu ahụ? Ikekwe dọkịta ma ọ bụ nọọsụ kwuru ya tupu ya enyewe gị ọgwụgwọ a tụrụ aro ya.

Eleghị anya, ị jụghị ịnara ọgwụgwọ ahụ iji zere nnọọ ihe mgbu ahụ a na-atụ anya ya. Kama nke ahụ, i diri ihe mgbu ahụ iji nwee ezi ahụ́ ike n’ọdịnihu. Mgbe mmadụ na-arịasi ọrịa ike, ịnara ma ọ bụ ịjụ ọgwụgwọ na-egbu mgbu pụrụ ịbụ ihe metụtara ọnwụ na ndụ.

Ọ bụ ezie na e nwere ike ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-achọ ka onye dọkịta lebara anyị anya, ịdọ aka ná ntị, ma ọ bụ mgbazi, ọbụna nke pụrụ igbu mgbu mgbe ụfọdụ, dị anyị nile bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè mkpa. (Jeremaịa 10:23) N’imesi ike mkpa nke a dị ụmụaka, Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata; ma mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.”—Ilu 22:15.

N’akụkụ a, mkpanaka bụ ihe nnọchianya nke ikike ndị mụrụ ụmụ nwere. Ọ bụ eziokwu na ụmụaka ole na ole na-enwe mmasị n’ịdọ aka ná ntị. Ọ bụrụ na ọ gụnyere ụdị ntaramahụhụ ụfọdụ, ha pụrụ ịjụ ya. Otú ọ dị, ndị nne na nna maara ihe ma na-ahụ n’anya na-ele anya gabiga mwute nwa ahụ ga-enwe ma hụ uru ọ ga-emesị baara ya. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst maara na Okwu Chineke kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla na-eyi mgbe ahụ ka ọ bụ ihe ọṅụ, kama ihe mwute; ma n’ikpeazụ, nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.”—Ndị Hibru 12:11; Ilu 13:24.

N’ezie, ọ bụghị nanị ụmụaka ka ịdọ aka ná ntị dị mkpa. Ọ dịkwa ndị meworo okenye mkpa. Ọ bụ ndị meworo okenye ka Bible na-agwa okwu mgbe ọ sịrị: “Jide ịdọ aka ná ntị aka; ahala ya aka: chebe ya; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị.” (Ilu 4:13) Ee, ndị maara ihe—ndị na-eto eto na ndị agadi—ga-anara ịdọ aka ná ntị dabeere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ihi na ime otú ahụ ga-emesị chebe ndụ ha.