Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lanahụ Ọgwụgwụ nke Ụwa A?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lanahụ Ọgwụgwụ nke Ụwa A?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lanahụ Ọgwụgwụ nke Ụwa A?

BIBLE na-akọwa ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a dị ka ‘ụbọchị nrubiga ókè nke iwe, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị.’ (Zefanaịa 1:15) N’ezie, nke a abụghị ụdị ụbọchị ị ga na-atụ anya ya n’ọnọdụ dị otú kwesịrịnụ! Ma, Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ ka ha “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche, bụ́ nke a ga-esite na ya gbazee eluigwe nke na-ere ọkụ, ihe ndị dị n’ígwé bụ́ ndị dị oké ọkụ ga-agbazekwa! Ma e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.”—2 Pita 3:12, 13.

N’ebe a, Pita adịghị ekwu banyere mbibi nke eluigwe na ụwa nkịtị. “Eluigwe” na “ụwa” nke Pita na-ezo aka na ha n’ebe a bụ ihe nnọchianya nke ọchịchị ụmụ mmadụ dị ugbu a bụ́ nke rụrụ arụ na ọha mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke. “Ụbọchị Jehova” agaghị ebibi ụwa n’onwe ya kama ọ ‘ga-ekpochapụ ndị mmehie n’ime ya.’ (Aịsaịa 13:9) Ya mere, nye ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile” nke a na-eme n’ajọ ọha mmadụ nke taa, ụbọchị Jehova ga-abụ ụbọchị nzọpụta.—Ezikiel 9:4.

Oleezi otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye a ga-azọpụta ‘n’ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu’? “Okwu Jehova” nke e kpugheere otu n’ime ndị amụma ya na-aza ajụjụ ahụ: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Joel 1:1; 2:31, 32) Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ịmụta ihe ịkpọku aha Jehova pụtara.