Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Eziokwu Ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Nye Gị?
Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Eziokwu Ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Nye Gị?
“Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—JỌN 8:32.
1. Olee otú ụzọ Paịlet si jiri okwu ahụ bụ́ “eziokwu” mee ihe si dị nnọọ iche n’ụzọ Jizọs si jiri ya mee ihe?
“GỊNỊ bụ eziokwu?” Mgbe Paịlet jụrụ ajụjụ ahụ, o yiri ka o nwere mmasị nanị n’ịmara ihe bụ́ eziokwu n’ozuzu ya. N’aka nke ọzọ, Jizọs ka kwupụrụ, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37, 38) Ihe odide Grik mbụ na-egosi na Jizọs ji ọkọwa mkpọaha na-ezo aka n’ihe, mee ihe mgbe ọ na-ekwu banyere ‘eziokwu.’ Ọ na-ekwu banyere eziokwu Chineke.
Àgwà Ụwa Na-enwe n’Ebe Eziokwu ahụ Dị
2. Olee ihe Jizọs kwuru nke na-egosi uru eziokwu ahụ bara?
2 Pọl kwuru, sị: “Okwukwe abụghị ihe mmadụ nile nwere.” (2 Ndị Tesalonaịka 3:2) A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere eziokwu ahụ. Ọbụna mgbe e ziri ọtụtụ ndị eziokwu dabeere na Bible, ha na-ama ụma eleghara ya anya. Ma, lee ka o si dị oké ọnụ ahịa! Jizọs kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.
3. N’ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere ozizi ndị na-eduhie eduhie ka anyị kwesịrị ige ntị?
3 Pọl onyeozi kwuru na a gajeghị ịhụ eziokwu ahụ na nkà ihe ọmụma na ọdịnala nke mmadụ. (Ndị Kọlọsi 2:8) N’ezie, ozizi ndị dị otú ahụ na-eduhie eduhie. Pọl dọrọ Ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs aka ná ntị na ọ bụrụ na ha ekwere na ha, ha ga-adị ka ụmụ ọhụrụ ime mmụọ “ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ, site n’aghụghọ dị n’ichepụta njehie.” (Ndị Efesọs 4:14) Taa, e ji mgbasa echiche nke ndị na-emegide eziokwu Chineke na-eme akwalite ‘aghụghọ nke ụmụ mmadụ.’ Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kọwara “mgbasa echiche” dị ka “mgbalị e leziri anya na-eme iji na-achịkwa nkwenkwe, àgwà, ma ọ bụ omume nke ndị ọzọ.” A na-eji aghụghọ eji mgbasa echiche dị otú ahụ agbagọ eziokwu ka o yie ụgha ma na-akwalite ụgha dị ka eziokwu. Iji chọta eziokwu ahụ n’agbanyeghị nrụgide aghụghọ ndị dị otú ahụ, anyị aghaghị iji ịdị uchu na-atụle Akwụkwọ Nsọ.
Ndị Kraịst na Ụwa
4. Olee ndị na-enweta eziokwu ahụ, gịnịkwa bụ ọrụ dịịrị ndị natara ya?
4 N’izo aka n’ebe ndị ghọworo ndị na-eso ụzọ ya nọ, Jizọs Kraịst kpekuru Jehova ekpere, sị: “Jiri eziokwu [ahụ] doo ha nsọ; okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) A ga-edo ndị dị otú ahụ nsọ, ma ọ bụ doo ha iche, maka nzube nke ijere Jehova ozi na ime ka a mara aha na Alaeze ya. (Matiu 6:9, 10; 24:14) Ọ bụ ezie na ọ bụghị mmadụ nile nwere eziokwu Jehova, ọ bụ onyinye mmadụ nile na-achọ ya ga-enweta n’efu, n’agbanyeghị mba, agbụrụ, ma ọ bụ ọdịbendị ha. Pita onyeozi kwuru, sị: “Ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
5. N’ihi gịnị ka e ji akpagbukarị Ndị Kraịst?
5 Ndị Kraịst na-eso ndị ọzọ ekerịta eziokwu Bible ma ọ bụghị n’ebe nile ka a na-anabata ha. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) N’ikwu okwu banyere amaokwu a, ụkọchukwu bụ́ onye Ireland, bụ́ John R. Cotter dere na 1817, sị: “Kama mgbalị ha [Ndị Kraịst] na-eme iji nkwusa ha gbanwee ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-eme ka ndị mmadụ nwee ekele, n’ezie, ọ ga-eme ka ha kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ asị ma kpagbuo ha n’ihi na ha na-ekpughe ajọ omume ha.” Ndị mkpagbu dị otú ahụ adịghị ‘anakwere ịhụnanya maka eziokwu ahụ ka e wee zọpụta ha.’ N’ihi nke a, ‘Chineke kwere ka ịrụ ọrụ nke njehie na-erutere ha, ka ha wee na-ekwere ihe bụ́ ụgha, ka e wee kpee ha nile ikpe n’ihi na ha ekwereghị eziokwu ahụ kama ha nwere obi ụtọ n’ajọ omume.’—2 Ndị Tesalonaịka 2:10-12.
6. Ọchịchọ ndị dị aṅaa ka Onye Kraịst na-ekwesịghị ịzụlite?
6 Jọn onyeozi dụrụ Ndị Kraịst na-ebi n’ụwa a na-enweghị omume enyi ọdụ, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. . . . Ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa.” (1 Jọn 2:15, 16) N’ịsị “ihe ọ bụla,” ọ dịghị ihe Jọn gụpụrụ. N’ihi nke a, anyị agaghị anwa anwa zụlite ọchịchọ maka ihe ọ bụla a pụrụ inweta n’ụwa a bụ́ nke pụrụ ịdọpụ anyị n’eziokwu ahụ. Ige ntị na ndụmọdụ Jọn ga-enwe mmetụta dị ike ná ndụ anyị. N’ụzọ dị aṅaa?
7. Olee otú ịmara eziokwu ahụ si akpali ndị obi ha ziri ezi?
7 N’afọ 2001, Ndịàmà Jehova n’ụwa nile duziri ihe karịrị nde ọmụmụ Bible ebe obibi anọ n’ọkara kwa ọnwa, na-akụziri ụmụ mmadụ na ìgwè dị iche iche ihe Chineke chọrọ n’aka ha ka ha wee dị ndụ. N’ihi ya, e mere mmadụ 263,431 Ndị Efesọs 5:5) Eziokwu ahụ ọ̀ dị oké ọnụ ahịa otú ahụ nye gị?
baptizim. Ìhè nke eziokwu ahụ bịara dịrị ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ oké ọnụ ahịa, ha kwụsịkwara mkpakọrịta ọjọọ na omume rụrụ arụ bụ́ ndị na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ bụ́ ndị juru n’ụwa a. Kemgbe e mesịrị ha baptizim, ha anọgidewo na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova setịpụụrụ Ndị Kraịst nile. (Jehova Na-elekọta Anyị
8. Olee otú Jehova si emeghachi omume ná nraranye anyị, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ‘iburu ụzọ chọọ alaeze ahụ’?
8 N’agbanyeghị ezughị okè anyị, Jehova ji amara na-anakwere nraranye anyị, na-ehulata, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji dọta anyị n’ebe ọ nọ. O si otú ahụ akụziri anyị iwelitekwu ihe mgbaru ọsọ na ọchịchọ anyị. (Abụ Ọma 113:6-8) N’otu oge ahụ, Jehova na-ekwe ka anyị soro ya na-enwe mmekọrịta onwe onye, ọ na-ekwekwa nkwa ilekọta anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘anọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.’ Ọ bụrụ na anyị emee nke a ma chebe onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ, ọ na-ekwe nkwa, sị: “A ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:33.
9. Ònye bụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” n’ijikwa “ohu” a eme ihe, olee otú Jehova si elekọta anyị?
9 Jizọs Kraịst họọrọ ndịozi 12 ya ma tọọ ntọala maka ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ nke a bịara na-akpọ “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16; Mkpughe 21:9, 14) E mesịrị kọwaa ya dị ka “ọgbakọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Jizọs kọwara ndị so n’ọgbakọ ahụ dị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” nakwa dị ka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ onye nwere uche.” Jizọs kwuru na ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga na-ahụ maka inye Ndị Kraịst “ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe oriri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” (Matiu 24:3, 45-47; Luk 12:42) Ọ bụrụ na anyị adịghị eri nri, agụụ ga-egbu anyị. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị adịghị eri nri ime mmụọ, anyị ga-aghọ ndị na-adịghị ike ma nwụọ n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ọnụnọ nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” nọ ya bụ ihe ọzọ na-agba akaebe na Jehova na-elekọta anyị. Ka anyị jiri ihe oriri ime mmụọ dị oké ọnụ ahịa nke a na-enye anyị site n’aka “ohu” ahụ kpọrọ ihe mgbe nile.—Matiu 5:3.
10. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị nọrọ ná nzukọ mgbe nile?
10 Iri nri ime mmụọ na-agụnye ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ na-agụnyekwa iso Ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta nakwa ịga nzukọ ọgbakọ. Ì chetara kpọmkwem ihe ndị i riri n’ọnwa isii, ma ọ bụ ọbụna izu isii, gara aga? Eleghị anya i chetaghị. Otú o sina dị, ihe ọ bụla i riri doziri gị ahụ́ otú dị mkpa iji mee ka ị nọgide na-adị ndụ. Eleghịkwa anya, i riwo ụdị nri ahụ kemgbe ahụ. Otú ahụ ka ọ dị ná nri ime mmụọ ndị a na-enye ná nzukọ Ndị Kraịst. Eleghị anya, anyị adịghị echeta ihe nile anyị nụworo ná nzukọ. Eleghịkwa anya, e nyewo ihe ọmụma yiri ya ihe karịrị otu ugboro. Otú o sina dị, ọ bụ nri ime mmụọ, ọ dịkwa oké mkpa maka ọdịmma anyị. A na-enye anyị ihe oriri ime mmụọ ndị dị mma ná nzukọ mgbe nile, bụ́ ndị a na-enye n’oge kwesịrị ekwesị.
11. Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere mgbe anyị na-aga nzukọ Ndị Kraịst?
11 Ịga nzukọ Ndị Kraịst na-atụkwasịkwa ibu ọrụ n’ubu anyị. A dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘na-agbarịta ibe ha ume,’ na-akpali ndị nọ n’ọgbakọ “inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” Anyị ịkwadebe maka, ịga, na ikere òkè ná nzukọ nile nke Ndị Kraịst na-ewusikwu okwukwe anyị ike n’otu n’otu ma na-agba ndị ọzọ ume. (Ndị Hibru 10:23-25) Dị ka ụmụaka bụ́ ndị pụrụ ịdị na-ahọ nri, agbamume a na-enyechi anya pụrụ ịdị ụfọdụ ndị mkpa iji na-eri nri ime mmụọ. (Ndị Efesọs 4:13) Ọ bụ ihe na-egosipụta ịhụnanya bụ́ ịdị na-enye agbamume ahụ mgbe ọ dị mkpa ka ndị dị otú ahụ wee nwee ike ịghọ Ndị Kraịst tozuru okè, bụ́ ndị Pọl dere banyere ha, sị: “Nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.
Ilekọta Onwe Anyị n’Ụzọ Ime Mmụọ
12. Ònye ka ọ kasị dịrị n’ubu ya ịhụ na anyị nọgidere n’eziokwu ahụ? Kọwaa.
12 Di ma ọ bụ nwunye anyị ma ọ bụ nne na nna anyị pụrụ ịgba anyị ume n’ụzọ nke eziokwu ahụ. N’otu aka ahụ, ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịzụ anyị dị ka akụkụ nke ìgwè atụrụ ha na-elekọta. (Ọrụ 20:28) Ma ònye ka ọ kasị dịrị n’ubu ya ịhụ na anyị nọgidesiri ike n’ụzọ nke ndụ anyị bụ́ nke dabeere n’eziokwu ahụ? N’ezie, ibu ọrụ ahụ dịkwasị n’ubu onye ọ bụla n’ime anyị. Nke ahụ bụ eziokwu ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike. Tụlee ihe atụ na-esonụ.
13, 14. Dị ka e gosiri n’ihe atụ nke metụtara nwa atụrụ, olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka ime mmụọ dị anyị mkpa?
13 Na Scotland, ụmụ atụrụ ụfọdụ na-akpa nri n’ebe ịta nri mgbe otu n’ime ha kpagara n’akụkụ obere ugwu ma si ebe ahụ daa. O merụghị ahụ, ma egwu tụrụ ya, o nweghịkwa ike ịrịgoghachi. N’ihi ya, ọ malitere ibe ákwá ilu. Nne ya nụrụ ya, malitekwa ibe ákwá nke ya ruo mgbe onye ọzụzụ atụrụ bịara kupụta nwa atụrụ ahụ.
14 Rịba ama usoro ihe ahụ ji mee. Nwa atụrụ ahụ bere ákwá enyemaka, nne ya etinye ọnụ, onye ọzụzụ atụrụ e mere ka ọ mara ihe na-emenụ emee ihe ozugbo iji napụta ya. Ọ bụrụ na obere anụmanụ na nne ya pụrụ ịghọta na ihe ize ndụ dị ma tie mkpu ozugbo maka enyemaka, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ mgbe anyị sụrụ ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ chee ihe ize ndụ ndị anyị na-atụghị anya ha sitere n’ụwa Setan ihu? (Jems 5:14, 15; 1 Pita 5:8) Anyị kwesịrị, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị enweghị ahụmahụ n’ihi na anyị bụ ụmụaka ma ọ bụ n’ihi na anyị ka batara nnọọ ọhụrụ n’eziokwu ahụ.
Ịgbaso Nduzi Chineke Na-eweta Obi Ụtọ
15. Olee mmetụta otu nwanyị nwere mgbe ọ malitere iso ọgbakọ Ndị Kraịst?
15 Tụlee uru ịghọta Bible bara na udo nke obi ọ na-ewetara ndị na-ejere Chineke nke eziokwu ozi. Otu nwanyị dị afọ 70 bụ́ onye jeworo Chọọchị England n’afọ ndụ ya nile kwere ka otu n’ime Ndịàmà Jehova mụọrọ ya Bible. Ọ mụtara n’oge na-adịghị anya na aha Chineke bụ Jehova ma sonye n’ịsị “Amen” n’ekpere ihu ọha sitere n’obi nke e kpere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O ji
oké mmetụta kwuo, sị: “Kama igosi Chineke dị ka onye nọ anyị bụ́ nanị ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ n’ebe dị anya, o yiri ka ùnu na-egosi na ọ nọ kpọmkwem n’etiti anyị dị ka ezigbo enyi. Ọ bụ ihe m na-enwetụbeghị ahụmahụ ya.” Eleghị anya onye ahụ nwere mmasị anyị hụrụ n’anya agaghị echefu mmetụta mbụ eziokwu ahụ nwere n’ahụ́ ya. N’otu aka ahụ, ka anyị ghara ichefu ma ọlị otú eziokwu ahụ dịruru anyị oké ọnụ ahịa mgbe mbụ anyị nakweere ya.16. (a) Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị emee inweta ego ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nweta ezi obi ụtọ?
16 Ọtụtụ ndị kweere na ọ bụrụ na ha enwekwuo ego na ha ga-enwe obi ụtọ karị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị emee inweta ego ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi ná ndụ, anyị pụrụ inwe “ọtụtụ ihe mgbu nke uche.” (1 Timoti 6:10, Phillips) Tụlee mmadụ ole na-azụ tiketi lọtrị, na-emefu ego n’ụlọ ọkụ na-eri ego, ma ọ bụ na-akọ nkọ n’echeghị echiche n’ụlọ ahịa ego, mụrụ anya na-arọ nrọ inweta nnukwu ego. Nanị mmadụ ole na ole na-enweta ego ha tụrụ anya ya. Ọtụtụ mgbe, ọbụnadị ndị nwetara ya na-ahụ na ụba ọkụ ọkụ ha bara adịghị ewetara ha obi ụtọ. Kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịgide adịgide na-abịa site n’ime uche Jehova, iso ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụkọ ọrụ site ná nduzi nke mmụọ nsọ Jehova nakwa site n’enyemaka nke ndị mmụọ ozi ya. (Abụ Ọma 1:1-3; 84:4, 5; 89:15) Mgbe anyị mere nke a, anyị pụrụ inweta ngọzi ndị anyị na-atụghị anya ha. Eziokwu ahụ ọ̀ dị oké ọnụ ahịa nye gị ruo n’ókè nke iwetara gị ngọzi ndị dị otú ahụ?
17. Gịnị ka Pita ịnọ na nke Saịmọn, bụ́ onye na-esiji akpụkpọ anụ, na-ekpughe banyere àgwà onyeozi ahụ?
17 Tụlee ihe atụ nke Pita onyeozi. N’afọ 36 O.A., o mere njem ozi ala ọzọ gaa Ala Dị Larịị nke Sherọn. Ọ kwụsịrị na Lida, bụ́ ebe ọ gwọrọ Anias nwere nkwarụ ma gawazie ọdụ ụgbọ mmiri nke Jọpa. N’ebe ahụ, ọ kpọlitere Dọkas n’ọnwụ. Ọrụ 9:43 na-agwa anyị, sị: “Ọ nọgidere na Jọpa ruo ọtụtụ ụbọchị ya na otu onye bụ́ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.” Izo aka a dị mkpirikpi na-ekpughe na Pita eleghị mmadụ anya n’ihu ka ọ na-ejere ndị bi n’obodo ahụ ozi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọkà mmụta Bible bụ́ Frederic W. Farrar na-ede, sị: “Ọ dịghị onye na-agbasochi Iwu [Mozis] ahụ E Nyere n’Ọnụ anya nke a pụrụ ịratawo ibi n’ụlọ onye na-esiji akpụkpọ anụ. Imetụ akpụkpọ anụ na ozu anụmanụ dịgasị iche iche aka kwa ụbọchị bụ́ ihe ya na ọrụ a na-agakọ, nakwa ngwá ọrụ ndị e ji arụ ya, mere ka ọ bụrụ ihe na-adịghị ọcha na ihe na-asọ oyi n’anya ndị na-agbasochi iwu anya.” Ọbụna ma a sị na ‘ụlọ Saịmọn nke dị n’akụkụ oké osimiri’ adịghị nso n’ebe ọ na-esiji akpụkpọ anụ, Saịmọn na-arụ ‘ọrụ a sọrọ oyi bụ́ nke weturu ùgwù onwe onye nke ndị rụrụ ya ala,’ ka Farrar na-ekwu.—Ọrụ 10:6.
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ọhụụ Pita hụrụ ji gbagwojuo ya anya? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa a na-atụghị anya ha ka Pita nwetara?
18 Pita na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu nabatara omume ile ọbịa nke Saịmọn, Pita nọkwa n’ebe ahụ nata ntụziaka ọ na-atụghị anya ya site n’aka Chineke. Ọ hụrụ ọhụụ ebe e nyere ya iwu ka o rie anụ ndị na-adịghị ọcha dị ka iwu ndị Juu si dị. Pita mere mkpesa na ọ dịbeghị mgbe ya “riworo ihe ọ bụla rụrụ arụ na nke na-adịghị ọcha.” Ma a gwara ya ugboro atọ, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe ndị Chineke meworo ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” N’ụzọ kwere nghọta, “Pita nọ n’oké mgbagwoju anya n’ime onwe ya banyere ihe ọhụụ ahụ ọ hụworo pụrụ ịpụta.”—Ọrụ 10:5-17; 11:7-10.
19 Pita amaghị na n’ụnyaahụ ya na Sesaria, nke dị kilomita 50 site n’ebe ahụ, otu onye Jentaịl aha ya bụ́ Kọniliọs ahụwokwa ọhụụ. Mmụọ Ọrụ 10:1-48; 11:18) Lee ihe ùgwù na-enweghị atụ nke Pita nwetara—ihe a nile bụ n’ihi na eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa nye ya ma mee ka o gee ntị ná nduzi Jehova ma jiri okwukwe mee ihe!
ozi Jehova enyeworị Kọniliọs ntụziaka ka o ziga ndị ohu ya ka ha chọga Pita n’ụlọ Saịmọn onye na-esiji akpụkpọ anụ. Kọniliọs zigara ndị ohu ya n’ụlọ Saịmọn, Pita sokwara ha laghachi Sesaria. N’ebe ahụ, o kwusaara Kọniliọs na ndị ikwu na ibe ya ozi ọma. N’ihi ya, ha ghọrọ ndị Jentaịl mbụ kwere ekwe a na-ebighị úgwù natara mmụọ nsọ dị ka ndị nketa nke Alaeze. Ọ bụ ezie na e bighị ndị ikom ahụ úgwù, e mere ndị nile nụrụ okwu Pita baptizim. Nke a megheere ndị nke mba ọzọ, bụ́ ndị e weere dị ka ndị na-adịghị ọcha n’anya ndị Juu, ohere isonye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (20. Enyemaka dị aṅaa sitere n’aka Chineke ka anyị na-enweta mgbe anyị na-ebute eziokwu ahụ ụzọ ná ndụ anyị?
20 Pọl na-agba ume, sị: “N’ikwu eziokwu [ahụ], ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe nile n’ime onye ahụ bụ isi, bụ́ Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:15) Ee, eziokwu ahụ ga-ewetara anyị obi ụtọ na-enweghị atụ ugbu a ma ọ bụrụ na anyị ebute ya ụzọ ná ndụ anyị ma kwe ka Jehova na-eduzi nzọụkwụ anyị site ná mmụọ nsọ ya. Ọzọkwa, buru nkwado nke ndị mmụọ ozi n’ọrụ nzisa ozi ọma anyị n’uche. (Mkpughe 14:6, 7; 22:6) Lee ihe ùgwù anyị nwere inwe nkwado dị otú ahụ n’ọrụ Jehova nyeworo anyị ịrụ! Ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-eduga anyị n’ito Jehova, bụ́ Chineke nke eziokwu, ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ̀ dị ihe pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa karịa nke ahụ?—Jọn 17:3.
Gịnị Ka Anyị Mụtaworo?
• Gịnị mere ọtụtụ ndị adịghị anakwere eziokwu ahụ?
• Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele ihe nke ụwa Setan anya?
• Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe nzukọ dị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
• Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere ilekọta onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Map/Foto dị na peeji nke 18]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
OSIMIRI UKWU
Sesaria
ALA DỊ LARỊỊ NKE SHERỌN
Jọpa
Lida
Jeruselem
[Foto]
Pita gbasoro nduzi Chineke ma nweta ngọzi ndị ọ na-atụghị anya ha
[Ebe E Si Nweta Foto]
Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
[Foto dị na peeji nke 13]
Jizọs gbaara eziokwu ahụ àmà
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka ọ dị ná nri nkịtị, nri ime mmụọ dị oké mkpa maka ọdịmma anyị