Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Imeri Owu Ọmụma

Ị Pụrụ Imeri Owu Ọmụma

Ị Pụrụ Imeri Owu Ọmụma

Ọ̀ DỊ onye pụrụ ikwu na ọ dịbeghị mgbe o nwere ihe mgbu owu ọmụma kpatara? Ọtụtụ ihe pụrụ ịkpatara anyị owu ọmụma. Otú ọ dị, nke kasị egbu mgbu bụ owu ọmụma nke ụmụ nwanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nke ndị di ha nwụrụ ma ọ bụ ndị a gbara alụkwaghịm.

Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ́ Frances na-akọ, sị: “Mgbe m ruru afọ 23, ọ dị m ka ndị enyi m nile ha alụchaala di ya afọdụ nanị m.” * Mmetụta nke ịbụ onye nọ nanị ya pụrụ ịka njọ ka afọ na-agabiga, atụmanya nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye a na-ebelatakwa. “Ọ dịghị mgbe ọ bụ ọchịchọ m ịnọ n’alụghị di, m ka ga-enwekwa mmasị ịlụ di ma ọ bụrụ na ohere ya adapụta,” ka Sandra kwuru, bụ́ onye nọ ná ngwụsị nke afọ ndị 40 ya ugbu a. Angela, bụ́ onye nọ n’afọ ndị 50 ya, kwuru, sị: “Amaghị m ụma kpebie ịghara ịlụ di, ma, ọ bụ otú o si dapụtara m. E nwere nnọọ ụmụnna nwoke ole na ole na-alụbeghị nwanyị n’ógbè e kenyere m ọrụ dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche.”

N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na-ahọrọ ịghara ịlụ di n’ihi na ha ji iguzosi ike n’ihe na-agbaso ndụmọdụ Jehova nyere ka a lụọ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ụfọdụ na-anagide ọnọdụ nke alụghị di ma ọ bụ nwunye nke ọma, ma ndị ọzọ na-achọpụta na ọchịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ịmụ ụmụ na-esiwanye ike ka oge na-agafe. “Ana m enwekarị mmetụta nke ịbụ onye tọgbọ chakoo n’ụzọ mmetụta uche bụ́ nke alụghị di na-akpata,” ka Sandra kwupụtara.

Ihe ndị ọzọ, dị ka ilekọta ndị nne na nna meworo agadi, pụrụ ime ka mmetụta nke owu ọmụma ka njọ. “Ebe ọ bụ na alụghị m di, ndị ezinụlọ m tụrụ anya ka m lekọta nne na nna anyị meworo agadi,” ka Sandra na-ekwu. “Eburu m ibu a dị arọ ruo afọ 20 ọ bụ ezie na abụ m otu onye n’ime ụmụ isii. Ndụ gaara adịrị m mfe karị ma a sị na m nwere di ga-akwado m.”

Frances kwuru ihe ọzọ mere ka owu ọmụma ya ka njọ. Ọ na-akọ, sị: “Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ m kpọmkwem, sị ‘Gịnị mere ị lụbeghị di?’ Okwu dị otú ahụ na-eme ka ọ dị m ka alụghị di m ò sitụ m n’aka. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’agbamakwụkwọ nile m gara, mmadụ na-ajụ m ajụjụ ahụ m na-atụ egwu ịnụ bụ́, ‘Oleedị mgbe ị ga-alụ di?’ Ana m amalitekwa iche, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụnna nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe enweghị mmasị n’ebe m nọ, ikekwe enweghị m àgwà Ndị Kraịst dị mkpa ma ọ bụkwanụ ma eleghị anya ya abụrụ nnọọ na amaghị m mma.’”

Olee otú a pụrụ isi merie mmetụta nke nnọpụ iche na owu ọmụma? Gịnị ka ndị ọzọ pụrụ ime iji nye aka, ma ọ bụrụ n’ezie na e nwere ihe ha pụrụ ime?

Dabere na Jehova

Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Tụkwasị Jehova [ibu arọ gị, NW], Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) N’ihe odide Hibru, okwu ahụ bụ́ “ibu arọ” pụtara n’ụzọ nkịtị “ọnọdụ,” ọ na-ezokwa aka ná nchegbu na nrụgide ndị anyị pụrụ inwe n’ihi ọnọdụ anyị nọ na ya ná ndụ. Jehova maara nke ọma banyere ibu arọ ndị a karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ pụkwara inye anyị ume ịnagide ha. Ịtụkwasị Jehova Chineke obi bụ ihe nyewooro Angela aka ịnagide owu ọmụma. N’izo aka n’ozi oge nile ya, ọ na-echeta, sị: “Mgbe m malitere ịsụ ụzọ, mụ na onye mụ na ya na-asụkọ ụzọ bi ebe dị anya site n’ọgbakọ kasị nso. Anyị mụtara ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam, ịdabere n’ebe ọ nọ otú a enyeworo m aka ná ndụ m nile. Mgbe m nwere echiche na-ezighị ezi, m na-agwa Jehova okwu, ọ na-enyekwara m aka. Abụ Ọma nke 23 abụworo m ihe nkasi obi dị ukwuu, m na-agụkwa ya ugboro ugboro.”

Pọl onyeozi nwere otu ibu arọ dị ịrịba ama ibu. Ọ dịkarịa ala ugboro atọ, ọ ‘rịọsiri Onyenwe anyị arịrịọ ike ka ogwu n’anụ ahụ́ a si n’ebe ọ nọ pụọ.’ E nyereghị Pọl aka n’ụzọ ọrụ ebube, ma e kwere ya nkwa na obi ọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ga-akwagide ya. (2 Ndị Kọrint 12:7-9) Pọl chọpụtakwara isi ihe na-eme ka e nwee afọ ojuju. O mesịrị dee, sị: “N’ihe ọ bụla nakwa n’ọnọdụ nile amụtawo m ma ụzọ isi nọrọ n’ùjú ma ụzọ isi nọrọ n’agụụ, ma ụzọ isi nwee ihe n’ụba ma ụzọ isi nọrọ n’ụkọ. Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:12, 13.

Olee otú mmadụ pụrụ isi nweta ume site n’aka Chineke mgbe o nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ mgbe owu na-ama ya? Pọl dere, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Sandra tinyere ndụmọdụ a n’ọrụ. Ọ na-akọwa, sị: “Ebe m na-alụghị di, ana m anọ nanị m ọtụtụ mgbe. Nke a na-enye m ohere dị ukwuu ikpegara Jehova ekpere. Ana m enwe mmetụta nke ịnọ ya nso nke ukwuu, apụkwara m ịgwa ya okwu banyere nsogbu na ọṅụ m n’enweghị ihe mgbochi.” Frances na-ekwukwa, sị: “Ịlụso echiche na-ezighị ezi ọgụ nanị m bụ oké ihe isi ike. Ma ịgwa Jehova otú ọ dị m n’ezoghị ọnụ na-enyere m aka nke ukwuu. Ekwenyesiri m ike na ihe ọ bụla pụrụ imetụta ọdịmma ime mmụọ na nke uche m na-emetụta Jehova.”—1 Timoti 5:5.

“Nọgidenụ Na-eburịta Ibu Arọ nke Ibe Unu”

N’òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst, mmadụ ekwesịghị ibu ibu arọ nanị ya. “Nọgidenụ na-eburịta ibu arọ nke ibe unu, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst ahụ,” ka Pọl onyeozi gbara ume. (Ndị Galeshia 6:2) Site ná mkpakọrịta nke anyị na Ndị Kraịst ibe anyị, anyị pụrụ inweta “okwu ọma” nke agbamume bụ́ nke pụrụ ime ka ibu nke owu ọmụma anyị belata.—Ilu 12:25.

Tụleekwa ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ada Onyeikpe Izrel bụ́ Jefta. Tupu Jefta emerie usuu ndị agha Amọn, o kwere nkwa inye Jehova onye mbụ si n’ụlọ ya bịa ikele ya. Nke ahụ mesịrị bụrụ ada ya. (Ndị Ikpe 11:30, 31, 34-36) Ọ bụ ezie na ọ pụtara na ọ gaghị alụ di nakwa na ọ ga-echefu ọchịchọ ebumpụta ụwa nke inwe ezinụlọ, ada Jefta ji ọchịchọ obi ya kwere ka e mezuo nkwa ahụ ma jiri afọ ndụ ya ndị fọdụrụnụ jee ozi n’ebe nsọ ahụ dị na Shaịlo. Àjà ọ chụrụ ọ̀ bụ nke ndị mmadụ na-ahụghị? N’ụzọ dị iche: “Ụmụ ndị inyom Izrel na-eje kwa afọ ịkọ akụkọ nwa nwanyị Jefta onye Gilead ụbọchị anọ n’afọ.” (Ndị Ikpe 11:40) Ee, okwu ịja mma pụrụ ịgba ndị a na-agwa ya ume. N’ihi ya, ka anyị ghara ịla azụ ikwu okwu ịja mma gwa ndị e kwesịrị ịgwa ya.

Anyị ga-emekwa nke ọma ịtụle ihe nlereanya Jizọs. Ọ bụ ezie na ọ bụghị omenala ndị Juu bụ́ ndị ikom isoro ndị inyom na-akparịta ụka, Jizọs wepụtara oge soro Meri na Mata nọrịa. Eleghị anya, ha bụ ndị inyom di ha nwụrụ ma ọ bụ ndị na-alụbeghị di. Jizọs chọrọ ka ha abụọ nweta uru ime mmụọ nke a na-enweta site n’ịbụ enyi ya. (Luk 10:38-42) Anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya Jizọs site n’ịgụnye ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị na-alụbeghị di ná nnọkọ ntụrụndụ nakwa site n’ime ndokwa iso ha rụkọọ ọrụ nkwusa. (Ndị Rom 12:13) Ha na-enwe ekele maka nchebara echiche dị otú ahụ? Otu nwanna nwanyị sịrị: “Amaara m na ụmụnna nwoke hụrụ m n’anya ma jiri m kpọrọ ihe, ma ana m enwe ekele mgbe ha nwekwuru mmasị onwe onye n’ebe m nọ.”

“Ebe ọ bụ na anyị enweghị ezinụlọ nke aka anyị,” ka Sandra na-akọwa, “ọ dị anyị mkpa nke ukwuu karị ịbụ ndị a hụrụ n’anya, na inwe mmetụta nke ịbụ akụkụ nke ezinụlọ nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ.” N’ụzọ doro anya, Jehova na-elekọta ndị dị otú ahụ, anyị na-esokwa ya eme otú ahụ mgbe anyị na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ na ndị a hụrụ n’anya. (1 Pita 5:6, 7) A ga-ahụ nchebara echiche dị otú ahụ, n’ihi na “onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ [Jehova Chineke] ga-akwụghachi ya.”—Ilu 19:17.

“Onye Ọ Bụla Ga-ebu Ibu nke Ya

Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ inye aka, nkwado ha pụkwara ịbụ nnọọ ihe agbamume, “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:5) Otú ọ dị, n’ibu ibu nke owu ọmụma, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya banyere ihe ize ndụ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, owu ọmụma pụrụ imeri anyị ma ọ bụrụ na anyị amalite ịnọrọ onwe anyị. N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ iji ịhụnanya merie owu ọmụma. (1 Ndị Kọrint 13:7, 8) Inye ihe na ikerịta ihe bụ ụzọ kasị mma isi chọta obi ụtọ—n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị. (Ọrụ 20:35) “Enweghị m oge dị ukwuu iji chewe banyere ịbụ onye owu na-ama,” ka otu ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike na-ekwu. “Mgbe m nwere mmetụta nke ịbụ onye bara uru na onye ji ọrụ n’aka, owu anaghị ama m.”

Anyị aghaghịkwa ilezi anya ka owu ọmụma ghara ịkwaba anyị ná mmekọrịta amamihe na-adịghị na ya. Dị ihe atụ, lee ihe mwute ọ ga-abụ ikwe ka ọchịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye mee ka anyị ghara ịhụ ọtụtụ nsogbu ndị na-abịa site n’ịlụ onye na-ekweghị ekwe, ma karịsịa, mee ka anyị leghara ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nyere ka anyị zere nkekọ dị otú ahụ anya! (2 Ndị Kọrint 6:14) Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke a gbara alụkwaghịm sịrị: “Ọ dị ihe dị njọ nke ukwuu karịa ịnọ n’alụghị di. Ọ bụ ịlụ onye na-ekwesịghị ekwesị.”

A ghaghị idi nsogbu a na-apụghị ịgwọta agwọta, ma ọ dịghị ihe ọzọ ka ọ dị ugbu a. Site n’enyemaka Chineke, a pụrụ idi owu ọmụma. Ka anyị na-anọgide na-ejere Jehova ozi, ka anyị nwee obi ike na otu ụbọchị a ga-egbo mkpa anyị nile n’ụzọ kasị mma ga-ekwe omume.—Abụ Ọma 145:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ndị inyom e hotara n’ebe a.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

A pụrụ imeri owu ọmụma site n’inye ihe na ikerịta ihe