Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbasi Ozu—Ò Kwesịrị Ka Ndị Kraịst Na-eme Ya?

Ịgbasi Ozu—Ò Kwesịrị Ka Ndị Kraịst Na-eme Ya?

Ịgbasi Ozu—Ò Kwesịrị Ka Ndị Kraịst Na-eme Ya?

Ka oge ọnwụ nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jekọb na-eru nso, ọ rịọrọ arịrịọ ikpeazụ a, sị: “Lienụ m n’ebe nna m hà dị n’ọgba nke dị n’ọhịa nke Efrọn, bụ́ onye Het, n’ọgba nke dị n’ọhịa Makpila, nke dị n’ihu Mamre, n’ala Kenan.”—Jenesis 49:29-31.

JOSEF mere ihe nna ya rịọrọ site n’ịgbaso omenala ọtụtụ ndị na-eme n’Ijipt n’oge ahụ. O nyere “ndị ohu ya, bụ́ ndị dibịa, iwu ịgbasi ozu nna ya.” Dị ka ihe ndekọ dị na Jenesis isi 50 si kwuo, ndị dibịa ahụ jiri ụbọchị 40 a na-ejikarị eme ya kwadebe ozu ahụ. Ịgbasi ozu Jekọb mere ka o kwe ezinụlọ ahụ buru ibu na-adịghị ejesi ike na ndị oké ozu bụ́ ndị Ijipt omume ime njem dị ihe dị ka kilomita 400 iji buru ozu Jekọb gaa Hebrọn maka olili.—Jenesis 50:1-14.

Ò kwere omume na a ga-ahụ ozu Jekọb a gbasiri agbasi otu ụbọchị? Ọ gaghị ekwecha omume. Izrel bụ ala mmiri na-ede nke ọma, bụ́ nke na-akpara ụdị ihe mgbe ochie a na-egwupụta n’ebe ahụ ókè. (Ọpụpụ 3:8) Ọla na nkume oge ochie juru eju ebe ahụ, ma ihe ndị dị pekepeke dị ka ákwà, akpụkpọ anụ, na ozu a gbasiri agbasi, alanarịghị mmiri na ngabiga nke oge.

Gịnịdị bụ ịgbasi ozu? Gịnị mere e jiworo na-eme ya? Ò kwesịrị ka Ndị Kraịst na-eme ya?

Ebee Ka Omenala ahụ Malitere?

A pụrụ ịkọwa ịgbasi ozu n’ụzọ kasị mma dị ka ichekwa ozu mmadụ ma ọ bụ nke anụmanụ. Ọ dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme hà kweere na ọ malitere n’Ijipt, ma, ndị Asiria, ndị Peasia, na ndị Sitia oge ochie mekwara ya. Eleghị anya ihe kpaliri mmasị mbụ e nwere n’ịgbasi ozu na nnwale mbụ a nwalere ya bụ nchọpụta a chọpụtara ozu ndị e liri n’ọzara bụ́ ndị usoro okike chekwara. Ebe dị otú ahụ e liri ya ga-eme ka mmiri na ikuku ghara irute ozu ahụ, si otú ahụ na-eme ka ọ ghara ire ọsọ ọsọ. Ụfọdụ ndị chepụtara na ịgbasi ozu malitere mgbe a hụrụ ozu ndị e chekwara n’ime natron (sodium carbonate), bụ́ ụdị akanwụ nke juru n’Ijipt na gburugburu ya.

Nzube nke onye na-agbasi ozu bụ nnọọ igbochitụ ọrụ ụmụ nje bacteria na-arụ dị ka o kwesịrị bụ́ nke ha na-amalite ịrụ n’ime awa ole na ole a nwụsịrị, na-eme ka ozu ahụ rewe ure. Ọ bụrụ na a pụrụ izere usoro a, ire ure ga-akwụsị ma ọ bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, jiritụ nwayọọ. Ihe atọ dị mkpa: ichekwa ozu ahụ ka o yie ka ọ ka dị ndụ, igbochi ya ire ure, na ime ka ụmụ ahụhụ ghara ịkpa ike n’ahụ́ ozu ahụ.

N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi ihe banyere okpukpe ka ndị Ijipt oge ochie ji agbasi ndị ha nwụrụ anwụ. Echiche ha banyere ndụ mgbe a nwụsịrị nwere ihe jikọrọ ya na ọchịchọ ha ịnọgide soro ndị dị ndụ na-emekọrịta ihe mgbe ha nwụsịrị. Ha kweere na a ga-eji ahụ́ ha na-eme ihe ruo mgbe ebighị ebi nakwa na a ga-eme ka ọ dịghachi ndụ. N’agbanyeghị otú ịgbasi ozu si bụrụ ihe a na-eme n’ọtụtụ ebe, ruo ugbu a, ọ dịghị ihe ndekọ Ijipt a chọtara banyere otú e si mee ya. Akụkọ kasị mma e nwere bụ nke onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ nke ise T.O.A., bụ́ Herodotus. Otú ọ dị, a kọwo na ime ka ozu a gbasiri agbasi dịrị otú ọ na-adị n’oge ochie site n’iji ntụziaka Herodotus nyere eme ihe agachabeghị nke ọma.

Ò Kwesịrị Ka Ndị Kraịst Na-eme Ya?

Ndị gbasiri ozu Jekọb bụ ndị nkwenkwe okpukpe ya na ha na-abụghị otu. Ma, anyị apụtụghị iche n’echiche na mgbe Josef bunyere ndị dibịa ahụ ozu nna ya, ọ gwara ha ka ha kpee ekpere ma mee ememe ndị a na-eme mgbe a na-agbasi ihe ka ọtụtụ n’ozu ndị a gbasiri n’Ijipt n’oge ahụ. Ma Jekọb ma Josef bụcha ndị ikom nwere okwukwe siri ike. (Ndị Hibru 11:21, 22) Ọ bụ ezie na o doro anya na Jehova enyeghị ya n’iwu, Akwụkwọ Nsọ akatọghị nchekwa e chekwara ozu Jekọb. A gbasighị ozu Jekọb ka ọ bụrụ usoro mba Izrel ma ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-agbaso. N’ezie, e nweghị ntụziaka a kapịrị ọnụ e nyere n’Okwu Chineke banyere okwu ahụ. Mgbe a gbasisịrị ozu Josef n’onwe ya n’Ijipt, ọ dịghị ebe ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere omume ahụ.—Jenesis 50:26.

Otú ozu ndị a hụrụ n’ili ndị dị na Palestine si rekasịa erekasịa na-egosi na ọ bụghị omenala ndị Hibru ịgbasi onye nwụrụ anwụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ bụghị maka ichekwa ya ruo ogologo oge. Dị ka ihe atụ, a gbasighị ozu Lazarọs agbasi. Ọ bụ ezie na e ji ákwà kechie ya, e gosiri nchegbu mgbe a na-aga iwepụ nkume e ji mechie ili ahụ. Ebe ọ bụ na o ruola ụbọchị anọ Lazarọs nwụrụ tupu mgbe ahụ, nwanne ya nwanyị ji n’aka na a ga-anụ ísì ihe ma e meghee ili ahụ.—Jọn 11:38-44.

À gbasiri ozu Jizọs Kraịst agbasi? Ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ adịghị akwado nke a. N’oge ahụ, ọ bụ omenala ndị Juu iji mmanụ ndị na-esi ísì ụtọ akwadebe ozu tupu e lie ya. Dị ka ihe atụ, iji tee ozu Jizọs mmanụ, Nikọdimọs wetara nnukwute mmanụ na-esi ísì ụtọ maka nke a. (Jọn 19:38-42) Gịnị mere e ji weta mmanụ na-esi ísì ụtọ dị ukwuu otú a? Ọ pụrụ ịbụwo ịhụnanya sitere n’obi na nkwanye ùgwù o nwere n’ebe Jizọs nọ kpaliri ya igosipụta mmesapụ aka dị otú ahụ. Anyị ekwesịghị ikwubi na ojiji dị otú ahụ e ji mmanụ na-esi ísì ụtọ mee ihe bụ iji chekwaa ozu ahụ.

Onye Kraịst, ọ̀ ga-ajụ omenala nke ịgbasi ozu? N’ile ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ịgbasi ozu bụ nanị igbu ihe a na-apụghị izere ezere oge. Anyị sitere n’ájá, ọ bụkwa n’ájá ka anyị ga-alaghachi mgbe anyị nwụrụ. (Jenesis 3:19) Ma ogologo oge ha aṅaa ka ọ ga-ewe site ná mgbe a nwụrụ ruo mgbe a ga-eli ozu? Ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi si ebe dị anya na-abịa, a chọọkwa ka ha hụ ozu ahụ anya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-agbasitụ ya.

Mgbe ahụ, dị ka Akwụkwọ Nsọ si egosi, ọ dịghị mkpa inwewe nchegbu ma ọ bụrụ na obodo i bi na ya chọrọ na a ga na-agbasi ozu ma ọ bụ na ndị òtù ezinụlọ chọrọ ka e mee nke a. Ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ọ bụrụ na ha nọ ná ncheta Chineke, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ ya e kwere ná nkwa.—Job 14:13-15; Ọrụ 24:15; 2 Pita 3:13.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

ỊGBASI OZUN’OGE AHỤ NA N’OGE A

N’Ijipt oge ochie, otú a ga-esi agbasi ozu dabeere n’ọnọdụ ezinụlọ. Eleghị anya ezinụlọ bara ọgaranya ga-ahọrọ usoro a:

A ga-eji ngwá ọrụ e ji ọla mee si n’oghere imi mịpụta ụbụrụ ya. Mgbe e mesịrị, a ga-eji ọgwụ kwesịrị ekwesị mee ihe maka okpokoro isi ya. Ihe ọzọ a ga-eme bụ iwepụtasị akụkụ ahụ́ nile dị n’ime ahụ́ ma e wezụga obi na akụrụ. Iji nwee ike iwepụta ihe dị n’afọ ya, a ghaghị ịbọwa ya afọ, ma e lere nke a anya dị ka mmehie. Iji hụ na e doziri ihe omume na-ese okwu, ndị na-agbasi ozu n’Ijipt họpụtara otu onye a na-akpọ onye na-abọwa ihe ka ọ na-abọwa afọ ahụ. Ọ na-agbalaga ozugbo o mesịrị nke a, n’ihi na ọbụbụ ọnụ na ịtụ nkume bụ ntaramahụhụ maka ihe a a sị na ọ bụ mpụ.

Mgbe e wepụtasịrị ihe ndị dị n’afọ ya, a na-asa ya nke ọma. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus dere, sị: “Ha na-awụju maịa kasị dịrị ọcha e gweriri egweri, cassia, na mmanụ ọ bụla na-esi ísì ụtọ, e wezụga frankincense, n’ime afọ ahụ, ma dụchie ya.”

Mgbe e mesịrị, a na-amịkpọ ozu ahụ site n’ịbanye ya na natron ruo ụbọchị 70. Mgbe e mesịrị, a na-asa ozu ahụ ma jiri nkà were ákwà fụchie ya. A na-ejizi resin ma ọ bụ ihe na-anya anya techie ákwà ọcha ahụ, dọbazie ozu ahụ a gbasiri agbasi n’ime igbe a rụrụ ka o nwee ọdịdị mmadụ.

Taa, a pụrụ iji awa ole na ole gbasie ozu. A na-emekarị ya site n’ịgbanye ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke mmiri ọgwụ e ji agbasi ozu n’akwara mwebata ọbara na nke nkesa ọbara nakwa n’oghere ndị dị n’ime afọ na n’oghere ndị ọzọ dị n’ime ahụ́. Ruo ọtụtụ afọ, e mepụtawo ma jiri ọtụtụ mmiri ọgwụ mee ihe. Otú ọ dị, n’ihi ọnụ ego na ịdị nchebe ya, formaldehyde bụ mmiri ọgwụ e ji agbasi ozu nke a na-ejikarị eme ihe.

[Foto]

Igbe ozu ọlaedo nke Eze Tutankhamen