Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ezughị okè nke nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ Meri ò nwere mmetụta na-adịghị mma n’ịtụrụ ime Jizọs?

Banyere “ọmụmụ Jizọs,” ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “N’oge e kwere nne ya bụ́ Meri nkwa na Josef ga-alụ ya, a hụrụ na ọ dị ime site na mmụọ nsọ tupu e jikọọ ha.” (Matiu 1:18) N’ezie, mmụọ nsọ Chineke keere òkè dị oké mkpa n’ime ahụ Meri dị.

Otú ọ dị, gịnị banyere Meri? Àkwá ya ò keere òkè ọ bụla n’ime ahụ ọ dị? N’iburu n’uche nkwa Chineke kwere Ebreham, Aịzik, Jekọb, Juda, na Eze Devid—ndị nna nna Meri—nwa ahụ a ga-amụ aghaghị ịbụ nwa ha kpọmkwem. (Jenesis 22:18; 26:24; 28:10-14; 49:10; 2 Samuel 7:16) Olee ụzọ ọzọ nwa ahụ Meri mụrụ ga-esi bụrụ onye nketa kwesịrị ekwesị nke nkwa ndị ahụ Chineke kwere? Ọ ghaghị ịbụ nwa ya n’ezie.—Luk 3:23-34.

Mmụọ ozi Jehova abịakwutewo nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ Meri, na-asị: “Atụla egwu, Meri, n’ihi na i nwetawo ihu ọma n’ebe Chineke nọ; ma, lee! ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs.” (Luk 1:30, 31) Àkwá ga-aghọ nwa tupu a dịrị ime. Ihe àmà na-egosi na Jehova Chineke mere ka àkwá dị n’akpa nwa Meri ghọọ nwa, na-eme nke a site n’ibufe ndụ nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya site n’ógbè ndị bụ́ mmụọ bịa n’ụwa.—Ndị Galeshia 4:4.

Nwa nwanyị na-ezughị okè mụrụ n’ụzọ dị otú a, ọ̀ pụrụ izu okè n’enweghị mmehie n’anụ ahụ́ ya? Olee otú iwu nke ihe nketa na-esi arụ ọrụ mgbe e nwere njikọ nke ihe zuru okè na ihe na-ezughị okè? Cheta na e ji mmụọ nsọ mee ihe n’ibufe ike ndụ zuru okè nke Ọkpara Chineke ma mee ka a tụrụ ime ahụ. Nke a kpuchiri ezughị okè ọ bụla nke dị n’àkwá Meri, si otú ahụ na-emepụta ụdị mkpụrụ ndụ zuru okè site ná mmalite ya.

Otú o sina dị, anyị pụrụ ijide n’aka na ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke n’oge ahụ mere ka nzube Chineke mezuo. Mmụọ ozi bụ́ Gebriel akọwaworo Meri, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụkwa, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Ee, mmụọ nsọ Chineke ghọrọ mgbidi nchebe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka ezughị okè ma ọ bụ mmetụta ọ bụla na-emerụ emerụ ghara imerụ nwa ahụ na-etolite n’akpa nwa, malite mgbe a tụụrụ ime ya gaa n’ihu.

N’ụzọ doro anya, Jizọs nwetara ndụ mmadụ ya zuru okè site n’aka Nna ya nke eluigwe, ọ bụghị n’aka mmadụ ọ bụla. Jehova ‘kwadebeere ya ahụ́,’ Jizọs—site n’oge a tụụrụ ime ya gaa n’ihu—bụkwa n’ezie onye “a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ.”—Ndị Hibru 7:26; 10:5.

[Foto dị na peeji nke 19]

“Ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke”