Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Idu Ndú—Ebee Ka Anyị Pụrụ Ịchọta Ya?

Ezi Idu Ndú—Ebee Ka Anyị Pụrụ Ịchọta Ya?

Ezi Idu Ndú—Ebee Ka Anyị Pụrụ Ịchọta Ya?

“ỤLỌ ọ bụla nwere onye wuru ya,” ka Bible na-ekwu, “ma onye wuru ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4; Mkpughe 4:11) Ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, bụ Onye Okike anyị, ọ “maara otú a kpụworo anyị.” (Abụ Ọma 103:14) Ọ mazuru erughị eru na mkpa anyị. Ebe ọ bụkwa Chineke na-ahụ n’anya, ọ chọrọ igbo mkpa ndị ahụ. (Abụ Ọma 145:16; 1 Jọn 4:8) Nke a na-agụnye mkpa anyị nwere maka ezi idu ndú.

Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova kwupụtara, sị: “Lee, enyewo m ya ka ọ bụrụ onye àmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 55:4) Ihe ngwọta nke ọgba aghara a na-enwe n’idu ndú taa na-agụnye ịmata Onye Ndú a—nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ji aka ya họpụta—na ịnakwere idu ndú ya. Ònyezi bụ Onye Ndú na Onye Iwu a e buru n’amụma? Olee ihe ndị mere o ji ruo eruo dị ka onye ndú? Ebee ka ọ ga-eduru anyị gaa? Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji rite uru site n’idu ndú ya?

Onye Ndú ahụ E Kwere ná Nkwa Abịarute

Ihe dị ka afọ 2,500 gara aga, mmụọ ozi Gebriel mere ka Daniel onye amụma hụ ya anya, wee gwa ya, sị: “Mara, werekwa uche mata, na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na [izu iri isii na abụọ], a ga-ewuzikwa ya ọzọ, ya na ámá na ékpè, ọbụna ná mkpa nke mgbe ndị a.”—Daniel 9:25.

N’ụzọ doro anya, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa Daniel kpọmkwem oge Onye Ndú Jehova họpụtara ga-abịa. “Onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-apụta ná ngwụsị nke izu 69, ma ọ bụ afọ 483, ma a malite na 455 T.O.A., bụ́ mgbe e kwuru ka e wughachi Jeruselem, gụkọwa ya. * (Nehemaịa 2:1-8) Gịnị mere mgbe oge ahụ gwụrụ? Luk, bụ́ onye so dee Oziọma na-akọ, sị: “N’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd abụrụkwa onye na-achị ógbè Galili [29 O.A.], . . . okwu Chineke kwupụtaworo ruru Jọn nwa Zekaraịa ntị n’ala ịkpa. O wee bata n’ime ógbè nile dị na gburugburu Jọdan, na-ekwusa baptizim dị ka ihe ngosipụta nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.” N’oge ahụ, “ndị Juu nọ na-atụ anya” Mezaịa bụ́ Onye Ndú. (Luk 3:1-3, 15) Ọ bụ ezie na ìgwè mmadụ bịakwutere Jọn, ọ bụghị ya bụ Onye Ndú ahụ.

E mesịa, ihe dị ka n’October nke 29 O.A., Jizọs onye Nazaret bịakwutere Jọn ka o mee ya baptizim. Jọn gbakwara àmà, na-asị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata dị ka nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya. Amaghịdị m ya, ma Onye ahụ nke zitere m ime baptizim n’ime mmiri sịrị m, ‘Onye ọ bụla nke ị hụrụ ka mmụọ nsọ na-abịakwasị ma na-adịgide n’isi ya, onye a bụ onye ahụ nke ji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’ Ahụwokwa m ya, agbawokwa [m] àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:32-34) Mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ ghọrọ Onye Ndú e tere mmanụ—Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst.

Ee, onye ahụ e kwere ná nkwa ịbụ “onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche” bịara bụrụ Jizọs Kraịst. Mgbe anyị tụlekwara àgwà ya dị ka onye ndú, anyị na-aghọta ozugbo na idu ndú ya karịrị nnọọ ihe a chọrọ n’oge a iji bụrụ ezigbo onye ndú.

Mezaịa—Ezigbo Onye Ndú

Ezi onye ndú na-enye ntụziaka doro anya ma na-enyere ndị ọ na-edu aka inwe ikike na mkpebisi ike ga-eme ka ha nwee ike idozi nsogbu n’ụzọ ga-aga nke ọma. ‘Nke a bụ ihe dị oké mkpa a chọrọ n’aka onye ndú ga-enwe ihe ịga nke ọma na narị afọ nke 21,’ ka akwụkwọ bụ́ 21st Century Leadership: Dialogues With 100 Top Leaders na-ekwu. Lee ụzọ dị mma Jizọs si kwadebe ndị na-ege ya ntị ime ihe banyere ọnọdụ ndị ha na-enwe kwa ụbọchị! Tụlee nnọọ ozizi kasị wuo ewuo o ziri—Ozizi Elu Ugwu. Okwu ndị ahụ e dekọrọ na Matiu isi 5 ruo 7 nwere ọtụtụ ndụmọdụ ndị dị irè.

Dị ka ihe atụ, tụlee ndụmọdụ Jizọs nyere banyere idozi esemokwu dị n’etiti otu onye na ibe ya. O kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Mmadụ ibute ụzọ n’ime ka ya na ndị ọzọ dị n’udo kasị mkpa—ọbụna karịa ije ozi okpukpe, dị ka inye onyinye n’ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem dị ka Iwu Mozis si chọọ. Ma ọ́ bụghị ya, Chineke agaghị anakwere ofufe onye ahụ. Ndụmọdụ Jizọs dị irè taa otú ọ dị ọtụtụ narị afọ gara aga.

Jizọs nyekwaara ndị na-ege ya ntị aka izere ọnyà nke omume rụrụ arụ. Ọ dụrụ ha ọdụ, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:27, 28) Lee ka ịdọ aka ná ntị ahụ si daba adaba! N’ihi gịnị ka anyị ga-eji malite ime ihe ga-eduga n’ịkwa iko site n’ichewe banyere ya? N’obi ka ịkwa iko nile si apụta, ka Jizọs kwuru. (Matiu 15:18, 19) Anyị ga-abụ ndị maara ihe ichebe obi anyị.—Ilu 4:23.

Ozizi Elu Ugwu ahụ bukwa ndụmọdụ magburu onwe ya banyere mmadụ ịhụ ndị iro ya n’anya, imesapụ aka, inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ihe onwunwe na ihe ime mmụọ, na ihe ndị yiri ha. (Matiu 5:43-47; 6:1-4, 19-21, 24-34) Ọbụna Jizọs gosiri ndị na-ege ya ntị otú e si achọ enyemaka Chineke site n’ịkụziri ha otú e si ekpe ekpere. (Matiu 6:9-13) Mezaịa bụ́ Onye Ndú na-ewusikwu ụmụazụ ya ike ma na-akwadebe ha imeri nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ na-enwekarị.

Ugboro isii n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs ji okwu ndị bụ́ “unu nụrụ na a sịrị” ma ọ bụ “ọzọkwa, a sịrị,” malite okwu ya, n’otu mgbe ahụkwa, na-ekwupụta echiche ọzọ, na-asị, “otú ọ dị, asị m unu.” (Matiu 5:21, 22, 27, 28, 31-34, 38, 39, 43, 44) Nke ahụ na-egosi na ọ marawo ndị na-ege ya ntị ahụ́ ime ihe n’ụzọ ụfọdụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ọdịnala ndị Farisii ji ọnụ kụzie. Ma Jizọs na-egosizi ha ụzọ dị iche—nke na-egosipụta ihe Iwu Mozis na-ekwu n’ezie. N’ụzọ dị otú a, Jizọs nọ na-eweta mgbanwe, o mekwara ya n’ụzọ dịịrị ụmụazụ ya mfe ịnakwere ya. Ee, Jizọs kpaliri ndị mmadụ ime mgbanwe ndị dị ịrịba ama ná ndụ ha, n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ omume. Nke a bụ ihe e ji amata ezi onye ndú.

Otu akwụkwọ nduzi kwuru otú iweta mgbanwe dị otú ahụ si bụrụ ihe siri ike. Ọ na-asị: “Ọ dị onye ọrụ [onye ndú] na-eweta mgbanwe mkpa inwe nchebara echiche onye ọrụ ebere na-enwe, nghọta nke ọkà n’akparamàgwà mmadụ, ume nke onye na-agba ọsọ marathon, nnọgidesi ike nke nkịta bulldog, ndabere n’onwe onye nke onye na-anọ nanị ya, na ndidi nke onye senti. Ya nwegodị àgwà nile ahụ, a pụghị ijide n’aka na ọ ga-enwerịrị ihe ịga nke ọma.”

“Ndị ndú aghaghị ịdị na-akpa àgwà otú ha chọrọ ka ụmụazụ ha na-akpa,” ka e kwuru n’otu ihe odide nke isiokwu ya bụ “Idu Ndú: Àgwà Ọ̀ Dị Mkpa?” N’ezie, ezi onye ndú na-eme ihe ọ na-akụzi. Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ebe Jizọs Kraịst nọ! Ee, ọ kụziiri ndị ya na ha nọ ka ha na-adị umeala n’obi, o setịpụkwaara ha ihe nlereanya site n’ịsa ụkwụ ha. (Jọn 13:5-15) Ọ bịaghị zipụ nanị ndị na-eso ụzọ ya ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, kama ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’ịrụ ọrụ ahụ. (Matiu 4:18-25; Luk 8:1-3; 9:1-6; 10:1-24; Jọn 10:40-42) A bịakwa n’ihe banyere ịnakwere idu ndú, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya. “Ọkpara ahụ apụghị ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka ya,” ka o kwuru banyere onwe ya, “kama nanị ihe ọ hụrụ ka Nna ya na-eme.”—Jọn 5:19.

Ihe ndị a tụlere n’elu banyere ihe Jizọs kwuru ma mee na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ ya bụ ezigbo Onye Ndú ahụ. N’ezie, ọ gafere ụkpụrụ nile ụmụ mmadụ setịpụrụ maka ezi idu ndú. Jizọs zuru okè. N’ịbụ onye ketara anwụghị anwụ mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, ọ na-adịru mgbe ebighị ebi. (1 Pita 3:18; Mkpughe 1:13-18) Olee onye ndú bụ́ mmadụ nke pụrụ iru eru otú a?

Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime?

Dị ka Eze na-achị achị nke Alaeze Chineke, “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-awụkwasị ngọzi n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa banyere nke a, sị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ụwa taa nọ n’ọgba aghara n’ihe banyere idu ndú. Otú ọ dị, Jizọs Kraịst na-edu ndị dị umeala n’obi abanye n’ụwa ọhụrụ nke udo, bụ́ ebe a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi dị n’otu n’ofufe nke Jehova Chineke, ha ga-agakwa n’ihu ruo izu okè. Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị na-ewepụta oge iji nweta ihe ọmụma banyere ezi Chineke na Onye Ndú ọ họpụtara ma na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ!—Jọn 17:3.

Otu n’ime ùgwù kasị mma anyị pụrụ ịkwanyere mmadụ bụ iṅomi ya. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalị iṅomi Onye Ndú kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—Jizọs Kraịst? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Mmetụta dị aṅaa ka ịnakwere idu ndú ya pụrụ inwe ná ndụ anyị? A ga-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu abụọ na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee peeji nke 186-192 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 4]

Daniel buru amụma banyere ọbịbịa nke Onye Ndú Chineke họpụtara

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ozizi Jizọs kwadebere ndị mmadụ imeri nsogbu ndị ha na-enwe ná ndụ

[Foto dị na peeji nke 7]

Jizọs ga-eduru ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi banye n’ụwa ọhụrụ nke udo