Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Idu Ndú—Ihe Ịma Aka Zuru Ụwa Ọnụ

Ezi Idu Ndú—Ihe Ịma Aka Zuru Ụwa Ọnụ

Ezi Idu Ndú—Ihe Ịma Aka Zuru Ụwa Ọnụ

Nwoke ahụ bụ onye edemede na onye na-agụ urí. O nwere olileanya dị nnọọ ukwuu maka ọdịnihu. Ihe dị ka afọ 90 gara aga, o ji anya nke uche ya hụ ebe “obi na-adịghị amapụ mmadụ na ebe e nwere nchekwube; ebe ihe ọmụma bụ n’efu; ebe ụwa na-abụbeghị nke ajọ mbunobi dị n’etiti mba dị iche iche kewasịrị; ebe a na-ekwu eziokwu; [na] ebe ọ fọrọ nke nta ka e ruo izu okè n’ihi mgbalị a gbakọrọ aka na-eme n’enweghị ike ọgwụgwụ.”

ONYE edemede ahụ kwupụtaziri olileanya ya na otu ụbọchị, mba ya nakwa ụwa dum ga-ahụ onwe ha n’ebe dị otú ahụ. A sị na onye a ritere Ihe Nrite Nobel n’ide urí nọ ndụ taa, n’ezie ọ gaara abụwo onye e mechuru ihu n’ụzọ dị ukwuu. N’agbanyeghị ọganihu nile ụwa nwere nakwa ihe nile ọ rụpụtara, ọ bụ nke kewasịrị ekewasị ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọdịnihu nke ụmụ mmadụ n’ozuzu ya ka nọgidekwara bụrụ nke a na-ejighị n’aka.

Mgbe a jụrụ otu onye ọrụ ugbo ihe mere ime ihe ike ji tiwapụ n’ike n’etiti òtù ụfọdụ nọ ná mba ya, ọ rụtụrụ aka n’ihe o weere dị ka otu ihe kpatara ya. “Ọ bụ n’ihi ndị ndú ọjọọ,” ka o kwuru. N’akwụkwọ ya bụ́ Humanity—A Moral History of the Twentieth Century, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jonathan Glover kwupụtara echiche yiri nke ahụ, na-asị: “Mgbuchapụ agbụrụ [e mere n’otu mba ahụ] abụghị ịkpọasị agbụrụ malitere na mberede, ọ bụ nke ndị chọrọ ịnọgide n’ọkwá ọchịchị mere atụmatụ ya.”

Mgbe agha tiwapụrụ ná mmalite afọ ndị 1990 n’etiti ọchịchị ripọblik abụọ nke ebe bụbu Yugoslavia, otu odeakụkọ dere, sị: “Anyị bikọtara ọnụ n’obi ụtọ ruo ọtụtụ afọ, ugbu a kwa, ihe emebiela ruo n’ókè nke anyị igburịta ụmụ anyị. Gịnị na-emedị anyị?”

Mba India, bụ́ ebe a mụrụ onye ahụ na-ede urí e kwuru okwu ya na mbụ, dị ọtụtụ kilomita n’anya site na Europe. Ná mgbakọ ọmụmụ ihe isiokwu ya bụ “India Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide Dị Ka Otu Mba?,” onye edemede bụ́ Pranay Gupte kwuru, sị: ‘Ihe dị ka pasent 70 nke ndị mmadụ bi n’India erubeghị afọ 30, ma e nweghị ndị ndú na-esetịpụrụ ha ihe nlereanya.’

Ná mba ụfọdụ, ndị ndú agbaala arụkwaghịm n’ihi ịbụ ndị e boro ebubo nrụrụ aka. Mgbe ahụ, n’ihi ọtụtụ ihe, o doro anya na ụwa nwere nsogbu n’ihe banyere idu ndú. Ihe ndị na-emenụ na-agba akaebe na ihe otu onye amụma biri ndụ ihe dị ka afọ 2,600 gara aga kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

Ọ̀ dị ihe ngwọta e nwere maka nsogbu a na-enwe n’ụwa ugbu a? Ònye pụrụ iduru ihe a kpọrọ mmadụ banye n’ụwa ebe ọha mmadụ na-agaghị abụ ndị esemokwu na-ekewa ma ọ bụ ndị egwu na-atụgbu, ebe ezi ihe ọmụma ga-abụ n’efu ma baa ụba, na ebe ihe a kpọrọ mmadụ ga-aga n’ihu iru izu okè?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Fatmir Boshnjaku