Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Idu Ndú Kraịst Ọ̀ Dị Adị Nye Gị?

Idu Ndú Kraịst Ọ̀ Dị Adị Nye Gị?

Idu Ndú Kraịst Ọ̀ Dị Adị Nye Gị?

“Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.”—MATIU 23:10.

1. Ònye ka nanị ya bụ Onye Ndú nke ezi Ndị Kraịst?

Ọ BỤ na Tuesday, Nisan 11. Ụbọchị atọ n’ihu, a ga-egbu Jizọs Kraịst. Nke a bụ nke ikpeazụ ọ gara n’ụlọ nsọ ahụ. N’ụbọchị a, Jizọs kụziiri ìgwè mmadụ gbakọrọ n’ebe ahụ nakwa ndị na-eso ụzọ ya otu ihe dị mkpa. O kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu nile bụ ụmụnna. Ọzọkwa, unu akpọla onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, bụ́ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.” (Matiu 23:8-10) N’ụzọ doro anya, Jizọs Kraịst bụ Onye Ndú nke ezi Ndị Kraịst.

2, 3. Mmetụta dị aṅaa ka ige Jehova ntị na ịnakwere Onye Ndú ọ họpụtaworo na-enwe ná ndụ anyị?

2 Lee mmetụta bara uru idu ndú Jizọs na-enwe ná ndụ anyị mgbe anyị na-anakwere ya! N’ibu amụma banyere ọbịbịa nke Onye Ndú a, Jehova Chineke kwupụtara site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Gee ntị, onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ ná mmiri, onye ahụkwa nke na-enweghị ego; bịanụ, zụrụ ọka, rie; ee, bịanụ, zụrụkwa mmanya vaịn na mmiri ara ehi n’ejighị ego n’ahụghị ọnụ ahịa. . . . Geenụ m ntị nke ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abụba tọọkwa mkpụrụ obi unu ụtọ. . . . Lee, enyewo m ya ka ọ bụrụ onye àmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.”—Aịsaịa 55:1-4.

3 Aịzaịa ji ihe ndị dị mmiri mmiri a na-ahụkarị—mmiri, mmiri ara ehi, na mmanya vine—mee ihe dị ka ihe yiri ihe iji gosi mmetụta ọ na-enwe ná ndụ anyị mgbe anyị na-ege Jehova ntị ma na-agbaso Onye Ndú na Onye Iwu o nyeworo anyị. Ihe na-esi na ya apụta na-enye ume ọhụrụ. Ọ dị ka ịṅụ iko mmiri jụrụ oyi n’ụbọchị anwụ na-achasi ike. Akpịrị ịkpọ nkụ anyị na-enwe maka eziokwu na ezi omume na-adajụ. Dị ka mmiri ara si eme ka ụmụ ọhụrụ gbasie ike ma na-enyere ha aka ito eto, ‘mmiri ara nke okwu ahụ’ na-ewusikwu anyị ike ma na-akwalite uto ime mmụọ ná mmekọrịta anyị na Chineke. (1 Pita 2:1-3) Ònyekwa pụrụ ịjụ ikwere na mmanya so eme ka e nwee ọṅụ n’oge ememe? N’ụzọ yiri nke ahụ, ife ezi Chineke ahụ ofufe na ịgbaso nzọụkwụ nke Onye Ndú ọ họpụtara na-eme ka ndụ bụrụ “nanị ọṅụ.” (Deuterọnọmi 16:15) Mgbe ahụ, ọ dị oké mkpa ka anyị nile—ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị ikom na ndị inyom—na-egosi na idu ndú Kraịst dị adị nye anyị. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta site ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị na Mezaịa ahụ bụ Onye Ndú anyị?

Ndị Ntorobịa—Nọgidenụ “Na-aga n’Ihu n’Amamihe”

4. (a) Gịnị mere mgbe Jizọs onye dị afọ 12 gara Jeruselem n’oge Ememe Ngabiga? (b) Olee otú Jizọs nweruru ihe ọmụma mgbe ọ dị nanị afọ 12?

4 Tụlee ihe nlereanya Onye Ndú anyị setịpụụrụ ndị na-eto eto. Ọ bụ ezie na anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere oge Jizọs bụ nwata, otu ihe merenụ kpughere nnọọ ihe dị ukwuu. Mgbe Jizọs dị afọ 12, ndị mụrụ ya kpọọrọ ya gaa njem ha na-aga kwa afọ na Jeruselem maka Ememe Ngabiga. N’oge a, ọ banyere ná mkparịta ụka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ezinụlọ ya hapụkwara ya laa n’amaghị ụma. Ụbọchị atọ ka e mesịrị, ndị mụrụ ya bụ́ ndị na-echegbu onwe ha, bụ́ Josef na Meri, chọtara ya n’ụlọ nsọ ahụ “ka ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.” Ọzọkwa, “nghọta ya na azịza ya nọgidere na-eju ndị nile na-ege ya ntị anya.” Cheedị echiche, mgbe Jizọs dị nanị afọ 12, ọ bụghị nanị na ọ pụrụ ịjụ ajụjụ ndị na-akpali iche echiche bụ́ ndị metụtara ihe ime mmụọ kamakwa o nyere azịza ndị ezi uche dị na ha! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọzụzụ ndị mụrụ ya nyere ya nyeere ya aka.—Luk 2:41-50.

5. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi nyochaa àgwà ha n’ebe ọmụmụ Bible ezinụlọ dị?

5 Ikekwe ị bụ onye na-eto eto. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ikekwe unu nwere usoro ihe omume nke ọmụmụ ihe ezinụlọ n’ụlọ unu. Àgwà dị aṅaa ka ị nwere n’ebe ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ dị? Gịnị ma ị tụgharịa uche n’ajụjụ ndị dị ka: ‘Èji m obi m nile na-akwado ndokwa maka ọmụmụ Bible n’ezinụlọ m? M̀ na-akwado ya, n’adịghị eme ihe ọ bụla iji tisaa ihe omume ahụ?’ (Ndị Filipaị 3:16) ‘M̀ na-ekerechi òkè anya n’ọmụmụ ihe ahụ? Mgbe o kwesịrị ekwesị, m̀ na-ajụ ajụjụ banyere ihe a na-amụ ma na-aza ajụjụ banyere otú a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ? Ka m na-enwe ọganihu ime mmụọ, m̀ na-azụlite agụụ maka “nri siri ike [bụ́ nke] dịịrị ndị tozuru okè”?’—Ndị Hibru 5:13, 14.

6, 7. Uru dị aṅaa ka usoro ọgụgụ Bible kwa ụbọchị pụrụ ịbara ndị ntorobịa?

6 Inwe usoro ọgụgụ Bible kwa ụbọchị bakwara uru. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu, . . . kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Onye nọchiri Mozis, bụ́ Joshua, ‘gụrụ akwụkwọ nke iwu ahụ n’olu dị ala ehihie na abalị.’ Nke a nyeere ya aka ime ihe n’ụzọ amamihe ma nwee ihe ịga nke ọma n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya. (Joshua 1:8, NW) Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’” (Matiu 4:4) Ọ bụrụ na nri nkịtị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, lee ka nri ime mmụọ si dị anyị mkpa mgbe nile karị!

7 N’ịmata mkpa ime mmụọ ya, Nicole dị afọ 13 malitere ịgụ Bible kwa ụbọchị. * Ugbu a, ka ọ dị afọ 16, ọ gụchapụla Bible otu ugboro, ọ gụruokwala ya n’ọkara na nke ugboro abụọ ya. Ụzọ o si eme ya dị mfe. “Ekpebisiri m ike ịdị na-agụ ma ọ dịkarịa ala otu isiakwụkwọ kwa ụbọchị,” ka ọ na-ekwu. Olee otú Bible ọ na-agụ kwa ụbọchị siworo nyere ya aka? Ọ na-aza, sị: “Mmetụta ọjọọ juru eju taa. Ana m enweta nrụgide kwa ụbọchị n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ndị ọzọ bụ́ ndị na-ama okwukwe m aka. Ịgụ Bible kwa ụbọchị na-enyere m aka icheta ngwa ngwa iwu na ụkpụrụ Bible ndị na-agba m ume iguzogide nrụgide ndị a. N’ihi ya, ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye nọkwu Jehova na Jizọs nso.”

8. Gịnị ka e ji mara Jizọs n’ihe banyere ụlọ nzukọ, oleekwa otú ndị na-eto eto pụrụ isi ṅomie ya?

8 E ji ige ntị mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ na iso na-agụ ya mara Jizọs. (Luk 4:16; Ọrụ 15:21) Lee ka o si magbuo onwe ya bụ́ ndị na-eto eto ịgbaso ihe nlereanya ahụ site n’ịdị na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya, bụ́ ebe a na-agụ ma na-amụ Bible! N’igosipụta ekele maka nzukọ ndị dị otú ahụ, Richard dị afọ 14 na-ekwu, sị: “Nzukọ ndị ahụ na-abara m uru. N’ebe ahụ, a na-echetara m mgbe nile ihe dị mma na ihe dị njọ, ihe bụ́ omume ọma na omume ọjọọ, ihe ndị yiri nke Kraịst na ihe ndị na-eyighị. Ọ dịghị m mkpa ịchọpụta nke ahụ n’ụzọ dị mwute—site n’ahụmahụ.” Ee, “ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7) Nicole n’onwe ya mere ka ọ bụrụ ọrụ ya ịgachi nzukọ ọgbakọ ise a na-enwe kwa izu anya. Ọ na-ejikwa awa abụọ ruo atọ akwadebe maka ha.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

9. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi nọgide “na-aga n’ihu n’amamihe”?

9 Oge ntorobịa bụ oge kwesịrị ekwesị iji nweta ‘ihe ọmụma banyere nanị ezi Chineke, nakwa banyere onye ahụ o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Ị pụrụ ịma ndị na-eto eto bụ́ ndị na-atụfu oge dị ukwuu n’ịgụ akwụkwọ ndị na-akpa ọchị, n’ikiri telivishọn, n’igwu egwuregwu vidio, ma ọ bụ n’ịchọ ihe ọmụma n’Internet. N’ihi gịnị ka ị ga-eji na-eṅomi ha mgbe ị pụrụ ịgbaso ihe nlereanya zuru okè nke Onye Ndú anyị? Dị ka nwata nwoke, o nwere mmasị n’ịmụta banyere Jehova. Gịnị sikwa na ya pụta? N’ihi ịhụnanya o nwere maka ihe ime mmụọ, ‘Jizọs nọgidere na-aga n’ihu n’amamihe.’ (Luk 2:52) Ị pụrụ ime otú ahụ.

“Na-edonụ Onwe Unu n’Okpuru Ibe Unu”

10. Gịnị ga-enyere ndụ ezinụlọ aka ịbụ isi iyi nke udo na obi ụtọ?

10 Ebe obibi pụrụ ịbụ ebe a na-enweta udo na afọ ojuju ma ọ bụ ọgbọ agha nke esemokwu na nkewa. (Ilu 21:19; 26:21) Anyị ịnakwere idu ndú Kraịst na-eme ka anyị na-enwekwu udo na obi ụtọ n’ime ezinụlọ. N’ezie, Jizọs bụ onye nlereanya ná mmekọrịta ezinụlọ. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu n’egwu Kraịst. Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ, ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. . . . Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Ndị Efesọs 5:21-25) Pọl onyeozi degaara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe ọ bụla, n’ihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.”—Ndị Kọlọsi 3:18-20.

11. Olee otú onye bụ́ di pụrụ isi gosi na idu ndú Kraịst dị adị nye ya?

11 Ịgbaso ndụmọdụ a na-apụta na di ga na-edu ndú n’ezinụlọ, nwunye ya ejiri iguzosi ike n’ihe na-enyere ya aka, ụmụ ana-erubere ndị mụrụ ha isi. Otú ọ dị, ịbụisi nke ụmụ mmadụ na-eweta obi ụtọ nanị mgbe a na-eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Di maara ihe aghaghị ịmụta otú e si abụ isi site n’iṅomi Isi na Onye Ndú ya, bụ́ Kraịst Jizọs. (1 Ndị Kọrint 11:3) N’agbanyeghị na Jizọs mesịrị ghọọ “onyeisi nke ihe nile n’ebe ọgbakọ ahụ dị,” ọ bịara n’ụwa, “ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi.” (Ndị Efesọs 1:22; Matiu 20:28) N’ụzọ yiri nke ahụ, Onye Kraịst bụ́ di na-abụ isi, ọ bụghị n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ya nanị, kama iji lebara ọdịmma nke nwunye ya na ụmụ ya anya—ee, nke ezinụlọ ya dum. (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Ọ na-agbalị iṅomi àgwà nsọpụrụ Chineke nke Jizọs Kraịst, onye bụ́ isi ya. Dị ka Jizọs, ọ na-enwe obi dị umeala ma na-adị nwayọọ n’obi. (Matiu 11:28-30) Okwu ndị dị ka “o wutere m” ma ọ bụ “i ziri ezi” adịghị esiri ya ike ikwu mgbe o mehiere ihe. Ezi ihe nlereanya nke nwoke dị otú ahụ na-eme ka ọ dịkwuoro nwunye ya mfe ịbụrụ ya “onye inyeaka” na ‘onye e jikọtara ya na ya,’ na-amụta ihe n’aka ya ma soro ya na-arụkọ ọrụ.—Jenesis 2:20; Malakaị 2:14.

12. Gịnị ga-enyere nwunye aka ịnakwere ụkpụrụ ịbụisi?

12 N’akụkụ nke ya, onye bụ́ nwunye ga-edo onwe ya n’okpuru di ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmụọ nke ụwa na-emetụta ya, ọ pụrụ ịmalite ime ka ọ na-eleda echiche ọ na-enwe banyere ụkpụrụ ịbụisi anya, echiche nke ido onwe ya n’okpuru nwoke agaghịkwa amasị ya. Akwụkwọ Nsọ adịghị enye echiche na nwoke kwesịrị ịdị aka ike, ma, ọ na-achọ ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru di ha. (Ndị Efesọs 5:24) Bible na-achọkwa ka onye bụ́ di ma ọ bụ nna na-ebu ibu ọrụ, mgbe e tinyekwara ndụmọdụ dị na ya n’ọrụ, nke a na-eme ka e nwekwuo udo na ịdị n’otu n’ime ezinụlọ.—Ndị Filipaị 2:5.

13. Ihe nlereanya dị aṅaa nke ido onwe onye n’okpuru ka Jizọs setịpụụrụ ụmụaka?

13 Ụmụaka ga na-erubere ndị mụrụ ha isi. N’akụkụ a, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya. Mgbe ihe ahụ mere n’ụlọ nsọ gasịrị bụ́ mgbe a hapụrụ Jizọs dị afọ 12 ruo ụbọchị atọ, ‘o sooro ndị mụrụ ya gbadaa ma bịaruo Nazaret, ọ nọgidekwara na-edo onwe ya n’okpuru ha.’ (Luk 2:51) Ụmụaka ido onwe ha n’okpuru ndị mụrụ ha so eme ka a na-enwe udo na nkwekọ n’ime ezinụlọ. Mgbe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ na-anọ n’okpuru idu ndú Kraịst, ihe na-esi na ya apụta na-abụ ezinụlọ obi ụtọ.

14, 15. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma mgbe anyị nwetara ọnọdụ na-ama aka n’ebe obibi? Nye ihe atụ.

14 Ọbụnadị mgbe e nwere ọnọdụ ndị na-ama aka n’ebe obibi, isi ihe ga-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma bụ iṅomi Jizọs na ịnakwere nduzi ya. Dị ka ihe atụ, ọlụlụ Jerry dị afọ 35 lụrụ Lana, bụ́ nne nke nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma, wetara ihe ịma aka ha abụọ na-echetụdịghị n’echiche. Jerry na-akọwa, sị: “Amaara m na ka m wee bụrụ isi nke ọma, ọ dị m mkpa itinye otu ụkpụrụ Bible ndị ahụ wetaworo ihe ịga nke ọma n’ezinụlọ ndị ọzọ n’ọrụ. Ma achọpụtara m n’oge na-adịghị anya na aghaghị m iji amamihe na nghọta ka ukwuu tinye ha n’ọrụ.” Nwa nkuchi ya lere ya anya dị ka onye na-ekewapụ ya n’ebe nne ya nọ, wee na-eweso ya iwe nke ukwuu. Ọ chọrọ nghọta n’aka Jerry iji hụ na àgwà a na-emetụta ihe nwa agbọghọ ahụ na-ekwu ma na-eme. Olee otú o si mee ihe banyere ọnọdụ ahụ? Jerry na-aza, sị: “Mụ na Lana kwekọrịtara na, ma ọ dịghị ihe ọzọ ka ọ dịgodị, Lana ga na-enye ọzụzụ ndị metụtara ịdọ aka ná ntị, ebe m ga-elekwasị anya n’iwulite ezi mmekọrịta n’etiti mụ na nwa nkuchi m. Ka oge na-aga, ụzọ ime ihe a rụpụtara ihe dị mma.”

15 Mgbe anyị nwere ọnọdụ ndị tara akpụ n’ebe obibi, nghọta dị anyị mkpa iji chọpụta ihe mere ndị òtù ezinụlọ ji ekwu okwu ma na-eme omume otú ha si eme. Amamihe dịkwa anyị mkpa iji tinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, Jizọs ghọtara nke ọma ihe mere nwanyị ahụ oruru ọbara na-eme ji metụ ya aka, o jikwa amamihe na ọmịiko mesoo ya ihe. (Levitikọs 15:25-27; Mak 5:30-34) Amamihe na nghọta bụ ihe ndị e ji mara Onye Ndú anyị. (Ilu 8:12) Obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe otú ọ gaara esiwo mee.

“Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị, oleekwa otú Jizọs si jiri ihe nlereanya ya gosipụta nke a?

16 Jizọs mere ka ihe ndị nakweere idu ndú ya kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ ha doo anya. O kwuru, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya [Chineke].” (Matiu 6:33) O jikwa ihe nlereanya ya gosi anyị otú e si eme nke a. Mgbe ụbọchị 40 o ji buo ọnụ, tụgharịa uche, ma kpee ekpere bụ́ nke sochiri oge e mere ya baptizim gasịrị, a nwara Jizọs ọnwụnwa. Setan bụ́ Ekwensu nyere ya ịchịisi n’elu “alaeze nile nke ụwa.” Cheedị echiche ndụ Jizọs gaara ebiwo ma a sị na ọ naara ihe ahụ Ekwensu nyere ya! Otú ọ dị, Kraịst lekwasịrị anya n’ime uche Nna ya. Ọ ghọtakwara na ndụ dị otú ahụ n’ụwa Setan agaghị adịte aka. Ọ jụrụ ozugbo ịnara ihe ahụ Ekwensu na-enye ya, na-asị: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs “bidoro ime nkwusa na-asị: ‘Chegharịanụ, n’ihi na alaeze nke eluigwe eruwo nso.’” (Matiu 4:2, 8-10, 17) N’oge fọdụrụnụ ọ dịrị ndụ n’ụwa, Kraịst kwusara Alaeze Chineke oge nile.

17. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ihe ndị metụtara Alaeze na-ebute ụzọ ná ndụ anyị?

17 Anyị kwesịrị iṅomi Onye Ndú anyị ma ghara ikwe ka ụwa Setan raba anyị n’ịchụso ọrụ na-enye nnukwute ego dị ka ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi ná ndụ. (Mak 1:17-21) Lee ihe nzuzu ọ ga-abụ anyị ịbụ ndị ọnyà nke ịchụso ihe nke ụwa matara nke na ihe ndị metụtara Alaeze na-aghọ nnọọ ihe nke abụọ ná ndụ anyị! Jizọs enyefewo anyị ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ee, anyị pụrụ inwe ibu ọrụ ezinụlọ ma ọ bụ ibu ọrụ ndị ọzọ anyị na-ebu, ma obi ọ́ naghị adị anyị ụtọ iji uhuruchi na ngwụsị izu na-ebu ibu ọrụ anyị nke ime nkwusa na izi ihe dị ka Ndị Kraịst? Leekwa ihe agbamume ọ bụ na n’ime afọ ije ozi 2001, ihe dị ka mmadụ 780,000 jere ozi dị ka ndị ozi oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ!

18. Gịnị na-enyere anyị aka inweta ọṅụ n’ozi ahụ?

18 Ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ na-akọwa Jizọs dị ka ekwu eme nakwa dị ka onye nwere mmetụta ọmịiko. Mgbe ọ hụrụ mkpa ime mmụọ nke ndị gbara ya gburugburu, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha ma jiri oké mmasị nyere ha aka. (Mak 6:31-34) Ozi anyị na-aghọ nke na-enye ọṅụ mgbe anyị na-eje ya n’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ nakwa ọchịchọ sitere n’ezi obi nke inyere ha aka. Ma olee otú anyị pụrụ isi zụlite ọchịchọ dị otú ahụ? “Mgbe m dị afọ iri na ụma,” ka nwa okorobịa aha ya bụ Jayson na-ekwu, “ozi ahụ adịchaghị amasị m.” Gịnị nyeere ya aka ịzụlite mmasị n’ọrụ a? Jayson na-aza, sị: “N’ezinụlọ anyị, ụtụtụ Saturday nile na-abụ maka ozi ubi. Nke a baara m uru n’ihi na ka m na-agakwu ozi, otú ahụ ka m na-ahụkwu ezi ihe na-esi na ya apụta, otú ahụ ka m na-enwekwa mmasị na ya.” Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịdị na-agachi ozi ahụ anya ma na-adị uchu na ya.

19. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike n’ihe banyere idu ndú Kraịst?

19 N’ezie, ịnakwere idu ndú Kraịst bụ ihe na-enye ume ọhụrụ na ihe na-akwụghachi ụgwọ. Mgbe anyị mere otú ahụ, oge ntorobịa na-aghọ oge ito eto n’ihe ọmụma na amamihe. Ndụ ezinụlọ na-aghọ isi iyi nke udo na obi ụtọ, ozi ahụ bụkwa ọrụ na-enye ọṅụ na afọ ojuju. Mgbe ahụ, n’ezie, ka anyị kpebisie ike igosi ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị nakwa ná mkpebi ndị anyị na-eme na idu ndú Kraịst dị adị nye anyị. (Ndị Kọlọsi 3:23, 24) Otú ọ dị, Jizọs Kraịst anọwo na-edu anyị site n’ụzọ ọzọkwa—ọgbakọ Ndị Kraịst. Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú anyị pụrụ isi rite uru ná ndokwa a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú iso Onye Ndú anyị Chineke họpụtara si abara anyị uru?

• Olee otú ndị ntorobịa si egosi na ha chọrọ iso idu ndú Jizọs?

• Mmetụta dị aṅaa ka idu ndú Kraịst na-enwe ná ndụ ezinụlọ nke ndị nọ n’okpuru ya?

• Olee otú ozi anyị pụrụ isi gosi na idu ndú Kraịst dị adị nye anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Oge ntorobịa bụ oge dị mma iji nweta ihe ọmụma banyere Chineke nakwa banyere Onye Ndú anyị a họpụtara ahọpụta

[Foto dị na peeji nke 10]

Ịnọ n’okpuru idu ndú Kraịst na-akwalite obi ụtọ ezinụlọ

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Jizọs bu ụzọ chọọ Alaeze ahụ. Ị̀ na-eme otú ahụ?