Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Omume Kasị Mkpa n’Akụkọ Ihe Mere Eme

Ihe Omume Kasị Mkpa n’Akụkọ Ihe Mere Eme

Ihe Omume Kasị Mkpa n’Akụkọ Ihe Mere Eme

Ọ BỤ ọnwụ Jizọs Kraịst. Gịnị mere o ji dị oké mkpa? E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya.

Ikwesị ntụkwasị obi Jizọs gosipụtara ruo ọnwụ gosiri na ụmụ mmadụ pụrụ iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke.

Ọnwụ Kraịst mere ka ụfọdụ ndị nwee ohere nke iso ya chịa ọchịchị n’eluigwe. O meghekwaara ọtụtụ ndị ọzọ ụzọ inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala.

N’uhuruchi ahụ tupu ọ nwụọ, Jizọs jiri achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe dị ka ihe nnọchianya nke àjà mmadụ ya bụ́ nke o ji ịhụnanya chụọ. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ị̀ ga-echeta ihe omume a dị mkpa?

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù isonyere ha n’ime Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs. N’afọ a, ụbọchị ememe a bụ Thursday, March 28, mgbe anyanwụ dasịrị. Ị pụrụ ịga ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị nso n’ebe i bi. Biko jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị maka kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ya.