Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Òtù Waldo—Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant

Ndị Òtù Waldo—Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant

Ndị Òtù Waldo—Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant

Ọ bụ n’afọ 1545 n’ọmarịcha ógbè Lubéron nke Provence, n’ebe ndịda France. Ndị agha zukọrọ ịga rụọ ọrụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ bụ́ nke omume ekweghị okpukpe ọzọ dịrị kpaliri. Ha lara ndụ n’iyi ruo otu izu.

E BIBIRI ọtụtụ obodo nta, tụọkwa ọtụtụ ndị bi na ha mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ha. Ndị soja obi tara mmiri kpara arụ obi ọjọọ ahụ ná mgbuchapụ nke mere ka Europe maa jijiji. Ihe dị ka ndị ikom 2,700 nwụrụ, a kpọgara 600 ịkwọ ụgbọ epeepe, e kwuwebeghị banyere ahụhụ ndị inyom na ụmụaka tara. Eze France na popu toro ọchịagha kpọ ndị gara kwafuo ọbara a.

Ndozigharị ahụ ekewasịalarị Germany mgbe Eze Francis nke Mbụ nke France bụ́ onye Katọlik, n’inwe nchegbu banyere mgbasawanye nke okpukpe Protestant, jụrụ ase banyere ndị a sị na ha bụ ndị jụrụ okwukwe bụ́ ndị nọ n’alaeze ya. Kama ịchọpụta mmadụ ole na ole jụrụ okwukwe, ndị ọchịchị nọ na Provence chọpụtara ọtụtụ obodo nta nke ndị jụrụ okwukwe. E tiri iwu ka e kpochapụ ịjụ okwukwe a, e mesịkwara mezuo ya ná mgbuchapụ ahụ weere ọnọdụ na 1545.

Olee ndị bụ́ ndị a jụrụ okwukwe? Gịnịkwa mere e ji jiri ime ihe ike chọọ ikpochapụ okpukpe ha?

Site n’Ịba Ọgaranya Gaa n’Ogbenye Ọnụ Ntụ

Ndị e gburu ná mgbuchapụ ahụ so n’otu òtù okpukpe malitere laa azụ na narị afọ nke 12, nke gbasakwara ruo ọtụtụ ebe na Europe. Otú o si gbasaa ma dịgide ruo ọtụtụ narị afọ mere ka ọ pụọ iche n’akụkọ ihe mere eme nke nkewa okpukpe. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kweere na òtù ahụ malitere n’ihe dị ka n’afọ 1170. N’obodo Lyons nke France, otu onye ahịa bụ́ aka ji akụ̀ nke aha ya bụ́ Vaudès bịara nwee mmasị dị ukwuu n’ịmụta otú e si eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’ụzọ doro anya, n’ịbụ onye ndụmọdụ Jizọs Kraịst nyere otu nwoke bara ọgaranya ka o ree ihe o nwere ma nye ya ndị ogbenye kpaliri, Vaudès hụrụ na ezinụlọ ya nwere ego ga-ezuru ha ma nyefezie akụ̀ na ụba ya maka ikwusa Oziọma ahụ. (Matiu 19:16-22) N’oge na-adịghị anya, o nwetara ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị a bịara mara dị ka ndị òtù Waldo. *

Ịda ogbenye, ime nkwusa, na Bible bụ ihe ndị bụ́ isi ná ndụ Vaudès. Ime mkpesa megide ndị ụkọchukwu bara ọgaranya abụghị ihe ọhụrụ. Ruo oge ụfọdụ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu nwere echiche dị iche akatọwo omume rụrụ arụ na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke ndị chọọchị. Ma Vaudès bụ onye nkịtị, dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụazụ ya bụkwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a na-egosi ihe mere ha ji chee na ọ dị oké mkpa inwe Bible n’asụsụ ógbè, bụ́ asụsụ ndị nkịtị na-aghọta. Ebe ọ bụ nanị ndị ụkọchukwu na-agụ nsụgharị Bible Latin nke chọọchị, Vaudès kwadoro ka a malite ịsụgharị Oziọma ndị ahụ na akwụkwọ Bible ndị ọzọ gaa n’asụsụ Franco-Provençal, bụ́ asụsụ ndị nkịtị nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe etiti France na-aghọta. * N’ime ihe kwekọrọ n’iwu Jizọs nyere ka e mee nkwusa, Ndị Ogbenye nke Lyons gawara n’okporo ámá izisa ozi ha. (Matiu 28:19, 20) Ọkọ akụkọ ihe mere bụ́ Gabriel Audisio na-akọwa na ọnwụ ha siri na-eme nkwusa n’ihu ọha ghọrọ isi ihe kpatara chọọchị ji mesoo ndị òtù Waldo omume otú ha siri mesoo ha.

Site n’Ịbụ Ndị Katọlik Gaa n’Ịbụ Ndị Jụrụ Okwukwe

N’oge ndị ahụ, ọ bụ nanị ndị ụkọchukwu ka e nyere ikike ime nkwusa, ọ bụkwa chọọchị ka ọ dị n’aka inye ndị mmadụ ikike ime nkwusa. Ndị ụkọchukwu lere ndị òtù Waldo anya dị ka ndị na-amaghị nke a na-akọ na ndị na-amaghị akwụkwọ, ma na 1179, Vaudès gbalịrị inweta ikike maka ime nkwusa ya site n’aka Popu Alexander nke Atọ. E nyere ya ikike—ma ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu nọ n’ógbè ya ekwere. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Malcolm Lambert na-ekwu na nke a “dị nnọọ ka ịjụwa isi.” N’ezie, Achịbishọp Jean Bellesmains nke Lyons machibidoro ndị nkịtị iwu ime nkwusa. Vaudès zaghachiri site n’ihota Ọrụ 5:29: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” N’ihi ịjụ ịkwanyere mmachibido iwu ahụ ùgwù, a chụpụrụ Vaudès na chọọchị na 1184.

Ọ bụ ezie na a chụpụrụ ndị òtù Waldo na dayọsis nke Lyons, chụpụkwa ha n’obodo ahụ, o yiri ka e meghị ihe kwekọrọ ná mmachibido iwu mbụ ahụ n’ụzọ siri ike. Ọtụtụ ndị nkịtị bịara nwee mmasị n’ebe ndị òtù Waldo nọ n’ihi ime ihe n’eziokwu nakwa ụzọ ndụ ha, ọbụna ndị bishọp nọgidere soro ha na-ekwurịta okwu.

Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Euan Cameron si kwuo, o yiri ka ndị òtù Waldo bụ́ ndị nkwusa ‘emegideghị Chọọchị Rom kpọmkwem.’ Nanị ihe ha “chọrọ bụ ime nkwusa na izi ihe.” Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na iwu dịgasị iche iche bụ́ ndị ji nke nta nke nta napụ òtù a ikike n’ụzọ na-adịgide adịgide fọrọ nke nta ka o mee ka ọ bụrụ òtù jụrụ okwukwe. Nkatọ nke chọọchị na-akatọ ha kpatara mmachibido iwu nke Kansụl nke Anọ nke Lateran machibidoro ha na 1215. Olee otú nke a si metụta ime nkwusa ha?

Ha Malitere Ime Ihe na Nzuzo

Vaudès nwụrụ n’afọ 1217, mkpagbu chụsakwara ụmụazụ ya gaa na ndagwurugwu nke Alps nke France, Germany, ebe ugwu Ịtali, na Ebe Etiti na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Mkpagbu mekwara ka ndị òtù Waldo gaa biri n’ime ime obodo, nke a mekwara ka ọrụ nkwusa ha ghara iru ọtụtụ ebe.

Na 1229, Chọọchị Katọlik lụchara Agha Ntụte ọ na-alụso ndị Cathar, ma ọ bụ ndị Albi, n’ebe ndịda France. * Ndị òtù Waldo ghọrọ ndị ọzọ a lụsoro agha ntụte ahụ. N’oge na-adịghị anya, njụta okwukwe ahụ ga-aghọ nke a ga-eji obi ọjọọ mee megide ndị nile na-emegide chọọchị. Egwu mere ka ndị òtù Waldo mewe ihe na nzuzo. Ka ọ na-erule n’afọ 1230, ha anaghịzi eme nkwusa n’ihu ọha. Audisio na-akọwa, sị: “Kama ịga na-achọ atụrụ ọhụrụ, . . . , ha tinyere onwe ha n’ilekọta ndị a tọghatarala atọghata, na-eme ka ha nọsie ike n’okwukwe n’agbanyeghị nrụgide na mkpagbu ha na-enweta site n’èzí.” Ọ na-agbakwụnye na “ime nkwusa nọgidere bụrụ ihe dị oké mkpa ma a gbanwere otú e si eme ya kpam kpam.”

Nkwenkwe na Omume Ha

Kama ime ka ma ndị ikom ma ndị inyom na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa, ka ọ na-erule na narị afọ nke 14, ndị òtù Waldo enwewo ọdịiche n’etiti ndị nkwusa na ndị kwere ekwe. Ọ bụ nanị ndị ikom a zụrụ nke ọma na-ekere òkè n’oge ahụ n’ọrụ ọzụzụ atụrụ. E mesịrị bịa mara ndị ozi a na-ejegharị ejegharị dị ka ndị barbe (deede).

Ndị barbe, bụ́ ndị letara ezinụlọ ndị òtù Waldo n’ebe obibi ha, rụrụ ọrụ iji mee ka òtù ahụ dịgide kama ịgbasawanye ya. Ndị barbe nile maara agụ, marakwa ede, ọzụzụ ha kwa, bụ́ nke na-ewe afọ isii, bụ nke dabeere na Bible. Iji Bible nke dị n’asụsụ ógbè ha eme ihe nyeere ha aka ịkọwara ya ìgwè atụrụ ha. Ọbụna ndị mmegide ha kwetara na ndị òtù Waldo, gụnyere ụmụaka ha, maara Bible nke ọma, nweekwa ike ihota akụkụ dị ukwuu nke Akwụkwọ Nsọ.

Ụfọdụ n’ime ihe ndị mbụ bụ́ ndị òtù Waldo jụrụ gụnyere ịgha ụgha, pọgatrị, idoro ndị nwụrụ anwụ Mas, mgbaghara mmehie site n’aka popu na ọpịpịa, na ife Meri na “ndị nsọ” ofufe. Ha mekwara ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, ma ọ bụ Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ, kwa afọ. Dị ka Lambert si kwuo, ụdị ofufe ha “bụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, okpukpe nke ndị nkịtị.”

“Ụdị Ndụ Abụọ”

Obodo dị iche iche nke ndị òtù Waldo nọkọtara ọnụ. Ha na-alụrịta dị na nwunye n’ime òtù ha, ruokwa ọtụtụ narị afọ, nke a mere ka aha nna ndị ha na-aza bụrụ nke e jiri mara ndị òtù Waldo. Otú ọ dị, ná mgbalị ha ịlanarị, ndị òtù Waldo gbalịrị izochi echiche ha. Otú ha si ezo nkwenkwe na ihe omume okpukpe ha mere ka ọ dịịrị ndị mmegide ha mfe ibo ha ebubo ndị jọgburu onwe ha, dị ka ihe atụ, na-ekwu na ha na-efe Ekwensu. *

Otu ụzọ ndị òtù Waldo si mee ka a kwụsị ebubo ndị dị otú ahụ bụ site n’ime ihe ndị ha na-adịghị emebu na ime ihe ọkọ akụkọ ihe mere bụ́ Cameron kpọrọ “ifetụ ofufe” dị ka ndị Katọlik. Ọtụtụ ndị òtù Waldo kwupụtaara ndị ụkọchukwu Katọlik mmehie, gaa Mas, jiri mmiri nsọ mee ihe, ọbụnakwa mee njem ala nsọ. Lambert na-ekwu, sị: “Ha mere ka ndị agbata obi ha bụ́ ndị Katọlik n’ọtụtụ ihe.” Audisio kwuru hoo haa na ka oge na-aga, ndị òtù Waldo “biwere ụdị ndụ abụọ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’otu akụkụ, ha mere nnọọ omume n’ihu ọha ka ndị Katọlik iji nwetụ udo; n’akụkụ ọzọ, ha mere ememe na omume ụfọdụ n’etiti onwe ha bụ́ ndị mere ka òtù ha dịgide.”

Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant

Na narị afọ nke 16, Ndozigharị ahụ gbanwere ikpe okpukpe na Europe n’ụzọ dị egwu. Ihe ndị a na-ekweghị ka okpukpe ha dịrị pụrụ ime bụ inweta nkwado iwu ná mba ha ma ọ bụ ịkwaga ná mba ọzọ ebe ọ ga-akara ha mma. Okwu banyere ịjụ okwukwe bịakwara bụrụ obere okwu, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị amalitewo inyo nkwenkwe okpukpe ndị a ma ama enyo.

Laa azụ na 1523, Onye Ndozigharị a ma ama bụ́ Martin Luther kpọtụrụ ndị òtù Waldo aha. Na 1526, otu n’ime ndị barbe nke ndị òtù Waldo ji akụkọ banyere ihe ndị metụtara okpukpe bụ́ ndị na-eme na Europe lọta Alps. Ihe sochiri nke a bụ oge mgbanwerịta bụ́ mgbe ndị òtù Protestant na ndị òtù Waldo gwarịtara onwe ha echiche ha. Ndị Protestant gbara ndị òtù Waldo ume ka ha kwalite nsụgharị mbụ nke Bible site n’asụsụ mbụ e ji dee ya gaa na French. N’ịbụ nke e bipụtara na 1535, e mesịrị mara ya dị ka Bible Olivétan. Otú ọ dị, n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị òtù Waldo apụghị ịghọta French.

Ka mkpagbu sitere n’aka Chọọchị Katọlik gara n’ihu, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị òtù Waldo gara biri n’ógbè Provence nke dị n’ebe ndịda France bụ́ nke dị nchebe karị, dị ka ndị Protestant si mba ọzọ kwabata mere. N’oge na-adịghị anya, e mere ka ndị ọchịchị mara banyere nkwabata a. N’agbanyeghị ọtụtụ akụkọ ọma a kọrọ banyere ụzọ ndụ na omume nke ndị òtù Waldo, ụfọdụ ndị nyowere iguzosi ike n’ihe ha enyowe ma boo ha ebubo na ha na-akpaghasị ihe. E tiri iwu Mérindol, bụ́ nke kpatara ajọ mwụfu ọbara ahụ a kpọtụrụ uche ná mmalite nke isiokwu a.

Mmekọrịta dị n’etiti ndị Katọlik na ndị òtù Waldo nọgidere na-aka njọ. N’imeghachi omume ná mwakpo a na-awakpo ha, ndị òtù Waldo ji ngwá agha mee ihe iji chebe onwe ha. Ọgba aghara a mere ka ha banye n’òtù Protestant. N’ụzọ dị otú a, ndị òtù Waldo sonyeere okpukpe Protestant a ma ama.

Ruo ọtụtụ narị afọ, e guzobewo chọọchị dị iche iche nke ndị òtù Waldo ná mba ndị dị anya site na France, dị ka Uruguay na United States. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kweere ihe Audisio kwuru, bụ́ onye sịrị na “ndị òtù Waldo bịara ná njedebe n’oge Ndozigharị ahụ,” bụ́ mgbe okpukpe Protestant “loro” ya. N’ezie, ndị òtù Waldo enwechaghịzi ụdị ịnụ ọkụ n’obi mbụ ha nwere ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Nke ahụ mere mgbe ndị òtù ya ji ụjọ hapụ ime nkwusa na izi ihe dabeere na Bible.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A na-akpọgasị Vaudès, Valdès, Valdesius, ma ọ bụ Waldo. Aha nke ikpeazụ a bụ ebe aha ahụ bụ́ “ndị òtù Waldo” sitere. A makwaara ndị òtù Waldo dị ka Ndị Ogbenye nke Lyons.

^ par. 8 Laa azụ na 1199, bishọp nke Metz, nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ France, kpesaara Popu Innocent nke Atọ na ndị mmadụ na-agụ ma na-ekwurịta okwu Bible n’asụsụ ógbè. O yikarịrị ka bishọp ahụ ọ̀ na-ekwu banyere ndị òtù Waldo.

^ par. 15 Lee “Ndị Cathar—Hà Bụ Ndị Kraịst E Gburu Maka Okwukwe Ha?” nke dị n’Ụlọ Nche nke September 1, 1995, peeji nke 27-30.

^ par. 21 Aha ọjọọ a nọgidere na-akpọ ndị òtù Waldo mere ka e nwee aha ahụ bụ́ vauderie (nke sitere n’okwu French bụ́ vaudois). E ji ya akọwa ndị a na-enyo enyo na ha jụrụ okwukwe ma ọ bụ ndị na-efe Ekwensu.

[Map/Foto dị na peeji nke 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebe Ndị Ndị Òtù Waldo Nọrọ

FRANCE

Lyons

PROVENCE

Lubéron

Strasbourg

Milan

Rom

Berlin

Prague

Vienna

[Foto]

Ndị òtù Waldo kwalitere nsụgharị nke Bible Olivétan nke 1535

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bible: © Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

VAUDÈS

Ịkpọ ndị agadi nwanyị abụọ bụ́ ndị òtù Waldo ọkụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Peeji nke 20 na 21: © Landesbildstelle Baden, Karlsruhe