Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzukọ Ndị Na-akpali Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ

Nzukọ Ndị Na-akpali Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ

“Bịakwutenụ m, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”

Nzukọ Ndị Na-akpali Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ

SITE na Toronto ruo Tokyo, site Moscow ruo Montevideo—ọtụtụ ugboro kwa izu, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na ndị enyi ha na-enuga n’ebe ndị ha na-anọ efe ofufe. Ndị a na-agụnye ndị ikom na-arụsi ọrụ ike nwere ezinụlọ, bụ́ ndị ike gwụchara ka ha rụsịrị ọrụ ruo ogologo oge n’ụbọchị; ndị nwunye na ndị nne na-agba mbọ bụ́ ndị na-akpọrọ obere ụmụaka ha aga; ndị ntorobịa nwere ume bụ́ ndị si ụlọ akwụkwọ lọta; ndị agadi ike na-adịchaghị bụ́ ndị ahụ́ mgbu na-eme ka ha ghara ijesi ije ike; ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei nwere obi ike; na ndị nwere nkụda mmụọ nkasi obi dị mkpa.

Ndịàmà Jehova ndị a na-eji ọtụtụ usoro ime njem eme ihe—site n’ụgbọ okporo ígwè na-agbasi ike ruo n’ịnyịnya ibu, site n’ụgbọala ndị na-agba n’ụzọ okpuru ala ruo na gwongworo. Ụfọdụ aghaghị ịgafe osimiri ndị agụ iyi nọ n’ime ha, ebe ndị ọzọ na-aghaghị ịnagide okporo ụzọ na-ekwo ekwo n’ụzọ na-emenye ụjọ nke obodo ukwu. Gịnị mere ndị a nile ji etinye mgbalị dị nnọọ ukwuu?

N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi na ịga na ikere òkè ná nzukọ Ndị Kraịst bụ ụzọ dị mkpa isi na-efe Jehova Chineke ofufe. (Ndị Hibru 13:15) Pọl onyeozi zoro aka n’ihe ọzọ kpatara ya mgbe o dere, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, . . . kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ebe a, Pọl kwughachiri mmetụta ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid nwere, bụ́ onye bụrụ, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.”—Abụ Ọma 122:1.

N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji aṅụrị ọṅụ n’ihi ịnọ ná nzukọ ha? Ọ bụ n’ihi na ndị nọ ya abụghị ndị bịara nnọọ ikiri nkiri. Kama nke ahụ, nzukọ ahụ na-enye ha ohere ịmara ibe ha. Karịsịa, nnọkọ ndị a na-eme ka e nwee oge maka inye ihe, ọ bụghị nanị ịnara anara, na oge ịkpali otu onye na ibe ya igosirịta ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ. Nke a na-enye aka eme ka nzukọ bụrụ oge na-ewuli elu. Ọzọkwa, nzukọ Ndị Kraịst bụ otu n’ime ụzọ ndị Jizọs si emezu nkwa ya bụ́: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.”—Matiu 11:28.

Ebe A Na-enweta Nkasi Obi na Nchebara Echiche

Ndịàmà Jehova nwere ezi ihe mere ha ga-eji na-ele nzukọ ha anya dị ka ihe na-enye ume ọhụrụ. Tinyere ihe ndị ọzọ, ná nzukọ, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. (Matiu 24:45) Nzukọ na-ekerekwa òkè dị mkpa n’ime ka ndị ohu Jehova bụrụ ndị ji nkà na ịnụ ọkụ n’obi na-ezi Okwu Chineke. Tụkwasị na nke ahụ, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mmadụ pụrụ ịhụ ìgwè ndị enyi na-ahụ n’anya, ndị na-enwe nchegbu banyere ibe ha, na ndị na-echebara ibe ha echiche bụ́ ndị dị njikere inye aka na ịkasi ndị ọzọ obi n’oge nsogbu.—2 Ndị Kọrint 7:5-7.

Nke a bụ ahụmahụ nke Phillis, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ mgbe ụmụ ya dị afọ ise na afọ asatọ. N’ịkọwa ume ọhụrụ nke nzukọ Ndị Kraịst na-enye ya na ụmụ ya, ọ sịrị: “Ọ bụ ihe na-akasi obi ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi na ndị kwere ekwe ibe anyị na-eji mmakụ, okwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ ikwe n’aka n’ụzọ na-ekpo ọkụ, egosipụta ịhụnanya na nchegbu ha nwere n’ebe anyị nọ. Ọ bụ ebe m na-achọ ịnọ mgbe nile.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

Mgbe a wasịrị Marie ahụ́ nke dị oké ize ndụ, dọkịta ya kwuru na ọ ga-ewe ihe dị ka izu isii tupu ya agbakee. N’ime izu ndị mbụ nke mgbake ya, Marie apụghị ịga nzukọ. Dọkịta ya chọpụtara na ọ dịghịzi enwe ihu ọchị otú o sibu enwe. Mgbe ọ chọpụtara na ọ naghị aga nzukọ, ọ gbara ya ume ime otú ahụ. Marie zaghachiri na di ya, bụ́ onye na-anọghị n’okpukpe ya, agaghị adị njikere ikwe ka ọ gaa nzukọ n’ihi nchegbu o nwere maka ahụ́ ike ya. N’ihi ya, dọkịta ahụ ji aka ya ‘nye Marie iwu’ ka ọ gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka agbamume na mkpakọrịta na-ewuli elu. Marie na-ekwubi, sị: “Mgbe m gasịrị otu nzukọ, ahụ́ dịrị m mma karị. Amalitere m iri nri, ehiri m ụra n’abalị ahụ dum, ọ dịghịzikwa m mkpa ịṅụ ọgwụ na-akwụsị ahụ́ mgbu ugboro ugboro, amalitekwara m inwe ihu ọchị ọzọ!”—Ilu 16:24.

Ndị nọ n’èzí na-ahụ ọnọdụ ịhụnanya a na-enwe ná nzukọ Ndị Kraịst. Otu nwa akwụkwọ kọleji họọrọ inyocha Ndịàmà Jehova iji wee dee ihe odide ya n’ihe ọmụmụ nkà mmụta banyere ịdị adị mmadụ. Banyere ọnọdụ e nwere ná nzukọ, o dere n’ihe odide ya, sị: “Nnabata a nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ . . . na-akpali nnọọ mmasị. . . . Omume enyi nke Ndịàmà Jehova nwere bụ àgwà pụtara nnọọ ìhè nakwa nke m chere na ọ bụ akụkụ kasị mkpa nke nnọkọ ahụ.”—1 Ndị Kọrint 14:25.

N’ụwa a nsogbu jupụtara, ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ebe mgbaba ime mmụọ. Ọ bụ ebe a na-enweta udo na ịhụnanya. Site n’ịnọ ná nzukọ, ị pụrụ ịhụ n’onwe gị ịbụ eziokwu nke okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”—Abụ Ọma 133:1.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

IGBO MKPA PỤRỤ ICHE

Olee otú ndị na-enweghị ike ịnụ ihe pụrụ isi rite uru ná nzukọ Ndị Kraịst? Gbaa ụwa gburugburu, Ndịàmà Jehova na-eguzobe ọgbakọ ndị ji asụsụ ndị ogbi eme ihe. N’ime afọ 13 gara aga, e guzobewo ọgbakọ 27 na ìgwè 43 ji asụsụ ndị ogbi eme ihe na United States. Ọ dịkarịa ala ná mba 40 ọzọ, e nwere ihe dị ka ọgbakọ 140 ji asụsụ ndị ogbi eme ihe. E mepụtawo ọtụtụ vidio nke akwụkwọ Ndị Kraịst n’asụsụ 13 nke ndị ogbi.

Ọgbakọ Ndị Kraịst na-enye ndị ogbi ohere ito Jehova. Odile, onye bụ́bu onye Katọlik na France nke nwere oké ịda mbà n’obi ruo ogologo oge ma chee echiche igbu onwe ya, nwere ekele dị ukwuu maka ọzụzụ sitere na Bible o nwetaworo ná nzukọ Ndị Kraịst. “Enwetaghachiri m ahụ́ ike m na ọṅụ nke ndụ,” ka ọ na-ekwu. “Ma nke kasịnụ, achọtara m eziokwu ahụ. Ugbu a, ndụ m nwere nzube.”