Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Achọrọ M Ijere Chineke Ozi”

“Achọrọ M Ijere Chineke Ozi”

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Achọrọ M Ijere Chineke Ozi”

“NDỊ nke m, sinụ n’ime ya pụta.” Nke ahụ bụ òkù otu mmụọ ozi kpọrọ nke Jọn onyeozi nụrụ na narị afọ mbụ O.A. N’ụbọchị anyị, ọtụtụ nde ndị nwere obi eziokwu azawo òkù ahụ ma si na “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, pụta. (Mkpughe 18:1-4) Otu onye n’ime ha bụ Wilner onye Haiti, bụ́ onye kọrọ ahụmahụ ya a.

“A mụrụ m na 1956 n’ime ezinụlọ ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe nke bi n’obodo nta St. Marc, Haiti. Cheedị ọṅụ ezinụlọ m nwere mgbe a họọrọ mụ na mmadụ abụọ ọzọ si n’obodo anyị, ịga seminarị na St. Michel de l’Atalaye, Haiti. E mesịa, na 1980, e zigara anyị Stavelot, Belgium, maka inwetakwu ọzụzụ. N’ebe ahụ, anyị gakwara mahadum ndị Katọlik.

“Ná mbụ, ọ dị m ọkụ n’obi ịbanye n’òtù ndị ụkọchukwu. Otu ụbọchị n’ụlọ nri, ụkọchukwu na-elekọta ìgwè anyị gwara m ka m cheretụ ruo nkeji ole na ole n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa m. Cheedị akpata oyi wụrụ m n’ahụ́ mgbe ọ gwara m hoo haa na ya nwere mmasị n’ebe m nọ iso m nwee mmekọahụ́! Ajụrụ m ma nwee oké nkụda mmụọ. Edegaara m ezinụlọ m akwụkwọ banyere ihe a merenụ ma hapụ seminarị ahụ ọnwa ole na ole ka e mesịrị, n’agbanyeghị na ọ masịghị ha. Agara m biri n’ime obodo ma mụọ ọrụ ọzọ.

“Mgbe m laghachiri St. Marc, atụkwasịghịzi m Chọọchị Katọlik obi ma ọlị. Otú ọ dị, achọrọ m ijere Chineke ozi, ma amaghị m ihe m ga-eme. Agara m chọọchị Adventist, chọọchị Ebenezer, na chọọchị Mormon. Enwetaghị m nduzi n’ụzọ ime mmụọ.

“Mgbe ahụ, echetara m na mgbe m nọ na seminarị na Belgium, ana m adị na-agụ Bible Crampon. Ahụrụ m aha Chineke n’ime ya. Ya mere, n’iji aha Chineke eme ihe, ekpekusiri m ya ekpere ike ka o nyere m aka ịchọta ezi okpukpe ahụ.

“Ntakịrị oge ka e mesịrị, Ndịàmà Jehova abụọ kwabatara n’ógbè anyị. Ha dị nwayọọ, na-akwanyere mmadụ ùgwù, ma dị ùgwù. Ụzọ ndụ ha masịrị m. Otu ụbọchị, otu n’ime Ndịàmà abụọ ahụ kpọrọ m òkù ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs nke a na-eme kwa afọ. Nzukọ ahụ masịrị m nke ukwuu, ekwekwara m ka Ndịàmà mụọrọ m Bible n’ụzọ chiri anya. N’ihe dị ka ọnwa isii, abịara m kwenyesie ike na achọtawo m ụzọ kwesịrị ekwesị isi jeere Chineke ozi. Araara m ndụ m nye Jehova, e meekwa m baptizim na November 20, 1988.”

Ka oge na-aga, Wilner weere ozi oge nile. Taa, ọ na-eje ozi dị ka okenye ọgbakọ. Ya na nwunye ya na ụmụ ha abụọ ji obi ụtọ na-eje ozi n’ọgbakọ ha.

[Foto dị na peeji nke 9]

Site n’ịgụ Bible, Wilner chọpụtara na aha Chineke bụ Jehova